< 1 Ndị Eze 22 >

1 Agha ọzọ adaghị nʼetiti Aram na Izrel afọ atọ.
Kwathatha iminyaka kungelampi phakathi kwe-Aramu le-Israyeli.
2 Ma nʼafọ nke atọ, Jehoshafat, eze Juda, gara ileta Ehab eze Izrel.
Kodwa ngomnyaka wesithathu uJehoshafathi inkosi yakoJuda wayabonana lenkosi yako-Israyeli.
3 Eze Izrel sịrị ndị ozi ya, “Unu amaghị na ala Ramọt Gilead bụ nke anyị, ma lee na anyị gbara nkịtị ịga napụta ya site nʼaka eze Aram?”
Inkosi yako-Israyeli yayike yakhuluma lezikhulu zayo isithi, “Alikwazi na ukuthi eleRamothi Giliyadi ngelethu kodwa asikenzi lutho ukuze silithathe ezandleni zenkosi yase-Aramu?”
4 Ya mere, ọ jụrụ Jehoshafat, “Ị ga-eso m gaa buso Ramọt Gilead agha?” Jehoshafat zaghachiri eze Izrel, sị, “Otu m dị ka gị onwe gị dị, ndị m bụkwa ndị gị, ịnyịnya m bụkwa nke gị.”
Ngakho yasicela uJehoshafathi isithi, “Ungahamba lami na ukuze siyehlasela eRamothi Giliyadi?” UJehoshafathi ephendula inkosi yako-Israyeli wathi, “Mina ngikanye lawe, abantu bami banjengabakho, amabhiza ami anjengawakho.”
5 Ma Jehoshafat gwakwara eze Izrel, sị, “Buru ụzọ chọpụta ihe bụ ntụziaka Onyenwe anyị.”
Kodwa uJehoshafathi waphinda wathi enkosini yako-Israyeli, “Akubuze kuThixo kuqala.”
6 Ya mere, eze Izrel kpọkọtara ndị amụma, ọnụọgụgụ ha ruru narị ndị ikom anọ, jụọ ha sị, “Ọ bụ m gaa buso Ramọt Gilead agha, ka ọ bụ m hapụ ịga?” Ha zara, “Gaa, nʼihi na Onyenwe anyị ga-enyefe ha nʼaka eze.”
Ngakho inkosi yako-Israyeli yahlanganisa abaphrofethi abangaba ngamakhulu amane yasibabuza isithi, “Ngihambe ngiyehlasela iRamothi Giliyadi yini, loba ngiyekele na?” Abaphrofethi bathi, “Hamba ngoba iNkosi izayinikela esandleni sakho.”
7 Ma Jehoshafat jụrụ, “Ọ bụ na e nwekwaghị onye amụma Onyenwe anyị nọ nʼebe a, onye anyị nwere ike ịjụta ase nʼaka ya?”
Kodwa uJehoshafathi wabuza wathi, “Kambe kakusela mphrofethi kaThixo lapha esingabuza kuye na?”
8 Eze Izrel zaghachiri Jehoshafat, sị, “A ka nwere otu onye amụma, onye anyị nwere ike isite nʼaka ya jụọ Onyenwe anyị ase, ọ bụ Maikaya nwa Imla, ma akpọrọ m ya asị, nʼihi na o nweghị oge ọ na-ebu amụma ihe ọma nʼebe m nọ, kama ọ bụ naanị nke ọjọọ.” Jehoshafat sịrị, “Eze ekwesighị ikwu okwu dị otu a.”
Inkosi yako-Israyeli yathi kuJehoshafathi, “Ukhona oyedwa esingabuza uThixo ngaye kodwa ngiyamzonda ngoba kakaze aphrofethe okuhle ngami, uhlala ekhuluma okubi. Ibizo lakhe nguMikhaya indodana ka-Imla.” UJehoshafathi wathi, “Inkosi kayimelanga itsho njalo.”
9 Mgbe ahụ, eze Izrel kpọrọ otu onye na-ejere ya ozi sị ya, “Mee ọsịịsọ kpọta Maikaya nwa Imla nʼebe a.”
Inkosi yako-Israyeli yasibiza omunye wezikhulu zayo yathi kuye, “Phangisa ungilethele uMikhaya indodana ka-Imla.”
