< 1 Jọn 5 >
1 Onye ọbụla kweere na Jisọs bụ Kraịst bụ onye amụrụ site na Chineke. Onye ọbụla nke hụkwara Nna nʼanya na-ahụkwa Ọkpara ya nʼanya.
Wonke okholwa ukuthi uJesu unguKristu uzelwe nguNkulunkulu; laye wonke othanda umzali uthanda lozelwe nguye.
2 Ọ bụ otu a ka anyị si amata na anyị hụrụ ụmụ Chineke nʼanya, mgbe anyị na-ahụ Chineke nʼanya, na-erubekwa isi nʼiwu ya niile.
Ngalokho siyazi ukuthi siyabathanda abantwana bakaNkulunkulu, nxa sithanda uNkulunkulu, njalo sigcina imilayo yakhe;
3 Nke a bụ ịhụnanya Chineke, na anyị ga-edebe iwu ya. Iwu ya adịghịkwa arọ.
ngoba lolu luthando lukaNkulunkulu, ukuthi sigcine imilayo yakhe; lemilayo yakhe kayinzima.
4 Nʼihi na onye ọbụla amụrụ site na Chineke na-emeri ụwa. Nke a bụkwa mmeri ahụ na-emeri ụwa, ọ bụladị okwukwe anyị.
Ngoba konke okuzelwe nguNkulunkulu kuyawunqoba umhlaba; lalokho yikunqoba okunqoba umhlaba, ukholo lwethu.
5 Onye pụrụ imeri ụwa, ma ọ bụghị naanị onye ahụ kweere na Jisọs bụ Ọkpara Chineke?
Ngubani onqoba umhlaba, ngaphandle kokholwa ukuthi uJesu uyiNdodana kaNkulunkulu?
6 Ọ bụ onye ahụ bịara site na mmiri na ọbara, ya bụ Jisọs Kraịst. O siteghị naanị na mmiri bịa, kama o sitere na mmiri na ọbara. Ọ bụkwa Mmụọ Nsọ na-agba ama maka ya, nʼihi na Mmụọ Nsọ bụ eziokwu.
Lo nguye oweza ngamanzi legazi, uJesu Kristu; kungeyisikho ngamanzi kuphela, kodwa ngamanzi legazi. LoMoya nguye ofakazayo, ngoba uMoya uliqiniso.
7 Nʼihi na ha dị atọ gbara akaebe:
Ngoba bathathu abafakazayo ezulwini, uYise, uLizwi, loMoya oNgcwele; laba abathathu banye.
8 Mmụọ Nsọ, na mmiri na ọbara, ha atọ kwekọrịtara.
Njalo bathathu abafakazayo emhlabeni, uMoya, lamanzi, legazi; laba abathathu bahlanganyela intonye.
9 Ọ bụrụ na anyị nabata akaebe nke mmadụ gbara, akaebe nke Chineke gbara dị ukwuu karịa, nʼihi na ọ bụ akaebe Chineke gbara banyere Ọkpara ya.
Uba sisemukela ubufakazi babantu, ubufakazi bukaNkulunkulu bukhulu; ngoba lobu yibufakazi bukaNkulunkulu, abufakazileyo ngeNdodana yakhe.
10 Onye ọbụla kweere nʼỌkpara Chineke nwere ọgbụgba ama a nʼobi ya. Ma onye ọbụla na-ekwereghị na Chineke emeela ya ka ọ bụrụ onye ụgha, nʼihi na o kwereghị nʼama ahụ Chineke gbara banyere Ọkpara ya.
Okholwa eNdodaneni kaNkulunkulu ulobufakazi phakathi kwakhe ngokwakhe; ongakholwa uNkulunkulu, umenze abe ngumqambimanga, ngoba engakholwanga ubufakazi uNkulunkulu abufakazileyo ngeNdodana yakhe.
