< 1 Ndị Eze 10 >

1 Mgbe eze nwanyị Sheba nụrụ akụkọ Solomọn, na ịdị na mma nke dị nʼetiti ya na Onyenwe anyị, ọ bịara ka o were ọtụtụ ajụjụ siri ike nwalee Solomọn.
And when the queen of Sheba heard of the fame of Solomon in connection with the name of the Lord, she came to prove him with riddles.
2 Ọ bịarutere Jerusalem, ya na ọtụtụ ndị ozi nʼebe ha bara ụba, ndị so ya, tinyere ọtụtụ ịnyịnya kamel ndị bu ụda dị iche iche, ọtụtụ ọlaedo na nkume dị oke ọnụahịa dị iche iche. Ọ bịakwutere Solomọn, ya na ya kparịtara ụka banyere ihe niile nke dị ya nʼobi.
And she came to Jerusalem with an exceedingly great train, with camels bearing spices, and gold in great abundance, and precious stones: and when she was come to Solomon, she spoke with him of all that was on her heart.
3 Solomọn zara ya ajụjụ ya niile; ọ dịkwaghị ihe siiri eze ike ịkọwara ya.
And Solomon solved [for] her all her questions: nothing remained hidden from the king, which he did not tell her.
4 Mgbe eze nwanyị Sheba hụrụ amamihe niile nke Solomọn, hụkwa ụlọeze o wuru,
And when the queen of Sheba saw all Solomon's wisdom, and the house that he had built,
5 na ihe oriri a na-adọkwasị nʼelu tebul ya, usoro ọnọdụ nke ndịisi ọchịchị ya, na ndị guzo na-ejere ya ozi nʼuwe ha yi, onye na-ebu iko ihe ọṅụṅụ ya, na aja nsure ọkụ niile ọ na-achụ nʼụlọnsọ Onyenwe anyị, ọ dịkwaghị ihe ọzọ ọ maara ọ ga-eme, maọbụ kwuo.
And the food of his table, and the sitting of his servants, and the attendance of his ministers, and their apparel, and his cup-bearers, and his ascent by which he went up unto the house of the Lord: there was no more spirit in her.
6 Ọ sịrị eze, “Akụkọ niile m nọ nʼala m nụ banyere ihe niile ị rụpụtara na amamihe gị bụ eziokwu.
And she said to the king, The truth only was the word that I heard in my own land of thy acts and of thy wisdom.
7 Ma ekwenyeghị m akụkọ ndị a tutu ruo mgbe m bịara jiri anya m abụọ hụ ha. Nʼezie, ihe m nụrụ erughị ọkara; nʼamamihe nakwa nʼịba ụba gị, ị tụkwasịla ihe nʼakụkọ m nụrụ.
And I believed not in the words, until I came, and my eyes saw [all]: and, behold, the half hath not been told me; thou excellest in wisdom and prosperity the report which I have heard.
8 Lee, ụdị ọṅụ ndị gị na-enwe. Lee, ụdị ọṅụ nke ndị ozi na-enwe, bụ ndị na-eguzo nʼihu gị mgbe niile na-anụ okwu amamihe gị.
Happy are thy men, happy are these thy servants, who stand before thee continually, who hear thy wisdom.
9 Ngọzị dịrị Onyenwe anyị Chineke gị, onye nwere mmasị nʼebe ị nọ, o debere gị nʼocheeze Izrel. Nʼihi ịhụnanya nke Onyenwe anyị na-adị ruo mgbe ebighị ebi nʼebe Izrel nọ, o meele gị eze, ka ị debe ikpe ziri ezi na ezi omume.”
Blessed be the Lord thy God, who hath had delight in thee, to place thee on the throne of Israel; because the Lord loveth Israel for ever, therefore hath he made thee king, to do justice and righteousness.
10 O nyere Solomọn onyinye ọlaedo ịdị arọ ya dị puku kilogram anọ, nyekwa ya ọtụtụ ụda na-esi isi ụtọ dị iche iche, na ọtụtụ nkume dị oke ọnụahịa. O nwebeghị oge ọzọ ewebatara ọtụtụ ụda na-esi isi ụtọ dịka ndị ahụ eze nwanyị Sheba nyere eze Solomọn.
