< 1 Ndị Eze 9 >

1 Mgbe Solomọn rụchara ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, na ụlọeze, rụzukwaa ihe niile bụ nke o bu nʼobi ime,
After Solomon’s [workers] had finished building the temple and his palace and everything else that Solomon wanted them to build,
2 Onyenwe anyị mere ka ọ hụ ya anya nke ugboro abụọ dịka o mere ka ọ hụ ya anya na Gibiọn.
Yahweh appeared to him [in a dream] a second time, like he had appeared to him at [the city of] Gibeon.
3 Onyenwe anyị sịrị ya, “Anụla m ekpere gị, na arịrịọ gị, nke ị rịọrọ nʼihu m. Edoola m ụlọnsọ a nke i wuru nsọ, site nʼitinye Aha m nʼebe ahụ ruo mgbe ebighị ebi. Anya m na obi m abụọ ga-adịkwa nʼebe ahụ ụbọchị niile.
Yahweh said to him, “I heard what you prayed and what you pleaded for me to do. I have set apart/dedicated this temple which your [workers] have built to be the place where people will worship me forever. I will always watch over it and protect it.
4 “Ma gị onwe gị, ọ bụrụ na ị jiri obi zuruoke na omume ziri ezi, bie ndụ nʼikwesị ntụkwasị obi nʼihu m dịka Devid nna gị mere, na-eme ihe niile m nyere nʼiwu, debe ụkpụrụ m na iwu m niile,
“And as for you, if you conduct your life as I want you to, like your father David did, and if you very sincerely obey all the statutes and laws that I have commanded you to obey,
5 mgbe ahụ, aga m eme ka ocheeze ọchịchị gị nʼIzrel guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi, dịka m kwere nna gị Devid nkwa, mgbe m sịrị, ‘Ị ghaghị inwe onye nnọchite anya nʼocheeze Izrel.’
I will do what I promised your father that I would do: I promised him that Israel would always be ruled by his descendants.
6 “Ma ọ bụrụ na unu, maọbụ ụmụ ụmụ unu alaghachi azụ, site nʼebe m nọ, jụ idebe iwu na ụkpụrụ niile bụ nke m nyere unu, pụọ gbasoro chi ndị ọzọ ife ha ofufe na ịkpọ isiala nye ha,
“But if you or your descendants turn away from me and disobey the commands and decrees that I have given to you, and if you start to worship other gods,
7 mgbe ahụ, aga m esite nʼala ahụ nke m nyere ha wezuga Izrel. Aga m ajụkwa ụlọnsọ a m doro nsọ nye Aha m. Izrel ga-aghọ ihe eji atụ ilu na ihe ịkpa ọchị nʼetiti ndị niile.
I will remove my Israeli people from the land that I have given to them. I will also abandon this temple that I have set apart/dedicated to be the place where people should worship me. Then people everywhere will despise [the people of] Israel and make fun of them.
8 Ọ bụ ezie na ụlọnsọ ukwu a kachasị elu ugbu a, ma ọnọdụ ya ga-eju ndị niile ga-esi nʼakụkụ ya gafee anya. Ha ga-emi ọnụ, sị, ‘Gịnị mere Onyenwe anyị ji mee ala a na ụlọnsọ a, ihe dị otu a?’
This temple will become a heap of ruins. Everyone who passes by will be astonished [when they see it], and they will be shocked and say, ‘Why has Yahweh done this to this land and to this temple?’
9 Ndị mmadụ ga-aza, ‘Nʼihi na ha gbakụtara Onyenwe anyị Chineke ha azụ, onye kpọpụtara ha site nʼala Ijipt azụ, makụọ chi ndị ọzọ, na-akpọ isiala na-efekwa ha ofufe. Ọ bụ nʼihi nke a ka O ji mee ka ihe ọjọọ niile ndị a bịakwasị ha.’”
And other people will reply, ‘It happened because the Israeli people abandoned Yahweh their God, the one who brought their ancestors out of Egypt. They started to accept and worship other gods. And that is why Yahweh has caused them to experience all these disasters.’”
10 Nʼọgwụgwụ iri afọ abụọ, mgbe Solomọn ji wuo ụlọ abụọ ndị a, ya bụ ụlọnsọ Onyenwe anyị na ụlọeze.
Solomon’s [workers] labored for 20 years to build the temple and the palace.
11 Eze Solomọn nyere Hiram, eze Taịa, iri obodo abụọ dị na Galili, nʼihi osisi sida, na osisi junipa, na ọlaedo niile Hiram butere ya dịka o si chọọ ya.
Hiram, the king of Tyre had [arranged for his workers to] give Solomon all the cedar and pine [logs] and all the gold that he needed [for this work]. After it was all finished, King Solomon gave to Hiram 20 cities in the Galilee region.
12 Ma mgbe Hiram si Taịa gaa ịhụ obodo ndị a nke Solomọn nyere ya, ha amasịghị obi ya.
But when Hiram went from Tyre [to Galilee] to see the cities that Solomon had given to him, he was not pleased with them.
13 Ya mere, ọ jụrụ sị, “Nwanne m nwoke, ụdị obodo dị aṅaa bụ ihe a i nyere m?” Nʼihi ya, ọ kpọrọ ha Kabul, aha ọ na-aza ruo taa.
He said to Solomon, “My friend, those cities that you gave me are worthless!” So, that area is still called ‘Worthless’.
14 Hiram zigaara eze ọlaedo dị puku kilogram anọ na iri asatọ.
Hiram paid Solomon only five tons of gold [for those cities].
