< 1 Ndị Eze 20 >

1 Ugbu a, Ben-Hadad, bụ eze ndị Aram, chịkọtara ndị agha ya niile. Iri ndị eze atọ na abụọ sonyere ya, ha na ịnyịnya ha na ụgbọ agha ha. Ọ rịgooro nọchibido obodo Sameria buso ya agha.
Ben Hadad, roi de Syrie, rassembla toute son armée, et il y avait avec lui trente-deux rois, avec des chevaux et des chars. Il monta et assiégea Samarie, et il la combattit.
2 Mgbe ahụ, eze ndị Siria zigaara Ehab, eze Izrel ozi nʼime obodo sị ya, “otu a ka Ben-Hadad sịrị,
Il envoya des messagers dans la ville à Achab, roi d'Israël, et lui dit: « Ben Hadad dit:
3 ‘Ọlaọcha na ọlaedo gị, nkem ka ha bụ, ndị nwunye gị na ụmụ gị, bụ ndị dị mma karịsịa nke m ka ha bụ.’”
Ton argent et ton or sont à moi. Tes femmes aussi et tes enfants, même les meilleurs, sont à moi. »
4 Ehab eze Izrel, zighachiri ozi sị, “Ọ dị mma, onyenwe m, mụ onwe m, na ihe niile m nwere bụ nke gị.”
Le roi d'Israël répondit: « C'est ce que tu as dit, mon seigneur, ô roi. Je suis à toi, avec tout ce que j'ai. »
5 Ngwangwa ndị ozi Ben-Hadad bịaghachiri zie Ehab ozi ọzọ sị ya, “Otu a ka Ben-Hadad sịrị, ‘Ọ bụ ezie na m ziteere gị ozi, sị, ọlaọcha gị na ọlaedo gị na ndị nwunye gị na ụmụ gị ka ị ga-enye m.
Les messagers revinrent et dirent: « Ben Hadad dit: « Je t'ai effectivement envoyé dire: « Tu me livreras ton argent, ton or, tes femmes et tes enfants;
6 Ma ugbu a, nʼoge dị ka nke a, echi, aga m ezite ndị ozi m ka ha bịa nyochaa ụlọ gị niile na ụlọ ndị ozi gị niile. Ihe ọbụla dị oke ọnụahịa nʼanya gị ka ha ga-ewere.’”
mais je t'enverrai mes serviteurs demain à cette heure-ci, et ils fouilleront ta maison et les maisons de tes serviteurs. Tout ce qui sera agréable à vos yeux, ils le mettront dans leur main et l'emporteront. »'"
7 Eze Izrel kpọrọ ndị okenye niile nke ala ahụ, sị ha, “Leenụ ugbu a, hụkwanụ otu nwoke a si achọ nsogbu. Mgbe o zitere m ozi inye ya ndị nwunye m, na ụmụ, na ọlaọcha m na ọlaedo m, ekwenyere m ya inye ya ihe ndị a.”
Alors le roi d'Israël appela tous les anciens du pays et dit: « Remarquez, je vous prie, comment cet homme cherche le malheur, car il m'a envoyé chercher mes femmes et mes enfants, mon argent et mon or, et je ne l'ai pas refusé. »
8 Ndị okenye na ndị Izrel zara sị ya, “Aṅala ya ntị! Enyela ya ihe ọbụla.”
Tous les anciens et tout le peuple lui dirent: « N'écoute pas, et ne consens pas. »
9 Mgbe ahụ, ọ sịrị ndị ozi Ben-Hadad, “Gwanụ onyenwe m, bụ eze, ‘M bụ odibo gị jikeere ime ihe niile ị buru ụzọ kwuo na m ga-enye gị. Ma ekwenyeghị m nʼozi nke ugboro abụọ a.’” Ndị ozi ahụ laghachiri kọọrọ Ben-Hadad ihe niile Ehab kwuru.
Il dit donc aux messagers de Ben Hadad: « Dis à mon seigneur le roi: « Je ferai tout ce que tu as envoyé à ton serviteur au début, mais je ne peux pas faire ceci. » Les messagers partirent et lui rapportèrent le message.
10 Ma Ben-Hadad zigakwaara Ehab ozi ọzọ sị, “Ka chi ndị a mesoo m mmeso, otu ọbụla mmeso ahụ si dị njọ, ma ọ bụrụ na aja Sameria ga-afọdụ inye onye ọbụla nʼetiti ndị ikom m otu njuaka.”
