< 1 Ndị Eze 19 >

1 Ehab kọọrọ Jezebel ihe niile Ịlaịja mere, na otu o si jiri mma agha gbuo ndị amụma Baal niile.
Ahab told Jezebel all that Elijah had done, and how he had killed all the prophets with the sword.
2 Nʼihi nke a, Jezebel zigara onyeozi ka ọ ga zie Ịlaịja sị, “Ka chi ndị a mesoo m mmeso, nʼagbanyeghị otu mmeso ahụ si dị njọ, ma ọ bụrụ na oge dịka oge a echi, egbughị gị dịka i si gbuo ndị amụma Baal.”
Then Jezebel sent a messenger to Elijah, saying, “So let the gods do to me, and more also, if I don’t make your life as the life of one of them by tomorrow about this time!”
3 Ịlaịja tụrụ egwu, gbapụ ọsọ, nʼihi ichebe ndụ ya. Mgbe ọ bịaruru Bịasheba, dị na Juda, ọ hapụrụ nwokorobịa na-ejere ya ozi nʼebe ahụ.
When he saw that, he arose and ran for his life, and came to Beersheba, which belongs to Judah, and left his servant there.
4 Ma ya onwe ya pụkwara jee ije otu ụbọchị nʼọzara naanị ya. Nʼikpeazụ, ọ kwụsịrị nọdụ ala nʼokpuru otu osisi brum, kpee ekpere rịọọ ka a napụ ya ndụ ya. Ekpere o kpere nʼoge a bụ, “O zuorela m Onyenwe anyị, biko napụ ndụ m. O nweghị ụzọ m si dị mma karịa nna nna m ha.”
But he himself went a day’s journey into the wilderness, and came and sat down under a juniper tree. Then he requested for himself that he might die, and said, “It is enough. Now, O LORD, take away my life; for I am not better than my fathers.”
5 O dinara nʼokpuru osisi brum rahụ ụra. Ma lee, otu oge ahụ, mmụọ ozi metụrụ ya aka, sị ya, “Bilie, rie nri.”
He lay down and slept under a juniper tree; and behold, an angel touched him, and said to him, “Arise and eat!”
6 Ịlaịja biliri legharịa anya, hụ ogbe achịcha na ite mmiri nta nke dị nʼakụkụ ebe ọ tụkwasịrị isi ya. O riri ogbe achịcha ahụ a hụrụ nʼicheku ọkụ, ṅụọkwa mmiri ahụ. Emesịa, o dinakwara ọzọ.
He looked, and behold, there was at his head a cake baked on the coals, and a jar of water. He ate and drank, and lay down again.
7 Mmụọ ozi nke Onyenwe anyị bịaghachikwara nke ugboro abụọ, sị ya, “Bilie rie ihe, nʼihi na ije dị gị nʼihu dị ukwuu.”
The LORD’s angel came again the second time, and touched him, and said, “Arise and eat, because the journey is too great for you.”
8 Ịlaịja biliri rie ihe, ṅụọkwa mmiri. Nri ahụ nyere ya ike ije ije iri ụbọchị anọ ọzọ, ehihie na abalị, tutu ruo mgbe ọ bịaruru nʼugwu Horeb nke bụ ugwu Chineke.
He arose, and ate and drank, and went in the strength of that food forty days and forty nights to Horeb, God’s Mountain.
9 Nʼebe ahụ, ọ banyere nʼotu ọgba nkume rahụ ụra abalị nʼime ya. Ma okwu Onyenwe anyị rutere ya sị, “Ịlaịja, gịnị ka ị na-eme nʼebe a?”
He came to a cave there, and camped there; and behold, the LORD’s word came to him, and he said to him, “What are you doing here, Elijah?”
10 Ọ zaghachiri sị, “Eji m ịnụ ọkụ nʼobi na-ejere Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile ozi. Ndị Izrel ajụla ọgbụgba ndụ gị, tidasịakwa ebe ịchụ aja gị, were mma agha gbukwaa ndị amụma gị niile, ugbu a, ọ bụ naanị mụ onwe m bụ onye fọdụrụ, ma ha na-achọkwa iwepụ ndụ m.”
He said, “I have been very jealous for the LORD, the God of Hosts; for the children of Israel have forsaken your covenant, thrown down your altars, and killed your prophets with the sword. I, even I only, am left; and they seek my life, to take it away.”
11 Onyenwe anyị sịrị ya, “Pụọ gaa guzo nʼelu ugwu, nʼihu Onyenwe anyị, nʼihi na Onyenwe anyị na-aga isite nʼebe ahụ gafee.” Mgbe ahụ, oke ifufe dị ike gbawara ugwu ahụ, tipịasịa nkume ndị ahụ nʼihu Onyenwe anyị, ma Onyenwe anyị anọghị nʼime ifufe ahụ. Mgbe ifufe ahụ gasịrị, e nwere oke ala ọma jijiji nʼugwu ahụ, ma Onyenwe anyị anọkwaghị nʼala ọma jijiji ahụ.
