< 1 Ndị Eze 1 >

1 Mgbe eze Devid ghọrọ agadi, nʼagbanyeghị na-eji ọtụtụ uwe kpuchie ya, ahụ ya ekpoghị ọkụ.
King David had grown old and couldn't keep warm in bed however many blankets they used to cover him.
2 Ya mere, ndị na-ejere ya ozi sịrị ya, “Ka anyị chọtara eze otu nwaagbọghọ na-amaghị nwoke, onye ga-akwụ nʼihu eze ma bụrụkwa onye ga-elekọta ya. O nwere ike idina nʼakụkụ onyenwe anyị bụ eze ime ka ahụ kpoo ya ọkụ.”
So his officials suggested, “Let a search be made on behalf of Your Majesty for a young virgin to serve you and look after you. She can lie next to you and keep you warm.”
3 Ha gagharịrị nʼala Izrel niile chọọ nwaagbọghọ mara mma, chọta otu nwaagbọghọ onye Shunem, aha ya bụ Abishag, kpọtaara ya eze.
So they searched the whole country of Israel for a beautiful young woman and found Abishag from the town of Shunem and took her to the king.
4 Nwaagbọghọ a mara mma nke ukwuu; ọ lekọtakwara eze, jekwaara ya ozi ma ya na eze enweghị mmekọ ọbụla.
She was very beautiful, and she looked after the king, attending to his needs, but he did not have sex with her.
5 Nʼoge a, Adonaịja onye nne ya bụ Hagit, wepụtara onwe ya, kwuo sị, “Aga m abụ eze.” Nʼihi nke a, ọ kwadooro onwe ya ụgbọ agha na ọtụtụ ịnyịnya, kpọtakwa iri ndị ikom ise, ndị ga-agba ọsọ nʼihu ya.
Adonijah, son of Haggith, was busy promoting himself, saying “I'm going to be king!” He arranged chariots and horsemen for himself, and fifty men to run ahead of him.
6 Na ndụ Adonaịja niile, o nweghị oge nna ya baara ya mba site nʼịjụ ya, “Gịnị mere i ji akpa agwa dị otu a?” Ọ bụ nwokorobịa mara mma nke ukwuu; ọ bụ ya na-esotekwa nwanne ya Absalọm.
(Never in his life had his father corrected him. He'd never asked him, “Why did you do that?” He was also very good-looking, and had been born after Absalom.)
7 Adonaịja na Joab, nwa Zeruaya tinyere Abịata onye nchụaja, kparịtara ụka. Ha kwenyere inyere ya aka ka ọ ghọọ eze.
Adonijah discussed his plan with Joab, son of Zeruiah, and with Abiathar the priest, who agreed to support him.
8 Ma Zadọk onye nchụaja, Benaya nwa Jehoiada, Netan onye amụma, Shimei, Rei na ndị agha niile na-eche Devid nche esonyeghị Adonaịja.
But Zadok the priest, Benaiah, son of Jehoiada, Nathan the prophet, Shimei, Rei, and David's bodyguard were not on Adonijah's side.
9 Adonaịja chịịrị atụrụ, ehi na ụmụ ehi gbara abụba, gaa nʼakụkụ En-Rogel chụọ aja na Nkume Zohelet. Ọ kpọrọ ụmụnne ya niile bụ ụmụ ndị ikom eze na ndịisi Juda niile, ndị na-ejere eze ozi oku,
Adonijah invited all his brothers, the king's sons, and the king's officials of Judah, to come to the stone of Zoheleth, which is near En-rogel, where he sacrificed sheep, cattle and fattened calves.
10 ma ọ kpọghị Netan onye amụma, maọbụ Benaya, maọbụ ndị agha niile na-eche Devid nche. Ọ kpọkwaghị Solomọn nwanne ya.
But he didn't invite Nathan the prophet, Benaiah, David's bodyguard, or his brother Solomon.