Ben Hadad lui envoya un message et dit: « Les dieux me font ainsi, et plus encore, si la poussière de Samarie suffit en poignées pour tout le peuple qui me suit. »
11 Ma eze Izrel zaghachiri, “Gwa ya, ‘Onye na-ebu agha na-anya isi naanị mgbe a lụchara agha, ọ bụghị tupu a lụọ agha.’”
Le roi d'Israël répondit: « Dis-lui: 'Que celui qui met son armure ne se vante pas comme celui qui l'enlève'. »
12 Ben-Hadad nụrụ ozi Ehab ziri mgbe ya na ndị eze ndị ọzọ ahụ nọ na-aṅụ mmanya nʼụlọ ikwu ha manyere nʼọgbọ agha ahụ. Ben-Hadad nyere ndị agha ya iwu sị ha, “Jikerenụ, buso ndị Izrel agha.” Ya mere, ha kwadoro ibuso obodo ahụ agha.
Lorsque Ben Hadad entendit ce message alors qu'il buvait, lui et les rois dans les pavillons, il dit à ses serviteurs: « Préparez-vous à attaquer! » Ils se préparèrent donc à attaquer la ville.
13 Nʼoge a, otu onye amụma bịakwutere Ehab, bụ eze Izrel sị, “Otu a ka Onyenwe anyị sịrị, ‘Ị hụrụ oke igwe ndị agha a? Aga m enyefe ha nʼaka gị taa, mgbe ahụ ị ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.’”
Voici qu'un prophète s'approcha d'Achab, roi d'Israël, et dit: « L'Éternel dit: As-tu vu toute cette grande foule? Voici que je vais la livrer aujourd'hui entre tes mains. Alors tu sauras que je suis Yahvé. »
14 Ma Ehab jụrụ sị, “Onye ga-eme nke a?” Onye amụma zara, “Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘Ọ bụ ụmụ okorobịa bụ ndịisi agha nọ nʼokpuru ndị ọchịagha na-achị akụkụ ala Izrel.’” Ehab jụkwara ọzọ, “Onye ga-amalite agha a?” Onye amụma ahụ zara, “Gị onwe gị.”
Achab a dit: « Par qui? » Il dit: « Yahvé dit: 'Par les jeunes gens des princes des provinces'. » Puis il a dit: « Qui va commencer la bataille? » Il a répondu: « Vous. »
15 Mgbe ahụ, Ehab kpọkọtara ụmụ okorobịa bụ ndịisi agha si nʼakụkụ obodo ya. Ọnụọgụgụ ha dị narị abụọ na iri atọ na mmadụ abụọ. Ọnụọgụgụ ndị agha Izrel ndị ọzọ dị puku asaa.
Il rassembla ensuite les jeunes gens des chefs des provinces, au nombre de deux cent trente-deux. Après eux, il rassembla tout le peuple, tous les enfants d'Israël, au nombre de sept mille.
16 Nʼetiti ehihie, mgbe Ben-Hadad na iri ndị eze atọ na abụọ ahụ, bụ ndị ahụ bịara inyere ya aka nọ na-aṅụ mmanya, na-aṅụbiga ya oke,
Ils sortirent à midi. Mais Ben Hadad s'enivrait dans les pavillons, lui et les rois, les trente-deux rois qui l'avaient aidé.
17 ụmụ okorobịa, bụ ndị agha, ndị nọ nʼokpuru ndị ọchịagha na-achị akụkụ ala Izrel buru ụzọ pụọ ibu agha. Ma Ben-Hadad, nʼonwe ya ezipụlarị ndị nledo, ndị lọghachiri bịa gwa ya sị, “Ndị agha si Sameria na-abịa.”
Les jeunes gens des princes des provinces sortirent les premiers; Ben Hadad les fit sortir, et on lui dit: « Des hommes sortent de Samarie. »
18 Ọ sịrị, “Ọ bụrụ na ha abịa nʼihi udo, jidenụ ha na ndụ; ọ bụrụ na ha bịara maka ibu agha, jidenụ ha na ndụ!”
Il dit: « S'ils sont sortis pour la paix, prenez-les vivants; ou s'ils sont sortis pour la guerre, prenez-les vivants. »
19 Ma ụmụ okorobịa ndị ọchịchị a bụ ndị nọ nʼokpuru ndịisi, na-achị akụkụ ala ahụ sitere nʼobodo zọlie ije ebe ndị agha so ha nʼazụ, pụọ ibu agha.
Ils sortirent donc de la ville, les jeunes gens des chefs de province et l'armée qui les suivait.
