< 1 Ndị Kọrint 7 >

1 Ugbu a, okwu banyere ihe unu dere nʼakwụkwọ: “Ọ dị mma ka nwoke ghara ịmetụ nwanyị aka.”
Ahusu amambo ngamsimbiye: Huli isala aje shinza unume asahag'one nushe wakwe.
2 Ma nʼihi ọtụtụ ihe omume banyere ịkwa iko, ka nwoke ọbụla nwee nwunye nke aka ya, nwanyị ọbụla di nke aka ya.
Walakini eshi injelo nyinchi iya zinaa shila ashe awe nu nume wakwe, na shila ashe awe nu nume wakwe.
3 Ka nwoke ọbụla jisie ike na-akwụ nwunye ya ụgwọ mmekọ o ji ya. Nwanyị ọbụla ga-emekwara di ya otu aka ahụ.
Unume ahwanziwa apele ushi ihaki yakwe iiyahwengama, shishila ushi nape hwanume.
4 Nʼihi na nwanyị ọbụla lụrụ di adịghịkwa achị ahụ ya, kama ọ bụ di ya na-achị ya. Otu aka ahụ, di anakwaghị achị ahụ ya, kama ọ bụ nwunye ya na-achị ya.
Saga yushi yatawala ubele gwakwe, nume. Na shishila unume nape sagatawala ubele gwake ila ushialinao.
5 Ka di na nwunye hapụ igbochi ibe ha mmekọrịta nke anụ ahụ ruuru ha. Karịakwa maọbụ na mkpebi ha nwere nʼetiti onwe ha ịnọrọ iche nwa oge nta nʼihi inyefe onwe ha ikpe ekpere. Mgbe oge a gasịrị, ha ga-agakwa nʼihu na mmekọrịta ha, ka e site otu a hapụ inye ekwensu ohere ịnwa ha ọnwụnwa nʼihi enweghị ike ha ijide onwe ha aka.
Mngaje ahwimane lwamgona peka, maana mwentehene masala gengo. Muwombaje shesho nkamzahugaje amasala gapute. Epo mzawezye awelelano nantele peka, aje usietono asahahwezye huwapele ingelo nkhasanga muwe ni kiasi.
6 Anaghị m enye nke a dị ka iwu, kama ọ bụ alo ka m na-atụnyere unu.
Walakini iyanga ega amambo ninene sagaje malajizyo.
7 Asị m kwuo, aga m asị na ọ ga-aka mma ka mmadụ niile nọrọ dị ka m. Ma onye ọbụla nwere onyinye nke Chineke nyere ya. O nyere otu onye nke a, onye ọzọ nke ọzọ.
Inyonywa aje shila muntu angahali nazine shindeho. Eshi shila weka alinishipaji shakwe afume hwa Ngolobhe. Ono alinishipaji eshi, ola alinishipaji eshi.
8 Ma ana m agwa ndị na-anọghị nʼọnọdụ di na nwunye na ndị di ha nwụrụ anwụ, na ọ ka mma ka ha nọdụ na-alụghị di maọbụ nwunye, dịka m onwe m nọ.
Hwawasaga wengwilwe na awafyelwe inyanga aje shinza aje wasangale bila ahwengwe, nanzi sindehone.
9 Ma ọ bụrụ na ha apụghị ijide onwe ha, ha gaa chọrọ di maọbụ nwunye lụọ. Ọ ka mma ịlụ di maọbụ nwunye, karịa mmadụ ịgba ara site nʼagụụ nke anụ ahụ.
Walakini nkasangawawajie huizijile wahuanziwa ahwengwe. Aje aheri ahwengwe kuliko anyonywe.
10 Ugbu a, unu ndị nwere di na ndị nwere nwunye niile, enwere m iwu m na-enye unu. (O sighị nʼaka m, kama o si nʼaka Onyenwe anyị): O kwesighị ka nwanyị ọbụla hapụ di ya.
Eshi hwawala wa wegwilwe ihimbapela indajizyo, saga nene ila yu Bwana. “Ushi asahalehane nu nume wakwe.”
11 A sịkwa na ọ hapụ di ya, ya nọọrọ onwe ya, maọbụ ya laghachikwuru di ya. Ka nwoke ọbụla gharakwa ịgba nwunye ya alụkwaghị m.
Eshi nkanza alehane afume hwa nuwene asangale shesho asahahwenge, au nkasangashesho akondane nunumeo na unume asahapele.”