He said, “Go out and stand on the mountain before the LORD.” Behold, the LORD passed by, and a great and strong wind tore the mountains and broke in pieces the rocks before the LORD; but the LORD was not in the wind. After the wind there was an earthquake; but the LORD was not in the earthquake.
12 Mgbe ala ọma jijiji ahụ gasịrị, ọkụ nwuuru, ma Onyenwe anyị anọghị nʼime ọkụ ahụ. Ma mgbe ọkụ ahụ gasịrị, nwa olu nta dị nwayọọ dara.
After the earthquake a fire passed; but the LORD was not in the fire. After the fire, there was a still small voice.
13 Mgbe Ịlaịja nụrụ ya, o ji uwe mwụda ya kpuchie ihu ya, pụọ gaa guzo nʼọnụ ụzọ ọgba nkume ahụ. Mgbe ahụ, ọ nụrụ olu jụrụ ya sị, “Ịlaịja, gịnị ka ị na-eme nʼebe a?”
When Elijah heard it, he wrapped his face in his mantle, went out, and stood in the entrance of the cave. Behold, a voice came to him, and said, “What are you doing here, Elijah?”
14 Ọ zaghachiri sị, “Eji m ịnụ ọkụ nʼobi na-ejere Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile ozi. Ndị Izrel ajụla ọgbụgba ndụ gị, tidasịakwa ebe ịchụ aja gị, were mma agha gbukwaa ndị amụma gị niile, ugbu a ọ bụ naanị mụ onwe m bụ onye fọdụrụ, ma ha na-achọkwa iwepụ ndụ m.”
He said, “I have been very jealous for the LORD, the God of Hosts; for the children of Israel have forsaken your covenant, thrown down your altars, and killed your prophets with the sword. I, even I only, am left; and they seek my life, to take it away.”
15 Onyenwe anyị sịrị ya, “Sikwa ụzọ i si bịa laghachi, gaa nʼọzara Damaskọs. Mgbe i ruru ebe ahụ, tee Hazael mmanụ ịbụ eze Aram.
The LORD said to him, “Go, return on your way to the wilderness of Damascus. When you arrive, anoint Hazael to be king over Syria.
16 Teekwa Jehu, nwa Nimshi mmanụ ịbụ eze Izrel. Ị ga-etekwa Ịlaisha nwa Shafat, onye Ebel-Mehola mmanụ ịbụ onye amụma nʼọnọdụ gị.
Anoint Jehu the son of Nimshi to be king over Israel; and anoint Elisha the son of Shaphat of Abel Meholah to be prophet in your place.
17 Onye ọbụla gbanarịrị Hazael ga-anwụ nʼaka Jehu. Otu a kwa, ndị niile gbanarịrị mma agha Jehu ka Ịlaisha ga-egbu.
He who escapes from the sword of Hazael, Jehu will kill; and he who escapes from the sword of Jehu, Elisha will kill.
18 Ma ghọta na ọ dị puku mmadụ asaa nọ nʼIzrel, ndị na-egbubeghị ikpere ha nʼala nye Baal, maọbụ sutu ya ọnụ, ife ya ofufe.”
Yet I reserved seven thousand in Israel, all the knees of which have not bowed to Baal, and every mouth which has not kissed him.”
19 Ịlaịja sitere nʼebe ahụ pụọ gaa chọta Ịlaisha nwa Shafat ebe ọ nọ na-akọ ala ubi. Iri ehi abụọ na anọ e jikọtara abụọ abụọ dị ya nʼihu, ma ya onwe ya ji ehi abụọ e jikọtara ọnụ, nke iri na abụọ ya na-akọ ala ubi. Ịlaịja jekwuru Ịlaisha wụkwasị ya uwe mwụda ya nʼubu ya.
So he departed from there and found Elisha the son of Shaphat, who was ploughing with twelve yoke of oxen before him, and he with the twelfth. Elijah went over to him and put his mantle on him.
20 Mgbe ahụ, Ịlaisha hapụrụ ehi ndị ahụ ebe ha guzoro nʼubi ahụ gbara ọsọ gbakwuru Ịlaịja sị ya, “Biko, kwere ka m gaa sutu nna m na nne m ọnụ, sị ha nọdụ nke ọma. Emesịa, aga m esokwa gị.” Ịlaịja zara sị ya, “Laghachi azụ, ọ bụ gịnị ka m mere gị?”
Elisha left the oxen and ran after Elijah, and said, “Let me please kiss my father and my mother, and then I will follow you.” He said to him, “Go back again; for what have I done to you?”
21 Ịlaisha laghachiri azụ, gbuo ehi abụọ ahụ e jikọtara nʼotu, kpọọ ihe ahụ e ji arụ ọrụ nʼubi ọkụ, were ha sie anụ ahụ nye ndị mmadụ, ha rie. Mgbe ahụ, o biliri ije pụọ ga soro Ịlaịja, bụrụ nwaodibo ya.
He returned from following him, and took the yoke of oxen, killed them, and boiled their meat with the oxen’s equipment, and gave to the people; and they ate. Then he arose, and went after Elijah, and served him.

< 1 Ndị Eze 19 >