< 1 Ndị Eze 7 >

1 Solomọn ji afọ iri na atọ wuo ụlọ nke ya, bịa ruchakwaa ụlọ ya niile.
Ya ɗauki Solomon shekaru goma sha uku kafin yă gama gina fadarsa.
2 O wuru ụlọeze ukwu aha ya bụ Oke Ọhịa Lebanọn, nke ogologo ya dị iri mita ise, obosara ya dị iri mita abụọ na ise. Otu a kwa, ịdị elu ya dị mita iri na ise. Osisi sida ukwu e ji rụọ elu ya ka e mere ka ha nọkwasị nʼelu ogidi e doro nʼahịrị nʼahịrị. Ahịrị ogidi ndị a dịkwa anọ.
Ya gina fadarsa mai suna Kurmin Lebanon, tsawonsa kamu ɗari, fāɗinsa kamu hamsin, tsayinsa kuma kamu talatin, a bisa jeri huɗu na ginshiƙan itacen al’ul, aka shimfiɗa katakan itacen al’ul a bisa ginshiƙan.
3 Ọ bụkwa osisi sida ka e ji machie elu ụlọ ahụ. A kụkwasịrị osisi ndị a nʼelu osisi sida ukwu ndị a a wara awa, ndị e mere ka ha nọkwasị nʼogidi ndị ahụ. Ọnụọgụgụ osisi ndị ahụ bụ iri anọ na ise. Ọ bụkwa iri na ise ka e nwere nʼahịrị ọbụla.
Aka yi rufin da al’ul bisa ginshiƙan da suke bisa ginshiƙai arba’in da biyar, goma sha biya a kowane jeri.
4 Oghereikuku ya dịkwa nʼụzọ ahịrị atọ, otu nʼelu ibe ya. E mere ka oghereikuku ndị dị nʼelu nʼotu akụkụ chee oghereikuku ndị dị nʼakụkụ nke ọzọ ihu.
Aka kuma yi tagogi masu sandunan ƙarfe, jeri uku, kowace taga tana ɗaura da’yar’uwarta, har jeri uku.
5 Ọnụ ụzọ niile nwere mbudo ọnụ ụzọ anọ. Ha dị atọ atọ cherịtara ibe ha ihu nʼebe mpụta ya.
Dukan ƙofofin da madogaransu murabba’i ne, taga kuma tana ɗaura da’yar’uwarta har jeri uku.
6 O wuru ọnụ ụzọ mbata nke ogidi, nke ruru iri mita na anọ nʼobosara, rukwaa iri mita anọ na ise nʼịdị ogologo. Nʼihu ya, e nwere mpụta ọnụ ụlọ, nʼihu ya, e nwekwara ogidi na elu ebe kpuchiri ekpuchi.
Ya yi babban zaure mai ginshiƙai, tsawonsa kamu hamsin, fāɗinsa kuwa kamu talatin. A gabansa kuwa akwai shirayi, kuma a gaban wannan shirayi akwai ginshiƙai da kuma rufin da yake a shimfiɗe.
7 E nwekwara ọnụ ụlọ ọzọ a na-akpọ, Ụlọ Ocheeze, maọbụ Ụlọ Ikpe ziri ezi ebe Solomọn na-anọ ekpe ikpe. E ji osisi sida machie ahụ ya niile, site nʼala ruo nʼelu.
Ya kuma gina shirayi ta sarauta, da ya kira Zauren Adalci, inda zai riƙa yin shari’a, ya kuma rufe dukan daɓensa da itacen al’ul daga ƙasa har sama.
8 Ụlọ obibi Solomọn dịkwa nʼogige dị nʼazụ ụlọ ikpe a. E wukwara ya dịka e si wuo ụlọ ndị ọzọ. Solomọn wukwaara nwunye ya ụlọ yiri nke ya. Nwanyị a bụ nwa Fero, eze ndị Ijipt, nke Solomọn na-alụ.
A fadar da zai zauna kuwa, wadda aka gina a can baya, ya yi ta da irin fasali guda. Solomon ya kuma yi wata fada kamar wannan zaure domin’yar Fir’auna, wadda ya auro.
9 E ji nkume dị mma ma dịkwa oke ọnụahịa nke a wara awa na nke a kwadoro nke ọma nʼime na nʼezi dịka ọtụtụ si dị, wuo ụlọ ndị a. Site na ezi ruo nʼogige ukwu ahụ ma sitekwa na ntọala ruo nʼelu ya.
