< 1 Ndị Eze 3 >
1 Solomọn na Fero eze Ijipt jikọtara onwe ha nʼotu, ọ lụrụ nwa nwanyị Fero. Ọ kpọbatara ya nʼobodo Devid ruo mgbe o wusiri ụlọeze ya na ụlọnsọ Onyenwe anyị, na mgbidi gbara Jerusalem gburugburu.
Awo Sulemaani n’akola endagaano ne Falaawo, ye kabaka w’e Misiri era n’awasa muwala we. N’amuleeta mu kibuga kya Dawudi okutuusa lwe yamala okuzimba ennyumba ye n’ennyumba ya Mukama, era ne bbugwe okwetooloola Yerusaalemi.
2 Nʼoge ahụ, ndị Izrel ka na-achụ aja ha nʼebe dị elu niile, nʼihi na ewubeghị ụlọnsọ ukwu nye aha Onyenwe anyị.
Kyokka ennyumba ya Mukama yali tenazimbibwa, abantu nga baweerayo ssaddaaka mu bifo eby’enjawulo.
3 Ma Solomọn gosiri ịhụnanya nʼebe Onyenwe anyị nọ, site na ịgbaso ntụziaka niile nke Devid nna ya nyere ya, ọ bụ naanị na ọ chụrụ ọtụtụ aja dị iche iche, na ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nʼebe dị elu dị iche iche.
Sulemaani n’ayagala Mukama, ng’atambulira mu mateeka ga Dawudi kitaawe, newaakubadde nga yaweerangayo ssaddaaka era ng’ayotereza n’obubaane ku bifo ebigulumivu.
4 Eze gara Gibiọn nʼihi ịchụ aja, nʼihi na ebe ahụ bụ ebe kachasị mkpa, dị elu. Solomọn chụrụ otu puku aja nsure ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja ahụ.
Awo kabaka n’agenda e Gibyoni okuweerayo ssaddaaka, kubanga ekyo kye kyali ekifo ekikulu mu byonna, era Sulemaani n’aweerayo ku kyoto ekyo ssaddaaka ezookebwa lukumi.
5 Na Gibiọn, Onyenwe anyị mere ka Solomọn hụ ya anya na nrọ nke abalị, Chineke sịrị ya, “Rịọọ ihe ọbụla ị chọrọ ka m nye gị.”
Mukama n’alabikira Sulemaani ekiro mu kirooto e Gibyoni, Katonda n’amugamba nti, “Saba ky’oyagala kyonna kye mba nkuwa.”
6 Solomọn zara sị, “I gosila ohu gị bụ nna m Devid obi ebere dị ukwuu, nʼihi na ọ bụ onye kwesiri ntụkwasị obi nye gị, onye ezi omume nakwa onye obi ya ziri ezi. Ị nọgidela na-egosi ya obi ebere dị ukwuu, nyekwa ya nwa nwoke ga-anọkwasị nʼocheeze ya nʼụbọchị taa.
Sulemaani n’addamu nti, “Olaze ekisa kingi eri omuddu wo, Dawudi kitange, kubanga yali mwesigwa gy’oli, era mutuukirivu ate nga mwesimbu gy’oli. Era oyongedde okulaga ekisa kino ekingi gy’ali n’omuwa omwana okutuula ku ntebe ye ey’obwakabaka leero.
7 “Ugbu a, Onyenwe anyị bụ Chineke m, i meela ohu gị eze nʼọnọdụ nna m, bụ Devid. Ma abụ m naanị nwantakịrị na-amaghị otu esi apụ ma na-abatakwa.
Kaakano, Ayi Mukama Katonda wange, ofudde omuddu wo okuba kabaka mu kifo kya Dawudi kitange. Naye ndi mwana muto era simanyi ngeri ya kuddukanyaamu mirimu gyange.
8 Ohu gị nọ nʼebe a, nʼetiti ndị gị ị họpụtara, ndị bara ụba nke ukwuu, ndị a na-adịghị agụta ọnụ nʼihi nʼọnụọgụgụ ha babigara ụba oke.
Omuddu wo ali wakati mu bantu bo be walonda, eggwanga ekkulu, eritabalika.
9 Ya mere, nye ohu gị uche nghọta nke m ga-eji chịa ndị gị, na ịghọta ihe dị iche nʼetiti ezi ihe na ajọ ihe. Nʼihi na onye pụrụ ịchịkọta ndị gị a dị ukwuu?”