20 Onye ọbụla nʼime ha gburu onye agha Siria ọbụla lụsoro ya ọgụ. Nke a mere ka ndị agha Siria gbapụ ọsọ, ndị agha Izrel chụsokwara ha. Ma Ben-Hadad, eze Aram, na ndị agha na-agba ịnyịnya, sitekwara nʼihu ọgbọ agha ahụ gbapụkwa ọsọ.
Ils tuèrent chacun leur homme. Les Syriens prirent la fuite, et Israël les poursuivit. Ben Hadad, roi de Syrie, s'échappa sur un cheval avec des cavaliers.
21 Ma eze ndị Izrel pụkwuru ya, nwude ọtụtụ ịnyịnya na ụgbọ agha, butere ndị Aram ọghọm dị ukwuu.
Le roi d'Israël sortit, frappa les chevaux et les chars, et tua les Syriens par une grande défaite.
22 Emesịa, onye amụma ahụ bịakwutere eze Izrel sị ya, “Mee onwe gị ka ị dị ike nke ọma, mara ihe e kwesiri ka e mee, nʼihi nʼetiti ọkọchị na udu mmiri nke afọ nʼabịa, eze Aram ga-abịa ibuso gị agha ọzọ.”
Le prophète s'approcha du roi d'Israël et lui dit: « Va, fortifie-toi et prévois ce que tu dois faire, car au retour de l'année, le roi de Syrie montera contre toi. »
23 Ma otu ọ dị, ndịisi agha eze ndị Aram dụrụ ya ọdụ sị, “Chi ha bụ chi ugwu. Nʼihi ya ka ha ji dị ike karịa anyị. Ma ọ bụrụ na anyị ebuso ha agha nʼobosara ala dị larịị, anyị aghaghị ịdị ike karịa ha.
Les serviteurs du roi de Syrie lui dirent: « Leur dieu est un dieu des collines; c'est pourquoi ils ont été plus forts que nous. Mais combattons-les dans la plaine, et nous serons sûrement plus forts qu'eux.
24 Mee ihe a, wepụ ndị eze a niile site nʼebe ha nọ, jiri ndị na-achị ala gbanwee ha.
Fais ceci: enlève les rois, chacun à sa place, et mets des chefs à leur place.
25 Kpọkọtaakwa ndị agha ọzọ, ndị dị ukwuu nʼọnụọgụgụ, dịka ndị agha i du gaa agha na mbụ. Nyekwa anyị ịnyịnya na ụgbọ agha ga-ezuru anyị. Anyị ga-apụkwa buso ndị Izrel agha nʼobosara ala dị larịị. Ọ dịkwaghị ihe ga-egbochi anyị imeri ha nʼoge a.” Ben-Hadad, eze Aram, kwenyere, meere ha dịka ha rịọrọ ya.
Rassemblez une armée comme celle que vous avez perdue, cheval contre cheval et char contre char. Nous les affronterons dans la plaine, et nous serons plus forts qu'eux. » Il écouta leur voix et fit ainsi.
26 Mgbe otu afọ gasịrị, Ben-Hadad chịkọtakwara ndị Aram niile duru ha gaa Afek ibuso Izrel agha.
Au retour de l'année, Ben Hadad rassembla les Syriens et monta à Aphek pour combattre Israël.
27 Mgbe a kpọkọtara ndị agha niile nọ nʼIzrel nye ha ngwa agha, ha pụrụ izute ha. Ndị agha Izrel mara ụlọ ikwu ha na ncherita ihu ndị agha Siria, dịka igwe ewu nta abụọ, ebe ndị Aram jupụtara ala ahụ niile.
Les enfants d'Israël furent rassemblés et reçurent des provisions, puis ils marchèrent contre eux. Les enfants d'Israël campèrent devant eux comme deux petits troupeaux de chevreaux, mais les Syriens remplirent le pays.
28 Onye nke Chineke bịara gwa eze ndị Izrel, “Otu a ka Onyenwe anyị sịrị, ‘Nʼihi na ndị Aram na-eche na Onyenwe anyị bụ chi nke ugwu, na ọ bụghị chi ala ndagwurugwu, aga m arara igwe ndị agha a nyefee gị nʼaka, ka gị na ndị gị mata nʼeziokwu na m bụ Onyenwe anyị.’”
