< 1 Ndị Eze 17 >
1 Ugbu a, Ịlaịja onye Tishbe, onye si obodo Tishbe, nke dị nʼala Gilead, sịrị Ehab, “Eji m aha Onyenwe anyị Chineke Izrel dị ndụ, onye m na-efe na onye m na-ejere ozi na-agwa gị na igirigi agaghị ada, mmiri agaghị ezo ọzọ nʼafọ ndị a na-abịa karịa ma ọ bụghị naanị site nʼokwu ọnụ m!”
Awo Eriya Omutisubi ow’e Tisubi mu Gireyaadi, n’agamba Akabu nti, “Mukama Katonda wa Isirayiri gwe mpeereza nga bw’ali omulamu, tewaabe musulo newaakubadde enkuba mu myaka egijja wabula olw’ekigambo kyange.”
2 Okwu Onyenwe anyị rutere Ịlaịja ntị, sị ya,
Awo ekigambo kya Mukama ne kijjira Eriya nga kigamba nti,
3 “Si nʼebe a pụọ. Soro ụzọ ọwụwa anyanwụ, gaa zoo onwe gị nʼakụkụ iyi Kerit, nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ ya, nke bụ nʼihu Jọdan.
“Vva wano ogende ebuvanjuba weekweke ku kagga Kerisi akoolekera Yoludaani.
4 Nọdụ nʼebe ahụ ṅụọ mmiri si nʼiyi ahụ, riekwa nri ọbụla ụmụ ugolọma ga-ebutere gị, nʼihi na enyela m ha iwu ka ha nye gị nri.”
Ojja kunywanga mu kagga, era ndagidde bannamuŋŋoona okukuliisiza eyo.”
5 O mere ihe Onyenwe anyị gwara ya ka o mee. Ọ gara nʼakụkụ iyi nta Kerit nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ Jọdan nọrọ nʼebe ahụ.
N’akola nga Mukama bwe yamulagira, n’alaga ku kagga Kerisi, akoolekera Yoludaani, n’abeera eyo.
6 Ugolọma na-ebutere ya achịcha na anụ, ụtụtụ na anyasị niile. Ọ na-aṅụkwa mmiri site nʼiyi ahụ.
Bannamuŋŋoona ne bamuleeteranga emmere n’ennyama buli nkya na buli kawungeezi, era n’anywanga mu kagga.
7 Ma mgbe ụbọchị ụfọdụ gasịrị, mmiri ahụ tara, nʼihi na mmiri adịghị ezokwa nʼala ahụ.
Bwe waayitawo ebbanga, akagga ne kakalira olw’obutabaawo nkuba mu nsi.
8 Okwu Onyenwe anyị bịakwutere ya,
Awo ekigambo kya Mukama ne kimujjira nga kigamba nti,
9 “Bilie, jee Zarefat, obodo dị Saịdọn nso, biri nʼebe ahụ. O nwere otu nwanyị di ya nwụrụ, onye m nyere iwu ka o nye gị nri.”
“Situkiramu ogende e Zalefaasi ekya Sidoni obeere eyo. Ndagidde nnamwandu ali eyo okukuwanga emmere.”
10 Ịlaịja biliri jee Zarefat. Mgbe o ruru ọnụ ụzọ ama e si abanye obodo ahụ, ọ hụrụ otu nwanyị di ya nwụrụ ka ọ nọ na-achịkọta nkụ. Ịlaịja kpọrọ ya oku sị ya, “Biko, kutere m ntakịrị mmiri nʼiko ka m ṅụọ.”
Awo n’agolokoka n’alaga e Zalefaasi. Bwe yatuuka ku wankaaki w’ekibuga, waliwo nnamwandu eyali alondalonda obuku. Eriya n’amusaba ng’agamba nti, “Nkwegayiridde, ndeetera ku mazzi matono mu kibya nnyweko.”
11 Mgbe nwanyị ahụ na-aga ikute mmiri ahụ, Ịlaịja kpọrọ ya oku ọzọ sị ya, “Biko, wetara m otu iberibe achịcha ka m taa.”
Bwe yali ng’agenda okugakima, Eriya n’amukoowoola ng’agamba nti, “Nkwegayiridde, ndeeteraayo n’omugaati.”
12 Ma nwanyị ahụ zara sị ya, “Dịka Onyenwe anyị Chineke na-adị ndụ, enweghị m achịcha ọbụla nʼụlọ m. Naanị ihe m nwere bụ otu njuaka ụtụ ọka dị nʼite, na mmanụ ntakịrị dị na karama. Ugbu a, ana m achịkọta nkụ ka m baa ga siere onwe m siekwara nwa m nri, ka anyị rie, chere ọnwụ ga-abịa egburu anyị.”
N’addamu nti, “Mukama nga bw’ali omulamu, sirina mugaati okuggyako olubatu lw’obutta mu kibya n’otufuta mu kasumbi, era kaakano nkuŋŋaanya buku mbutwale eka neefumbire nze n’omwana wange tubulye tufe.”
13 Ịlaịja sịrị ya, “Atụla egwu! Gaa mee dịka i kwuru. Ma naanị buru ụzọ meere m ogbe achịcha ntakịrị site nʼihe i nwere, wetara m ya. Emesịa, mee nke gị na nwa gị ga-eri.