Kale omuddu wo muwe amagezi okufuganga abantu bo, njawulenga ekirungi n’ekibi: kubanga ani ayinza okufuga eggwanga lyo lino ekkulu?”
10 Ọ masịrị Onyenwe anyị na Solomọn rịọrọ nke a.
Mukama n’asanyuka kubanga Sulemaani yasaba ekyo.
11 Ya mere, Chineke zara sị ya, “Nʼihi na ị rịọrọ amamihe na nghọta ị ga-eji chịa ndị m, ma ị rịọghị m ka m nye gị ndụ ogologo, maọbụ akụnụba, maọbụ ọnwụ nye ndị iro gị.
Katonda n’amugamba nti, “Kubanga osabye kino, so teweesabidde kuwangaala wadde bugagga, oba okufa kw’abalabe bo, naye weesabidde amagezi okwawulanga emisango,
12 Aga m eme dịka ihe ị rịọrọ si dị. Aga m enye gị obi maara ihe na uche ịghọta ihe ziri ezi, nke ga-abụ na ọ dịghị onye ọbụla dịka gị, ọ dịghịkwa onye ọbụla ga-adị ka gị.
n’akola ky’osabye. Nzija kukuwa omutima omugezi era omutegeevu, so tewalibeerawo eyali akwenkanye oba alikwenkana.
13 Ọzọkwa, aga m enyekwa gị ihe ndị ahụ ị na-arịọghị m, akụnụba, na nsọpụrụ, ka ọ ga-abụ nʼụbọchị niile nke ndụ gị, ị gaghị enwe onye ọbụla ga-adị ka gị nʼetiti ndị eze niile.
Era ndikuwa, ne by’otosabye: obugagga n’ekitiibwa waleme kubeerawo kabaka akwenkana mu kiseera kyo.
14 Ọ bụrụkwa na i jee ije nʼụzọ m niile, debe iwu m, meekwa ihe m gwara gị, dịka nna gị Devid mere, aga m enye gị ogologo ndụ.”
Era bw’onootambuliranga mu makubo gange, n’okukwatanga amateeka gange n’ebiragiro byange, nga kitaawo Dawudi bwe yakola, ndyongera ku nnaku zo.”
15 Mgbe ahụ, Solomọn si nʼụra teta, ghọtakwa na ọ bụ nrọ ka ọ na-arọ. Ọ lọtara na Jerusalem bata guzo nʼihu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị, chụọ aja nsure ọkụ na aja udo. Emesịa, o meere ndị na-ejere ya ozi oke oriri.
Awo Sulemaani n’azuukuka n’amanya nga kibadde kirooto. N’akomawo e Yerusaalemi, n’ayimirira mu maaso g’essanduuko ey’endagaano ya Mukama n’awaayo ebiweebwayo ebyokebwa n’ebiweebwayo olw’emirembe, era n’agabula abaweereza be ekijjulo.
16 Mgbe ihe ndị a gasịrị, ụmụ nwanyị akwụna abụọ bịakwutere eze, guzo nʼihu ya.
Awo abakazi bamalaaya babiri ne bajja eri kabaka, ne bayimirira mu maaso ge.
17 Otu nʼime ha gwara ya sị, “Onyenwe m, mụ na nwanyị a bi nʼotu ụlọ. Anyị abụọ dịkwa ime. Ma eburu m ya ụzọ mụọ nwa nke m.
Omu ku bo n’amugamba nti, “Mukama wange, omukazi ono nange tubeera mu nnyumba emu, era nazaala omwana nga naye waali.
18 Mgbe ụbọchị atọ gasịrị ka m mụsịrị nwa, ya onwe ya mụkwara nwa nke ya. Naanị anyị abụọ bi, o nweghị onye ọzọ binyere anyị.
Bwe waayitawo ennaku ssatu, naye n’azaala omwana we. Twali ffekka, so tewaali muntu n’omu eyali naffe mu nnyumba.
19 “Ma nʼotu abalị, nwa ya nwụrụ mgbe o dinakwasịrị ya nʼoge ọ na-arahụ ụra.
“Awo mu kiro omukazi ono, ne yeebakira omwana we n’amutta.
20 Mgbe o biliri nʼetiti abalị, chọpụtara na nwa ya anwụọla, o kuuru ya nibe ya nʼakụkụ m, kurukwanụ nwa nke m dị ndụ nibe nʼakụkụ ya onwe ya.
