< 1 Jọn 1 >

1 Ihe anyị na-edere unu banyere ya bụ ihe ahụ na-adịrị site na mmalite, nke anyị nụrụ, nke anyị jikwa anya anyị hụ, nke anyị lekwasịrị anya, na nke aka anyị metụrụ. Anyị na-ekwu ihe banyere Okwu nke ndụ ahụ.
That which was from the beginning—which we have heard, which we have seen with our eyes, which we have looked at, and our hands have touched—it is about the Word of life.
2 Ndụ ahụ pụtara ihe. Anyị ahụla ya ma gbaakwa ama banyere ya. Ya mere, ihe anyị na-ekwu okwu ya, na ihe anyị na-akọrọ unu bụ banyere ndụ ebighị ebi ahụ nke ya na Nna nọ na mbụ; nke e mere ka ọ pụta ìhè nye anyị. (aiōnios g166)
Also, the life was made known, and we have seen it, and we bear witness to it. We are announcing to you the eternal life, which was with the Father, and which has been made known to us. (aiōnios g166)
3 Anyị na-ekwusara unu ihe anyị hụrụ na nke anyị nụrụ, ka unu soro anyị nwee nnwekọ. Nʼezie nnwekọ anyị bụ nke anyị na Nna na nke Ọkpara ya bụ Jisọs Kraịst, na-enwekọ.
That which we have seen and heard we declare also to you, so you also will have fellowship with us. Our fellowship is with the Father and with his Son, Jesus Christ.
4 Anyị na-edere unu ihe ndị a nʼihi ime ka ọṅụ anyị zuo oke.
Also, we are writing these things to you so that our joy will be complete.
5 Nke a bụ ozi ahụ anyị nụrụ site nʼaka ya, nke anyị na-ekwusakwara unu. Chineke bụ ìhè, ọchịchịrị ọbụla adịghịkwa nʼime ya.
This is the message that we have heard from him and are announcing to you: God is light, and in him there is no darkness at all.
6 Ya mere ọ bụrụ na anyị asị na anyị na ya nọ nʼezi nnwekọ ma na-ebi nʼime ọchịchịrị, ọ bụ okwu ụgha ka anyị na-ekwu. Eziokwu ahụ adịghịkwa nʼime anyị.
If we say that we have fellowship with him and walk in darkness, we are lying and are not practicing the truth.
7 Ma ọ bụrụ na anyị na-ebi ndụ anyị nʼìhè, dị ka ya onwe ya si nọọ nʼìhè, mgbe ahụ anyị na ibe anyị na-enwe ezi nnwekọ. Ọbara Jisọs bụ Ọkpara ya na-asachapụkwa anyị mmehie anyị niile.
But if we walk in the light as he is in the light, we have fellowship with one another, and the blood of Jesus his Son cleanses us from every sin.
8 Ma ọ bụrụ na anyị asị na anyị adịghị eme mmehie, anyị na-eduhie onwe anyị, na-ajụkwa ịnabata eziokwu ahụ nʼime anyị.
If we say that we have no sin, we are deceiving ourselves, and the truth is not in us.
9 Ma ọ bụrụ na anyị ekwupụta mmehie anyị, onye ahụ kwesiri ntụkwasị obi na onye ezi omume, ọ ga-agbaghara anyị mmehie anyị niile, sachapụkwa anyị site nʼajọ omume anyị niile.
But if we confess our sins, he is faithful and just to forgive us our sins and cleanse us from all unrighteousness.
10 Ọ bụrụ na anyị asị na anyị emeghị mmehie ọbụla, anyị na-akpọ ya onye na-ekwu okwu ụgha, okwu ya enwekwaghị ọnọdụ nʼime anyị.
If we say that we have not sinned, we make him out to be a liar, and his word is not in us.

< 1 Jọn 1 >