12 Ma ana m agwa mmadụ ndị ọzọ (nke a abụghị iwu nke Onyenwe anyị nyere). Ọ bụrụ na nwanna alụọ nwanyị nke na-ekweghị ekwe, ya achụpụla ya ma ọ bụrụ na nwanyị ahụ achọọ ịnọgide dịka nwunye ya.
Walakini wawasangee iyanga- ane, saga yu Bwana- aje nkaholo wowonti ali nushi yasanga aputa ayetesha akhale nao, sagahwaziwa huneshe.
13 Ọ bụrụkwa na nwanyị kwere ekwe alụọ di nke na-ekweghị ekwe, ya agbarala di ya alụkwaghị m, ma ọ bụrụ na di ya chọrọ ịnọgide dịka di ya.
Nkashee alinunume yasagaputa na ahwenteha ahale nao asahaneshe.
14 Nʼihi na edoola di ahụ na-ekweghị ekwe nsọ site na nwunye ya, otu a kwa a na-edokwa nwunye ahụ na-ekweghị ekwe nsọ site na di ya, bụ onye kwere ekwe. Ọ bụrụ na ọ dịghị otu a, ụmụ unu ga-abụ ndị na-adịghị ọcha. Ma otu ọ dị, ha dị nsọ.
Hwa nume yasanga aputa ahoziwa nola yalinu lweteho ushi wakwe. Na ushi yasanga aputa ahoziwa nola unume yalinulweteho. Nkasanga sishesho awana wwenyu indisaga wazelu, walakini ulioli wozilwe.
15 Ma ọ bụrụ na onye ahụ nke na-ekweghị ekwe ekewapụ onwe ya, ya dịrị otu ahụ, nke a emeghị ka nwanna anyị nwoke maọbụ nwanna anyị nwanyị bụrụ ohu nʼọnọdụ dị otu a, nʼihi na Chineke kpọrọ anyị ka anyị bie ndụ udo.
Umpenzi yasagaputa nkasongola asongalaje. Hunamna eyo, usahala nendu sagawapinywa ni ndopo yao. Ungolobhe atikwizizye akhale huamani.
16 Gị nwunye, ị mara maọbụ gị ga-azọpụta di gị? Ma, gị bụ di, si aṅa mara maọbụ gị ga-azọpụta nwunye gị?
Umenye wele aje ushi angakombola unumeo? Au umenye wele aje unume angakombola ushi wakwe?
17 Ka onye ọbụla bie ndụ ya dịka amara Onyenwe anyị nyere ya si dị, nakwa nʼọnọdụ nke Chineke kpọrọ ya. Nke a bụ iwu m na-enye nʼụlọ chọọchị niile.
Shila weka ahale amaisha hwa Bwana shawagawiye, shila wweka nanzi Ungolobhe shakwizizye awene. Owu longozi wane huviwanza vyonti.
18 Akpọrọ onye ọbụla mgbe e biri ya ugwu? Ya achọla iwepụ akara obibi ugwu ya. Ka onye a na-ebighị ugwu tupu ọkpụkpọ ya hapụ inye onwe ya nsogbu ịchọ ụzọ a ga-esi bie ya ugwu.
Aleho yahaleho atahiliwe ahakwizi welwe akombolewe? Asijaribu kuondoa alama ya tohara yake. Yupo yeyote aliyeitwa katika imani hajatahiriwa? Sanga ahwaziwa atahiliwe.
19 Nʼihi na ọ dịghị mkpa ma e biri gị ugwu ma e bighị gị ugwu. Ihe kachasị mkpa bụ idebe iwu Chineke.
Hueli indola atahiliwa au sanga atahiliwe nagamo amatatizo. Shashili na matatizo hu tii iagizo lya Ngolobhe.
20 Ka onye ọbụla nọgide dịka ọ dị mgbe a kpọrọ ya.
Shila weka asagale shakwizizye Ungolobhe na hukombole.
21 Ị bụ ohu mgbe a kpọrọ gị? Echegbula onwe gị nʼihi ya. Kama ọ bụrụ na ọ dị ụzọ ị pụrụ isi nwere onwe gị, were ohere ahụ mee ihe ugbu a.
Uhali muwomba mbombo amasala Ungolobhe lwahakwizizye? Usahasaje ahusu elyo. Nkashele uwajie awe huru wombanga shesho.
