< 1 Ndị Kọrint 1 >

1 Pọl, onye a kpọrọ ịbụ onyeozi Jisọs Kraịst site nʼọchịchọ Chineke, na nwanna anyị nwoke Sostenis,
Paul, called to be an apostle of Jesus Christ through the will of God, and our brother Sosthenes,
2 Ọ bụ unu nzukọ Chineke dị na Kọrint ka a na-edere akwụkwọ a, ndị e doro nsọ nʼime Kraịst Jisọs, na ndị a kpọrọ ibi ndụ dị nsọ, tinyere ndị ahụ niile na-akpọku aha Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, onye bụ Onyenwe ha na Onyenwe anyị:
to the assembly of God which is at Corinth—those who are sanctified in Christ Jesus, called saints, with all who call on the name of our Lord Jesus Christ in every place, both theirs and ours:
3 Ka amara na udo nke sitere na Chineke Nna anyị, na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst dịrị unu.
Grace to you and peace from God our Father and the Lord Jesus Christ.
4 Ana m ekele Chineke ekele nʼihi onyinye amara niile o nyere unu site na Kraịst Jisọs.
I always thank my God concerning you for the grace of God which was given you in Christ Jesus,
5 Nʼihi na e emeela ka unu baa ụba nʼụzọ niile, nʼime ya, ma nʼokwu unu ma na nghọta unu. O meekwala ka unu nwee nghọta zuru ezu banyere eziokwu niile. Ọ na-emekwa ka unu nwee ike na-ekwupụta okwu banyere oziọma ya.
that in everything you were enriched in him, in all speech and all knowledge—
6 Nʼihi na ịgba akaebe banyere Kraịst pụtara ihe, guzosiekwa ike na ndụ unu.
even as the testimony of Christ was confirmed in you—
7 Otu ihe si dị, ọ dịghị onyinye mmụọ fọdụrụ unu nke unu na-enweghị, ka unu nọrọ na-eche mgbe Chineke ga-egosipụta Onyenwe anyị Jisọs Kraịst.
so that you come behind in no gift, waiting for the revelation of our Lord Jesus Christ,
8 Ọ ga-eme ka unu dị ike ruo na mgbe ikpeazụ, meekwa ka unu bụrụ ndị na-enweghị ịta ụta nʼụbọchị Onyenwe anyị Jisọs Kraịst.
who will also confirm you until the end, blameless in the day of our Lord Jesus Christ.
9 Chineke, onye kpọbatara unu ka unu na Ọkpara ya bụ Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, na-enwe mmekọrịta kwesiri ntụkwasị obi.
God is faithful, through whom you were called into the fellowship of his Son, Jesus Christ our Lord.
10 Ụmụnna m, eji m aha Onyenwe anyị Jisọs Kraịst na-arịọ unu, ka unu niile na-ekwekọrịta nʼihe ọbụla unu kwuru, ka nkewa ọbụla gharakwa ịbata nʼetiti unu. Ana m arịọkwa unu ka unu dị nʼotu, nʼechiche obi unu na nʼizu unu.
Now I beg you, brothers, through the name of our Lord, Jesus Christ, that you all speak the same thing, and that there be no divisions among you, but that you be perfected together in the same mind and in the same judgment.
11 Nʼihi na ụmụnna m, esi m nʼọnụ ndị si nʼezinaụlọ Kloyi bịara nʼebe a nụta na esemokwu dị nʼetiti unu.
For it has been reported to me concerning you, my brothers, by those who are from Chloe’s household, that there are contentions among you.
12 Anụrụ m na ịkpa iche iche abatala nʼetiti unu. Na ụfọdụ nʼime unu na-asị, “Abụ m onye na-eso Pọl”; ndị ọzọ na-asịkwa, “Abụ m onye na-eso Apọlọs”; ndị ọzọkwa na-asị, “Ana m eso Sefas”; ma ndị ọzọ na-asịkwa, “Ọ bụ Kraịst ka m na-eso.”
Now I mean this, that each one of you says, “I follow Paul,” “I follow Apollos,” “I follow Cephas,” and, “I follow Christ.”
13 Kraịst, ọ dị abụọ? Ọ bụ Pọl ka a kpọgidere nʼobe nʼihi unu? Ọ dị onye e mere baptizim nʼaha Pọl?
Is Christ divided? Was Paul crucified for you? Or were you baptized into the name of Paul?
14 Ana m ekele Chineke ekele na ọ dịghị onye ọbụla nʼime unu m mere baptizim, ewezugakwa Krispọs na Gaiọs.
I thank God that I baptized none of you except Crispus and Gaius,
15 Ya mere, ọ dịghị onye nʼime unu ga-asị na e mere ya baptizim nʼaha m.
so that no one should say that I had baptized you into my own name.
16 (Ahaa! Emekwara m Stefanas na ezinaụlọ ya baptizim. Ewezuga ndị a, amaghị m ma m ga-echetakwa onye ọzọ m mere baptizim nʼonwe m.)
