< 1 Ndị Eze 5 >

1 Mgbe Hiram eze Taịa nụrụ na eteela Solomọn mmanụ ịbụ eze nʼọnọdụ nna ya Devid, o zipụrụ ndị ozi ya ijekwuru Solomọn, nʼihi na ya na Devid bụ enyi, dịrịkwa na mma.
Hiramu mfalme wa Tiro aliwatuma watumishi wake kwa Sulemani kwa kuwa alisikia kuwa walikuwa wamemtawaza kuwa mfalme mahali pa baba yake, kwani Hiramu alimpenda Daudi.
2 Mgbe ahụ, Solomọn zigara Hiram ozi, sị ya:
Sulemani akatuma ujumbe kwa Hiramu, akisema,
3 “Ị maara na Devid nna m enweghị ike iwu ụlọnsọ ukwuu nye Aha Onyenwe anyị Chineke ya, nʼihi agha niile ọ lụrụ mgbe ọ dị ndụ. Ọ nọkwa na-eche ka Onyenwe anyị nye ya udo.
“Unajua kuwa Daudi baba yangu hakujenga nyumba kwa jina la BWANA, Mungu wake kwa sababu ya vile vita vilivyomzunguka, kwa kuwa wakati wa uhai wake BWANA alikuwa akiweka maadui wake chini ya nyayo za miguu yake.
4 Ugbu a, Onyenwe anyị Chineke m enyela m udo nʼakụkụ ọbụla. Enwekwaghị m ndị iro, ma ọ bụkwanụ ihe ndakwasị ọjọọ ọbụla.
Lakini sasa BWANA amenipa mimi pumziko toka pande zote. Hakuna maadui wala majanga.
5 Nʼihi ya, ana m achọ iwu ụlọnsọ ukwu nye Aha Onyenwe anyị Chineke m, dịka Onyenwe anyị gwara nna m Devid mgbe ọ sịrị ya, ‘Nwa gị nwoke, onye m ga-eme ka ọ nọdụ nʼocheeze gị, ga-ewu ụlọnsọ ukwu nye Aha m.’
Kwa hiyo ninakusudia kujenga hekalu kwa jina la BWANA, Mungu wangu, kama BWANA alivyosema kwa Daudi baba yangu, akisema, 'Mwanao ambaye nitamweka kwenye kiti chako cha enzi mahali pako, ndiye atakayenijengea hekalu kwa jina langu.'
6 “Ya mere, nye iwu ka e gbutuoro m osisi sida nke Lebanọn. Ndị ọrụ m ga-esoro ndị nke gị nʼọrụ a. Aga m akwụ gị ihe ọbụla i kpebiri bụ ụgwọ ọrụ ha. Ị maara na anyị enweghị ndị ọka igbutu osisi dịka ndị Saịdọn.”
Kwa hiyo sasa amuru wakate mierezi kutoka Lebanoni kwa ajili yangu. Watumishi wangu wataungana na watumishi wako, nami nitakulipa kwa ajili ya watumishi wako ili kwamba upate malipo mazuri kwa kila kitu utakchokubali kukifanya. Kwa kuwa unajua kuwa hakuna mtu mioingoni mwetu anayejua kukata miti kama Wasidoni.”
7 Mgbe Hiram nụrụ ozi Solomọn ziri, obi tọrọ ya ụtọ nke ukwuu. O kwuru sị, “Otuto dịrị Onyenwe anyị taa, nʼihi na o nyela Devid nwa nwoke nwere amamihe ịchị mba ukwuu a.”
Hiramu aliposikia maneno ya Sulemani, akafurahi sana akasema, “BWANA na abarikiwe leo, ambaye amempa Daudi mwana wa hekiima juu ya kundi hili kubwa.”
8 Ya mere, Hiram zigaara Solomọn ozi sị, “Anụla m ozi i ziteere m. Aga m emekwa ihe niile dịka i kwuru banyere i budatara gị osisi sida na osisi junipa.
Hiramu akatuma neno kwa Sulemani, akisema, “Nimeupata ujumbe ule ulionitumia. Nitatoa miti yote ya mierezi na miti ya miberoshi ambayo unahitaji.
9 Ndị ohu m ga-esi nʼugwu Lebanọn budaruo ha nʼosimiri Mediterenịa. A ga-ekekọta ha ọnụ, zitere gị ha nʼebe ị chọrọ ịnọ buru ha. Mgbe ha sere nʼelu mmiri rute ebe ị chọrọ, anyị ga-atọsakwara gị ha, ka i buru ha. Ma gị onwe gị ga-eme ihe bụ ọchịchọ m, site na-inye ndị ụlọ m ihe oriri.”
