< 1 Ndị Kọrint 7 >
1 Ugbu a, okwu banyere ihe unu dere nʼakwụkwọ: “Ọ dị mma ka nwoke ghara ịmetụ nwanyị aka.”
Now concerning the issues you wrote about: “It is good for a man not to touch a woman.”
2 Ma nʼihi ọtụtụ ihe omume banyere ịkwa iko, ka nwoke ọbụla nwee nwunye nke aka ya, nwanyị ọbụla di nke aka ya.
But because of temptations for many immoral acts, each man should have his own wife, and each woman should have her own husband.
3 Ka nwoke ọbụla jisie ike na-akwụ nwunye ya ụgwọ mmekọ o ji ya. Nwanyị ọbụla ga-emekwara di ya otu aka ahụ.
The husband should give to the wife her sexual rights, and likewise the wife to her husband.
4 Nʼihi na nwanyị ọbụla lụrụ di adịghịkwa achị ahụ ya, kama ọ bụ di ya na-achị ya. Otu aka ahụ, di anakwaghị achị ahụ ya, kama ọ bụ nwunye ya na-achị ya.
It is not the wife who has authority over her own body, it is the husband. Likewise, the husband does not have authority over his own body, but the wife does.
5 Ka di na nwunye hapụ igbochi ibe ha mmekọrịta nke anụ ahụ ruuru ha. Karịakwa maọbụ na mkpebi ha nwere nʼetiti onwe ha ịnọrọ iche nwa oge nta nʼihi inyefe onwe ha ikpe ekpere. Mgbe oge a gasịrị, ha ga-agakwa nʼihu na mmekọrịta ha, ka e site otu a hapụ inye ekwensu ohere ịnwa ha ọnwụnwa nʼihi enweghị ike ha ijide onwe ha aka.
Do not deprive each other, except by mutual agreement and for a specific period of time. Do this so that you may devote yourselves to prayer. Then you should come together again, so that Satan may not tempt you because of your lack of self-control.
6 Anaghị m enye nke a dị ka iwu, kama ọ bụ alo ka m na-atụnyere unu.
But I say these things to you as a concession and not as a command.
7 Asị m kwuo, aga m asị na ọ ga-aka mma ka mmadụ niile nọrọ dị ka m. Ma onye ọbụla nwere onyinye nke Chineke nyere ya. O nyere otu onye nke a, onye ọzọ nke ọzọ.
I wish that everyone were as I am. But each one has his own gift from God. One has this kind of gift, and another that kind.
8 Ma ana m agwa ndị na-anọghị nʼọnọdụ di na nwunye na ndị di ha nwụrụ anwụ, na ọ ka mma ka ha nọdụ na-alụghị di maọbụ nwunye, dịka m onwe m nọ.
To the unmarried and to widows I say that it is good for them if they remain unmarried, as I am.
9 Ma ọ bụrụ na ha apụghị ijide onwe ha, ha gaa chọrọ di maọbụ nwunye lụọ. Ọ ka mma ịlụ di maọbụ nwunye, karịa mmadụ ịgba ara site nʼagụụ nke anụ ahụ.
But if they cannot exercise self-control, they should marry. For it is better for them to marry than to burn with passion.
10 Ugbu a, unu ndị nwere di na ndị nwere nwunye niile, enwere m iwu m na-enye unu. (O sighị nʼaka m, kama o si nʼaka Onyenwe anyị): O kwesighị ka nwanyị ọbụla hapụ di ya.
Now to the married I give this command—not I, but the Lord—the wife should not separate from her husband
11 A sịkwa na ọ hapụ di ya, ya nọọrọ onwe ya, maọbụ ya laghachikwuru di ya. Ka nwoke ọbụla gharakwa ịgba nwunye ya alụkwaghị m.
(but if she does separate from her husband, she should remain unmarried or else be reconciled to her husband), and the husband should not divorce his wife.
12 Ma ana m agwa mmadụ ndị ọzọ (nke a abụghị iwu nke Onyenwe anyị nyere). Ọ bụrụ na nwanna alụọ nwanyị nke na-ekweghị ekwe, ya achụpụla ya ma ọ bụrụ na nwanyị ahụ achọọ ịnọgide dịka nwunye ya.
But to the rest I say—I, not the Lord—that if any brother has a wife who is an unbeliever, and if she is content to live with him, he should not divorce her.
13 Ọ bụrụkwa na nwanyị kwere ekwe alụọ di nke na-ekweghị ekwe, ya agbarala di ya alụkwaghị m, ma ọ bụrụ na di ya chọrọ ịnọgide dịka di ya.
If a woman has an unbelieving husband, and if he is content to live with her, she should not divorce him.
14 Nʼihi na edoola di ahụ na-ekweghị ekwe nsọ site na nwunye ya, otu a kwa a na-edokwa nwunye ahụ na-ekweghị ekwe nsọ site na di ya, bụ onye kwere ekwe. Ọ bụrụ na ọ dịghị otu a, ụmụ unu ga-abụ ndị na-adịghị ọcha. Ma otu ọ dị, ha dị nsọ.
