< 1 Ndị Eze 15 >
1 Abija malitere ịbụ eze Juda, nʼafọ iri na asatọ nke ọchịchị eze Jeroboam nwa Nebat.
Katika mwaka wa kumi na nane wa utawala wa Yeroboamu mwana wa Nebati, Abiya akawa mfalme wa Yuda,
2 Ọ chịrị afọ atọ na Jerusalem. Aha nne ya bụ Maaka, nwa nwanyị Abishalom.
naye akatawala huko Yerusalemu miaka mitatu. Mama yake aliitwa Maaka binti Abishalomu.
3 O mere mmehie niile nna ya mere nʼihu ya; o jighị obi zuruoke gbasoo Onyenwe anyị Chineke ya, dịka obi nna nna ya Devid dị.
Alitenda dhambi zote baba yake alizotenda kabla yake; moyo wake haukuwa mkamilifu kwa Bwana Mungu wake kama moyo wa Daudi baba yake ulivyokuwa.
4 Ma nʼihi Devid, Onyenwe anyị Chineke ya nyere ya oriọna na Jerusalem, site na-ime ka nwa ya nwoke nọchie ọnọdụ ya nakwa ime ka Jerusalem guzosie ike.
Pamoja na hayo, kwa ajili ya Daudi, Bwana Mungu wake akampa taa katika Yerusalemu kwa kumwinua mwana atawale badala yake na kwa kuifanya Yerusalemu kuwa imara.
5 Nʼihi na Devid mere ihe ziri ezi nʼanya Onyenwe anyị, ọ dịghịkwa iwu Onyenwe anyị ọbụla nke ọ na-edebeghị nʼụbọchị ndụ ya niile, ma ọ bụghị naanị ihe banyere okwu Ụraya, onye Het.
Kwa kuwa Daudi alifanya yaliyo mema machoni pa Bwana na hakushindwa kushika maagizo yote ya Bwana siku zote za uhai wake, isipokuwa katika habari ya Uria, Mhiti.
6 Agha dị nʼetiti Abija na Jeroboam nʼụbọchị niile nke ndụ Abija.
Kulikuwa na vita kati ya Rehoboamu na Yeroboamu wakati wote wa maisha ya Abiya.
7 Ma banyere ihe ndị ọzọ niile mere nʼoge ọchịchị Abija, o bụ na e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ndị eze Juda? Agha dịgidere nʼetiti Abija na Jeroboam.
Kwa habari ya matukio mengine ya utawala wa Abiya na yote aliyofanya, je, hayakuandikwa katika kitabu cha kumbukumbu za wafalme wa Yuda? Kulikuwa na vita kati ya Abiya na Yeroboamu.
8 Abija sooro nna nna ya ha dina nʼọnwụ, e lie ya nʼobodo Devid. Asa, nwa ya nwoke ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.
Naye Abiya akalala na baba zake akazikwa katika Mji wa Daudi. Asa mwanawe akawa mfalme baada yake.
9 Nʼafọ nke iri abụọ nke ọchịchị Jeroboam eze Izrel, ka Asa ghọrọ eze Juda.
Katika mwaka wa ishirini wa utawala wa Yeroboamu mfalme wa Israeli, Asa akawa mfalme wa Yuda,
10 Ọ chịrị iri afọ anọ na otu na Jerusalem. Aha nne nne ya bụ Maaka, nwa nwanyị Abishalom.
naye akatawala katika Yerusalemu miaka arobaini na mmoja. Bibi yake aliitwa Maaka binti Abishalomu.
11 Asa mere ihe ziri ezi nʼanya Onyenwe anyị dịka Devid nna ya mere.
Asa akatenda yaliyo mema machoni mwa Bwana, kama alivyokuwa ametenda Daudi baba yake.
12 O sitere nʼala ahụ niile chụpụ ndị ikom akwụna ụlọ arụsị niile, wezugakwa arụsị niile nke ndị nna nna ya ha mere.
Akawafukuza mahanithi wa mahali pa kuabudia miungu kutoka nchi na kuondoa sanamu zote ambazo baba zake walikuwa wametengeneza.
13 Ọ chụdakwara ọbụladị nne nne ya bụ Maaka, site nʼọnọdụ ya dịka nne eze, nʼihi na ọ kpụrụ ihe arụ, ogidi Ashera maka iji fee ya ofufe. Asa gbuturu ya kpọọ ya ọkụ na ndagwurugwu iyi Kidrọn.
Hata akamwondoa bibi yake Maaka kwenye wadhifa wake kama mama malkia, kwa sababu alikuwa ametengeneza nguzo ya Ashera ya kuchukiza. Asa akaikata hiyo nguzo na kuiteketeza kwa moto katika Bonde la Kidroni.