Dukan waɗannan gine-gine, daga waje zuwa babban fili, da kuma daga tushen zuwa rufin, an yi su da duwatsun da aka yanka, aka kuma gyara da zarto a fuskokinsu na ciki da waje.
10 Nkume e ji tọọ ntọala ụlọ ndị a bụ nkume buru ibu, ndị dị ezi mma. Ụfọdụ nʼime nkume ndị a ruru mita anọ na ọkara nʼogologo, ndị ọzọ dị mita atọ na ụma isii.
Aka kafa tushen da manyan duwatsu masu kyau, tsayin waɗansunsu ya kai kamu goma, waɗansu kuma kamu takwas.
11 Nʼelu nkume ndị a ka e doro nkume ndị ọzọ, ndị dị ezi mma, a waziri awazi dịka ọtụtụ si dị. Emesịa, e dokwara osisi sida nʼelu ha.
A can bisa akwai duwatsu masu tsada da aka yayyanka bisa ga ma’auni, da kuma ginshiƙan al’ul.
12 Ogige ukwu ahụ bụ nke eji ahịrị nkume atọ a wara awa dịkwasịrị nʼelu ibe ya gbaa gburugburu, otu ahịrị bụ nke sida a wara awa dịka ọ dị nʼime ime ogige ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị ahụ, ya na mpụta ọnụ ụlọ ya.
An kewaye babban filin da katanga da jerin uku-uku na duwatsun da aka gyara, da kuma jeri guda na gyararren al’ul, kamar yadda aka yi na filin cikin haikalin Ubangiji da shirayinsa.
13 Eze Solomọn zigara ozi na Taịa, ka a kpọta Huram.
Sarki Solomon ya aika zuwa Taya aka kuma kawo Huram,
14 Nne Huram bụ nwanyị si nʼebo Naftalị nke di ya nwụrụ anwụ, ma nna ya bụ onye Taịa, onye maara ǹka dị nʼịkpụ bronz. Huram jupụtara nʼamamihe na nghọta nʼihe ọmụma ịrụ ọrụ ọbụla metụtara bronz. Ọ bịakwutere eze bụ Solomọn, rụọkwa ọrụ niile enyere ya ịrụ.
wanda mahaifiyarsa gwauruwa ce daga kabilar Naftali, wanda kuma mahaifinsa mutumin Taya ne, shi Huram, gwani ne a aikin tagulla. Huram gwani ne sosai kuma ya saba da yin kowane irin aikin tagulla. Sai ya zo wurin Sarki Solomon ya kuma yi dukan aikin da aka sa shi.
15 Ọ kpụrụ ogidi bronz abụọ, nke ọtụtụ ya ruru mita asatọ na otu ụma nʼogologo, na mita ise na ụma anọ gburugburu ya.
Ya yi ginshiƙan tagulla, kowanne tsayinsa kamu goma sha takwas, ya kuma yi guru mai kamu goma sha biyu, kewaye da shi.
16 Ọ kpụkwara ihe ọkpụkpụ bronz, nke isi ya yiri ọnụ ite mmiri. A dọkwasịrị ha nʼelu ogidi ọla abụọ ahụ. Otu nʼime ihe ọkpụkpụ bronz abụọ ndị a dị ihe ruru mita abụọ na ụma atọ nʼogologo.
Ya yi dajiyoyi biyu na zubin tagulla don yă sa a bisa ginshiƙai; kowace dajiya tsayinta kamu biyar ne.
17 E nwekwara ihe e ji chọọ ha mma. Ọ bụ ọla akpara akpa, nke yiri ụdọ a tụrụ atụ ka e ji chọọ ha mma. Asaa dị nʼotu ihe ọkpụkpụ ọla.
Aka yi yanar tuƙaƙƙun sarƙoƙi aka ɗaura dajiyoyin a bisa ginshiƙai guda bakwai don kowace dajiya.
18 Ọ kpụrụ ihe yiri mkpụrụ pomegranet, nke dị nʼahịrị abụọ, nke o ji gbaa ihe ịchọ mma ndị ahụ gburugburu, maka iji ha chọọ ihe ọkpụkpụ ọla ndị ahụ dị nʼelu ogidi ndị ahụ mma. O mere otu ihe a maka ihe ọkpụkpụ ọla ọbụla.
