< 1 Jọn 2 >

1 Ezi ụmụntakịrị m, ana m edere unu ihe ndị a ka unu ghara imehie. Ma ọ bụrụ na onye ọbụla emehie, anyị nwere onye na-ekwuchite ọnụ anyị nʼihu Nna ahụ. Ọ bụ Jisọs Kraịst, Onye ezi omume ahụ.
Children, I am writing these things to you so that you will not sin. But if anyone sins, we have an advocate with the Father, Jesus Christ, the one who is righteous.
2 Ọ bụ onye jiri onwe ya chụọ aja nʼihi ikpuchiri anyị mmehie anyị, ma ọ bụghị naanị nʼihi mmehie anyị, ọ bụkwa nʼihi mmehie ụwa niile.
He is the propitiation for our sins, and not for ours only, but also for the whole world.
3 Otu a ka anyị si amata na anyị maara onye ọ bụ, ma ọ bụrụ na anyị erube isi nye iwu ya niile.
We know that we have come to know him, if we keep his commandments.
4 Onye ahụ na-ekwu sị, “Amaara m ya,” ma ọ dịghị eme ihe o nyere nʼiwu bụ onye okwu ụgha, eziokwu ahụ adịghịkwa nʼime ya.
The one who says, “I know God,” but does not keep his commandments, is a liar, and the truth is not in him.
5 Ma ọ bụrụ na onye ọbụla na-erube isi nʼokwu ya, nʼezie, ịhụnanya Chineke bụ ihe emere ka o zuo oke nʼime ya. Ọ bụ otu a ka anyị si amata na anyị nọ nʼime ya.
But whoever keeps his word, truly, in him truly the love of God has been perfected. By this we know that we are in him:
6 Onye ọbụla na-ekwu na ya bi nʼime ya kwesiri ibi ndụ dịka ya.
whoever says that he remains in God should himself also walk just as he walked.
7 Ndị enyi m hụrụ nʼanya, anaghị m edere unu ihe gbasara iwu ọhụrụ, kama ọ bụ otu iwu ochie ahụ, nke na-adị site na mbụ. Iwu ochie a bụ nke e ziri unu ozi banyere ya.
Beloved, I am not writing a new commandment to you, but an old commandment that you have had from the beginning. The old commandment is the word that you heard.
8 Ma otu ọ dị, ana m edere unu iwu ọhụrụ, nke bụ eziokwu nʼime ya na nʼime unu. Nʼihi na ọchịchịrị na-agafe, ezi ìhè ebidola ịchawapụta.
Yet I am writing a new commandment to you, which is true in Christ and in you, because the darkness is passing away, and the true light is already shining.
9 Onye ọbụla na-asị na ya nọ nʼìhè ma na-akpọ nwanna ya asị, na-anọ nʼọchịchịrị ruo ugbu a.
The one who says that he is in the light and hates his brother is in the darkness until now.
10 Onye ọbụla na-ahụ nwanna ya nʼanya na-ebi nʼime ihe ahụ ọ dịkwaghị ìhè dị nʼime onye dị otu a bụ nke ga-eme ya ka ọ sụọ ngọngọ.
The one who loves his brother remains in the light and there is no occasion for stumbling in him.
11 Ma onye ọbụla na-akpọ nwanna ya asị nọ nʼọchịchịrị, na-ejegharịkwa nʼime ọchịchịrị; ọ maghị ebe ọ na-aga nʼihi na ọchịchịrị ahụ emeela ka o kpuo ìsì.
But the one who hates his brother is in the darkness and walks in the darkness; he does not know where he is going, because the darkness has blinded his eyes.
12 Ana m edere unu ihe ndị a ụmụntakịrị m nʼihi na a gbagharala unu mmehie niile site nʼaha ya.
I am writing to you, dear children, because your sins are forgiven because of his name.
13 Ana m edere unu ndị bụ nna ihe ndị a, nʼihi na unu maara onye ahụ na-adị site na mbụ. Ana m edere unu ụmụ okorobịa, nʼihi na unu emeriela ajọ onye ahụ.
I am writing to you, fathers, because you know the one who is from the beginning. I am writing to you, young men, because you have overcome the evil one. I have written to you, little children, because you know the Father.
14 Ana m edere unu ụmụntakịrị, nʼihi na unu maara nna ahụ. Ana m edere unu ndị nna, nʼihi na unu maara onye ahụ na-adị site na mbụ. Ana m edere unu ụmụ okorobịa, nʼihi na unu siri ike, okwu Chineke na-ebikwa nʼime unu, unu emeriekwala ajọ onye ahụ.
I have written to you, fathers, because you know the one who is from the beginning. I have written to you, young men, because you are strong, and the word of God remains in you, and you have overcome the evil one.
15 Kwụsịnụ ịhụ ụwa nʼanya, ya na ihe niile dị nʼụwa. Ọ bụrụ na onye ọbụla ahụ ụwa nʼanya ịhụnanya nke Nna adịghị nʼime ya.
