< 1 Ndị Eze 14 >

1 Nʼoge a, Abija nwa Jeroboam nọ nʼọrịa nke dị ukwuu.
It was at that time that Abijah, Jeroboam's son, fell ill.
2 Nʼihi ya, Jeroboam sịrị nwunye ya, “Gaa, jikwaa onwe gị nʼụzọ mmadụ na-enweghị ike ịmata na ị bụ nwunye Jeroboam. Ị ga-ejekwa Shaịlo, Ahija onye amụma nọ nʼebe ahụ, bụ nwoke ahụ gwara m okwu na m ga-abụ eze ndị nke a.
So Jeroboam told his wife, “Please go and disguise yourself so nobody will know you're Jeroboam's wife. Then go to Shiloh and look for Ahijah the prophet. He was the one who told me I would become king over this people.
3 Chịrịkwa ogbe achịcha iri, na achịcha nta ole na ole, na otu karama mmanụ aṅụ, jekwuru ya. Ọ ga-agwa gị ihe ga-eme banyere nwantakịrị a.”
Take with you ten loaves of bread, some cakes, and a jar of honey for him. He will explain to you what will happen to the boy.”
4 Nwunye Jeroboam mere ihe o kwuru, o biliri jee nʼụlọ Ahija na Shaịlo. Ahija bụ agadi nwoke nʼoge a. Ọ naghị ahụkwa ụzọ nʼihi nka ọ kara.
Jeroboam's wife did as she was told. She got up and went to Ahijah's house in Shiloh. Ahijah could not see—he had become blind because of his age.
5 Ma Onyenwe anyị agwalarị Ahija okwu sị ya, “Nwunye Jeroboam na-abịa ịjụta ase nʼaka gị banyere nwa ya nwoke ahụ na-adịghị ike, ọsịsa dị otu a ka i ganye ya. Mgbe ọ ga-abịa ịhụ gị ọ ga-eme onwe ya dịka ọ bụghị nwunye Jeroboam.”
But the Lord had told Ahijah, “Look, Jeroboam's wife is coming to ask you about her son, because he's ill. This is what you are to tell her, because she'll come in disguise.”
6 Mgbe Ahija nụrụ ụda nzọ ụkwụ ya ka ọ na-abata nʼọnụ ụzọ, ọ kpọrọ ya oku sị ya, “Bata, nwunye Jeroboam. Gịnị mere i ji jie ejiji dịka onye ọzọ? Enwere m akụkọ ọjọọ m ga-akọrọ gị
So as soon as Ahijah heard her footsteps at the door, he called out, “Come in, wife of Jeroboam! Why do you bother coming in disguise? I have been given some bad news for you.
7 Ga gwa Jeroboam sị ya, Otu a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel kwuru, ‘Esi m nʼetiti ndị m welie gị elu, mee gị ka ị bụrụ onye ga-achị ndị m, bụ Izrel.
Go and tell Jeroboam this is what the Lord, the God of Israel, says: I picked you from the masses and I made you ruler over my people Israel.
8 Adọwapụrụ m alaeze Izrel site nʼụlọ Devid nye gị ya, ma ị geghị ntị nʼiwu m, maọbụ debe ha dịka ohu m Devid debere ihe niile m nyere ya nʼiwu. Onye echiche obi ya na ihe na-atọ obi ya ụtọ mgbe niile bụ idebe iwu m, na ime ihe ziri ezi nʼanya m.
I took the kingdom from the house of David and gave it to you. But you were not like my servant David, who kept my commandments and was totally committed to following me, only doing what was right in my sight.
9 Ma ihe ọjọọ i mere adịla ukwuu karịa nke ndị niile bu gị ụzọ bụrụ eze mere. Ị kpụọlara onwe gị chi ndị ọzọ, chi ndị e ji ọla kpụọ, si otu a kpasuo m iwe, gbakụta m azụ gị.
You have done more evil than all those who lived before you. You have gone and made other gods for yourself, idols made of molten metal that made me angry. You have tossed me aside.