10 Ehab eze Izrel na Jehoshafat eze Juda, onye ọbụla yi uwe eze ya, na-anọkwasị nʼocheeze ya nʼebe ịzọcha ọka nʼọnụ ụzọ ama e si abata obodo Sameria. Ndị amụma ahụ niile nọkwa na-ebu amụma nʼihu ha.
Bembethe izembatho zabo zobukhosi, inkosi yako-Israyeli loJehoshafathi inkosi yakoJuda babehlezi ezihlalweni zabo zobukhosi esizeni sokubhulela amabele esangweni laseSamariya labo bonke abaphrofethi bephrofetha phambi kwabo.
11 Zedekaya nwa Kenaana, mere mpi igwe, ọ kwupụtara sị, “Nke a bụ ihe Onyenwe anyị na-ekwu, ‘Ihe ndị a ka ị ga-eji sọgide ndị Aram, ruo mgbe a ga-ala ha nʼiyi.’”
UZedekhiya indodana kaKhenana wayekhande impondo zensimbi, wasesithi, “Nanku okutshiwo nguThixo, uthi: ‘Ngempondo lezi uzagwaza ama-Aramu uwabhubhise.’”
12 Ndị amụma ndị ọzọ niile na-ebu otu ihe ahụ nʼamụma, na-asị, “Gaa, busoo Ramọt Gilead agha, ị ga-enwekwa mmeri, nʼihi na Onyenwe anyị ga-enyefe ya nʼaka eze.”
Bonke abaphrofethi babevele bephrofetha okufananayo besithi, “Hlasela iRamothi Giliyadi unqobe, ngoba uThixo uyinikile esandleni senkosi.”
13 Onyeozi ahụ nke gara ịkpọ Maikaya sịrị ya, “Lee, ndị amụma ndị ọzọ na-agụpụghị onye ọbụla na-ebu amụma ọganihu nye eze. Mee ka okwu gị na ha dakọta. Kwuokwa ihe ga-adị eze mma.”
Isithunywa esasithunywe ukuyabiza uMikhaya sathi kuye, “Khangela, abanye abaphrofethi bafakaza bengela kuthandabuza ukuthi inkosi izanqoba. Lawe vumelana labo, ukhulume okuyithokozisayo.”
14 Ma Maikaya sịrị, “Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, aga m agwa ya naanị ihe Onyenwe anyị gwara m.”
Kodwa uMikhaya wathi, “Njengokutsho kukaThixo, mina ngizayitshela lokho engikuthunywe nguThixo.”
15 Mgbe ọ bịarutere, eze jụrụ ya, “Maikaya, ọ bụ anyị gaa buso Ramọt Gilead agha, ka ọ bụ anyị hapụ?” Ọ zara, “Gaa, ma nwekwa mmeri, nʼihi na Onyenwe anyị ga-enyefe ya nʼaka eze.”
Ekufikeni kwakhe, inkosi yambuza yathi, “Mikhaya, sihambe siyehlasela iRamothi Giliyadi yini, loba ngiyekele na?” Yena waphendula wathi, “Hlasela njalo unqobe, ngoba uThixo uzalinikela ezandleni zakho nkosi.”
16 Eze sịrị ya, “Ugboro ole ka m ga-eme ka ị ṅụọ iyi na ị gaghị agwa m ihe ọzọ, karịa naanị eziokwu nʼaha Onyenwe anyị?”
Inkosi yathi kuye, “Kumele ngikufungise kangaki ukuze ungangikhohlisi kodwa ungitshele iqiniso ebizweni likaThixo?”
17 Mgbe ahụ Mikaya zara, “Ahụrụ m Izrel niile ka ha gbasasịrị nʼelu ọtụtụ ugwu dịka atụrụ na-enweghị onye ọzụzụ atụrụ, ma Onyenwe anyị sịrị, ‘Ndị a enweghị onyendu. Ka onye ọbụla laghachi nʼụlọ ya nʼudo.’”
