< 1 Ndị Eze 6 >

1 Solomọn bidoro iwu ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị ahụ nʼọnwa Zif, bụ ọnwa nke abụọ nʼafọ nke anọ nke ịbụ eze ya. Ọ bụkwa nʼafọ nke mere ya narị afọ anọ na iri afọ asatọ site nʼoge ndị Izrel si nʼala Ijipt pụta.
En el año cuatrocientos ochenta después de que los hijos de Israel salieron de la tierra de Egipto, en el cuarto año que Salomón fue rey de Israel, en el mes Ziv, que es el segundo mes, la construcción de La casa del Señor fue iniciada.
2 Ụlọnsọ nke eze Solomọn wuuru Onyenwe anyị dị iri mita abụọ na asaa nʼogologo, mita itoolu nʼobosara, ebe ịla elu ya dịkwa mita iri na anọ.
El templo que Salomón hizo para el Señor tenía sesenta codos de largo, veinte codos de ancho y treinta codos de alto.
3 Mpụta ọnụ ụlọ nke dị nʼihu ụlọ ezumezu nke ụlọnsọ ahụ dị mita itoolu nʼogologo nke gbakwunyere ihe nʼobosara ụlọnsọ ahụ, dịrịkwa mita anọ na ọkara nʼobosara ya.
El pórtico delante del Templo de la casa tenía veinte codos de largo, tan ancho como la casa, y diez codos de ancho frente a la casa.
4 O meere ụlọnsọ ahụ oghereikuku kpara nkpa nʼime ma saa mbara nʼezi, nʼebe elu elu mgbidi ụlọ ahụ.
Y para él templo hizo ventanas, con rejas.
5 Nʼakụkụ mgbidi ụlọ ezumezu ahụ nakwa mgbidi nke ime ebe nsọ ahụ, o wuru okpukpu gburugburu ụlọ ahụ, nke nwere ọtụtụ ụlọ nta dị iche iche gbaa gburugburu.
Y contra los muros alrededor, y contra los muros del Templo y de la habitación de abajo, construyó anexos, con cuartos laterales alrededor:
6 Obosara okpukpu ụlọ nke dịkarịsịrị ala bụ mita abụọ na ọkara, obosara okpukpu nke ụlọ etiti dị mita atọ, otu a kwa, obosara okpukpu ụlọ nke atọ dị mita atọ na ọkara. Mgbe e wuru mgbidi gbara ụlọnsọ ukwu ahụ gburugburu, e wukwara ihe dịka aka nʼakụkụ mgbidi ahụ niile. Ọ bụ nʼelu ihe ndị a dịka aka ka e dokwasịrị osisi e ji wuo ọnụụlọ nta ndị ahụ. Nʼụzọ dị otu a, ka e ji gbochie ịmanye ihe ọbụla nʼaja ụlọnsọ ukwu ahụ.
La línea más baja de ellos tiene cinco codos de ancho, los seis codos de ancho y el tercero de siete codos; Porque había un espacio alrededor de las paredes exteriores de la casa para que las tablas que soportaban las habitaciones no tuvieran que fijarse en las paredes del templo.
7 Mgbe a na-ewu ụlọnsọ ukwu ahụ, ọ bụ naanị nkume awara nke ọma nʼebe a nọ gwupụta ha ka eji wuo ya. O nweghị onye nụrụ ụzụ itipịa nkume, maọbụ ụzụ ịwa osisi, maọbụ ụdị mkpọtụ ahụ ngwa ọrụ mkpirisi igwe na-eme, nʼebe a nọ wuo ụlọnsọ ukwu ahụ, mgbe a na-ewu ya.
Y las piedras usadas en la construcción del templo estaban cuadradas en el lugar donde fueron cortadas; no se oía ningún martillo, hacha ni ningún instrumento de hierro mientras construían la casa.
8 Ọnụ ụzọ e si abata nʼọnụ ụlọ ndị dị nʼokpukpu ụlọ elu nke mbụ dị nʼakụkụ aka nri nke ụlọnsọ ukwu ahụ. E nwekwara ụzọ nrigo e wuru e si abanye nʼọnụ ụlọ ndị dị nʼokpukpu ndị dị nʼetiti. A na-esitekwa na nke a rigoro ruo na nke atọ.
La puerta de las habitaciones laterales más bajas estaba en el lado derecho de la casa; y subía en caracol los escalones en las habitaciones intermedias, y desde la mitad hacia la tercera.
9 Mgbe o wusiri ụlọnsọ ukwu a, Solomọn jiri ibe osisi na osisi dị obosara e si nʼosisi sida mepụta, wuo ihe mgbachị elu ụlọ ahụ.
Entonces él levantó el templo y lo completó, lo cubrió con tablas de madera de cedro.