Un homme de Dieu s'approcha et parla au roi d'Israël, en disant: « L'Éternel dit: Parce que les Syriens ont dit: « L'Éternel est le dieu des collines, mais il n'est pas le dieu des vallées », je livrerai entre tes mains toute cette grande multitude, et tu sauras que je suis l'Éternel. »
29 Ọ bụ ụbọchị asaa ka ha mara ụlọ ikwu ha na ncherita ihu ibe ha. Ma nʼụbọchị nke asaa ahụ, ndị agha malitere ibu agha. Ndị Izrel merụrụ narị puku ndị agha Aram ahụ nʼotu ụbọchị.
Ils campèrent l'un en face de l'autre pendant sept jours. Le septième jour, le combat fut engagé, et les enfants d'Israël tuèrent en un jour cent mille hommes de pied des Syriens.
30 Ma ndị fọdụrụ nʼetiti ndị agha Aram gbapụrụ ọsọ gbalaga nʼobodo Afek. Ebe ahụ ka mgbidi obodo Afek nọ dagbuo iri puku ndị agha abụọ na asaa nʼime ha. Ma Ben-Hadad nʼonwe ya gbalagara, gbaba nʼime obodo ahụ, gaa zoo onwe ya nʼime ime otu ụlọ.
Mais les autres s'enfuirent à Aphek, dans la ville, et la muraille tomba sur les vingt-sept mille hommes qui restaient. Ben Hadad s'enfuit et entra dans la ville, dans une pièce intérieure.
31 Mgbe ahụ, ndịisi agha ya bịakwutere ya sị ya, “Lee, anyị nụrụ na ndị eze Izrel bụ ndị obi ebere. Ka anyị yiri akwa mkpe nʼukwu anyị, kee ụdọ nʼolu anyị, gaa rịọọ eze Izrel. Ma eleghị anya ọ ga-edebe gị ndụ.”
Ses serviteurs lui dirent: « Voici, nous avons appris que les rois de la maison d'Israël sont des rois miséricordieux. S'il te plaît, mettons des sacs sur nos corps et des cordes sur nos têtes, et sortons vers le roi d'Israël. Peut-être te sauvera-t-il la vie. »
32 Ya mere, ha yikwasịrị onwe ha akwa mkpe, nyarakwa ụdọ nʼolu ha, jekwuru eze Izrel sị ya, “Ohu gị bụ Ben-Hadad na-asị, ‘Biko, kwee ka m dịrị ndụ.’” Eze jụrụ ha sị, “Ọ bụ ezie na ọ ka dị ndụ ugbu a? Nwanne m ka ọ bụ.”
Ils mirent donc un sac sur leur corps et des cordes sur leur tête, puis ils se présentèrent au roi d'Israël et dirent: « Ton serviteur Ben Hadad dit: « Je t'en prie, laisse-moi vivre. » Il a dit: « Il est encore en vie? C'est mon frère. »
33 Okwu a mere ka ndị ozi eze Aram nwee olileanya. Ha mere ngwangwa kwugharịakwa ihe ahụ o kwuru. Ha sịrị, “E, Nwanne gị bụ Ben-Hadad.” Mgbe ahụ, eze Ehab nyere ha iwu sị, “Gaanụ kpọpụta ya, dutekwanụ ya nʼebe a.” Mgbe Ben-Hadad bịara, Ehab mere ka ọ rigota nʼụgbọ agha nke ya.
Or, les hommes observaient diligemment et se hâtaient de prendre cette phrase; et ils disaient: « Ton frère Ben Hadad. » Puis il a dit: « Va, amène-le. » Ben Hadad sortit vers lui, et le fit monter dans le char.
34 Mgbe ahụ, Ben-Hadad gwara Ehab sị, “Obodo niile nke nna m naara nna gị, ka m ga-enyeghachi gị. I nwere ike iwuru onwe gị ọdụ ahịa nʼama obodo Damaskọs dịka nna m wuru nʼime Sameria.” Ehab kwuru, “Ọ bụrụ na anyị agbaa ndụ, aga m eme ka i nwere onwe gị.” Ya mere, ha abụọ gbara ndụ. Ehab hapụkwara ya ka ọ laa nʼudo.
Ben Hadad lui dit: « Je rétablirai les villes que mon père a prises à ton père. Tu te feras des rues à Damas, comme mon père en a fait à Samarie. » « Je », dit Achab, « te laisserai partir avec cette alliance. » Il fit donc une alliance avec lui et le laissa partir.
35 Emesịa, okwu Onyenwe anyị rutere otu onye nʼetiti ụmụ ndị amụma. Ọ gwara otu nwoke nʼime ụmụ ndị amụma ahụ nọ ya nso sị ya, “Jiri ngwa agha dị gị nʼaka tie m ihe.” Ma nwoke ahụ jụrụ ime ihe onye amụma ahụ kwuru.