For the unbelieving husband is set apart because of his wife, and the unbelieving wife is set apart because of the brother. Otherwise your children would be unclean, but actually they are set apart.
15 Ma ọ bụrụ na onye ahụ nke na-ekweghị ekwe ekewapụ onwe ya, ya dịrị otu ahụ, nke a emeghị ka nwanna anyị nwoke maọbụ nwanna anyị nwanyị bụrụ ohu nʼọnọdụ dị otu a, nʼihi na Chineke kpọrọ anyị ka anyị bie ndụ udo.
But if the unbelieving partner departs, let him go. In such cases, the brother or sister is not bound to their vows. God has called us to live in peace.
16 Gị nwunye, ị mara maọbụ gị ga-azọpụta di gị? Ma, gị bụ di, si aṅa mara maọbụ gị ga-azọpụta nwunye gị?
For how do you know, woman, whether you will save your husband? Or how do you know, man, whether you will save your wife?
17 Ka onye ọbụla bie ndụ ya dịka amara Onyenwe anyị nyere ya si dị, nakwa nʼọnọdụ nke Chineke kpọrọ ya. Nke a bụ iwu m na-enye nʼụlọ chọọchị niile.
Only let each one live the life the Lord has assigned him, each as God has called him. This is my rule in all the churches.
18 Akpọrọ onye ọbụla mgbe e biri ya ugwu? Ya achọla iwepụ akara obibi ugwu ya. Ka onye a na-ebighị ugwu tupu ọkpụkpọ ya hapụ inye onwe ya nsogbu ịchọ ụzọ a ga-esi bie ya ugwu.
Was anyone circumcised when he was called to believe? He should not try to appear uncircumcised. Was anyone uncircumcised when he was called to faith? He should not be circumcised.
19 Nʼihi na ọ dịghị mkpa ma e biri gị ugwu ma e bighị gị ugwu. Ihe kachasị mkpa bụ idebe iwu Chineke.
For it is neither circumcision nor uncircumcision that matters. What matters is obeying the commandments of God.
20 Ka onye ọbụla nọgide dịka ọ dị mgbe a kpọrọ ya.
Each one should remain in the calling he was in when God called him to believe.
21 Ị bụ ohu mgbe a kpọrọ gị? Echegbula onwe gị nʼihi ya. Kama ọ bụrụ na ọ dị ụzọ ị pụrụ isi nwere onwe gị, were ohere ahụ mee ihe ugbu a.
Were you a slave when God called you? Do not be concerned about it. But if you can become free, take advantage of it.
22 Nʼihi na onye ọbụla Onyenwe anyị Chineke kpọrọ mgbe o bụ ohu, aghọọla onye nweere onwe ya nʼime Onyenwe anyị. Otu aka ahụ, onye nwerela onwe ya mgbe Onyenwe anyị kpọrọ ya aghọọla ohu nke Kraịst.
For someone who is called by the Lord as a slave is the Lord's freeman. Likewise, the one who was free when he was called to believe is Christ's slave.
23 Akwụọla ụgwọ isi unu, unu abụkwala ohu mmadụ ọzọ.
You have been bought with a price, so do not become slaves of men.
24 Ụmụnna m, nʼọnọdụ ọbụla mmadụ nọ mgbe a kpọrọ ya, ya nọgidesie ike nʼime Chineke.
Brothers, in whatever life each of us was in when we were called to believe, let us remain like that.
25 Ihe banyere ụmụ agbọghọ na-amaghị nwoke. Enweghị m iwu ọbụla site nʼaka Onyenwe anyị banyere ajụjụ a, ma aga m ekwu uche nke aka m dịka onye sitere nʼebere nke Onyenwe anyị kwesiri ntụkwasị obi.
Now concerning those who never married, I have no commandment from the Lord. But I give my opinion as one who, by the Lord's mercy, is trustworthy.
26 Echere m na ọ ka mma ugbu a, nʼihi nsogbu nke na-abịanụ ka onye ọbụla nọdụrụ onwe ya dịka o siri nọrọ ugbu a.
Therefore, I think that because of the disaster that is coming, it is good for a man to remain as he is.
27 Ị lụọla nwanyị? Achọla nkewa. Ọ bụ na ị lụbeghị nwanyị? Ejela ịchọ onye ị ga-alụ.
Are you married to a wife? Do not seek a divorce. If you are unmarried, do not seek a wife.
28 Ma ọ bụrụ na i kpebie nʼobi gị ịlụ nwunye, i meghị mmehie ọbụla; ọ bụrụkwa na nwaagbọghọ ekpebie na ọ ga-alụ di, o meghị mmehie. Ndị lụrụ di na nwunye ga-enwe ọtụtụ nsogbu nʼime ụwa. Ọ ga-amasị m igbochiri unu nsogbu ndị ahụ.
But if you do marry, you have not sinned, and if an unmarried woman marries, she has not sinned. But those who marry will have many kinds of worldly trouble, and I want to spare you from this.