14 Ọ bụ ezie na o wezugaghị ugwu niile dị elu, ma Asa ji obi zuruoke jere Onyenwe anyị ozi nʼoge ndụ ya niile.
Ijapokuwa hakuondoa mahali pa juu pa kuabudia miungu, moyo wa Asa ulikuwa umejiweka kwa Bwana kikamilifu maisha yake yote.
15 O webatara nʼime ụlọnsọ Onyenwe anyị ọlaọcha na ọlaedo na ihe niile nke nna ya na ya onwe ya doro nsọ.
Akaleta ndani ya Hekalu la Bwana fedha na dhahabu na vile vyombo ambavyo yeye na baba yake walikuwa wameviweka wakfu.
16 Ma agha dịgidere nʼetiti Asa na Baasha, eze Izrel ụbọchị ọchịchị ha niile.
Kulikuwa na vita kati ya Asa na Baasha mfalme wa Israeli siku zote za utawala wao.
17 Baasha eze Izrel, busoro Juda agha, wuchie Rema igbochi onye ọbụla na-apụ apụ maọbụ onye na-abata abata nʼoke ala Asa, eze Juda.
Mfalme Baasha wa Israeli akashambulia Yuda na kuweka ngome mji wa Rama ili kumzuia yeyote asitoke wala kuingia nchi ya Mfalme Asa wa Yuda.
18 Mgbe ahụ, Asa chịịrị ọlaọcha na ọlaedo niile dị nʼụlọakụ ụlọnsọ Onyenwe anyị, na ndị dị nʼụlọeze ya, nyefee ya nʼaka ndị ozi ya ka ha chịrị ha zigara Ben-Hadad, nwa Tabrimọm, nwa Hezion, bụ eze Aram, onye na-achị na Damaskọs, sị,
Kisha Asa akachukua fedha yote na dhahabu iliyokuwa imeachwa katika hazina za Hekalu la Bwana na za jumba lake mwenyewe la kifalme. Akawakabidhi maafisa wake na kuwatuma kwa Ben-Hadadi mwana wa Tabrimoni, mwana wa Hezioni, mfalme wa Aramu, aliyekuwa akitawala Dameski.
19 “Biko, ka anyị gbaa ndụ dịka nna m na nna gị mere. Lee, ana m ezitere gị onyinye ọlaọcha na ọlaedo. Ugbu a, mebie ọgbụgba ndụ dị nʼetiti gị na Baasha, bụ eze Izrel, ka o si nʼebe m nọ wezuga onwe ya.”
“Akasema na pawepo mkataba kati yangu na wewe, kama ulivyokuwepo kati ya baba yangu na baba yako. Tazama, nimekuletea zawadi ya fedha na dhahabu. Sasa vunja mkataba wako na Baasha mfalme wa Israeli ili aniondokee mimi.”
20 Ben-Hadad kwenyere eze Asa, zipụ ndị ọchịagha ndị agha ya ka ha gaa buso obodo Izrel niile agha. Ọ lụgburu Ijon, Dan, Ebel-Bet-Maaka na ala Kineret niile, tinyere ala niile nke ndị Naftalị.
Ben-Hadadi akakubaliana na Mfalme Asa na kutuma majemadari wa majeshi yake dhidi ya miji ya Israeli. Akaishinda miji ya Iyoni, Dani, Abel-Beth-Maaka na Kinerethi yote, pamoja na Naftali.
21 Mgbe Baasha nụrụ nke a, ọ kwụsịrị iwu Rema, laghachi biri na Tịaza.
Wakati Baasha aliposikia hili, akaacha kuijenga Rama na akaenda kuishi Tirsa.
22 Mgbe ahụ, eze Asa nyere iwu zigara ndị Juda niile, na ọ dịghị onye iwu ahụ hapụrụ, ha bịara bupusịa nkume na osisi niile dị na Rema, nke Baasha ji na-ewu ihe nʼebe ahụ. Eze Asa ji ihe ndị a wulie Geba nke Benjamin, wuokwa Mizpa.
Kisha Mfalme Asa akatoa amri kwa Yuda yote, pasipo kumbagua hata mmoja, kubeba mawe na mbao kutoka Rama, ambazo Baasha alikuwa akitumia huko. Mfalme Asa akazitumia kujengea Geba iliyoko Benyamini na Mispa pia.
23 Ma banyere ihe ndị ọzọ niile mere nʼoge ọchịchị Asa, na ihe niile ọ rụpụtara na obodo niile ndị o wuru, ọ bụ na e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe e mere nʼoge ndị eze Juda? Ma ọ rịara ọrịa nke metụtara ụkwụ ya abụọ, mgbe o mere agadi.