Watumishi wangu wataileta miti kutoka Lebanoni hadi baharini, nami nitaiendesha baharini mpaka mahali utakaponielekeza. Nitaigawa pale, nawe utaichukua. Utafanya kile ninachohitaji kwa kuwapa chakula watumishi wangu.”
10 Nʼụzọ dị otu a, Hiram nọgidere na-ezitere Solomọn osisi sida na junipa niile ọ chọrọ.
Kwa hiyo Hiramu akampa Sulemani miti yote ya mierezi na miti ya miberoshi ambayo alihitaji.
11 Solomọn nyere Hiram na ezinaụlọ ya narị puku bushel, na iri puku bushel ọka wiiti abụọ, ka ọ bụrụ ihe oriri nye ezinaụlọ ya, tinyekwara narị puku galọọnụ, na iri puku galọọnụ abụọ nke mmanụ oliv asụrụ asụ. Solomọn nọgidere na-enye Hiram ihe ndị a kwa afọ.
Sulemani akampa Hiramu kori ishirini elfu za ngano kwa ajili ya chakula cha watumishi wake na kori ishirii za mafuta safi. Sulemani akavitoa hivi kwa Hiramu mwaka baad ya mwaka.
12 Onyenwe anyị nyere Solomọn amamihe dị ukwuu dịka o kwere ya na nkwa. Hiram na Solomọn nwere mmekọ udo, ha abụọ gbakwara ndụ.
BWANA akampa Sulemani hekima, kama alivyokuwa amemwahidi. Kulikuwa na amani kati ya Hiramu na Sulemani na wote wawili wakafanya agano.
13 Eze Solomọn, sitere nʼakụkụ Izrel niile kpọbata ndị ọrụ mmanye ọnụọgụgụ ha dị iri puku atọ.
Mfalme Sulemani akaandaa wafanya kazi kutoka Israeli yote. Idadi ya watenda kazi walioandaliwa ilikuwa wanaume elfu thelathini.
14 Nʼotu ọnwa, ọ na-eziga puku mmadụ iri nʼime ndị a ka ha gaa Lebanọn ịrụ ọrụ. Nʼọnwa ọzọ, ọ na-ezigakwa puku mmadụ iri ka ha gaa gbanwee ndị buuru ụzọ gaa. Nʼụzọ dị otu a, otu ụzọ nʼime iri puku mmadụ atọ ndị a na-anọ na Lebanọn otu ọnwa maka ịrụ ọrụ, ma ha na-alọta zuo ike ọnwa abụọ. Adoniram bụ onyeisi ndị ọrụ mmanye a.
Aliwatuma kwenda Lebanoni, aliwatuma kwa zamu ya watu elfu kumi kila mwezi. Kwa mwezi mmoja walienda Lebanoni na miezi miwili walikaa nyumbani. Adoniramu ndiye aliyekuwa msimamizi wa watenda kazi.
15 Solomọn nwere ndị ọrụ ọzọ ọnụọgụgụ ha dị iri puku asaa na-ebu ibu, nweekwa ndị na-awa nkume nʼugwu ọnụọgụgụ ha dị iri puku asatọ.
Sulemani alikuwa na watu elfu sabini waliokuwa wabeba mizigo na watu elfu themanini wa kukata mawe milimani,
16 Nʼagụnyeghị ndị a, o nwekwara ndịisi, ndị na-elekọta ndị ọrụ ndị a, ọnụọgụgụ ha dị puku atọ na narị atọ.
zaidi ya hao, walikuwepo maakida 3, 300 ambao pia waliokuwa wakiisimamia hiyo kazi.
17 Dịka iwu eze si dị, ha na-esite nʼebe a na-awa nkume ebupụta nkume dị mma buru ibu nke e ji ewu ntọala ụlọnsọ ukwu ahụ
Kwa amri ya mfalme walileta mawe makubwa ya thamani kwa ajili ya kulaza kwenye msingi wa hekalu.
18 Ndị ikom si Gebal, nyere ndị ọrụ Solomọn na ndị ọrụ Hiram aka, igbutu osisi na ịwa ha. Ha nyekwara aka ịkwado nkume e ji ewu ụlọ ahụ.
Kwa hiyo wajenzi wa Sulemani na wajenzi wa Hiramu na Wagebaliti walifanya kazi ya kukata na kuandaa mbao kwa ajili ya ujenzi wa hekalu.

< 1 Ndị Eze 5 >