11 Mgbe ahụ, Netan onye amụma jụrụ Batsheba nne Solomọn ajụjụ sị, “Ị nụghị na Adonaịja nwa Hagit aghọọla eze ugbu a, ma onyenwe anyị bụ Devid amaghị ihe ọbụla banyere ya?
Nathan went to Bathsheba, Solomon's mother, and asked her, “Haven't you heard that Adonijah, son of Haggith, has become king, and His Majesty King David doesn't even know?
12 Ma ugbu a, ka m dụọ gị ọdụ otu ị ga-esi zọpụta ndụ gị na ndụ nwa gị Solomọn.
Let me give you some advice so you can save your life, and that of your son Solomon.
13 Bakwuru eze Devid sị ya, ‘Onyenwe m bụ eze, ọ bụ na i kweghị m bụ ohu gị nkwa sị: “Nʼezie, Solomọn nwa gị ga-abụ eze nʼọnọdụ m, ọ ga-anọdụ nʼocheeze m”? Ma gịnị mere Adonaịja ji bụrụ eze?’
Go immediately to King David and ask him, ‘Didn't Your Majesty swear to me, your servant, saying, Your son Solomon will definitely be king after me and will sit on my throne? So why is Adonijah saying he's king?’
14 Mgbe ị ka nọ na-akpanyere eze ụka, mụ onwe m ga-abịakwute gị gbaa okwu niile ị na-ekwu ume.”
Then I'll come in while you're still there talking with the king and I'll confirm what you're saying.”
15 Batsheba bakwuuru eze nʼime ụlọ. Eze emeela nnọọ agadi nke ukwuu. Abishag onye Shunem nọkwa na-elekọta ya.
So Bathsheba went to see the king in his bedroom. He was very old and Abishag was looking after him.
16 Batsheba gburu ikpere nʼala, kpọọ isiala nye eze. Mgbe ahụ, eze jụrụ ya sị, “Gịnị ka ị na-achọ?”
Bathsheba bowed low in respect. He asked her, “What is it that you want?”
17 Batsheba zara sị ya, “Onyenwe m, i jiri Onyenwe anyị Chineke gị ṅụọrọ m iyi, kwee m nkwa sị na nwa m Solomọn ga-abụ eze, nọdụkwa nʼocheeze gị.
She replied, “Your Majesty, you swore to me, your servant, by the Lord your God, ‘Your son Solomon will definitely be king after me and will sit on my throne.’
18 Ma ugbu a, Adonaịja aghọọla eze, ma gị onyenwe m bụ eze amaghị ihe banyere nke a.
But now Adonijah has become king and Your Majesty doesn't even know.
19 O jirila ọtụtụ igwe ehi na ụmụ ehi gbara abụba, na atụrụ chụọ aja. Ọ kpọkwara ụmụ ndị ikom eze niile na Abịata onye nchụaja, na Joab onyeisi agha. Ma ọ kpọghị Solomọn bụ ohu gị.
He has sacrificed plenty of cattle, fattened calves, and sheep, and he has invited all the king's sons, Abiathar the priest, and Joab the army commander. But he didn't invite your servant Solomon.
20 Ma ugbu a, onyenwe m eze, ndị Izrel niile na-ele gị anya isi nʼọnụ gị nụta onye ga-anọchi anya gị, ịnọkwasị nʼocheeze eze gị.
Now, Your Majesty, everyone in Israel is watching to see who you're going to say will be the next king.
21 Ma ọ bụghị otu a, ngwangwa onyenwe m bụ eze ga-esoro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ, mụ onwe m na nwa m Solomọn ka a ga-emeso mmeso dịka ndị mmebi iwu.”
If you don't do anything, as soon as Your Majesty dies, I and my son Solomon will be considered traitors…”
22 Mgbe Batsheba nọ na-akpanyere eze ụka, Netan onye amụma batara.
Right then, while she was still speaking with the king, Nathan the prophet arrived.
23 A gwara eze okwu sị, “Netan onye amụma nọ nʼebe a.” Ya mere, ọ gara nʼihu eze kpọọ isiala nye ya.
The king was told, “Nathan the prophet is here.” Nathan went in to see the king. He bowed down with his face to the ground.