29 Ihe unu kwesiri ịma, ụmụnna, bụ na oge anyị nwere fọdụrụ naanị ntakịrị, site ugbu a gaa nʼihu ndị nwere nwunye ga-adị ndụ ha dịka ndị na-enweghị.
But this I say, brothers: The time is short. From now on, let those who have wives live as though they had none.
30 Ka ndị na-akwa akwa bie ndụ dịka ndị ihe anaghị ewute, ka ndị na-achị ọchị dịrị ka ndị obi na-adịghị atọ ụtọ. Ka ndị na-azụ ahịa dịrị dịka ndị na-enweghị ngwa ahịa ọbụla.
Those who weep should act as though they were not weeping, and those who rejoice as though they were not rejoicing, and those who buy as though they did not possess anything,
31 Ka ndị na-etinye oge nʼihe ụtọ nke ụwa hapụ ibi ndụ ịchọ iritecha ihe niile dị nʼụwa nʼuru. Nʼihi na ụwa, otu ọ dị ugbu a, bụ ihe na-agabiga agabiga.
and those who use the world should not act as though they are using it to the full. For the world in its present form is coming to an end.
32 Unu emela ihe ga-ewetara unu oke echiche. Nwoke na-alụbeghị nwanyị nwere ohere iji oge ya niile rụọra Onyenwe anyị ọrụ. O nwekwara ohere ịgbalịsị ike ime ihe ga-atọ Onyenwe anyị ụtọ.
I would like you to be free from worries. The unmarried man is concerned about the things of the Lord, how to please him.
33 Ma nwoke nwere nwunye na-echegbu onwe ya banyere ihe igbo mkpa nke ụwa a, otu ọ ga-esi mee ihe ga-atọ nwunye ya ụtọ.
But the married man is concerned about the things of the world, how to please his wife—
34 Ọ na-enwekwa obi abụọ nʼihe ọbụla ọ chọrọ ime. Otu a ka ọ dịkwa nye nwaagbọghọ na-alụbeghị di maọbụ onye nke na-amabeghị nwoke, nchegbu ya bụ banyere ihe nke Onyenwe anyị. Ọchịchọ ya bụ ka ọ dị nsọ nʼanụ ahụ ya na nʼime mmụọ ya. Ma nwanyị nwere di na-echegbu onwe ya banyere ihe nke ụwa a, otu ọ ga-esi mee ihe ga-atọ di ya ụtọ.
he is divided. The unmarried woman or the virgin is concerned about the things of the Lord, how to be set apart in body and in spirit. But the married woman is concerned about the things of the world, how to please her husband.
35 Ana m ekwu ihe ndị a maka ọ dị mma nke unu onwe unu, ọ bụghị ịgbalị igbochi unu, kama ọ bụ ka unu nwee ike bie ndụ unu nʼụzọ kwesiri ekwesi, werekwa ịhụnanya zuruoke rụọra Onyenwe anyị ọrụ.
I say this for your own benefit, and not to put any constraint on you. I say this for what is right, so that you may be devoted to the Lord without any distraction.
36 Ọ bụrụ na nwoke ọbụla enweghị ike ijide onwe ya nʼihi agụụ mmekọrịta nke nwoke na nwanyị na-agụ ya nʼebe nwaagbọghọ ya na ya kpebiri ịlụ nọ, ya mee ihe ọ na-achọ, o meghị mmehie ọbụla, ha lụọ di na nwunye.
But if anyone thinks that he is not treating his fiancée with respect—if she is beyond the age of marriage and it must be so—he should do what he wants. He is not sinning. They should marry.
37 Ma ọ bụrụ na onye ọbụla ekpebie nʼobi ya, ma nwee ike ijide onwe ya, ka o si nʼenweghị mmanye ọbụla idebe nwaagbọghọ e kwuru na ọ ga-alụ na-enweghị mmekọ ọbụla, ọ bụ ihe dị mma ka o mere.
But if he is standing firm in his heart, if he is not under pressure but can control his own will, and if he has decided in his own heart to do this, to keep his own fiancée a virgin, he will do well.
38 Ya mere, onye ahụ lụrụ nwaagbọghọ o kwuru na ọ ga-alụ mere nke ọma, ma onye kpebikwara na ọ gaghị alụ mekwara nke ọma karịa.
So the one who marries his fiancée does well, and the one who chooses not to marry will do even better.
39 Njikọta e jikọtara nwunye na di ya na-adị ire naanị mgbe di nwanyị dị ndụ. Ọ bụrụ na di ya anwụọ o nwere ike ịlụ di ọzọ, ma ọ lụọ ya nʼime Onyenwe anyị.
A woman is bound to her husband for as long as he lives. But if her husband dies, she is free to marry whomever she wishes to marry, but only in the Lord.
40 Nʼuche m, ọ ga-enwe ọṅụ nʼobi ya karịa ma ọ bụrụ na ọ lụghị di ọzọ. Ana m echekwa na mụ onwe m nwekwara Mmụọ nke Chineke.
Yet in my judgment she would be happier if she lives as she is. And I think that I also have the Spirit of God.