15 Nke a bụ akụkọ banyere ndị ọrụ mmanye niile eze bụ Solomọn chịkọtara maka ịrụ ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, na ụlọeze nke ya, na ebe e wusiri ike nke Milo, na mgbidi Jerusalem, Hazọ, Megido nakwa Gaza.
This is a record of the work that King Solomon forced men to do. He forced them to build the temple and his palace and the terraces/landfills [on the east side of the city], and the wall around Jerusalem, and [to rebuild the cities of] Hazor and Megiddo and Gezer.
16 Fero eze Ijipt buru agha na mbụ merie Gaza, kpọọ ya ọkụ, gbukwaa ọtụtụ ndị Kenan bi nʼobodo ahụ, were ya nye nwa ya nwanyị, bụ nwunye Solomọn, ka ọ bụrụ ihe o ji duo ya ụlọ.
[The reason they needed to rebuild Gezer was that the army of] the king of Egypt had attacked Gezer and captured it. Then they had burned [the houses in] the city and killed all the people of the Canaan people-group who lived there. The king of Egypt gave that city to his daughter as a gift when she married Solomon.
17 Solomọn wugharịrị obodo Gaza, wuokwa ndịda Bet-Horon,
So Solomon’s workers also rebuilt Gezer, and they also rebuilt Lower Beth-Horon [city].
18 Baalat na Tadmọ nke dị nʼọzara nʼime ala ya.
They also rebuilt Baalath and Tamar [towns] in the desert in [the southern part of] Judah.
19 O wukwara ọtụtụ obodo ebe nchịkọba ihe, obodo ebe idebe ụgbọ agha na ịnyịnya ya niile. O wuru ihe ọbụla gụrụ obi ya agụụ iwu na Jerusalem, Lebanọn na nʼoke ala ahụ niile ọ na-achị.
They also built cities where they kept the supplies for Solomon, the places where his horses and chariots were kept. They also built everything else that Solomon wanted them to build, in Jerusalem and in Lebanon, and in other places in the area over which he ruled.
20 Ndị niile fọdụrụ ndụ nʼetiti ndị Amọrait, ndị Het, ndị Periz, ndị Hiv na Jebus (ndị ahụ abụghị ndị Izrel),
There were many people who belonged to the Amor people-group, the Heth people-group, the Periz people-group, the Hiv people-group, and the Jebus people-group who were not killed when the Israelis captured their land.
21 ndị ụmụ ụmụ ha niile fọdụrụ nʼala ahụ, ndị ahụ ndị Izrel na-enweghị ike egbuchapụ, ndị a ka Solomọn mere ndị ọrụ mmanye na ndị ohu, nke a bụkwa ọnọdụ ha ruo taa.
[Their descendants still lived in Israel]. It was those people whom Solomon forced to become his slaves [to build all those places], and they are still slaves.
22 Ma Solomọn emeghị ka onye Izrel ọbụla bụrụ ohu. Kama ha bụ ndị ikom agha, ndịisi ọrụ nʼọchịchị, ndịisi ndị ọchịagha, ndịisi ụgbọ agha na ndị na-agba ịnyịnya agha ya.
But Solomon did not force any Israeli people to become slaves. Some Israelis became soldiers and army officers and commanders and drivers of his chariots and soldiers who rode on horses.
23 Ndị a bụkwa ndịisi na-ahụ ihe banyere ọrụ niile nke Solomọn ji nʼaka. Ndị Izrel dị narị ise na iri ise, ka e mere ndịisi na-elekọta ndị ọrụ Solomọn.
There were 550 officials who supervised the slaves who worked [to build all those places].
24 Emesịa, ada Fero sitere nʼobodo Devid pụta gbagoo nʼụlọeze nke Solomọn wuuru ya. Solomọn wukwara ebe mpụta nke ụlọ ahụ.
After [Solomon’s wife, who was] the daughter of the king of Egypt, moved from [the place outside Jerusalem called] ‘The City of David’ to the palace that Solomon’s workers built for her, Solomon [told his workers to] fill in the slopes on the east side of the city.
25 Ugboro atọ nʼafọ, ka Solomọn na-achụ aja nsure ọkụ, na aja udo nʼelu ebe ịchụ aja o wuru nye Onyenwe anyị, tinyere aja nsure ọkụ ihe na-esi isi ụtọ ọ na-achụ nʼihu Onyenwe anyị. O si otu a wuchaa ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.
Three times each year Solomon [brought to the temple] offerings that were completely burned [on the altar] and offerings to restore fellowship with Yahweh. He also brought incense to be burned in the presence of Yahweh. And so his men finished building the temple.
26 Eze Solomọn wukwara ọtụtụ ụgbọ mmiri nʼEziọn Geba, bụ nke dị nʼakụkụ Elat, nʼọnụ mmiri Oke osimiri Uhie nʼala Edọm.
King Solomon’s [workers] also built a fleet of ships at Ezion-Geber [city], which is near Elath [city], on the shore of the Gulf of Aqaba, in the land belonging to the Edom people-group.
27 Hiram zigaara ndị ikom ya na-anya ụgbọ, ndị maara ihe banyere ime njem osimiri nke ọma, ka ha soro ndị ikom Solomọn jee ozi nʼime ụgbọ ndị a.
[King] Hiram sent some very expert sailors to work on the ships with Solomon’s workers.
28 Ha nyaara ụgbọ gaa Ọfịa, site nʼebe ahụ bulatara eze Solomọn ọlaedo nke ịdị arọ ya ruru puku kilogram iri na anọ na narị abụọ na asatọ.
They sailed to [the] Ophir [region] and brought back to Solomon about 16 tons of gold.

< 1 Ndị Eze 9 >