Ngakho uMikhaya waphendula wathi, “Ngabona u-Israyeli wonke ehlakazekile ezintabeni njengezimvu ezingelamelusi, kulapho uThixo athi ‘Lababantu abalamkhomkheli. Yekela bonke babuyele emakhaya ngokuthula.’”
18 Eze Izrel, sịrị Jehoshafat, “Ọ bụ na m agwaghị gị na ọ dịghị mgbe ọ na-ebu amụma ihe ọma banyere m, kama naanị ihe ọjọọ?”
Inkosi yako-Israyeli yathi kuJehoshafathi, “Angikutshelanga yini ukuthi uvele kaphrofethi okuhle ngami, kodwa okubi kuphela?”
19 Mikaya gara nʼihu, sị, “Ya mere, nụrụnụ okwu Onyenwe anyị. Ahụrụ m Onyenwe anyị ka ọ nọkwasịrị nʼocheeze ya, hụkwa usuu nke eluigwe ka ha na-eguzo nʼakụkụ ya, nʼaka nri ya nakwa nʼaka ekpe ya.
UMikhaya waqhubekela phambili wathi, “Ngakho zwana ilizwi likaThixo elithi, Ngabona uThixo ehlezi esihlalweni sakhe sobukhosi lamabutho wonke asezulwini emi ngakwesokunene sakhe lakwesokhohlo sakhe.
20 Onyenwe anyị sịrị, ‘Onye ga-aga rafuo Ehab ka ọ gaa buso Ramọt Gilead agha, gaa nwụọ nʼebe ahụ?’ “Otu onye tụpụtara aro nke a, ebe onye ọzọ tụpụtara nke ọzọ.
Njalo uThixo wathi, ‘Ngubani ozahugela u-Ahabi ekuhlaseleni iRamothi Giliyadi ukuze ayefela khonale na?’ Omunye waqamba lokhu, lomunye okwakhe.
21 Nʼikpeazụ otu mmụọ pụtara, guzo nʼihu Onyenwe anyị sị, ‘Mụ onwe m ga-arafu ya.’
Ekucineni kwavela umoya, wema phambi kukaThixo wathi, ‘Mina ngizamhuga.’
22 “‘Onyenwe anyị jụrụ sị, Olee otu ị ga-esi mee nke a?’ “‘Aga m apụ gaa bụrụ mmụọ nrafu nʼọnụ ndị amụma ya niile,’ ka ọ zara. “Onyenwe anyị sịrị, ‘Ị ga-enwe ike ịrafu ya. Gaa mee otu a.’
UThixo wabuza wathi, ‘Uzakwenza ngandlela bani?’ Umoya waphendula wathi, ‘Ngizahamba ngiyekuba ngumoya wokuqamba amanga emilonyeni yabo bonke abaphrofethi bakhe.’ UThixo wathi, ‘Uzaphumelela ukumhuga. Hamba-ke uyekwenza lokho.’
23 “Ma ugbu a, Onyenwe anyị etinyela mmụọ okwu ụgha nʼọnụ ndị amụma gị niile ndị a. Onyenwe anyị ekwubiela nʼihe ọjọọ ga-adakwasị gị.”
Ngakho khathesi uThixo usefake umoya wenkohliso emilonyeni yabaphrofethi bakho bonke laba. UThixo usekumisele ukubhujiswa.”
24 Mgbe ahụ, Zedekaya nwa Kenaana, gara nso, maa Maikaya aka na nti, jụọ ya, “Olee ụzọ ka mmụọ ahụ sitere na Onyenwe anyị gara, mgbe ọ hapụrụ m bịa ịgwa gị okwu?”
Kusenjalo uZedekhiya indodana kaKhenana wasondela, wamwakala uMikhaya ebusweni. Wabuza wathi: “Umoya kaThixo wasuka njani kimi ungena kuwe na?”
25 Maikaya zaghachiri, “Ị ga-achọpụta nke a nʼụbọchị ị ga-agbaba nʼime ime ụlọ izo onwe gị.”
UMikhaya waphendula wathi, “Uzazibonela mhla uzakuyacatsha endlini engaphakathi.”