10 O wuru ọtụtụ ọnụụlọ nta nʼakụkụ mgbidi gbara ụlọnsọ ukwu ahụ gburugburu. Ọ bụkwa osisi sida ka e ji jikọta mgbidi ụlọ ahụ na ọnụụlọ nta ndị ahụ. Ịdị elu nke ọbụla nʼime ha bụ mita abụọ na ọkara.
Y puso la línea de cuartos laterales contra las paredes de la casa, de quince codos de altura, apoyada contra la casa sobre tablas de madera de cedro.
11 Okwu Onyenwe anyị rutere Solomọn ntị,
Y vino palabra del Señor a Salomón, diciendo:
12 “Banyere ụlọnsọ ukwu a i na-ewu, ọ bụrụ na i mee ihe m gwara gị, gbasoo ihe niile m nyere gị nʼiwu, ma mezuo okwu m niile, aga m esite na gị mezuo nkwa ahụ m kwere nna gị Devid.
Acerca del templo que estás construyendo, si guardas mis leyes y cumples mis decisiones y te guías por mis reglas, cumpliré mi palabra que le di a David, tu padre.
13 Aga m ebikwa nʼetiti ndị Izrel, agaghị m ahapụkwa ndị m, Izrel.”
Y estaré siempre entre los hijos de Israel, y no abandonaré mi pueblo.
14 Emesịa, Solomọn wusiri ụlọnsọ ukwu ahụ.
Así que Salomón terminó la construcción del templo.
15 O ji osisi sida dị obosara machie ahụ ime ụlọnsọ ukwu ahụ site nʼakụkụ ala ruo nʼelu ya. E jikwa osisi junipa machie ala ụlọ ahụ niile.
Las paredes de la casa estaban cubiertas con tablas de madera de cedro; desde el suelo hasta el techo del templo, estaban cubiertas de madera; y el suelo estaba cubierto de tablas de madera de ciprés.
16 O ji osisi sida kewapụta ihe ruru mita itoolu nʼazụ ụlọnsọ ukwu ahụ, site nʼala ụlọ ahụ ruo nʼelu, nʼihi iwepụta site nʼụlọnsọ ahụ, ime ime ebe nsọ, nke bụ Ebe Kachasị Nsọ.
Y en la parte posterior de la casa se cerró un espacio adicional de veinte codos con tablas de madera de cedro, para la habitación del lugar santísimo.
17 Ụlọ ezumezu nke dị nʼihu ọnụụlọ a dị iri mita na asatọ.
Y la casa, es decir, el Templo, frente al lugar santísimo, tenía cuarenta codos de largo.
18 Ahụ ime ụlọnsọ ukwu ahụ bụ osisi sida, nke a tụrụ ihe ọtụtụ nke oyiyi afụfa ọhịa na okoko osisi wasara awasa nʼelu ya. Ihe niile dị nʼime ụlọ ahụ bụ osisi sida, adịghị ahụ nkume ọbụla anya.
Todo el interior de la casa era de madera de cedro, tallada con diseños de capullos y flores; no se veía piedra en el interior.
19 Ọ kwadokwara ebe nsọ ahụ, ebe dị nʼime ime ụlọ ahụ, maka idebe igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị nʼebe ahụ.
Y preparó una habitación en el centro del templo, para poner el cofre del pacto del Señor.
20 Ime ime ebe nsọ ahụ, dị mita iri nʼogologo, obosara ya dịkwa mita iri, ịdị elu ya dịkwa mita iri. O ji ọlaedo a nụchara anụcha machie ahụ ime ụlọ a niile, jiri osisi sida machie ebe nchụaja ya.
En el interior del lugar santísimo tenía veinte codos de forma cuadrada y veinte codos de altura, revestida de oro puro, e hizo un altar de madera de cedro, recubierto de oro.
21 Solomọn ji ọlaedo a nụchara anụcha machie ahụ ime ụlọnsọ ukwu ahụ. Ọ gbatịrị ụdọ ọlaedo gafere nʼihu ime ime ebe nsọ ahụ, nke e jikwa ọlaedo machie.
Salomón tenía todo el interior de la casa cubierto de oro, y él puso cadenas de oro frente al lugar santísimo, que a su vez estaba cubierto de oro.
22 Ya mere, o ji ọlaedo machie ime ya niile. O jikwa ọlaedo machie ebe ịchụ aja nke dịịrị ime ime ebe nsọ ahụ.
Se pusieron placas de oro en toda la casa hasta que se cubrió completamente y el altar del lugar santísimo estaba cubierto de oro.
23 O mere cherubim abụọ, nke e ji osisi oliv tụọ nʼime ime ebe nsọ ahụ, ịdị elu nke ọbụla bụ mita ise.
En el cuarto más íntimo hizo dos querubines seres alados de madera de olivo, diez codos de altura;
24 Cherub nke mbụ nwere nku abụọ, otu nku dị mita abụọ na ụma atọ nʼogologo, nku nke ọzọ dịkwa mita abụọ na ụma atọ nʼogologo. Ya bụ, mita ise site na ụma isii, site nʼọnụ otu nku ruo nʼọnụ nku nke ọzọ.
