< 1 Ndị Eze 4 >

1 Ya mere Solomọn ghọrọ eze ndị Izrel niile.
솔로몬 왕이 온 이스라엘의 왕이 되었고
2 Ndị a bụ aha ndịisi ọchịchị obodo eze Solomọn họpụtara inyere ya aka. Azaraya, nwa Zadọk bụ onye nchụaja.
그의 신하들은 이러하니라 사독의 아들 아사리아는 제사장이요
3 Elihoref na Ahija, ụmụ ndị ikom Shisha, bụ ndị ode akwụkwọ. Jehoshafat, nwa Ahilud bụ onye na-edekọ akụkọ.
시사의 아들 엘리호렙과, 아히야는 서기관이요 아힐룻의 아들 여호사밧은 사관이요
4 Benaya, nwa Jehoiada bụ onyeisi agha ndị Izrel. Zadọk na Abịata, bụ ndị nchụaja.
여호야다의 아들 브나야는 군대장관이요, 사독과 아비아달은 제사장이요
5 Azaraya nwa Netan bụ onyeisi na-elekọta ndị na-ejere eze ozi. Zabud nwa Netan bụ onye nchụaja na onye ndụmọdụ nye eze.
나단의 아들 아사리아는 관리장이요, 나단의 아들 사붓은 대신이니 왕의 벗이요
6 Ahisha, bụ onyeisi na-elekọta nʼụlọeze. Adoniram nwa Abda bụ onyeisi na-elekọta ndị ọrụ mmanye.
아히살은 궁내대신이요, 압다의 아들 아도니람은 감역관이더라
7 Eze Solomọn họpụtara ndị ikom iri na abụọ ndị o mere ndịisi ga-elekọta akụkụ iri na abụọ nke o mere ka Izrel dịrị. Mmadụ iri na abụọ ndị a nwekwa ọrụ iwetara eze ihe oriri. Nwoke ọbụla nʼime ha nwe iwetara eze na ezinaụlọ ya ihe oriri otu ọnwa nʼafọ.
솔로몬이 또 온 이스라엘 위에 열 두 관장을 두매 그 사람들이 왕과 왕실을 위하여 식물을 예비하되 각기 일년에 한달씩 식물을 예비하였으니
8 Nke a bụ aha ndị ikom iri na abụọ ahụ. Ben-Hua, onye na-achị ala ugwu ugwu Ifrem.
그 이름은 이러하니라 에브라임 산지에는 벤훌이요
9 Ben-Deka, onye na-achị Makaz, na Shaalbim na Bet-Shemesh, na Elọn Bethanan.
마가스와, 사알빔과, 벧세메스와, 엘론벧하난에는 벤데겔이요
10 Ben-Hesed, onye na-achị Arubot, na Soko, na Ala Hefa niile.
아룹봇에는 벤헤셋이니 소고와 헤벨 온 땅을 저가 주관하였으며
11 Ben-Abinadab, onye na-achị ala elu elu Doa. Nwoke a lụrụ Tafat, nwa nwanyị Solomọn.
돌 높은 땅 온 지방에는 벤아비나답이니 저는 솔로몬의 딸 다밧으로 아내를 삼았으며
12 Baana, nwa Ahilud, onye na-achị Teanak, na Megido nʼakụkụ Bet-Shan niile, nke dị nʼakụkụ Zaretan na ndịda Jezril, sitekwa na Bet-Shan ruo Ebel-Mehola gafee ma ruokwa Jokmeam.
다아낙과, 므깃도와, 이스르엘 아래 사르단 가에 있는 벧소안 온 땅은 아힐룻의 아들 바아나가 맡았으니 벧소안에서부터 아벨므홀라에 이르고 욕느암 바깥까지 미쳤으며
13 Ben-Geba, onye na-achị Ramọt Gilead, na obodo niile nke ikwu Jaịa, nwa Manase nwere nʼime Gilead, na akụkụ Agob niile nke dị na Bashan, na iri obodo ukwu isii e ji mgbidi gbaa gburugburu, nke nwekwara mkpọrọ bronz e ji kpụọ ụzọ ya.