26 Mgbe ahụ, eze Izrel nyere iwu sị, “Jidenụ Maikaya kpụgara ya Amọn onye na-achị obodo a, na Joash nwa eze
Inkosi yako-Israyeli yalaya yathi, “Thathani uMikhaya limbuyisele ku-Amoni obusa idolobho lakoJowashi indodana yenkosi.
27 ị ga-asịkwa, ‘Otu a ka eze sịrị: Tinye nwoke a nʼụlọ mkpọrọ, nye ya naanị achịcha na mmiri ọṅụṅụ tutu ruo mgbe m lọghachiri nʼudo.’”
Liyekuthi, ‘Inkosi ithi: Valelani umuntu lo entolongweni lingamniki lutho ngaphandle kwesinkwa lamanzi ngize ngiphenduke ngokuhle.’”
28 Maikaya kwupụtara sị, “Ọ bụrụ na ị lọghachi nʼudo, ọ pụtara na ọ bụghị Onyenwe anyị si nʼọnụ m kwuo okwu.” O kwukwara sị, “Unu niile hụbakwanụ okwu m ndị a niile ama!”
UMikhaya waqonqosela wathi: “Nxa ungaphenduka kuhle, uThixo uyabe engakhulumanga ngami.” Waqhubeka wathi, “Lani lonke bantu abambisiseni amazwi ami!”
29 Ya mere, eze Izrel na Jehoshafat eze Juda, pụrụ gawa Ramọt Gilead.
Ngakho inkosi yako-Israyeli loJehoshafathi inkosi yakoJuda baya eRamothi Giliyadi.
30 Eze Izrel gwara Jehoshafat, sị, “Aga m ejikere onwe m dịka m bụ onye ọzọ banye nʼọgbọ agha, ma gị onwe gị yiri uwe eze gị.” Ya mere, eze Izrel nwogharịrị onwe ya ka onye ọzọ baa nʼọgbọ agha.
Inkosi yako-Israyeli yathi kuJehoshafathi: “Mina ngizakuya empini ngizazifihla ngokulahlisa isimo sami, kodwa wena gqoka ezakho ezobukhosi.” Ngakho inkosi yako-Israyeli yazifihla ngokulahlisa isimo sayo yangena empini.
31 Ma eze Aram enyelarị ndị ọchịagha ndị na-agba ụgbọ agha, ọnụọgụgụ ha dị iri atọ na abụọ, iwu sị, “Unu ebusola onye ọbụla agha, maọbụ onye ukwu maọbụ onye nta, karịakwa naanị eze Izrel.”
Inkosi yase-Aramu yayilaye abalawuli bayo bezinqola zokulwa abangamatshumi amathathu lambili yathi, “Lina lingalwi lamuntu, loba eyisikhulu loba engumuntukazana, ngaphandle kwenkosi yako-Israyeli.”
32 Mgbe ndị ọchịagha, na-achị ụgbọ agha hụrụ Jehoshafat, ha chere nʼobi ha, “Nʼezie, onye a bụ eze Izrel.” Nʼihi ya ha tụgharịrị ibuso ya agha, ma Jehoshafat tiri mkpu,
Abalawuli bezinqola zokulwa bathe bebona uJehoshafathi, bahle bathi “Ngempela le yiyo kanye inkosi yako-Israyeli.” Abalawuli bezinqola zokulwa basebehlasela uJehoshafathi, yena wahlaba umkhosi,
33 ndị ọchịagha, na-achị ndị na-agba ụgbọ agha hụrụ na ọ bụghị eze Izrel, ma kwụsị ịchụso ya.
baphanga babona ukuthi kwakungasiyo inkosi yako-Israyeli bahle bayekela ukuxotshana laye.
34 Ma otu onye dọrọ ụta ya gbapụ ya na-ebughị onye ọbụla nʼobi, gbata ya eze Izrel nʼetiti njikọ nke uwe agha ya. Eze gwara onye ọkwọ ụgbọ agha ya, sị, “Tụgharịa, si nʼebe a bupụ m, nʼihi na emerụọla m ahụ.”