(I also baptized the household of Stephanas; besides them, I don’t know whether I baptized any other.)
17 Nʼihi na Kraịst ezighị m ime ndị mmadụ baptizim. O zitere m iji okwu dị mfe kwusaa oziọma ya. Ọ bụghị iji okwu oke mmụta na amamihe nke mmadụ ka ike nke obe Kraịst ghara ịbụ ihe efu.
For Christ sent me not to baptize, but to preach the Good News—not in wisdom of words, so that the cross of Christ wouldn’t be made void.
18 Nʼihi na okwu maka obe bụ ihe nzuzu nye ndị na-efu efu, ma nye anyị ndị a na-azọpụta, ọ bụrụ anyị ike nke Chineke.
For the word of the cross is foolishness to those who are dying, but to us who are being saved it is the power of God.
19 E dere ya, “Aga m emebi amamihe ndị maara ihe. Aga m emekwa ka oke nghọta nke ndị maara ihe bụrụ ihe efu.”
For it is written, “I will destroy the wisdom of the wise. I will bring the discernment of the discerning to nothing.”
20 Olee ebe ndị oke amamihe nọ? Olee ebe ndị ode akwụkwọ nọ? Olee ebe ndị oke ịrụ ụka nke oge a nọ? Chineke o mebeghị ka amamihe nke ụwa a bụrụ ihe efu? (aiōn g165)
Where is the wise? Where is the scribe? Where is the debater of this age? Hasn’t God made foolish the wisdom of this world? (aiōn g165)
21 Ma ebe ọ bụ site nʼamamihe nke Chineke, ụwa enweghị ike ịmata Chineke site na amamihe nke ya, ọ dị Chineke ezi mma isite nʼoziọma nke a na-ekwusa nke ndị mmadụ na-akpọ ihe nzuzu zọpụta ndị kweere.
For seeing that in the wisdom of God, the world through its wisdom didn’t know God, it was God’s good pleasure through the foolishness of the preaching to save those who believe.
22 Ndị Juu chọrọ ịhụ ihe ịrịbama, ndị Griik na-achọkwa amamihe.
For Jews ask for signs, Greeks seek after wisdom,
23 Ma anyị onwe anyị na-ekwusa Kraịst, onye a kpọgburu nʼobe, onye bụ ihe mgbochi nʼebe ndị Juu nọ, ma na ntị ndị mba ọzọ, ọ dị ka okwu nzuzu.
but we preach Christ crucified, a stumbling block to Jews and foolishness to Greeks,
24 Ma nye ndị niile a kpọrọ, ma ndị Juu ma ndị Griik, Kraịst bụ ike nke Chineke bụrụkwa amamihe nke Chineke.
but to those who are called, both Jews and Greeks, Christ is the power of God and the wisdom of God;
25 Nʼihi na nzuzu Chineke dị mma karịa amamihe niile nke mmadụ, adịghị ike Chineke dịkwa ukwuu karịa ike niile nke mmadụ.
because the foolishness of God is wiser than men, and the weakness of God is stronger than men.
26 Ụmụnna m, chetakwanụ ihe unu bụ mgbe a kpọrọ unu. Chetanụ na ọ bụ ole na ole nʼime unu bụ ndị maara ihe nʼusoro ogugo mmadụ, ndị dị ike, na ndị a maara aha ha nʼobodo.
For you see your calling, brothers, that not many are wise according to the flesh, not many mighty, and not many noble;
27 Ma lee na ọ bụ ihe ahụ ụwa gụrụ dịka ihe nzuzu, ka Chineke họrọ iji mee ka ihere mee ndị amamihe. Ọ bụkwa ihe ha gụrụ dịka ihe na-adịghị ike ka Chineke họọrọ iji mee ka ihere mee ndị dị ike.
but God chose the foolish things of the world that he might put to shame those who are wise. God chose the weak things of the world that he might put to shame the things that are strong.
28 Nʼihi na Chineke họọrọ ihe dịkarịrị ala nke ụwa, na ihe a jụrụ ajụ, jiri ha mee ka ihe ụwa chere na ọ baghị uru, bụrụ ihe bara uru.
God chose the lowly things of the world, and the things that are despised, and the things that don’t exist, that he might bring to nothing the things that exist,
29 Ka mmadụ ọbụla ghara ịnya isi nʼebe Chineke nọ.
that no flesh should boast before God.
30 Ma ọ bụ nʼihi ya ka unu ji nọrọ nʼime Kraịst Jisọs, onye ghọrọ isi amamihe nye anyị site na Chineke, nke bụ ezi omume anyị na nke ido anyị nsọ, na onye mgbapụta anyị.
Because of him, you are in Christ Jesus, who was made to us wisdom from God, and righteousness and sanctification, and redemption,
31 Ya mere, dịka e dere ya nʼakwụkwọ nsọ, “Onye ọbụla na-anya isi, ya nyaa nʼime Onyenwe anyị.”
that, as it is written, “He who boasts, let him boast in the Lord.”

< 1 Ndị Kọrint 1 >