< 1 Ndị Kọrint 9 >
1 Abụghị m onye nwe onwe ya? Abụghị m onyeozi Kraịst? Ọ bụ na m ahụghị Jisọs Onyenwe anyị? Unu abụghị ihe ngosipụta ọrụ m rụrụ nʼime Onyenwe anyị?
Ssiri wa ddembe? Ssiri mutume? Ssaalaba Yesu Mukama waffe? Si mmwe bibala by’omulimu gwange mu Mukama waffe?
2 Ọ bụrụ na m abụghị onyeozi nʼebe ndị ọzọ nọ, nʼebe unu nọ, abụ m onyeozi nʼeziokwu nʼihi na unu bụ akara nke ọrụ onyeozi m nʼime Onyenwe anyị.
Obanga ssiri mutume eri abalala, naye ndi mutume eri mmwe, kubanga mmwe kabonero k’obutume bwange mu Mukama waffe.
3 Ihe ngọpụ m nye ndị ahụ na-enyocha m bụ nke a.
Ekyo ky’eky’okuwoza kyange eri abo abambulirizaako.
4 Ọ bụ na anyị enweghị ike iri ihe oriri na ịṅụ ihe ọṅụṅụ?
Sirina buyinza kulya na kunywa?
5 Ọ bụ na anyị enweghị ike iduru nwunye onye bụ onye kwere ekwe gaa ebe ọbụla anyị na-aga dịka ndị ozi ọzọ na-eme, na dịka ụmụnne Onyenwe anyị na Sefas na-emekwa?
Singa nnewasiza omukazi, siyinza kutambula naye mu ŋŋendo zange ng’abatume abalala ne Keefa, ne baganda ba Mukama waffe bwe bakola?
6 Ọ ga-abụ naanị mụ na Banabas bụ ndị na-enweghị ike ịhapụ ịrụ ọrụ maka ihe anyị ga na-eri?
Oba Balunabba nange, ffe ffekka ffe tusaana okwekolera?
7 Olee onye agha unu maara nke na-esi nʼakpa ya akwụ onwe ya ụgwọ ọnwa? Ka ọ dị onye ọrụ ubi vaịnị unu maara nke na-adịghị eri mkpụrụ e si nʼubi ahụ weta? Olee onye ọzụzụ atụrụ unu maara nke na-adịghị aṅụ mmiri ara e si nʼigwe atụrụ ọ na-azụ apịpụta?
Muserikale ki ali mu magye nga yeesasula empeera? Muntu ki eyalima ennimiro y’emizabbibu naye n’aziyizibwa okulya ku bibala byayo? Oba ani alunda ekisibo n’atanywa ku mata gaamu?
8 Anaghị m ekwu ihe a nʼihi na ha bụ ihe na-eme ụbọchị niile nʼetiti ndị mmadụ? Akwụkwọ iwu, o kwukwaghị otu ihe ahụ?
Ebyo mbyogera ku bwange ng’omuntu, etteeka nalyo si bwe ligamba?
9 Nʼihi na e dere ya nʼiwu nke Mosis, “Ekechila ọnụ ehi mgbe ọ na-azọcha mkpụrụ ọka.” Unu chere na ọ bụ naanị ehi ka Chineke bu nʼobi kwuo okwu a?
Kubanga kyawandiikibwa mu mateeka ga Musa nti, “Tosibanga mumwa gwa nte ewuula eŋŋaano,” Mulowooza Katonda afa ku bya nte zokka,
10 E, nʼihi anyị ka eji dee ya nʼakwụkwọ. Nʼezie, e dere ihe ndị a nʼihi anyị, nʼihi na onye rụrụ ọrụ nʼubi na onye na-azọcha mkpụrụ dị nʼubi ahụ, na-eme nke a nʼolileanya na o kwesiri iketa oke site na mkpụrụ e si nʼubi ahụ weta.
oba kino akyogera ku lwaffe? Kubanga kino kyawandiikibwa ku lwaffe, oyo alima mu kusuubira alime, n’oyo awuula asuubire okufuna ku bibala.
11 Mkpụrụ anyị kụrụ nʼime obi unu bụ mkpụrụ nke mmụọ. Ọ ga-abụ ihe ọjọọ ma anyị sị unu nyetụ anyị ụfọdụ nʼime akụnụba unu?