Un homme d'entre les fils des prophètes dit à son compagnon par la parole de Yahvé: « Frappe-moi, je te prie! » L'homme refusa de le frapper.
36 Nʼihi nke a, onye amụma gwara nwoke ahụ okwu sị, “Ebe ọ bụ na ị jụrụ ime ihe Onyenwe anyị nyere nʼiwu, lee ihe ga-adakwasị gị. Mgbe i si nʼebe a na-ala nʼụlọ gị, ọdụm ga-ezute gị nʼụzọ dọgbuo gị.” Amụma a mezukwara, nʼihi na mgbe nwoke ahụ tụgharịrị si nʼebe ahụ na-ala, ọdụm lụsoro ya ọgụ nʼụzọ gbuo ya.
Il lui dit alors: « Parce que tu n'as pas obéi à la voix de Yahvé, voici que, dès que tu t'éloigneras de moi, un lion te tuera. » Dès qu'il se fut éloigné de lui, un lion le trouva et le tua.
37 Onye amụma ahụ pụkwara chọta onye ọzọ sị ya, “Biko, tie m ihe.” Nwoke ahụ tiri ya ihe tihịa ya ahụ.
Puis il trouva un autre homme, et dit: « Je te prie de me frapper. » L'homme le frappa et le blessa.
38 Mgbe ahụ, onye amụma ahụ e tiri ihe jiri akwa kechie ihu ya, ka mmadụ ọbụla ghara ịmata onye ọ bụ. Ọ pụrụ gaa guzo nʼakụkụ ụzọ ebe eze Izrel ga-esi gafee.
Le prophète s'en alla et attendit le roi sur le chemin, et il se déguisa avec son bandeau sur les yeux.
39 Mgbe eze na-agafe, onye amụma ahụ tiri mkpu sị, “Onyenwe m, biko gee m ntị. Lee, otu onye agha bịakwutere m mgbe m nọ nʼihu agha sị m, ‘Lee nwoke a a dọtara nʼagha; chee ya nche. Ekwekwala ka ọ gbanarị gị. Nʼihi na ọ bụrụ na o site nʼaka gị gbapụ, ị ga-anwụ, maọbụ i jiri otu talenti ọlaọcha gbara isi gị.’
Comme le roi passait par là, il cria au roi et lui dit: « Ton serviteur est sorti au milieu de la bataille, et voici qu'un homme est venu m'amener un homme et m'a dit: « Garde cet homme! Si, par hasard, il disparaît, alors ta vie vaudra la sienne, ou bien tu paieras un talent d'argent.'
40 Ma mgbe m nọ na-arụ ọrụ ọzọ, nwoke ahụ a dọtara nʼagha gbapụrụ. Ahụkwaghị m ya anya ọzọ.” Mgbe ahụ, eze Izrel zara sị ya, “I jirila ọnụ gị maa onwe gị ikpe. Ị ghaghị ịnata ahụhụ dịrị gị.”
Comme ton serviteur était occupé ici et là, il a disparu. » Le roi d'Israël lui dit: « Il en sera ainsi de ton jugement. C'est toi-même qui l'as décidé. »
41 Mgbe ahụ, onye amụma ahụ mere ngwangwa wepụ akwa ahụ o ji kechie anya ya abụọ. Eze Izrel matakwara na ọ bụ otu onye nʼime ndị amụma.
Il se hâta et ôta le bandeau de ses yeux, et le roi d'Israël reconnut qu'il était l'un des prophètes.
42 Onye amụma ahụ gwara eze okwu sị ya, “Otu a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘Ebe i mere ka nwoke a laa, bụ onye m nyere gị nʼaka ime ka ọ nwụọ, ugbu a, ị ghaghị ịnwụ nʼọnọdụ ya. A ga-alakwa ndị gị nʼiyi, nʼọnọdụ ndị nke ya.’”
Il lui dit: « L'Éternel dit: « Parce que tu as laissé échapper de ta main l'homme que j'avais voué à la destruction, ta vie prendra la place de sa vie, et ton peuple prendra la place de son peuple ». »
43 Nʼihi okwu a, eze Izrel ji iwe na ihu mgbarụ laa nʼụlọ ya dị na Sameria.
Le roi d'Israël s'en alla dans sa maison, renfrogné et furieux, et vint à Samarie.

< 1 Ndị Eze 20 >