22 Nʼihi na onye ọbụla Onyenwe anyị Chineke kpọrọ mgbe o bụ ohu, aghọọla onye nweere onwe ya nʼime Onyenwe anyị. Otu aka ahụ, onye nwerela onwe ya mgbe Onyenwe anyị kpọrọ ya aghọọla ohu nke Kraịst.
Hwa weka yahakwiziwilwe nu Bwana aje muomba mbombo uyo umntu huru hwa Bwana. Nazi shila weka yali huru lwahakwiziwilwe akombolewe awe muomba mbombo wa Kristi.
23 Akwụọla ụgwọ isi unu, unu abụkwala ohu mmadụ ọzọ.
Amwe mkalililwe hu hung'alama hije msahawe waomba mbombo hwa wantu.
24 Ụmụnna m, nʼọnọdụ ọbụla mmadụ nọ mgbe a kpọrọ ya, ya nọgidesie ike nʼime Chineke.
Wasahala na walendu wane, humaisha gonti shila weka ahakwiziwilwe akombolewe tusagale shishesho
25 Ihe banyere ụmụ agbọghọ na-amaghị nwoke. Enweghị m iwu ọbụla site nʼaka Onyenwe anyị banyere ajụjụ a, ma aga m ekwu uche nke aka m dịka onye sitere nʼebere nke Onyenwe anyị kwesiri ntụkwasị obi.
Eshi wala wonti wagawejile kamwe sanga indi ni ndajizyo afume hwa Bwana. Ila ihumbapela iseo zyane nazi shindeho. Husanjilo zya Bwana, zizihuaminiha
26 Echere m na ọ ka mma ugbu a, nʼihi nsogbu nke na-abịanụ ka onye ọbụla nọdụrụ onwe ya dịka o siri nọrọ ugbu a.
Kwa hiyo, isewa eshohunongwa ya malawa, shinza unume asagale nazi shaleho.
27 Ị lụọla nwanyị? Achọla nkewa. Ọ bụ na ị lụbeghị nwanyị? Ejela ịchọ onye ị ga-alụ.
Upinyilwe nushi nishiapo sha hwengane? Usahahanze uuhuru afume hwelyo. Uli nu huru wafume hwashe au saganyegwilwe? Usahahanze ushi.
28 Ma ọ bụrụ na i kpebie nʼobi gị ịlụ nwunye, i meghị mmehie ọbụla; ọ bụrụkwa na nwaagbọghọ ekpebie na ọ ga-alụ di, o meghị mmehie. Ndị lụrụ di na nwunye ga-enwe ọtụtụ nsogbu nʼime ụwa. Ọ ga-amasị m igbochiri unu nsogbu ndị ahụ.
Walakini nku yenje sanga uwombile imbiwi. Wasele wala wawahwengana wahugaga amalawa gagali mbalimbali nane ihwanza aje embepuzye ego.
29 Ihe unu kwesiri ịma, ụmụnna, bụ na oge anyị nwere fọdụrụ naanị ntakịrị, site ugbu a gaa nʼihu ndị nwere nwunye ga-adị ndụ ha dịka ndị na-enweghị.
Eshi iyanga ishi awasahala na walendu wane amasala mafupi. Ahwande eshi nahuendelele, walaw wawali na hawashe wakhale aje sagawali na washe.
30 Ka ndị na-akwa akwa bie ndụ dịka ndị ihe anaghị ewute, ka ndị na-achị ọchị dịrị ka ndị obi na-adịghị atọ ụtọ. Ka ndị na-azụ ahịa dịrị dịka ndị na-enweghị ngwa ahịa ọbụla.
Wonti wawazungumie wawenje saga wazungumie na wonti wawashiye wahalije sagawashinye, na wonti wawakala ivintu vyovyonti waweje sanga watawala shoshonti.
31 Ka ndị na-etinye oge nʼihe ụtọ nke ụwa hapụ ibi ndụ ịchọ iritecha ihe niile dị nʼụwa nʼuru. Nʼihi na ụwa, otu ọ dị ugbu a, bụ ihe na-agabiga agabiga.
Na wonti wawawomba imbombo zya munsi waweje sanga washunghuliha liohonti. Yaani amatindo ga munsi idujile humalishilo wakwe.
32 Unu emela ihe ga-ewetara unu oke echiche. Nwoke na-alụbeghị nwanyị nwere ohere iji oge ya niile rụọra Onyenwe anyị ọrụ. O nwekwara ohere ịgbalịsị ike ime ihe ga-atọ Onyenwe anyị ụtọ.