Kwa matukio yote ya utawala wa Asa, mafanikio yake yote, yote aliyofanya na miji aliyoijenga, je, hayakuandikwa katika kitabu cha kumbukumbu za wafalme wa Yuda? Katika uzee wake, hata hivyo, alipata ugonjwa wa miguu.
24 Asa sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ, e lie ya nʼebe e liri ha, nʼobodo Devid, bụ nna ya. Jehoshafat nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.
Kisha Asa akalala pamoja na baba zake na kuzikwa pamoja nao katika mji wa Daudi baba yake. Naye Yehoshafati mwanawe akawa mfalme baada yake.
25 Nadab, nwa Jeroboam, malitere ịbụ eze Izrel, nʼafọ nke abụọ nke Asa, eze Juda. Ọ chịrị Izrel afọ abụọ.
Nadabu mwana wa Yeroboamu akawa mfalme wa Israeli katika mwaka wa pili wa utawala wa Mfalme Asa wa Yuda, naye akatawala Israeli kwa miaka miwili.
26 O mere ihe dị njọ nʼanya Onyenwe anyị. Ọ gbasoro ụzọ niile nke nna ya ma na-emekwa otu mmehie ahụ nke nna ya ji duba Izrel nʼime mmehie.
Akafanya maovu machoni pa Bwana, akienenda katika njia za baba yake na katika dhambi yake, ambayo alisababisha Israeli kuifanya.
27 Baasha nwa Ahija, onye si nʼebo Isaka gbara izu ọjọọ megide ya. O tidara ya na Gibeton, nʼotu obodo ndị Filistia, mgbe Nadab na ndị Izrel niile nọchibidoro ya.
Baasha mwana wa Ahiya wa nyumba ya Isakari akafanya shauri baya dhidi yake, naye akamuua huko Gibethoni, mji wa Wafilisti, wakati Nadabu na Israeli yote walipokuwa wameuzingira.
28 Baasha gburu Nadab, nọchie ọnọdụ ya dịka eze, nʼafọ nke atọ nke ọchịchị Asa, eze Juda.
Baasha akamuua Nadabu katika mwaka wa tatu wa utawala wa Asa mfalme wa Yuda, naye Baasha akaingia mahali pake kuwa mfalme.
29 Ngwangwa, mgbe ọ malitere ọchịchị ya, o gburu ndị ezinaụlọ Jeroboam niile. O kweghị ka onye ọbụla na-eku ume fọdụ, kama ọ lara ha niile nʼiyi, dịka okwu Onyenwe anyị kwuru site nʼọnụ onyeozi ya, bụ Ahija onye Shilo.
Mara tu alipoanza kutawala, aliua jamaa yote ya Yeroboamu. Hakumwachia Yeroboamu yeyote aliyekuwa hai, bali aliwaangamiza wote, kulingana na neno la Bwana lililotolewa kupitia kwa mtumishi wake Ahiya Mshiloni,
30 Ihe ndị a mere nʼihi mmehie niile Jeroboam mere, nke o mere ka Izrel mee, nakwa nʼihi na ọ kpasuru Onyenwe anyị, bụ Chineke Izrel iwe.
kwa sababu ya dhambi alizokuwa amezitenda Yeroboamu na kusababisha Israeli kuzitenda, tena kwa sababu alimkasirisha Bwana, Mungu wa Israeli.
31 Ma banyere ihe ndị ọzọ niile mere nʼoge ọchịchị Nadab, o bụ na e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe mere nʼoge ndị eze Izrel?
Kwa matukio mengine ya utawala wa Nadabu na yote aliyofanya, je hayakuandikwa katika kitabu cha kumbukumbu za wafalme wa Israeli?
32 Ma agha dịgidere nʼetiti Asa na Baasha, eze Izrel, ụbọchị ọchịchị ha niile.
Kulikuwa na vita kati ya Asa na Baasha mfalme wa Israeli wakati wote wa utawala wao.
33 Nʼafọ nke atọ nke Asa, eze Juda, Baasha nwa Ahija ghọrọ eze ndị Izrel niile na Tịaza. Ọ chịrị iri afọ abụọ na abụọ.
Katika mwaka wa tatu wa utawala wa Asa mfalme wa Yuda, Baasha mwana wa Ahiya akawa mfalme wa Israeli yote huko Tirsa, naye akatawala kwa miaka ishirini na minne.
34 O mere ọtụtụ ihe dị njọ nʼanya Onyenwe anyị. Ọ gbasoro ụzọ ọjọọ niile nke Jeroboam, jeekwa ije nʼime otu mmehie ahụ nke Jeroboam dubara ndị Izrel ime.
Akatenda maovu machoni pa Bwana, akienenda katika njia za Yeroboamu na dhambi yake, ambayo alikuwa amesababisha Israeli kuitenda.