Obanga ffe twabasigamu eby’omwoyo, tekiriba kya kitalo bwe tulikungula ebyammwe eby’omubiri?
12 Ọ bụrụ na ndị ọzọ kwesiri iketa uru dị otu a nʼahụ unu, ọ bụ na anyị ekwesighị iketa karịa? Ma ọ dịbeghị mgbe anyị rịọrọ unu ihe ọbụla, kama anyị na-agbalịsị ike ịhụ na ọ dịghị ihe ga-egbochi unu iji ezi obi na-ege ntị nʼoziọma Kraịst nke anyị wetara.
Kale obanga abalala balina obuyinza ku mmwe, ffe tetusaanidde nnyo n’okusingawo? Kyokka ffe tetwabakaka kubituwa. Naye tugumiikiriza byonna, tuleme okuziyiza Enjiri ya Kristo.
13 Ọ bụ na unu amataghị na ndị na-arụ ọrụ nʼụlọnsọ ukwu na-esi nʼụlọnsọ ahụ na-eweta ihe ha na-eri? Ndị na-agbakwa odibo nʼebe ịchụ aja na-eketakwa oke nʼihe eji chụọ aja?
Temumanyi ng’abo abakola mu Yeekaalu baliisibwa bya Yeekaalu, era nga n’abo abaweereza ku kyoto bagabana bya ku kyoto?
14 Nʼotu aka ahụ kwa, Onyenwe anyị ekwuola na ndị niile na-ekwusa oziọma ya ga-esi nʼoziọma eweta nri ha ga-eri dị ndụ.
Mu ngeri y’emu Mukama waffe yalonda abo ababuulira Enjiri baliisibwenga olw’Enjiri.
15 Ma o nweghị mgbe m jirila ike ndị a m nwere irite uru nʼọrụ m nara ndị mmadụ ihe. Anaghị m ede nke a nʼakwụkwọ ka a na-ebutere m ihe onyinye. Nʼihi na ọ kaara m mma ka m nwụọ kama m ga-ekwe ka onye ọbụla mee ka ịnya isi m bụrụ ihe efu nʼihi ihe onyinye.
Kyokka nze siriiko na kimu ku ebyo kye nkozesezzaako. Era ssawandiika bino ndyoke binkolerwe kubanga waakiri nze okufa okusinga okwenyumiriza kwange bwe kutaabeemu nsa.
16 Anaghị anya isi nʼihi na ana m ezisa oziọma, maka na nke ahụ bụ ọrụ e nyere m nʼiwu ka m rụọ. Ahụhụ dịịrị m ma ọ bụrụ na m ezisaghị oziọma.
Kubanga bwe mbuulira Enjiri sisobola kwenyumiriza, kubanga mpalirizibwa okugibuulira. Era ziba zinsanze bwe sigibuulira.
17 A sị na m ji aka m họpụta onwe m ịrụ ọrụ a, agaara m enwe ụgwọ ọrụ, ma na ọ bụrụ na o sighị nʼuche aka m, unu mara na-ahanyere m ya nʼaka.
Kubanga bwe mbuulira Enjiri olw’okweyagalira, mbeera n’empeera, naye ne bwe mba nga ssaagala, nkikola lwa kubanga nakwasibwa omulimu ogwo.
18 Gịnị bụ ụgwọ ọrụ m? Ụgwọ ọrụ m bụ ọṅụ m na-enwe site nʼizisa oziọma a, na-anaghị onye ọbụla ụgwọ ọrụ ọbụla, maọbụ ihe ruru m dịka onye na-ezisa oziọma ahụ.
Kale empeera yange y’eruwa? Empeera yange kwe kubuulira Enjiri nga sisasulwa era nga sibasaba nsasulwe olw’omulimu ogwo nga bwe nsaanidde.
19 Ọ bụ ezie na-abụghị m ohu onye ọbụla, ma emeela m onwe m ohu nye mmadụ niile ka m nwee ike site nʼụzọ dị otu a rite ọtụtụ mkpụrụobi nʼuru nye Kraịst.
Kubanga newaakubadde nga ndi wa ddembe eri abantu bonna, nfuuka omuddu wa bonna olw’okweyagalira, ndyoke ndeete bangi eri Kristo.