10 “‘Nʼihi ihe ndị a, aga m eme ka ihe ọjọọ bịakwasị ezinaụlọ Jeroboam. Aga m ekpochapụkwa ụmụ ndị ikom gị niile, ma ndị ohu, ma ndị nwe onwe ha nọ nʼala Izrel. Aga m ekpochapụkwa ụlọ Jeroboam dịka mmadụ si ekpochapụ nsị anụ, ruo mgbe e kpochapụrụ ha niile.
Now pay attention, because as a result of this I am going to bring disaster on the house of Jeroboam. I will totally exterminate every one of your descendants in Israel, whether slave or free. I will burn the house of Jeroboam like a man burning refuse until it's all gone.
11 Nkịta ga-eri ozu ndị nke Jeroboam ndị nwụrụ nʼime obodo, ma ndị nwụrụ nʼọhịa ka anụ ufe nke eluigwe ga-eri ozu ha. Onyenwe anyị ekwuola ya.’
Those of Jeroboam's family who die in the town will be eaten by dogs, and those who die in the countryside will be eaten by birds. For the Lord has spoken.
12 “Ma gị onwe gị, Laa nʼụlọ gị. Mgbe ị na-azọbanye ụkwụ gị nʼobodo, nwokorobịa ahụ ga-anwụ.
As for you, get up and go home. As soon as you arrive in the city, the child will die.
13 Ndị Izrel niile ga-akwa akwa nʼihi ya lie ya. Ọ bụ naanị ya bụ onye a ga-eli eli, nʼihi na nʼime ezinaụlọ Jeroboam, ọ bụ naanị nʼime nwokorobịa a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel chọtara ihe dị mma.
All of Israel will mourn for him, and they will bury him. He alone of Jeroboam's family will be buried in a tomb because only in him has the Lord, the God of Israel found anything good—of the whole family of Jeroboam.
14 “Ma Onyenwe anyị ga-emekwa ka eze ọzọ bilie nʼIzrel, onye ga-ekpochapụ ezinaụlọ Jeroboam niile. O bidola taa, e, ma ugbu a kwa!
The Lord will choose for himself a king to rule over Israel who will destroy the house of Jeroboam. This is starting to happen even now!
15 Onyenwe anyị ga-eti Izrel ihe, mee ka ọ maa jijiji dịka osisi achara nke ikuku na-ebugharị nʼime mmiri. Ọ ga-ehopu Izrel site nʼezi ala o nyere nna nna ha, fesaa ha nʼofe osimiri Yufretis, nʼihi na ha akpasuola iwe Onyenwe anyị site nʼiguzobe ogidi ofufe Ashera.
The Lord will strike Israel like a reed jerked to and fro by the water. He will pull up Israel by the roots from this good land that he gave their forefathers and scatter them beyond the Euphrates, because they have made their pagan Asherah poles, making the Lord angry.
16 Ọ ga-agbakụta Izrel azụ nʼihi mmehie Jeroboam mere, ma meekwa ka Izrel niile soro ya mehie.”
He will abandon Israel because of the sins of Jeroboam, those that he committed himself, and those he made Israel commit.”
17 Mgbe ahụ, nwunye Jeroboam biliri laghachi Tịaza. Ma nwokorobịa ahụ nwụrụ mgbe ọ na-azọbata ụkwụ ya nʼọnụ ụzọ ụlọ ha.
Jeroboam's wife got up and left for Tirzah. As soon as she stepped through the doorway of her home, the boy died.
18 Ha liri ya, ndị Izrel niile rukwara ụjụ nʼihi ya, dịka okwu Onyenwe anyị si dị, nke o kwuru site nʼọnụ Ahija, onye amụma.
All of Israel buried him and mourned for him, just as the Lord had said through his servant Ahijah the prophet.
19 Ihe niile ọzọ Jeroboam mere, na ihe niile banyere ibu agha ya niile, na ọtụtụ ihe ọzọ dị iche iche banyere ọchịchị ya, ka e dere nʼakwụkwọ akụkọ ihe ndị eze Izrel mere.
The rest of what Jeroboam did, how he engaged in warfare and how he reigned, they are recorded in the Book of Chronicles of the Kings of Israel.
20 Jeroboam chịrị Izrel iri afọ abụọ na abụọ. O sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ, nwa ya Nadab ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.