11 Ama ahụ bụkwa nke a, na Chineke enyela anyị ndụ ebighị ebi, ndụ a dịkwa nʼime Ọkpara ya. (aiōnios )
Yilobu-ke ubufakazi, ukuthi uNkulunkulu usinikile impilo elaphakade, lale impilo iseNdodaneni yakhe. (aiōnios )
12 Onye ọbụla nwere Ọkpara ahụ nwere ndụ ma onye ọbụla na-enweghị Ọkpara Chineke enweghị ndụ.
Olayo iNdodana ulempilo; ongelayo iNdodana kaNkulunkulu kalampilo.
13 Ana m edere unu ihe ndị a unu ndị kweere nʼaha Ọkpara Chineke, ime ka unu mata na unu nwere ndụ ebighị ebi. (aiōnios )
Lezizinto ngizibhalela lina elikholwa ebizweni leNdodana kaNkulunkulu, ukuze lazi ukuthi lilempilo elaphakade, lokuze likholwe ebizweni leNdodana kaNkulunkulu. (aiōnios )
14 Nkwuwa okwu anyị nwere na ya bụ, na ọ bụrụ na anyị arịọ ihe ọbụla dịka ọchịchọ obi ya siri dị, ọ na-anụ olu anyị.
Njalo yilesi isibindi esilaso kuye, ukuthi uba sicela ulutho ngokwentando yakhe, uyasizwa;
15 Ọ bụrụkwanụ na anyị matara na ọ na-anụ olu anyị mgbe ọbụla anyị rịọrọ ya ihe, anyị na-amatakwa na anyị anatala ihe ọbụla anyị rịọrọ ya.
uba-ke sisazi ukuthi uyasizwa, loba yini esiyicelayo, siyazi ukuthi sesilezicelo esizicela kuye.
16 Ọ bụrụ na onye ọbụla ahụ ka nwanna ya na-eme mmehie nke na-adịghị eduba nʼọnwụ, ya kpee ekpere, Chineke ga-enyekwa onye ahụ ndụ. Nke a bụ maka ndị ahụ mmehie ha na-abụghị nke na-eduba nʼọnwụ. E nwere mmehie na-eduba nʼọnwụ. Asịghị m unu kpee ekpere maka nke ahụ.
Uba umuntu ebona umzalwane wakhe esona isono esingasi ekufeni, uzacela, njalo uzamnika impilo labo abangonelanga ekufeni. Sikhona isono esisa ekufeni; kangitsho ukuthi ancenge ngaleso;
17 Ajọ omume niile bụ mmehie, ma ọ dị mmehie nke na-adịghị eduba nʼọnwụ.
konke ukungalungi kuyisono; njalo kukhona isono esingasi ekufeni.
18 Anyị matara na onye ọbụla amụrụ site na Chineke anaghị aga nʼihu na-eme mmehie, kama onye ahụ nke amụrụ site na Chineke na-echekwa ha, ajọ onye ahụ adịghị emetụkwa ha aka.
Siyazi ukuthi wonke ozelwe nguNkulunkulu koni; kodwa ozelwe nguNkulunkulu uyazigcina, lomubi kamthinti.
19 Anyị maara na anyị bụ ụmụ Chineke, ụwa niile nọkwa nʼokpuru ike ajọ onye ahụ.
Siyazi ukuthi singabakaNkulunkulu, lokuthi umhlaba wonke ulele ebubini.
20 Anyị matakwara na Ọkpara Chineke abịala, nyekwa anyị nghọta ka anyị mara ya, onye bụ eziokwu. Anyị nọ nʼime onye ahụ bụ eziokwu, ọ bụladị nʼime Ọkpara ya, bụ Jisọs Kraịst. Ya onwe ya bụ ezi Chineke bụrụkwa ndụ ebighị ebi. (aiōnios )
Njalo siyazi ukuthi iNdodana kaNkulunkulu isifikile, yasinika ukuqedisisa ukuze simazi oweqiniso; njalo sikuye oweqiniso, eNdodaneni yakhe uJesu Kristu. Yena unguNkulunkulu weqiniso, lempilo elaphakade. (aiōnios )
21 Ụmụ m, wezuganụ onwe unu site nʼarụsị niile.
Bantwanyana, zilondolozeni ezithombeni. Ameni.