20 Nʼebe ndị Juu nọọ, ana m eme dịka onye Juu, ka m nwee ike rite ndị Juu nʼuru. Nʼetiti ndị nọ nʼokpuru iwu, ana m emekwa dịka otu nʼime ndị nọ nʼokpuru iwu (nʼagbanyeghị na mụ onwe m anọghị nʼokpuru iwu), ka m si otu a nwee ike rite ndị nọ nʼokpuru iwu nʼuru.
Eri Abayudaaya nafuuka ng’Omuyudaaya ndyoke nsobole okubaleeta eri Kristo. N’eri abo abafugibwa amateeka nafuuka ng’afugibwa amateeka, newaakubadde nze nga ssifugibwa mateeka, ndyoke mbaleete eri Kristo.
21 Nʼebe ndị na-anọghị nʼokpuru iwu nọ, emere m onwe m ka onye na-anọghị nʼokpuru iwu (ma nke a apụtaghị na m na-akwụsị ime ihe iwu Chineke na-achọ. Ana m emekwa dịka onye nọ nʼokpuru iwu Kraịst), ka m nwee ike rite ndị na-anọghị nʼokpuru iwu nʼuru.
Eri abo abatalina mateeka ga Katonda, nafuuka ng’atafugibwa mateeka, newaakubadde nga ssaaleka mateeka ga Katanda, naye nga ndi mu mateeka ga Kristo, n’abo abatalina mateeka ndyoke mbaleete eri Kristo.
22 Nʼebe ndị na-adịghị ike nọ, ana m emekwa dịka ha, ka m nwee ike rite ndị na-adịghị ike nʼuru. Otu ọbụla mmadụ si dịrị, ana m agbalị chọọ ụzọ m ga-esi mee ka ọ nabata m, ka m nwee ike site nʼụzọ niile ọbụla zọpụta ụfọdụ.
Mu banafu nafuuka ng’omunafu ndyoke mbaleete eri Kristo. Eri abantu bonna nfuuse byonna, mu ngeri yonna ndyoke mbeeko beentusa ku kulokolebwa.
23 Ana m eme ihe ndị a niile nʼihi oziọma, ma ka m nwekwa ike keta oke na ngọzị ya.
Byonna mbikola olw’enjiri, era nange ndyoke nfunire wamu nabo ebiva mu Njiri eyo.
24 Unu amataghị na mgbe ọtụtụ mmadụ na-agba ọsọ ịsọ mpi, ọ bụ naanị otu onye na-enwe ihe onyinye nke mbụ? Ya mere, gbasienụ ọsọ ike, ka unu nweta onyinye ahụ.
Temumanyi nga mu mpaka ez’okudduka abo bonna abazeetabamu badduka, naye awangula ekirabo abeera omu? Kale nammwe muddukenga bwe mutyo nga mufubirira okuwangula ekirabo.
25 Ndị na-ejikere ịgba ọsọ maọbụ egwuregwu ọzọ na-enwe ntachiobi nʼọtụtụ ahụhụ nke ya na ọzụzụ so. Ha na-azụ onwe ha naanị ka ha nweta okpueze okoko osisi na-emebi emebi. Ma ọsọ anyị na-agba bụ ka anyị nweta okpueze nke na-apụghị imebi emebi.
Buli muzanyi eyeetaba mu mpaka ateekwa okufuna okutendekebwa okw’amaanyi nga yeefuga mu bintu byonna. Ekyo bakikola balyoke bawangule engule eyonooneka. Naye ffe tulifuna engule eteyonooneka.
26 Ọ bụ nke a mere m ji na-agba ọsọ a na-eleghị anya nʼazụ, maọbụ kụọ ọkpọ dịka m na-akụ ifufe.
Noolwekyo nziruka nga nnina kye ŋŋenderera. Sirwana ng’omukubi w’ebikonde amala gawujja n’akuba ebbanga.
27 Ma ana m azụ ahụ m, na-enye ya ahụhụ mee ya ka ọ bụrụ ohu, ka mụ onwe m ghara ị bụ onye a jụrụ ajụ mgbe m kwusasịrị oziọma nye ndị ọzọ.
Naye mbonereza omubiri gwange ne ngufuula omuddu wange, si kulwa nga mbuulira abalala Enjiri, ate nze nzennyini ne sisiimibwa.