24 Netan sịrị, “Onyenwe m, bụ eze, ọ bụ gị onwe gị sịrị Adonaịja ga-abụ eze mgbe ị nwụrụ, na ọ ga-anọkwasịkwa nʼocheeze gị?
Nathan asked the king, “Your Majesty, you must have announced, ‘Adonijah will be king after me and will sit on my throne.’
25 Taa, ọ gaala jiri ọtụtụ igwe ehi, na ụmụ ehi gbara abụba, na ụmụ atụrụ chụọ aja. Ọ kpọọkwala ụmụ ndị ikom eze niile. Ọ kpọkwara ndịisi agha, na Abịata onye nchụaja. Ha na ya na-eri ihe oriri, na-aṅụkwa ihe ọṅụṅụ, na-eti mkpu na-asị, ‘Eze Adonaịja ga-adị ruo mgbe ebighị ebi.’
For today he has gone and sacrificed many cattle, fattened calves, and sheep, and he has invited all the king's sons, the army commanders, and Abiathar the priest. Right now they are eating and drinking with him, shouting, ‘Long live King Adonijah!’
26 Ma ha akpọghị mụ bụ ohu gị na Zadọk, onye nchụaja, na Benaya nwa Jehoiada, na ohu gị bụ Solomọn.
But he didn't invite me, your servant, or Zadok the priest, or Benaiah, son of Jehoiada, or your son Solomon.
27 Ọ bụ site nʼaka onyenwe m bụ eze ka ihe nke a siri mee, ma i meghị ka ndị ohu ya mata onye ga-anọdụ nʼocheeze onyenwe m eze, mgbe ọ nọghịkwa ya?”
If Your Majesty did this, you certainly didn't inform your officials as to who is meant to sit on your throne as the next king.”
28 Mgbe ahụ, Devid kwuru okwu sị, “Kpọọrọnụ m Batsheba.” Batsheba batara, guzo nʼihu eze.
King David replied, “Call Bathsheba for me.” Bathsheba came in and stood before the king.
29 Mgbe ahụ, eze ṅụrụ iyi sị ya, “Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, Onye ahụ napụtara m site na nsogbu m niile,
The king swore a vow, saying, “As the Lord lives, who has saved me from all kinds of trouble, just as I swore to you previously by the Lord the God of Israel,
30 otu ahụ m siri ṅụrụ gị iyi nʼaha Onyenwe anyị, Chineke Izrel, sị, na Solomọn nwa gị ga-abụ eze nʼọnọdụ m, ọ bụ ya ga-anọchi anya m, nọdụkwa nʼocheeze m. Otu ahụ ka m ga-eme nʼụbọchị taa.”
telling you Solomon your son will be the next king and he will sit on my throne instead of me—I swear I will do this today.”
31 Mgbe ahụ, Batsheba kpọrọ isiala, gbukwaa ikpere nʼihu eze sị ya, “Ka onyenwe m eze Devid dịrị ndụ ruo mgbe ebighị ebi.”
Bathsheba bowed with her face to the ground, honoring the king and said, “May Your Majesty King David live forever.”
32 Mgbe ahụ, Devid nyere iwu sị, “Kpọọrọ m Zadọk onye nchụaja, na Netan onye amụma, na Benaya, nwa Jehoiada.” Mgbe ha niile bịara nʼihu eze,
Then King David said, “Call for me Zadok the priest, Nathan the prophet, and Benaiah, son of Jehoiada.” When they arrived,
33 ọ sịrị ha, “Duru ndị ozi onyenwe unu, tinyere unu onwe unu, mee ka Solomọn nwa m nọkwasị nʼelu ịnyịnya muul nke mụ onwe m, kpọrọnụ ya gbada Gaihọn.
the king told them, “Take the king's officials with you, and have them put Solomon on my own mule and lead him down to the Gihon Spring.