Ya yi rumman jeri biyu kewaye da kowace yanar don yă yi adon dajiyoyin a bisa ginshiƙan. Haka kuma ya yi wa ɗaya dajiyar.
19 Ihe ọkpụkpụ ọla ndị dị nʼelu ogidi dị na mgbe ụlọ ka o mere ka ha yie okoko osisi lili. Ịdị elu ha ruru otu mita na ụma asatọ.
Dajiyoyin da suke a bisa ginshiƙan a shirayi suna da fasalin furen bi-rana, tsayinsu kamu huɗu-huɗu ne.
20 Nʼelu ihe ọkpụkpụ ọla dị nʼogidi abụọ ahụ, nʼelu elu ha, ebe ahụ yiri ọnụ ite mmiri nke dị nʼakụkụ ihe ọkpụkpụ ọla ahụ, e nwere ihe yiri narị mkpụrụ pomegranet abụọ e doro nʼahịrị nʼahịrị gburugburu ha.
A inda kan ginshiƙin ya buɗu kamar kwano, sama da zāne-zānen sarƙar, an yi zāne-zānen rumman wajen ɗari biyu, layi-layi kewaye da kawunan ginshiƙan nan.
21 O guzobere ogidi abụọ ndị ahụ na mgbe ọnụ ụzọ ụlọnsọ ukwu ahụ. Ogidi nke dị na ndịda ka ọ kpọrọ Jakin, ma nke dị nʼugwu ka ọ kpọrọ Boaz.
Ya ta da ginshiƙai a shirayin haikali. Ya ba wa ginshiƙi na wajen kudu sunan Yakin, na wajen arewa kuma ya kira Bowaz.
22 Ihe ọkpụkpụ ọla dị nʼelu ogidi ndị a bụ nke yiri okoko osisi lili. Ọ bụ nʼụzọ dị otu a ka e si rụzuo ọrụ niile metụtara ogidi ndị ahụ.
Dajiyoyin da suke a bisa suna da fasalin bi-rana ne. Ta haka aka gama aiki a kan ginshiƙan.
23 O mekwara Oke osimiri nke ọla awụrụ awụ, nke dị gburugburu nʼụdịdị. Ọtụtụ ya bụ mita abụọ na ụma atọ nʼogologo, dịkwa mita ise na ụma atọ, site nʼotu ọnụ ruo nʼọnụ nke ọzọ. Ọ bụ eriri e ji atụ ihe ruru ihe dịka mita iri na anọ ka e ji tụọ ya gburugburu.
Sai Huram ya yi wani ƙaton kwano na ƙarfen tagulla, da ya kira Teku. Zurfin kwanon nan kamu bakwai da rabi, fāɗinsa kamu goma sha biyar, da’irarsa kuma kamu talatin ne.
24 Nʼokpuru ọnụ ya, oyiyi ọba gbara ya gburugburu, iri dị na mita anọ na ọkara ọbụla. Ọba ndị a dị nʼahịrị abụọ, awụkọtara ha na Oke osimiri ahụ otu mgbe.
A kewayen bakin ƙaton kwanon akwai layi biyu na siffofin goran ƙarfen tagulla, akwai gora shida cikin kowane ƙafa. An yi zubinsu haɗe da kwanon nan da kira Teku.
25 E mekwara ka Oke osimiri ahụ guzo nʼelu ehi iri na abụọ. Atọ na-eche ihu nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ; atọ na-eche ihu nʼọdịda anyanwụ; atọ na-eche ihu nʼakụkụ ndịda, atọ na-eche ihu nʼakụkụ ugwu. Oke osimiri ahụ dịkwasịrị ha nʼelu, ebe azụ ha niile dị nʼime nʼetiti.
Kwanon ya tsaya a kan siffofin bijimai goma sha biyu, uku suna fuskantar arewa, uku suna fuskantar yamma, uku suna fuskantar kudu, sa’an nan uku suna fuskantar gabas. Kwanon da ya kira Teku ya zauna a kansu, gindin siffofin bijimai goma sha biyun nan suna wajen tsakiya.
26 Ịdị arọ ya ha ka otu ọtụtụ ntu-aka dimkpa. E mere ọnụ ya ka ọ dị ka ọnụ iko mmiri, dịkwa ka okoko lili na-awapụta awapụta. Ọ na-erite puku galọọnụ iri na abụọ.