And she gave to the king one hundred and twenty talents of gold, and of spices a very great store, and precious stones: there came no more spices in such abundance as these which the queen of Sheba gave to king Solomon.
11 (Ọzọkwa, ọtụtụ ụgbọ mmiri nke eze Hiram bubatara ọlaedo site nʼỌfịa bulatara Solomọn. Ha sitekwara nʼebe ahụ bute osisi almụg nʼebe ọ bara ụba, na ọtụtụ nkume dị oke ọnụahịa dị iche iche.
And also the ship of Hiram, that fetched gold from Ophir, brought in from Ophir in great abundance sandal-wood and precious stones.
12 Eze ji osisi almụg ndị a wuo ogidi ndabere dị nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị na nke ụlọeze. O jikwa ya meere ndị na-abụ abụ ụbọ akwara na une. Ọ dịbeghị mgbe ọbụla ahụrụ maọbụ tụbata osisi almụg ha otu a site nʼụbọchị ahụ ruo taa.)
And the king made of the sandal-wood a railing for the house of the Lord, and for the king's house, and harps and psalteries for the singers: there came no such sandal-wood, nor was it seen [again] until this day.
13 Eze Solomọn nyekwara eze nwanyị Sheba ihe niile ọ chọrọ na ihe niile bụ nke ọ rịọrọ, na-agụnyeghị onyinye niile Solomọn nyere ya dịka eze ọ bụ. Emesịa, ọ hapụrụ laghachi nʼala nke aka ya, ya na ndị na-ejere ya ozi.
And king Solomon gave unto the queen of Sheba all her pleasure, whatsoever she asked, beside what Solomon gave her of his royal bounty. So she turned about and went to her own country, she and her servants.
14 Ọtụtụ ịdị arọ nke ọlaedo Solomọn na-enweta kwa afọ bụ puku kilogram iri abụọ na atọ,
Now the weight of the gold that came to Solomon in one year was six hundred and sixty and six talents of gold,
15 na-agụnyeghị uru nke na-esi nʼaka ndị na-atụ mgbereahịa na ndị na-azụ ahịa na nke sitekwara nʼaka ndị eze Arebịa niile, nakwa nʼaka ndịisi na-achị obodo niile nke ala ahụ.
Beside [what he had] of the traveling tradesmen, and of the traffic of the merchants, and of the kings of confederate nations, and of the governors of the country.
16 Eze Solomọn kpụrụ narị ọta ọlaedo ukwu abụọ site nʼọlaedo etipịara etipịa. Ọ bụ ọlaedo nke ịdị arọ ya ruru kilogram isii na ụma itoolu ka eji kpụọ ọta ọbụla.
And king Solomon made two hundred targets of beaten gold: six hundred shekels of gold he used for each one target.
17 Ọ kpụkwara narị ọta nta atọ, nke sitere na ọlaedo etipịara etipịa. Ọ bụ ọlaedo ịdị arọ ya ruru kilogram atọ na ọkara ka eji kpụọ ọta ọbụla. Eze debere ha nʼụlọeze nʼOke Ọhịa Lebanọn.
And [he made] three hundred shields of beaten gold; three manehs of gold he used for each one shield: and the king put them in the house of the forest of Lebanon.
18 Eze mekwara ocheeze dị ukwu nke e ji ọdụ enyi na ọlaedo a nụchara anụcha machie.
The king also made a great throne of ivory, and overlaid it with the best gold.
19 Ocheeze ahụ nwere ihe nrigo isii, o nwere elu dị gburugburu nʼazụ ya. E nwere ebe ntụkwasị aka nʼakụkụ abụọ ya, nke nwere oyiyi ọdụm abụọ guzo nʼakụkụ nke ọbụla nʼime ha.
The throne had six steps, and there was a round top on the throne behind; and there were arms on either side on the place of the seat, and two lions stood beside the arms.
20 Ọdụm iri na abụọ na-eguzo nʼelu ihe nrigo isii ahụ, otu nʼakụkụ isi abụọ nke ihe nrigo ọbụla. Ọ dịkwaghị alaeze ọzọ dị nke e mere ihe dị otu a nye.