Do not love the world nor the things that are in the world. If anyone loves the world, the love of the Father is not in him.
16 Nʼihi na ihe niile dị nʼụwa, ihe ndị ahụ niile anụ ahụ anyị, na anya anyị na-achọ, ya na ịnya isi mmadụ banyere ihe ọ bụ na ihe o nwere, esiteghị nʼebe Nna nọ, kama ha sitere nʼụwa.
For everything that is in the world—the lust of the flesh, the lust of the eyes, and the arrogance of life—is not from the Father but is from the world.
17 Ụwa na ọchịchọ ọjọọ ya niile na-agafe agafe, ma onye ahụ na-eme uche Chineke ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi. (aiōn g165)
The world and its desire are passing away. But whoever does the will of God will remain forever. (aiōn g165)
18 Ụmụ m, nke a bụ oge awa nke ikpeazụ. Dịka unu nụrụ na otu onye na-emegide Kraịst na-abịa, ọ bụladị ugbu a, ọtụtụ ndị na-emegide Kraịst abịala. Otu a ka anyị si amata na ọ bụ oge awa nke ikpeazụ.
Little children, it is the last hour. Just as you heard that the antichrist is coming, now many antichrists have come. By this we know that it is the last hour.
19 Ha si nʼetiti anyị pụọ, ma ha abụghị ndị nke anyị nʼezie. Nʼihi na a sị na anyị na ha bụ otu, ha gaara aga nʼihu soro anyị nọdụ. Ma ọpụpụ ha pụrụ na-egosi na ọ dịghị onye nʼime ha sonyere anyị.
They went out from us, but they were not from us. For if they had been from us they would have remained with us. But when they went out, that showed they were not from us.
20 Ma unu nwere otite mmanụ sitere nʼOnye Nsọ ahụ, unu niile matakwara ihe niile.
But you have an anointing from the Holy One, and you all know the truth.
21 Ya mere, anaghị m edegara unu akwụkwọ a dịka ndị na-amaghị eziokwu kama nʼihi na unu maara ya na nʼihi na ọ dịghị okwu ụgha ọbụla na-esi nʼeziokwu ahụ apụta.
I did not write to you because you do not know the truth, but because you know it and because no lie is from the truth.
22 Onye bụ onye okwu ụgha? Ọ bụ onye ahụ na-asị na Jisọs abụghị Kraịst ahụ. Onye dị otu a bụ onye na-emegide Kraịst, nʼihi na ọ nabataghị Nna ahụ na Ọkpara ya.
Who is the liar but the one who denies that Jesus is the Christ? That person is the antichrist, since he denies the Father and the Son.
23 Onye ọbụla jụrụ Ọkpara ahụ enwekwaghị Nna ahụ; ma onye ọbụla nabatara Ọkpara ahụ nwekwara Nna ahụ.
No one who denies the Son has the Father. Whoever acknowledges the Son also has the Father.
24 Hụnụ na ihe unu nụrụ site na mmalite na-anọgide nʼime unu. Ọ bụrụ na ihe unu nụrụ na mbido ebiri nʼime unu, unu ga-anọgide nʼime Ọkpara ahụ na nʼime Nna ahụ.
As for you, let what you have heard from the beginning remain in you. If what you heard from the beginning remains in you, you will also remain in the Son and in the Father.
25 Ihe o kwere anyị na nkwa bụ nke a, ndụ ebighị ebi. (aiōnios g166)
This is the promise he gave to us—eternal life. (aiōnios g166)
26 Ana m edere unu ihe ndị a banyere ndị ahụ na-agbalị iduhie unu.
I have written these things to you about those who would lead you astray.
27 Ma unu onwe unu, otite mmanụ ahụ unu natara nʼaka ya na-anọgide nʼime unu, nʼihi nke a, onye ozizi ọzọ adịghị unu mkpa. Dịka otite mmanụ ya na-ezi unu ihe banyere ihe niile, bụrụkwa eziokwu, ọ bụghị okwu ụgha. Ya mere, dịka o zikwara unu, na-anọgidenụ nʼime ya.
As for you, the anointing that you received from him remains in you, and you do not need anyone to teach you. But as his anointing teaches you everything and is true and is not a lie, and just as it has taught you, remain in him.
28 Ugbu a ụmụntakịrị m, nọgidesienụ ike nʼime ya, ka ọ ga-abụ mgbe e mere ka ọ pụta ìhè, anyị ga-abụ ndị obi siri ike, ndị ihere na-agaghị eme, nʼihu ya mgbe ọ bịara.
Now, dear children, remain in him, so that when he appears, we will have boldness and not be ashamed before him at his coming.
29 Ọ bụrụ na unu matara na ọ bụ onye ezi omume, unu maara na onye ọbụla nke na-eme ihe ziri ezi bụ onye a mụrụ site na ya.
If you know that he is righteous, you know that everyone who does what is right has been born from him.

< 1 Jọn 2 >