34 Nʼebe ahụ, ka Zadọk onye nchụaja, na Netan onye amụma, tee ya mmanụ ịbụ eze Izrel. Fụkwaanụ opi, tiekwanụ mkpu sị, ‘Eze Solomọn ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi.’
There have Zadok the priest and Nathan the prophet anoint him king of Israel. Blow the trumpet and shout out, ‘Long live King Solomon!’
35 Mgbe ahụ, unu na ya ga-esokwa gbagota, ọ ga-abịa nọkwasị nʼocheeze m ịchị nʼọnọdụ m. Nʼihi na ọ bụ ya ka m họpụtara ịchị eze nʼIzrel na Juda.”
Then follow him back up, and have him come and sit on my throne. He is to be king instead of me. I am placing him in charge as ruler of Israel and Judah.”
36 Benaya nwa Jehoiada zara eze sị, “Amen, ka Onyenwe anyị Chineke onyenwe m na eze, kwupụta ya ka ọ dị otu a.
“Amen!” replied Benaiah, son of Jehoiada. “May the Lord, the God of my lord the king, confirm this!
37 Dịka Onyenwe anyị si nọnyere onyenwe m bụ eze, biko, ka o si otu a nọnyere Solomọn ime ka ocheeze ya dị ukwuu karịa ocheeze onyenwe m bụ eze Devid.”
In the same way the Lord was with my lord the king may he be with Solomon, and may he make his reign even greater than the reign of my lord King David.”
38 Ya mere, Zadọk, onye nchụaja, na Netan onye amụma, na Benaya, nwa Jehoiada, na ndị Keret na ndị Pelet, duuru Solomọn mee ya ka ọ nọkwasị nʼelu ịnyịnya muul nke eze Devid. Emesịa, ha duuru ya gaa Gaihọn.
Zadok the priest, Nathan the prophet, and Benaiah, son of Jehoiada, together with the Cherethites and Pelethites, went and placed Solomon on King David's mule, and led him down to the Gihon Spring.
39 Nʼebe ahụ, Zadọk onye nchụaja wepụtara mpi mmanụ ahụ dị nʼụlọ nzute Chineke, were tee Solomọn nʼisi. Ha fụkwara opi. Mgbe ahụ, ndị mmadụ niile tiri mkpu sị, “Ka eze Solomọn dịrị ndụ ruo mgbe ebighị ebi.”
Zadok the priest took the horn containing olive oil from the Tent and anointed Solomon. Then they blew the trumpet, and all the people shouted, “Long live King Solomon!”
40 Ndị Izrel niile sooro ya rigoo, na-afụ ọja na-aṅụrịkwa oke ọnụ, ruo nʼala mara jijiji nʼihi oke ụzụ.
Everyone followed him, playing flutes and celebrating so happily that the sound shook the earth.
41 Adonaịja na ndị ọbịa ya niile nụrụ mkpu ọṅụ ahụ mgbe ha onwe ha na-erisi nri. Mgbe Joab nụrụ opi ike ka ọ na-ada, ọ jụrụ sị, “Gịnị mere oke ụzụ dị otu a ji na-ada nʼime obodo.”
Adonijah and all his guests heard the noise as they were finishing eating. When Joab heard the sound of the trumpet, he asked, “What's all this noise coming from the city?”
42 Ma mgbe ọ ka kpụ okwu ahụ nʼọnụ, lee Jonatan nwa Abịata onye nchụaja, ka ọ batara. Adonaịja sịrị, “Bata! Nʼihi na ị bụ ezi mmadụ amaara m na ọ bụ oziọma ka i ji bịa.”
While he was speaking, Jonathan, son of Abiathar the priest, suddenly arrived. “Come on in,” said Adonijah. “A good man like you must be bringing good news.”
43 Jonatan zara ya sị, “Mba, ọ dịghị otu ahụ! Onyenwe anyị eze Devid emeela Solomọn eze.
“Absolutely not!” Jonathan replied. “Our lord King David has made Solomon king!
44 Eze e zigala ya na Zadọk onye nchụaja, na Netan onye amụma, na Benaya nwa Jehoiada, ndị Keret na ndị Pelet sokwa duru ya gaa. Ha mere ka ọ nọkwasị nʼelu ịnyịnya muul eze.