길르앗 라못에는 벤게벨이니 저는 길르앗에 있는 므낫세의 아들 야일의 모든 촌을 주관하였고 또 바산 아르곱 땅의 성벽과 놋빗 장 있는 큰 성읍 육십을 주관하였으며
14 Ahinadab nwa Ido, onye na-achị Mahanaim.
마하나임에는 잇도의 아들 아히나답이요
15 Ahimaaz, onye na-achị Naftalị (ọ lụkwara nwa nwanyị Solomọn a na-akpọ Basemat).
납달리에는 아히마아스니 저는 솔로몬의 딸 바스맛으로 아내를 삼았으며
16 Baana nwa Hushaị, onye na-achị Asha na Alot.
아셀과 아롯에는 후새의 아들 바아나요
17 Jehoshafat nwa Parua onye na-achị Isaka.
잇사갈에는 바루아의 아들 여호사밧이요
18 Shimei nwa Ela onye na-achị Benjamin.
베냐민에는 엘라의 아들 시므이요
19 Gebea nwa Uri, onye na-achị Gilead (ala Saịhọn eze ndị Amọrait, na nke Ọg eze Bashan). Naanị ya ka e doro dịka gọvanọ ala ahụ.
아모리 사람의 왕 시혼과 바산왕 옥의 나라 길르앗 땅에는 우리의 아들 게벨이니 그 땅에서는 저 한사람만 관장이 되었더라
20 Nʼoge a, ndị Juda na Izrel bara ụba nʼọnụọgụgụ dịka aja dị nʼakụkụ osimiri. Ha dịkwa ukwuu nʼọnụọgụgụ. Ha na-eri na-aṅụ, na-emekwa onwe ha obi ụtọ.
유다와 이스라엘의 인구가 바닷가의 모래 같이 많게 되매 먹고 마시며 즐거워하였으며
21 Ala niile Solomọn na-achị sitere nʼoke osimiri Yufretis ruo ala ndị Filistia, rukwaa nʼoke ala ndị Ijipt. Ndị niile a lụgburu nʼagha nʼobodo ndị a na-atụta ụtụ ha na-enye Solomọn. Ha nọgidekwara nʼokpuru Solomọn ụbọchị niile nke ndụ ya.
솔로몬이 하수에서부터 블레셋 사람의 땅에 이르기까지와 애굽지경에 미치기까지의 모든 나라를 다스리므로 그 나라들이 공을 바쳐 솔로몬의 사는 동안에 섬겼더라
22 Ihe oriri a na-ewebata nʼụlọ Solomọn ụbọchị niile bụ otu narị bushel ụtụ ọka na iri bushel asatọ, na iri akpa ọka a kwọrọ akwọ isii,
솔로몬의 일일분 식물은 가는 밀가루가 삼십석이요, 굵은 밀가루가 육십석이요,
23 na ehi iri mara abụba, na iri ehi abụọ a zụrụ nʼebe a na-azụ anụ, na narị atụrụ na ewu. A gụnyeghị anụ ele na mgbada na oke ele na ọkụkọ ọma a na-ewebata.
살진 소가 열이요, 초장의 소가 스물이요, 양이 일백이며, 그 외에 수사슴과, 노루와, 암사슴과, 살진 새들이었더라
24 Nʼihi na ọ chịrị alaeze niile a ruo nʼakụkụ ọdịda anyanwụ nke osimiri Yufretis, site na Tifsa ruo na Gaza. O nwekwara udo nʼakụkụ niile.