Umuntu othile wakhokha umtshoko wakhe watshoka engaqondanga muntu umtshoko wayaciba inkosi yako-Israyeli emkenkeni wesihlangu sayo. Inkosi yasisithi kumtshayeli wenqola yokulwa: “Phendula inqola yakho ungisuse lapha. Sengilimele.”
35 Agha ahụ siri ike nʼụbọchị ahụ niile, e ji ihe mee ka eze kwụrụ ọtọ nʼime ụgbọ agha ya na-eche ndị Aram ihu. Ọbara si nʼọnya ahụ sọjuru nʼala ụgbọ agha ahụ, ọ nwụrụ nʼuhuruchi ụbọchị ahụ.
Kwalwiwa impi kanzima ilanga lonke. Inkosi yayeyanyiswe enqoleni yayo yokulwa ikhangele ama-Aramu. Igazi lamanxeba ayo lagelezela phansi enqoleni yokulwa, kwathi Ngalokhokuhlwa yafa.
36 Mgbe anyanwụ na-ada, e tiri mkpu nke gazuru nʼọgbọ agha ndị Izrel, sị, “Nwoke ọbụla laa nʼobodo ya, onye ọbụla laakwa nʼala nke aka ya!”
Ekutshoneni kwelanga kwamenyezelwa kuyo yonke impi ukuthi: “Abantu bonke kababuyele emizini yakibo, bonke kababuyele lowo lalowo elizweni lakibo!”
37 Ya mere, eze nwụrụ, e buta ozu ya nʼobodo Sameria, ebe a nọ lie ya.
Ngakho inkosi yafa yasiwa eSamariya, yangcwatshwa khona.
38 Ha sachara ụgbọ agha ya nʼọdọ mmiri dị na Sameria (ebe ndị akwụna na-asa ahụ). Ụmụ nkịta rachara ọbara ya, dịka okwu Onyenwe anyị kwubiri.
Inqola yokulwa bayigezisela esizibeni seSamariya (endaweni eyayigezela izifebe), izinja zakhotha igazi layo, njengokutsho kwelizwi likaThixo.
39 Ma banyere ihe ndị ọzọ niile mere nʼoge ọchịchị Ehab na ihe niile o mere, ụlọeze o wuru nke o ji ọdụ chọọ mma, na obodo niile o wusiri ike, ọ bụ na e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe mere nʼoge ndị eze Izrel?
Konke okunye ngempilo langokubusa kuka-Ahabi lakho konke akwenzayo, ukwakha isigodlo esasiceciswe ngempondo zezindlovu, lamadolobho ayevikelwe okwenqaba, akulotshwanga na egwalweni lwembali yamakhosi ako-Israyeli?
40 Ehab sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ. Ahazaya nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ.
U-Ahabi wangcwatshwa laboyise. Ubukhosi bakhe bathathwa yindodana yakhe u-Ahaziya.
41 Jehoshafat nwa Asa ghọrọ eze Juda, nʼafọ nke anọ, nke ọchịchị Ehab eze Izrel.
UJehoshafathi indodana ka-Asa waba yinkosi yakoJuda ngomnyaka wesine wokubusa kuka-Ahabi inkosi yako-Israyeli.
42 Jehoshafat gbara iri afọ atọ na ise mgbe ọ malitere ịbụ eze. Ọ chịrị iri afọ abụọ na ise na Jerusalem. Aha nne ya bụ Azuba, nwa Shilhi.
UJehoshafathi waba yinkosi eleminyaka engamatshumi amathathu lemihlanu yokuzalwa, wabusa eJerusalema okweminyaka engamatshumi amabili lemihlanu. Ibizo likanina kungu-Azubha indodakazi kaShilihi.
43 Nʼihe niile o jere ije nʼụzọ Asa bụ nna ya, o sitekwaghị nʼime ha wezuga onwe ya, o mekwara ihe ziri ezi nʼanya Onyenwe anyị. Naanị na o wezugaghị ebe dị elu niile, nke mere na ndị mmadụ gara nʼihu na-achụ aja, na-esurekwa ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nʼebe ahụ niile.
Kukho konke ayekwenza wayesenyathelweni likayise u-Asa njalo kazange aphambuke; wenza konke okuhle emehlweni kaThixo. Kodwa izindawo eziphakemeyo zokukhonzela kazisuswanga, abantu babelokhu benikela imihlatshelo, betshisa impepha khonapho.