Ihwanza unume yalihura humalawa gonti. Unume yasaga ayejile ahwihusisha ni vintu vivihumsu uBwana, isha hupendezye umwene.
33 Ma nwoke nwere nwunye na-echegbu onwe ya banyere ihe igbo mkpa nke ụwa a, otu ọ ga-esi mee ihe ga-atọ nwunye ya ụtọ.
Lakini unume ya yejile ahuihusisha na mambo ya dunia, namna ya hupendezye ushi wakwe,
34 Ọ na-enwekwa obi abụọ nʼihe ọbụla ọ chọrọ ime. Otu a ka ọ dịkwa nye nwaagbọghọ na-alụbeghị di maọbụ onye nke na-amabeghị nwoke, nchegbu ya bụ banyere ihe nke Onyenwe anyị. Ọchịchọ ya bụ ka ọ dị nsọ nʼanụ ahụ ya na nʼime mmụọ ya. Ma nwanyị nwere di na-echegbu onwe ya banyere ihe nke ụwa a, otu ọ ga-esi mee ihe ga-atọ di ya ụtọ.
abaguhene ushi yasagaayegwilwe au unende ahuihusisha ni vintu kuhusu Bwana, inamna ya huibagula hu bele na mpepo. Lakini ushi yayengwilwe ahuihusisha ahusu ivintu vya munsi namna ya hufulaisye unume wakwe.
35 Ana m ekwu ihe ndị a maka ọ dị mma nke unu onwe unu, ọ bụghị ịgbalị igbochi unu, kama ọ bụ ka unu nwee ike bie ndụ unu nʼụzọ kwesiri ekwesi, werekwa ịhụnanya zuruoke rụọra Onyenwe anyị ọrụ.
Iyanga ishi hufaida yenyu, mwemwe na sanga imbeha umtengo humwenyu. Iyanga eshi nalioli aje muwajie huiweshe tayari hwa Bwana bila azigwe nashashonti.
36 Ọ bụrụ na nwoke ọbụla enweghị ike ijide onwe ya nʼihi agụụ mmekọrịta nke nwoke na nwanyị na-agụ ya nʼebe nwaagbọghọ ya na ya kpebiri ịlụ nọ, ya mee ihe ọ na-achọ, o meghị mmehie ọbụla, ha lụọ di na nwunye.
Lakini umntu nkasewa apotilwe humuombele ishishi umwanamwali wakwe, huu seo zwake zili ni ngovu hani leha wegane nao nanzishahwanzya. Sanga mbiwi.
37 Ma ọ bụrụ na onye ọbụla ekpebie nʼobi ya, ma nwee ike ijide onwe ya, ka o si nʼenweghị mmanye ọbụla idebe nwaagbọghọ e kwuru na ọ ga-alụ na-enweghị mmekọ ọbụla, ọ bụ ihe dị mma ka o mere.
Lakini awombile shahuanza saga ahwenga nemo ihaja ya ulazima, nkawajiye atawale ihamu yakwe anzawombe shinza nkasanga ahwenga.
38 Ya mere, onye ahụ lụrụ nwaagbọghọ o kwuru na ọ ga-alụ mere nke ọma, ma onye kpebikwara na ọ gaghị alụ mekwara nke ọma karịa.
Oyo yahumwenga umwana mwali wakwe awombe shinza, wowonti ola yasaluye sagaahwenga anza wombe shinza hani.
39 Njikọta e jikọtara nwunye na di ya na-adị ire naanị mgbe di nwanyị dị ndụ. Ọ bụrụ na di ya anwụọ o nwere ike ịlụ di ọzọ, ma ọ lụọ ya nʼime Onyenwe anyị.
Ushi apinyilwe nu nume wakwe uwakati wa ali momi. Lakini nkuleshe unume afyiye ali huru ahwengwe na wowonti yagene, lakini katika Bwana tu.
40 Nʼuche m, ọ ga-enwe ọṅụ nʼobi ya karịa ma ọ bụrụ na ọ lụghị di ọzọ. Ana m echekwa na mụ onwe m nwekwara Mmụọ nke Chineke.
Bado katika ahwamle hwane anza songwe hani nkahale nazi shaleho. Na isewa aje nane pia indi nu Mpepo ufinjile.

< 1 Ndị Kọrint 7 >