Con las alas extendidas de cinco codos de ancho; la distancia desde el borde de un ala hasta el borde de la otra era de diez codos.
25 Cherub nke abụọ dịkwa iri mita na ụma isii, nʼihi na cherubim abụọ ndị a bụ otu nʼọtụtụ nakwa nʼibu ibu.
Los dos seres alados tenían diez codos de altura, del mismo tamaño y forma.
26 Ịdị elu nke cherub ọbụla ruru mita ise na ụma isii.
Los dos tenían diez codos de alto.
27 O tinyere cherubim ndị a nke gbasapụrụ nku ha nʼime ime Ebe Nsọ Kachasị Nsọ nke ụlọnsọ ukwu. Ọnụ ọnụ nke nku cherub ọbụla na-emetụ otu akụkụ ahụ ụlọ ahụ, ebe ọnụ ọnụ nke nku cherub ọbụla na-emetụ na nke ibe ya nʼetiti ọnụụlọ ahụ.
Estos se colocaron dentro del lugar santísimo, sus alas extendidas tocaban las paredes de la casa, una tocaba una pared y la otra, mientras que las otras alas tocaban en el medio.
28 O jiri ọlaedo machie cherubim ndị ahụ.
Los seres alados estaban cubiertos de oro.
29 Nʼahụ aja ụlọnsọ ukwu ahụ gbaa gburugburu, ma nʼime ọnụụlọ nke dị nʼime na ndị dị na mpụta, ka ọ pịkwasịrị oyiyi cherubim, osisi nkwụ na okoko osisi wara awa.
Y todas las paredes de la casa, por dentro y por fuera, estaban adornadas con formas de querubines, palmeras y flores abiertas.
30 O jikwa ọlaedo machie ala ụlọ nke ọnụụlọ niile dị nʼime ụlọ, na ọnụụlọ ndị dị na mpụta ụlọnsọ ukwu ahụ.
Y el piso de la casa estaba cubierto de oro, por dentro y por fuera.
31 O ji osisi oliv mee ibo ọnụ ụzọ mbata nke ime ime ebe nsọ ahụ, osisi ndị a bụ otu ụzọ nʼụzọ ise nke obosara ebe nsọ ahụ.
Para el camino al lugar santísimo, hizo las puertas de madera de olivo, el arco y los soportes de las puertas formando una abertura de cinco lados.
32 Nʼahụ ibo abụọ ahụ nke si nʼosisi oliv, ọ tụnyere oyiyi cherubim abụọ, igu nkwụ na okoko osisi wara awa. O ji ọlaedo etipịara etipịa machie oyiyi cherubim na igu nkwụ ndị ahụ.
En las puertas de madera de olivo se cortaron diseños de querubines, palmeras y flores abiertas, todas ellas, con las puertas, chapadas en oro.
33 Otu a kwa, o ji osisi oliv mee mbudo ibo ọnụ ụzọ e si abata nʼụlọ ezumezu ahụ, nke bụ otu ụzọ na nkewa anọ nke obosara ụlọ ezumezu ahụ.
Luego hizo columnas de madera de olivo para el camino hacia el templo; Los pilares eran cuadrados:
34 O jikwa osisi junipa mee ibo abụọ a na-emechikọta nʼotu.
Y dos puertas plegables de madera de ciprés, con dos hojas.
35 Ọ pịrị oyiyi cherubim na oyiyi nkwụ, na oyiyi okoko osisi wara awa, jiri ọlaedo techie ibo ndị ahụ na oyiyi a pịkwasịrị ha.
Estaban labrados con diseños querubines, palmeras y flores abiertas, chapados en oro.
36 O wuru ogige nʼime ụlọnsọ ukwu ahụ. Ọ bụ ahịrị nkume atọ e doziri edozi na otu ahịrị osisi sida a kwachara nke ọma ka e ji wuo ogige a.
Y el espacio interior estaba amurallado con tres líneas de piedras cuadradas y una línea de tablas de madera de cedro.
37 Ọ bụ nʼọnwa Ziv, nʼafọ nke anọ, nke ịbụ eze Solomọn ka a tọrọ ntọala ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.
En el cuarto año se colocó la base del templo en su lugar, en el mes Ziv.
38 Ọ bụ nʼime afọ iri na otu, nʼọnwa Bul, ya bụ ọnwa nke asatọ, ka e wusiri ụlọnsọ ukwu ahụ, nʼihe niile ya dịka ntụziaka e nyere si dị. Ọ bụ afọ asaa ka o weere ya i ji rụchaa ụlọnsọ ukwu ahụ.
Y en el año undécimo, en el mes Bul, que es el octavo mes, la construcción del templo se completó en cada detalle, como se había diseñado. Así que llevo siete años construyéndose.

< 1 Ndị Eze 6 >