And twelve lions stood there upon the six steps on both sides: there was not the like made in any other kingdom.
21 Ihe niile Solomọn nwere nke e ji aṅụ ihe bụ ọlaedo ka e ji mee ha. Ngwongwo niile nke dị nʼime ụlọeze nʼOke Ọhịa Lebanọn bụkwa ọlaedo a nụchara anụcha ka e ji kpụọ ha. Ọ dịghị ihe e ji ọlaọcha kpụọ, nʼihi na-agụnyeghị ọlaọcha dịka ihe ọbụla nʼoge Solomọn.
And all king Solomon's drinking-vessels were of gold, and all the vessels of the house of the forest of Lebanon were of pure gold; none were of silver; it was not valued in the days of Solomon at the least.
22 Eze nwere ọtụtụ ụgbọ mmiri e ji azụ ahịa nʼoke osimiri, tinyere ụgbọ nke Hiram. Otu ugbo nʼafọ atọ, ka ụgbọ mmiri ndị a na-alọta, buru ọlaedo, ọlaọcha na ọdụ enyi, enwe na adaka dị iche iche bata.
For the king had a Tharshish-ship at sea with the ship of Hiram: once in three years the Tharshish-ship used to come home, laden with gold, and silver, ivory, and apes, and peacocks.
23 Eze Solomọn bara ụba nʼakụ, nwekwa amamihe karịa ndị eze niile dị nʼụwa.
And king Solomon became greater than all the kings of the earth for riches and for wisdom.
24 Ụwa niile na-abịa ịchọ ihu Solomọn ka ha nụta okwu amamihe nke Chineke tinyere nʼobi ya.
And [men of] all the earth sought the presence of Solomon to hear his wisdom, which God had put in his heart.
25 Onye ọbụla bịakwutere ya na-ebutere ya onyinye ịnata ihuọma, ya bụ ngwa ọlaọcha na ọlaedo, uwe dị iche iche, ngwa agha, ụda dị iche iche, ịnyịnya na ịnyịnya muul, nke a bụ kwa afọ, kwa afọ.
And they brought every man his present, vessels of silver, and vessels of gold, and garments, and armor, and spices, horses, and mules: and so year by year.
26 Solomọn chịkọbara ọtụtụ ụgbọ agha na ịnyịnya dị iche iche. O nwere ụgbọ agha dị otu puku na narị anọ na ịnyịnya agha dị puku iri na abụọ nʼọnụọgụgụ, ndị o debere ụfọdụ nʼime ha nʼobodo ụgbọ agha ya ma ndị ọzọ dị na Jerusalem ebe ya onwe ya nọ.
And Solomon gathered together chariots and horsemen: and he had a thousand and four hundred chariots, and twelve thousand horsemen, whom he quartered in the cities for chariots, and near the king at Jerusalem.
27 Eze mere ka ọlaọcha baa ụba dịka nkume efu na Jerusalem. O mekwara ka osisi sida dị ọtụtụ dịka osisi sikamọ nke dị nʼala ala ugwu dị iche iche.
And the king rendered the silver in Jerusalem like stones, and the cedars he rendered like the sycamore-trees that are in the lowlands, for abundance.
28 A na-esite nʼIjipt nakwa ala Kue atụbatara Solomọn ịnyịnya. Ndị ahịa eze na-azụta ha site na Kue nʼọnụ ahịa a na-ere ha nʼoge ahụ.
And Solomon had horses brought out of Egypt; and a company of the king's merchants bought a quantity at a price.
29 Ha sitere nʼIjipt tụbata otu ụgbọ agha nʼọnụ ahịa narị shekel ọlaọcha isii, jirikwa otu narị shekel na iri shekel ise zụta otu ịnyịnya. Ha zipụkwara ha nye ndị eze niile nke ndị Het na ndị Aram.
And a chariot-team came up and went out of Egypt for six hundred shekels of silver, and a horse for a hundred and fifty: and so for all the kings of the Hittites, and for the kings of Syria, did they bring them out by their means.

< 1 Ndị Eze 10 >