Kaurin kwanon ya kai tafin hannu, kuma da’iransa ya yi kamar da’iran kwaf, kamar bi-ranar da ta buɗe. Wannan kwanon da aka kira Teku yakan ci garwa dubu biyu.
27 O mekwara ihe ndọkwasị bronz iri, nke e nwere ike ịkpụgharị akpụgharị. Mita abụọ ka ogologo nke otu ihe ndọkwasị ọbụla dị, mita abụọ ka obosara ya dịkwa; ịdị elu ya dị otu mita na ọkara.
Ya kuma yi dakalai guda goma na tagulla da ake iya matsar da su; kowane tsawonsa kamu huɗu ne, fāɗinsa kamu huɗu, tsayinsa kuma kamu uku.
28 Ihe ndọkwasị ahụ nwere ihe e ji jikọta ya dị nʼetiti ya. Otu a ka e si mee ihe ndọkwasị ahụ.
Ga yadda aka yi dakalan, dakalan suna da ɓangarori haɗe da mahaɗai.
29 Nʼelu ihe njikọta ahụ ka a wụrụ oyiyi dị iche iche, dịka ọdụm, na oke ehi, na ndị mmụọ ozi cherubim nwere nku. Nʼelu, na nʼokpuru ọdụm, na oke ehi ndị ahụ, a wụkwara ahịhịa na okoko osisi dị iche iche.
A bisa sassan tsakanin mahaɗan, akwai siffofin zakoki, bijimai da kuma kerubobi, suna a kan mahaɗan su ma. A sama da kuma ƙasan siffofin zakokin da na bijiman kuwa akwai hotunan furanni.
30 Otu ihe ndọkwasị ọbụla nwere ụkwụ bronz anọ dị gburugburu, nweekwa okporo bronz ebe ụkwụ ndị a na-agbagharị. Nʼakụkụ anọ nke ihe ndọkwasị ndị a, a rụnyere ebe a na-adọkwasị efere. E ji oyiyi okoko osisi na ahịhịa chọọ ihe ndị a mma.
Kowane dakali yana da ƙafa huɗu na tagulla kamar na keken yaƙi, da sandunan tagulla don sa kwanon nan da aka kira Teku. A kusurwoyin akwai abubuwan zubi don riƙe kwanon. An zāna furanni a kowane gefensu.
31 Nʼime ihe ndọkwasị ahụ, e nwere oghere nke nwere ọnụ dị gburugburu nke ịdị omimi ya bụ sentimita iri anọ na ise. Oghere a dị gburugburu, nwee ebe ndọkwasị nʼokpuru ya nke dị sentimita iri isii na asatọ nʼọtụtụ. Oyiyi ihe apịrị apị dịkwa gburugburu ọnụ ya. Ihe njikọta ha niile nwere akụkụ anọ nke ha nʼotu, ha adịghị gburugburu.
A dakalin daga ciki, akwai bakin da yake da’ira, mai zurfi kamun guda. Bakin da’irar ne, yana da zāne-zānensa da ya kai kamu ɗaya da rabi. Kusa da bakin akwai zāne-zāne. Sassan dakalin murabba’i ne, ba da’ira ba ne.
32 A na-adọkpụgharị ihe ndọkwasị a nʼụkwụ anọ o nwere. A dụnyekọtakwara ụkwụ anọ ndị a nʼime okporo ọla e mekọtara ya na ihe ndọkwasị ahụ. Ịdị elu nke ụkwụ ọbụla bụ iri sentimita isii na asatọ.
Ƙafafu huɗun suna a ƙarƙashin ɓangarorin, aka kuma haɗa gindin ƙafafun keken da dakalin. Tsayin kowace ƙafa kamu ɗaya da rabi ne.
33 E mekwara ụkwụ ndị a dịka ụkwụ ụgbọala nke ịnyịnya na-adọkpụ. Ọ bụkwa ọla ka e ji kpụọ akụkụ ihe ndọkwasị ahụ niile, ma okporo igwe ukwu, ma okporo igwe nta, na ihe niile jikọtara ha.
An yi ƙafafun kamar ƙafafun keken yaƙi ne; gindin, da’irar, gyaffan da kuma cibiyar duk an yi su da ƙarfe ne.