Jeroboam reigned for twenty-two years, and then he died. His son Nadab succeeded him as king.
21 Nʼoge a, Rehoboam nwa Solomọn, bụ eze Juda. Ọ gbara iri afọ anọ na otu mgbe ọ malitere ịbụ eze. Ọ chịrị afọ iri na asaa na Jerusalem, bụ obodo ahụ Onyenwe anyị họọrọ site nʼetiti ebo niile nke Izrel, bụ ebe ọ ga-akpọkwasị Aha ya. Aha nne ya bụ Naama, onye Amọn.
Rehoboam, son of Solomon, reigned in Judah. He was forty-one when he became king, and he reigned seventeen years in Jerusalem, the city the Lord had chosen from all the tribes of Israel where he would be honored. The name of his mother was Naamah the Ammonite.
22 Mgbe ahụ, ndị Juda mehiekwara megide Onyenwe anyị. Ha sitere nʼọtụtụ mmehie ha mere, nke karịrị mmehie nke ndị nna nna ha ochie mere, kpasuo ekworo ya.
Judah did what was evil in the Lord's sight, and because of the sins they committed they made his jealous anger even greater than all their fathers had done.
23 Ha wukwara nye onwe ha ebe ịchụ aja na ogidi arụsị nʼelu ugwu niile, na ogidi chi Ashera, na nʼokpuru osisi ọbụla akwụkwọ ndụ dị nʼelu ya.
They also set up for themselves high places, sacred pillars, and Asherah poles on every high hill and under every green tree.
24 E nwere ndị ikom akwụna nʼala ahụ, ndị nọ nʼụlọ arụsị ha dị iche iche. Ndị mmadụ mere ụdị ihe arụ ahụ nke ndị mba niile ndị ahụ na-eme, bụ mba ndị ahụ Onyenwe anyị sitere nʼihu ndị Izrel chụpụ.
There were even cult prostitutes in the land. They followed all the disgusting practices of the nations that the Lord had driven out before the Israelites.
25 Nʼafọ nke ise, nke ọchịchị eze Rehoboam, Shishak, eze Ijipt, busoro Jerusalem agha.
In the fifth year of King Rehoboam's reign, Shishak, king of Egypt, attacked Jerusalem.
26 O bukọrọ akụ niile dị nʼime ụlọ Onyenwe anyị, na akụ niile dịkwa nʼụlọeze. Ọ kwakọọrọ ihe niile, werekwa ọta ọlaedo niile ndị ahụ Solomọn kpụrụ.
He took the treasures of the Lord's Temple and the royal palace. He took everything, including all the gold shields Solomon had made.
27 Ma eze Rehoboam kpụrụ ọta bronz i ji dochie ndị ahụ, nyefee ha nʼaka ndịisi ndị nche, bụ ndị na-eche nʼọnụ ụzọ ụlọeze nche ka a lekọta ha anya.
So King Rehoboam made bronze shields to replace them and handed them over to the captains of the guard to look after. They stood on duty at the entrance to the royal palace.
28 Mgbe ọbụla eze na-aga nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, ndị nche na-ebu ọta ndị ahụ, emesịa, ha na-ebughachikwa ha nʼime ụlọ ndị nche.
Whenever the king went to the Lord's Temple, the guards would carry the shields. Afterwards they returned them to the guardroom.
29 Ma banyere ihe ndị ọzọ niile mere nʼoge ọchịchị Rehoboam, na ihe niile o mere, ọ bụ na e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ndị eze Juda?
The rest of what happened in Rehoboam's reign and everything that he did are recorded in the Book of Chronicles of the Kings of Judah.
30 Agha dịgidere nʼetiti Rehoboam na Jeroboam ụbọchị niile nke ndụ ha.
Rehoboam and Jeroboam were always at war with each other.
31 Rehoboam sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ, e lie ya nʼebe e liri ha nʼobodo Devid. Aha nne ya bụ Naama, onye Amọn. Abija nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.
Rehoboam died and was buried with his ancestors in the City of David. The name of his mother was Naamah the Ammonite. His son Abijam succeeded him as king.

< 1 Ndị Eze 14 >