N’agolokoka ekiro mu ttumbi n’aggya omwana wange mu mbiriizi zange, nze omuweereza wo nga neebase, n’amuteeka mu kifuba kye, ate n’addira owuwe afudde n’amussa mu kifuba kyange.
21 Nʼisi ụtụtụ, mgbe m tetara nʼụra chọọ inye nwa m ara, achọpụtara m na ọ nwụọla. Ma mgbe m leziri ya anya nke ọma ka chi bọrọ, ahụrụ m na nwa mụ na ya dina abụghị nwa nke m mụrụ.”
Awo bwe nagolokoka enkya okuyoonsa omwana wange, nga mufu. Naye bwe n’amwekaliriza amaaso, ne ndaba nga si ye mwana gwe nazaala.”
22 Mgbe ahụ, nwanyị nke ọzọ kwuru sị, “Mba, nwantakịrị ahụ dị ndụ bụ nwa m, ma nke nwụrụ anwụ bụ nwa gị.” Nwanyị nke mbụ zara sị, “Mba, ọ bụghị eziokwu; nwa nke nwụrụ anwụ bụ nke gị, ma nke dị ndụ bụ nke m.” Otu a ka ha si na-arụrịta ụka nʼihu eze.
Omukazi oli omulala n’agamba nti, “Nedda! Omulamu ye mwana wange, omufu ye wuwo.” Naye ow’olubereberye n’aggumiza nti, “Nedda! Omufu ye wuwo, omulamu ye wange.” Ne bawakanira mu maaso ga kabaka.
23 Eze kwuru sị, “Onye nke a na-asị, ‘Nwa m bụ nke dị ndụ, ma nke gị bụ nke nwụrụ anwụ,’ mgbe onye nke ọzọ na-asị, ‘Mba! Nwa gị bụ nke nwụrụ anwụ, ma nke m bụ nke dị ndụ.’”
Kabaka n’agamba nti, “Omu agamba nti, ‘Omwana wange ye mulamu, owuwo ye mufu,’ n’omulala agamba nti, ‘Omwana wange ye mulamu, owuwo ye mufu.’”
24 Mgbe ahụ, eze sịrị, “Wetara m mma agha.” Ya mere, ha wetaara eze mma agha.
Awo kabaka n’agamba nti, “Mundeetere ekitala.” Ne baleetera kabaka ekitala.
25 Eze nyere iwu sị, “Kpọwaa nwa ahụ dị ndụ ụzọ abụọ, were otu ọkara nye otu onye, werekwa nke ọzọ nye onye nke ọzọ.”
N’alyoka alagira nti, “Musaleemu omwana omulamu, muwe omu ekitundu n’omulala ekitundu ekirala.”
26 Nwanyị ahụ nwa ya dị ndụ jupụtara nʼọmịiko nʼebe nwa ya nọ, ọ gwara eze sị, “Biko, onyenwe m, kunye ya nwantakịrị ahụ dị ndụ. Egbukwala ya.” Ma onye nke ọzọ sịrị, “Kpọwaa ya abụọ. Nwa a agaghị abụ nke gị, ọ gaghị abụkwa nke m.”
Nnyina w’omwana omulamu n’ajjula ennaku olw’omwana we, n’agamba kabaka nti, “Nkwegayiridde mukama wange, omwana omulamu mumuwe! Tomutta!” Naye omukazi oli n’agamba nti, “Tajja kuba wange oba wuwo. Mumusalemu!”
27 Mgbe ahụ, eze kpebiri ikpe sị, “Kuru nwantakịrị a dị ndụ kunye ya nwanyị ahụ chọrọ ka ọ dị ndụ. Egbula ya, nʼihi na nwanyị ahụ bụ nne ya.”
Awo kabaka n’asalawo ng’agamba nti, “Omwana omulamu mumuwe omukazi ow’olubereberye, so temumutta, kubanga oyo ye nnyina.”
28 Mgbe ndị Izrel niile nụrụ otu eze si kpebie ikpe a, ha sitere nʼịtụ egwu nye eze nsọpụrụ, nʼihi na ha hụrụ na o si nʼaka Chineke nweta amamihe ikpe ikpe ziri ezi.
Isirayiri yonna bwe yawulira okusalawo kwa kabaka, ne beewuunya kabaka, kubanga baalaba ng’alina amagezi okuva eri Katonda okulamula ensonga.