34 Ụkwụ ọla nta anọ dịkwa nʼokpuru ihe ndọkwasị ahụ, nʼakụkụ ọbụla. A wụkọtakwara ha na ihe ndọkwasị ahụ.
Kowane dakali yana da hannuwa huɗu, ɗaya a kowane gefe, da yake nausawa daga dakalin.
35 E nwere ihe a magidere gburugburu nʼelu ihe ndọkwasị ọbụla, nke omimi ya dị iri sentimita abụọ na ụma atọ. Ọla a, na ụkwụ ya, ka a wụkọtara na ihe ndọkwasị ahụ otu mgbe.
A bisa dakalin akwai da’irar da ta yi kamar gammo mai zurfi kamar rabin kamu. Abubuwan da suke riƙewa da kuma sassan, an haɗa su da bisa dakalin.
36 Ebe ọbụla ohere dị, o gbunyere oyiyi cherubim nwere nku, na oyiyi ọdụm, na oyiyi osisi nkwụ, nʼahụ ibo ọla ahụ e mere ka ọ dịrị gburugburu elu ihe ndọkwasị ọla ahụ.
Ya zāna siffofin kerubobi, zakoki da itatuwan dabino a saman abubuwan riƙewa da kuma a kan ɓangarorin, a kowane abin da ya ga akwai ɗan fili, ya zāna furanni.
37 Ihe ndọkwasị ọla iri ndị ahụ ha otu. Ha yikwara ibe ha, nʼihi na e mere ka ha nwee otu ụdị.
Haka ya yi dakalai goma. Duk an yi zubinsu iri ɗaya ne, girmansu da fasalinsu kuma iri ɗaya.
38 Huram jikwa bronz kpụọ efere ịsa ihe iri. Ogbu efere ọbụla dị mita abụọ na otu ụma, otu efere maka ihe ndọkwasị ọbụla. Mmiri na-eju otu nʼime ha bụ narị galọọnụ mmiri abụọ na iri anọ.
Sa’an nan ya yi kwanoni goma na tagulla, kowane yana cin garwa arba’in, kuma kamu huɗu daga wannan zuwa wancan, kowane dakali yana da daro ɗaya.
39 Ọ dọnyere ihe ndọkwasị ọla ise nʼakụkụ ndịda ụlọnsọ ukwu ahụ, dọnyekwa ihe ndọkwasị ọla ise nke ọzọ nʼakụkụ ugwu. Ọ dọbara ihe ichenye mmiri ukwu ahụ nʼakụkụ ndịda, nʼihu ọwụwa anyanwụ nke ụlọnsọ ahụ, nʼebe chere ihu na ndịda.
Ya sa dakalai biyar a gefen kudu na haikali, biyar kuma a arewa. Ya sa kwanon a gefen kudu, a gefen kudu maso gabas na haikalin.
40 Ọ kpụkwara ite dị iche iche, shọvel niile, na efere ịkwọsa mmiri niile. Nʼikpeazụ, ọ rụchara ọrụ niile dị nʼụlọnsọ Onyenwe anyị, nke eze Solomọn tinyere ya nʼaka ịrụ.
Ya kuma yi kwanoni da manyan cokula da kuma kwanonin yayyafawa. Ta haka Huram ya gama dukan aikin da ya yi wa Sarki Solomon a haikalin Ubangiji.
41 Ogidi abụọ ahụ; ihe ọkpụkpụ abụọ dịka efere dị nʼelu ogidi abụọ ahụ; ihe ọkpụkpụ yiri ụdọ a tụrụ atụ nke e ji chọọ ihe ọkpụkpụ abụọ ahụ dịka efere mma.
Ya yi ginshiƙai biyun; dajiyoyi biyu masu fasalin kwano a kan ginshiƙan; ya yi yanar kashi biyu wa dajiyoyi masu fasalin kwano guda biyu a kan ginshiƙai;
42 Narị anọ nke mkpụrụ pomegranet a kpụrụ akpụ maka ahịrị ihe abụọ ahụ a kpụrụ akpụ, ya bụ, ahịrị pomegranet abụọ nʼihi otu ihe ọkpụkpụ, iji chọọ ihe ọkpụkpụ ahụ yiri efere dị nʼisi elu ogidi ahụ mma.