He sent Solomon to be anointed with Zadok the priest, Nathan the prophet, and Benaiah, son of Jehoiada, and the Cherethites and the Pelethites. They had him ride on the king's mule.
45 Zadọk onye nchụaja na Netan onye amụma eteela ya mmanụ na Gaihọn ịbụ eze. Ha esitekwala nʼebe ahụ ṅụrụ ọṅụ na-alaghachikwa, ndị obodo niile nọkwa ugbu a na-eme mkpọtụ, na-aṅụrịkwa ọṅụ. Ọ bụkwa ụzụ ọṅụ ha ka unu nụrụ.
Zadok the priest and Nathan the prophet anointed him king at the Gihon Spring. Now they have returned, celebrating with shouts that echo round the city. That's the noise you're hearing.
46 Solomọn na-anọkwasị nʼocheeze ugbu a.
On top of that, Solomon is sitting on the royal throne,
47 Ọzọkwa, ndị na-ejere eze ozi abịala ikele onyenwe anyị eze Devid ekele, na-asị, ‘ka Chineke gị mee ka aha Solomọn bụrụ aha a ma ama karịa nke gị, ka ocheeze Solomọn dịkwa ukwuu karịa nke gị.’ Eze nọkwa nʼelu ihe ndina ya kpọọ isiala ofufe,
and the royal officials have also gone to voice their approval to our lord King David, saying, ‘May your God make Solomon's reputation even more famous than your own, and may he make his reign greater than your reign.’ The king on his bed bowed his head,
48 sị, ‘Otuto dịrị Onyenwe anyị, Chineke Izrel onye mere ka m jiri anya m hụ onye nọchiri anya nʼocheeze m taa.’”
and said, ‘Praise the Lord, the God of Israel! Today he has provided a successor to sit on my throne, and I have been privileged to see it.’”
49 Mgbe ahụ, Adonaịja, na ndị ọbịa ya si nʼebe ha na-eri ihe malie. Onye ọbụla sikwa nʼebe ahụ gbapụ ọsọ, nʼihi ụjọ.
When all of the guests who were supporting Adonijah heard this they shook with fear. They got up and rushed out in different directions.
50 Ma Adonaịja tụrụ egwu nke ukwuu ihe Solomọn ga-eme ya, nʼihi ya, ọ gara jide mpi dị nʼebe ịchụ aja aka.
Adonijah was terrified of Solomon, so he ran off. He went and grabbed hold of the horns of the altar.
51 Mgbe ahụ, a gwara Solomọn sị, “Adonaịja na-atụ egwu ihe Solomọn ga-eme ya, nʼihi ya ọ na-ejide mpi ebe nchụaja aka. Ọ na-asị, ‘Ka eze Solomọn ṅụọra m iyi taa sị na ọ gaghị eji mma agha gbuo ohu ya.’”
Solomon was told, “Adonijah is terrified of Your Majesty. He has grabbed hold of the horns of the altar, saying, ‘Let King Solomon swear today that he won't kill me, his servant!’”
52 Solomọn zara sị, “Ọ bụrụ na o gosi onwe ya dịka onye kwesiri ntụkwasị obi, otu agịrị isi dị ya nʼisi agaghị ada nʼala, ma ọ bụrụ na a hụta ihe ọjọọ na nʼaka ya, ọ ga-anwụ.”
Solomon replied, “If he is an honorable man, not one hair of his will fall to the ground. But if he shows himself to be evil, he will die.”
53 Mgbe ahụ, eze Solomọn, zigara ndị ozi mere ka o site nʼebe nchụaja rịdata. Adonaịja bịara kpọọ isiala nye eze Solomọn. Mgbe ahụ, Solomọn sịrị ya, “Laa nʼụlọ gị.”
King Solomon had Adonijah brought down from the altar, and he came and bowed down before King Solomon, who told him, “Go home.”

< 1 Ndị Eze 1 >