44 Jehoshafat mere ka udo dị nʼetiti ya na eze Izrel.
UJehoshafathi wahlalisana ngokuthula lenkosi yako-Israyeli.
45 Ma banyere ihe ndị ọzọ niile mere nʼoge ọchịchị Jehoshafat, ihe niile ndị ọ rụpụtara, ike ọ kpara nʼọtụtụ agha nke o buru, ọ bụ na e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe mere nʼoge ndị eze Juda?
Okwenzakala ekubuseni kukaJehoshafathi, ukuphumelela kwakhe kanye lokunqoba ezimpini, akulotshwanga na encwadini yembali yamakhosi akoJuda?
46 O kpochapụrụ ndị ikom akwụna ụlọ arụsị, bụ ndị nke fọdụrụ, mgbe nna ya bụ Asa chịchara ọchịchị.
Waqeda insalela yabesilisa ababefeba emathempelini ayelokhu esasele lapho langemva kokubusa kukayise u-Asa.
47 Nʼoge a, eze adịghị nʼala Edọm, kama ọ bụ onye nnọchite anya eze bụ onye na-achị.
Kwakungaselankosi e-Edomi, umsekeli nguye owayebusa.
48 Jehoshafat wuuru ọtụtụ ụgbọ mmiri eji azụ ahịa, maka ije nʼala Ọfịa ịga bute ọlaedo ma ụgbọ mmiri ndị a agaghị ebe ọbụla, nʼihi na ha mikpuru nʼEziọn Geba.
UJehoshafathi wakha imikhumbi yokuthutha igolide e-Ofiri, kodwa ayizange isebenze olwandle, yahle yahlikizeka, yabhidlikela e-Eziyoni-Gebheri.
49 Nʼoge ahụ, Ahazaya nwa Ehab sịrị Jehoshafat, “Kwere ka ndị ikom m soro ndị ọrụ gị nʼụgbọ gị,” ma Jehoshafat ekweghị.
Ngalesosikhathi u-Ahaziya indodana ka-Ahabi wathi kuJehoshafathi, “Yekela abantu bami bahambe labakho olwandle,” kodwa uJehoshafathi wala.
50 Mgbe ahụ, Jehoshafat sooro nna nna ya ha dina nʼọnwụ, e lie ya nʼebe e liri ha nʼobodo Devid, nna ya. Jehoram nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.
Ngakho uJehoshafathi waphumula labokhokho bakhe, wangcwatshwa kanye labo emzini kaDavida uyise. UJehoramu indodana yakhe wabusa esikhundleni sakhe.
51 Ahazaya nwa Ehab, malitere ịbụ eze Izrel na Sameria, nʼafọ iri na asaa nke ọchịchị Jehoshafat, eze Juda. Ma ọ chịrị Izrel naanị afọ abụọ.
U-Ahaziya indodana ka-Ahabi waba yinkosi yako-Israyeli eSamariya ngomnyaka wetshumi lesikhombisa wokubusa kukaJehoshafathi inkosi yakoJuda, yena-ke wabusa ko-Israyeli okweminyaka emibili.
52 O mere ihe dị njọ nʼanya Onyenwe anyị, nʼihi na o sooro ụzọ ọjọọ niile nke nna na nne ya, na ụzọ ọjọọ nke Jeroboam nwa Nebat, onye mere ka Izrel mee mmehie.
Wona emehlweni kaThixo, ngoba wahamba enyathelweni likayise lelikanina walandela njalo izindlela zikaJerobhowamu indodana kaNebhathi, owabangela u-Israyeli ukuthi enze isono.
53 Ọ fekwara arụsị Baal ofufe, kpọọkwa isiala nye ya, si otu a kpasuo Onyenwe anyị, Chineke Izrel iwe, dịka nna ya mere.
Wasebenzela uBhali njalo wamkhonza wathukuthelisa uThixo, uNkulunkulu ka-Israyeli, njengalokhu okwakwenziwe nguyise.

< 1 Ndị Eze 22 >