Eriya n’amugamba nti, “Totya. Genda eka okole nga bw’ogambye. Naye sooka onfumbire akagaati, okuva mu by’olina okandeteere, oluvannyuma weefumbire ggwe n’omwana wo.
14 Nʼihi na nke a bụ ihe Onyenwe anyị, Chineke Izrel kwuru, ‘Ụtụ ọka dị nʼite ahụ agaghị agwụ, mmanụ ahụ dị nʼite ahụ agakwaghị akọ tutu ruo ụbọchị ahụ Onyenwe anyị ga-ezite mmiri ozuzo nʼala a.’”
Kubanga kino Mukama Katonda wa Isirayiri ky’agamba nti, ‘Ekibya ky’obutta tekiriggwaamu, so n’akasumbi k’amafuta tekalikalira okutuusa olunaku Mukama lw’alitonyesa enkuba ku nsi.’”
15 Nwanyị ahụ mere dịka Ịlaịja kwuru. Sitekwa nʼụbọchị ahụ gaa nʼihu, ihe oriri akọkwaghị Ịlaịja na nwanyị ahụ, na ezinaụlọ ya.
N’agenda n’akola nga Eriya bwe yamugamba, era ne waba emmere bulijjo eya Eriya ne nnamwandu n’amaka ge.
16 Nʼihi na ụtụ ọka ahụ agwụghị, mmanụ akọkwaghị nwanyị ahụ, dịka okwu Onyenwe anyị kwuru site nʼọnụ Ịlaịja, onye amụma.
Ekibya ky’obutta tekyakendeera wadde akasumbi k’amafuta okukalira, ng’ekigambo kya Mukama kye yayogerera mu Eriya bwe kyali.
17 Mgbe ihe ndị a gasịrị, nwa nwanyị ahụ nwe ụlọ rịara ọrịa. Ọrịa a bịara sie ike nke ukwuu na ume afọdụghị nʼime ya.
Bwe waayitawo ebbanga, omwana wa nnamwandu n’alwala nnyo, obulwadde ne bweyongera okutuusa lwe yafa.
18 Mgbe ahụ, nwanyị ahụ kwaara akwa bịakwute Ịlaịja sị ya, “Ewoo, onye nke Chineke, gịnị ka i nwere megide m? Ị bịara ka i chetara m mmehie m, na igbu nwa m nwoke?”
Nnamwandu n’agamba Eriya nti, “Kiki ky’onnanga, omusajja wa Katonda? Wajja okunzijukiza ekibi kyange n’okutta omwana wange?”
19 Ịlaịja zara sị ya, “Kunye m nwa gị nwoke.” Ịlaịja kuuru ya site nʼaka nne ya rigoo nʼụlọ elu ebe ya onwe ya na-edina, nibe ya nʼelu ihe ndina ya.
Eriya n’amuddamu nti, “Mpa omwana wo.” N’amuggya mu kifuba kye, n’amusitula n’amutwala mu kisenge ekya waggulu gye yabeeranga, n’amugalamiza ku kitanda kye.
20 Ọ kpọkuru Onyenwe anyị sị ya, “Onyenwe anyị Chineke m, gịnị mere i ji wetara nwanyị a m bi nʼụlọ ya ihe mgbu site nʼikwe ka nwa nwoke ya nwụọ?”
N’akoowoola Mukama ng’agamba nti, “Ayi Mukama Katonda wange, ne nnamwandu ono gwe mbeera naye omuleeseko ekikangabwa kino, n’otta omwana we?”
21 Ịlaịja gbatịrị onwe ya nʼahụ nwantakịrị ahụ ugboro atọ, kpọkuo Onyenwe anyị, sị, “Biko, Onyenwe anyị Chineke m, kwere ka mkpụrụobi nwantakịrị a laghachikwute ya.”
Eriya ne yeegololera ku mulenzi emirundi esatu, n’akaabira Mukama ng’agamba nti, “Ayi Mukama Katonda wange, obulamu bw’omulenzi ono bukomewo nate!”
22 Onyenwe anyị nụrụ ekpere Ịlaịja, ndụ nwantakịrị ahụ laghachikwutere ya, ọ dịkwara ndụ ọzọ.
Mukama n’awulira okukaaba kwa Eriya, obulamu bw’omulenzi ne bumuddamu, era n’alama.
23 Mgbe ahụ, Ịlaịja kuuru ya si nʼụlọ elu ahụ rịdata, kunye ya nne ya, gwa ya okwu sị, “Lee, nwa gị dị ndụ!”
Awo Eriya n’asitula omwana n’amuserengesa okuva mu kisenge n’amuleeta mu nnyumba, n’amuwa nnyina, n’amugamba nti, “Laba mutabani wo mulamu!”
24 Nwanyị ahụ sịrị Ịlaịja, “Ugbu a, amatala m na ị bụ onye nke chineke, na okwu Onyenwe anyị si nʼọnụ gị apụta bụ eziokwu.”
Awo nnamwandu n’agamba Eriya nti, “Kaakano ntegedde ng’oli musajja wa Katonda, era n’ekigambo kya Mukama ekiva mu kamwa ko kiba kya mazima.”