솔로몬이 하수 이편을 딥사에서부터 가사까지 모두 다스리므로 하수 이편의 모든 왕이 다 관할한 바 되매 저가 사방에 둘린 민족과 평화가 있었으니
25 Nʼoge ndụ Solomọn niile, Juda na Izrel site na Dan ruo Bịasheba bi nʼudo. Nwoke ọbụla nọ nʼokpuru osisi vaịnị na nʼokpuru osisi fiig nke ya.
솔로몬의 사는 동안에 유다와 이스라엘이 단에서부터 브엘세바에 이르기 까지 각기 포도나무 아래와 무화과나무 아래서 안연히 살았더라
26 Ọnụọgụgụ ụlọ a na-etinye ụgbọ agha ịnyịnya na-adọkpụ nke Solomọn nwere dị puku anọ. Ọnụọgụgụ ịnyịnya a na-agba agba o nwere dị puku iri na abụọ.
솔로몬의 병거의 말의 외양간이 사만이요, 마병이 일만 이천이며
27 Nʼọnwa ọbụla, ndị ahụ a họpụtara ịchị Izrel na-ewetara eze Solomọn na ndị ụlọ ya ihe oriri. Ha adịghị ekwekwa ka otu ihe kọọ nʼụlọ ya.
그 관장들은 각각 자기 달에 솔로몬왕과 왕의 상에 참여하는 모든 자를 위하여 먹을 것을 예비하여 부족함이 없게 하였으며
28 Ha na-ewetakwa ọka balị na ahịhịa ọka nʼebe o kwesiri, maka ịnyịnya na-adọkpụ ụgbọ agha na ịnyịnya ụkwụ ọsọ ndị ọzọ dịka ihe ha ketara nʼụtụ si dị.
또 저희가 각기 직무를 따라 말과 준마에게 먹일 보리와 꼴을 그 말의 있는 곳으로 가져왔더라
29 Chineke nyere Solomọn amamihe, na uche nghọta, na mmụọ ịmụta ọtụtụ ihe nke bara ụba dịka aja dị nʼakụkụ osimiri.
하나님이 솔로몬에게 지혜와 총명을 심히 많이 주시고 또 넓은 마음을 주시되 바닷가의 모래 같이 하시니
30 Amamihe Solomọn dị ukwuu karịa amamihe ndị si ọwụwa anyanwụ. Nʼezie, ọ dị ukwuu karịakwa amamihe ndị maara ihe nʼIjipt.
솔로몬의 지혜가 동양 모든 사람의 지혜와 애굽의 모든 지혜보다 뛰어난지라
31 Ọ maara ihe karịa onye ọbụla, karịa Etan onye Ezra, na Heman, na Kalkol, na Dada, ụmụ ndị ikom Mahol. Ihe banyere ịdị ukwuu ya gbasara na mba niile gbara ha gburugburu.
저는 모든 사람보다 지혜로와서 예스라 사람 에단과, 마홀의 아들 헤만과 갈골과, 다르다보다 나으므로 그 이름이 사방 모든 나라에 들렸더라
32 Ọ tụrụ puku ilu atọ, deekwa abụ ọnụọgụgụ ha dị otu puku na ise.
저가 잠언 삼천을 말하였고 그 노래는 일천 다섯이며
33 O kwuru okwu banyere osisi, site na osisi sida nke Lebanọn ruo nʼahịhịa hisọp nke na-eto na mgbidi aja, na ihe banyere ụmụ anụmanụ na anụ ufe, na anụ na-akpụgharị nʼala nakwa azụ.
저가 또 초목을 논하되 레바논 백향목으로부터 담에 나는 우슬초까지 하고 저가 또 짐승과 새와 기어 다니는 것과 물고기를 논한지라
34 Ndị eze niile dị nʼụwa bụ ndị bịara ịnụrụ banyere amamihe ya zitere ndị si na mba niile dị iche iche ịnụrụ okwu amamihe Solomọn.
모든 민족 중에서 솔로몬의 지혜의 소문을 들은 천하 모든 왕 중에서 그 지혜를 들으러 왔더라

< 1 Ndị Eze 4 >