ya yi rumman guda ɗari huɗu na sashi yanar biyun (jeri biyu na rumman don kowace yanar, yana adon dajiyoyi masu fasalin kwano a kan ginshiƙai);
43 Ihe ndọkwasị iri na efere ịsa mmiri iri nke dọkwasịrị nʼelu ha;
ya yi dakalai goma da kwanoninsu goma;
44 na Oke osimiri ahụ na oke ehi iri na abụọ ahụ dị ya nʼokpuru;
ya yi kwanon da ya kira Teku, da bijimai goma sha biyu a ƙarƙashinsa;
45 ite niile, shọvel niile na efere ịkwọsa mmiri. Ihe ndị a niile nke Huram meere eze Solomọn nʼihi ụlọnsọ Onyenwe anyị, bụ bronz na-egbu maramara ka eji mee ha.
ya yi tukwane, manyan cokula da kwanonin yayyafawa. Dukan waɗannan abubuwan da Huram ya yi wa Sarki Solomon saboda haikalin Ubangiji, an dalaye su da tagulla.
46 Ọ bụ nʼala ụrọ, nʼobosara ala Jọdan, nʼetiti Sukọt na Zaretan ka eze mere ka a nọrọ kpụọ ihe ndị a.
Sarki ya sa aka yi zubi a abin yin tubalin laka a filin Urdun, tsakanin Sukkot da Zaretan.
47 Ma Solomọn atụghị ihe ndị a niile a kpụrụ nʼihe ọtụtụ, nʼihi na ha dị ọtụtụ nʼọnụọgụgụ, achọpụtaghịkwa ịdị arọ nke bronz ahụ.
Solomon ya bar dukan waɗannan abubuwa ba tare da an auna su ba, domin sun yi yawa sosai; ba a san nauyin tagullar ba.
48 Solomọn mekwara ngwongwo niile dị nʼime ụlọnsọ Onyenwe anyị, ya bụ: ebe ịchụ aja e ji ọlaedo kpụọ, tebul ọlaedo nke a dọkwasịrị achịcha nke iche nʼIhu Onyenwe anyị.
Solomon ya kuma yi dukan kayayyakin da suke cikin haikalin Ubangiji. Ya yi bagaden zinariya; teburin zinariya, inda ake ajiye burodin Kasancewa;
49 E jikwa ọlaedo a nụchara anụcha kpụọ ihe ịdọkwasị oriọna, ise nʼakụkụ aka nri, ise nʼakụkụ aka ekpe, nʼihu ime ime ebe nsọ; tinyere ihe ịchọ mma oyiyi okoko osisi, na oriọna niile, na ihe ịgụta ihe niile;
ya yi alkukai na zinariya zalla (Biyar a dama, biyar kuma a hagu, a gaban wuri mai tsarki na can cikin); ya yi zāne-zānen furannin zinariya da fitilu da kuma arautaki;
50 na efere ọlaedo a nụchara anụcha dị iche iche, na ihe ịkpakepụ ọkụ niile, na efere ịkwọsa mmiri, na ngaji na ihe ịgụ ọkụ; na ihe ikonye ibo nʼihi ibo ọnụụlọ ndị dị nʼime ime, bụ Ebe Kachasị Nsọ, nakwa ibo ndị dị nʼọnụ ụzọ ụlọ ezumezu nke ụlọnsọ ukwu.
ya yi kwanonin zinariya zalla, hantsuka, kwanonin yayyafawa, kwanoni, da kuma farantan wuta; ya yi wurin ajiye fitila na zinariya domin ƙofofi na ɗakin can ciki-ciki, da na ƙofofin Wuri Mafi Tsarki, da kuma domin ƙofofin babban zauren haikali.
51 Mgbe a rụzuru ọrụ niile nke eze Solomọn nwere ịrụ maka ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị ahụ, o webatara ihe niile Devid bụ nna ya doro nsọ nʼime ya, ya bụ ọlaọcha, ọlaedo na ngwongwo ndị ọzọ niile. O tinyere ha nʼụlọakụ dị nʼụlọnsọ Onyenwe anyị.
Sa’ad da aka gama aikin da Sarki Solomon sa a yi domin haikalin Ubangiji, sai ya kawo kayayyakin da mahaifinsa Dawuda ya keɓe, azurfa da zinariya da kayayyaki, ya sa su a ma’ajin haikalin Ubangiji.

< 1 Ndị Eze 7 >