< 1 Ndị Kọrint 6 >

1 Mgbe onye ọbụla nʼetiti unu nwere esemokwu megide ibe ya, unu ọ pụrụ i buru okwu ahụ gaa nʼụlọikpe ka ndị ajọ omume kpeere unu ikpe, karịa ịga ya nʼihu ndị nsọ?
Ngati mundu yeyoha pagati yinu avi na luhonda na muyaki msadika, ihotola wuli kumtakila mlongo waki palongola ya vandu vangammanya Chapanga, pahala pa kumtakila palongolo ya vandu va Chapanga?
2 Ọ bụ na unu amabeghị na ọ bụ ndị nsọ ga-ekpe ụwa ikpe? Ọ bụrụkwa na unu ga-ekpe ụwa ikpe, ọ pụtara na unu etozughị oke idozi okwu ntakịrị dapụtara nʼetiti unu?
Wu, mmanyi lepi kuvya vandu va Chapanga yati vakuvahamula vandu va mulima? Ngati mulima yati uhamuliwa na nyenye, ndava kyani muganikiwa lepi kuhamula hati mambu gadebe?
3 Ọ bụ na unu amataghị na ọ bụ anyị ga-ekpe ndị mmụọ ozi ikpe? Gịnị ga-emekwa ka anyị ghara idozi okwu ụka dịkarịsịrị nta nke ndụ a?
Mmanyi lepi ngati yati mkuvahamula vamitumi va kunani kwa Chapanga? Wu, lepi neju ya mambu ga pamulima!
4 Ya mere, ọ bụrụ na esemokwu dị otu a adapụta nʼetiti unu, unu ga-ewere okwu ahụ jekwuru ndị ibi ndụ ha na-akpọ nzukọ ihe efu ka ha kpee ya?
Pemwiva na ngondo ngati iyi, ndava kyani muhamba kwa vandu vangali vachilongosi va Nyumba ya Chapanga?
5 Ana m ekwu nke a ime ka ihere mee unu. Ọ ga-abụ na e nweghị ike ịchọta ọ bụladị otu onye maara ihe nʼetiti unu, onye ga na-ekpe ikpe dị nʼetiti nwanna na ibe ya?
Soni kwinu! Ndi kujova kawaka hati mmonga pagati yinu mweavi na luhala wa kuhotola kuhamula mihalu pagati ya vasadika?
6 Ma lee, nwanna na-akpọrọ nwanna ya aga ụlọ ikpe, ka ndị na-ekweghị ekwe kpee ha ikpe!
Nambu hinu valongo vasadika vakumtakila myavi palongolo ya libanji la mihalu ya vandu vangasadika vahamula.
7 Ebe unu na-enwe esemokwu nke ikpe ikpe nʼetiti unu, ọ pụtara na unu bụ ndị emeriri kpamkpam. Nʼihi gịnị ka unu na-adịghị ekwe ka emejọ unu? Nʼihi gịnị ka unu na-adịghị ekwe ka a ghọgbuo unu?
Chakaka kutakilani kwenuku nyenye mwavene kulangisa hotohoto kuvya mwangahotola! Wu, ngayivii chabwina lepi kukongewa! Wu, chabwina lepi kukongewa? Chabwina lepi kwinu kunyagiwa vindu vinu?
8 Ma unu onwe unu na-emejọ, ma na-aghọgbu, ọ bụladị ụmụnna unu nʼime Kraịst.
Nambu, pahala paki, nyenye ndi myiva na kunyaga, kangi ago mukuvakitila valongo vinu!
9 Ọ bụ na unu amaghị na ndị na-eme ajọ omume dị otu a enweghị oke ọbụla nʼalaeze Chineke? Unu ekwela ka eduhie unu. Nʼihi na ọ dịghị onye ọbụla na-akwa iko, na ndị na-efe arụsị, ndị ikom nwere nwunye na-akwa iko, na ndị ikom na-eji ndị ikom ibe ha akwa iko,
Wu, mmanyi lepi kuvya vandu vahakau vipewa lepi Unkosi wa Chapanga? Mkoto kukongewa! Vevikita ukemi, vevigundamila vimong'omong'o, vagosi kugona na vagosi vayavi, na vadala kwa vadala,
10 ndị niile na-ezu ohi, ndị anya ukwu, ndị na-aṅụbiga mmanya oke, ndị nkwutọ, maọbụ ndị na-apụnara mmadụ ihe ha nwere, agaghị eketa oke nʼalaeze Chineke.
vahiji, vevinota, vevigala, veviheha, vevinyaga, veviliga venavo voha vihanganila lepi muunkosi wa Chapanga.
11 Na mbụ, ụfọdụ nʼime unu na-ebi ndụ dị otu a. Ma ugbu a, a sachapụla mmehie unu, doo unu nsọ nye Chineke. Ọ bụkwa site nʼaha Onyenwe anyị Jisọs Kraịst na nʼime Mmụọ nke Chineke anyị ka a gụrụ unu ka ndị ezi omume.
Vangi vinu mwavi chenicho, nambu hinu mubaguliwi ndava ya Chapanga na kulolekana vabwina palongolo yaki kupitila BAMBU witu Yesu Kilisitu na kupitila Mpungu wa Chapanga witu.
12 Ị na-asị, “Enwere m ike ime ihe niile m maara na m kwesiri ime,” ma ọ bụghị ihe niile ga-abara m uru. “Enwere m ike ime ihe niile m maara ziri ezi,” ma a gaghị ekwe ka ihe ọbụla na-achị m.
Mundu ihotola kujova, “Kwa nene vindu vyoha viganikiwa.” Nambu lepi vindu vyoha vyeviganikiwa. Niyidikila kuvya kila chindu chiganikiwa kwa nene nambu mbwitu kutamiwa na chindu chochoha.
13 Unu na-asị, “E mere ihe oriri maka afọ, meekwa afọ maka ihe oriri, ma Chineke ga-emebi ma afọ ma ihe oriri.” Ekeghị ahụ anyị maka ịkwa iko, kama o mere ya maka Onyenwe anyị, Onyenwe anyị dịkwa maka ahụ anyị.
Mwihotola kujova, “Chakulya chivii ndava ya lileme, na lileme luvi ndava ya chakulya.” Nambu Chapanga yati akuvihalabisa vyoha. Higa ya mundu ndi lepi ukemi ndi kwa kumhengela BAMBU, na BAMBU ndi ndava ya higa.
14 Chineke mere ka Onyenwe anyị site nʼọnwụ bilie, ọ ga-ejikwa ike ya mee ka anyị si nʼọnwụ bilie.
Chapanga amyukisi BAMBU kuhuma mulifwa na tete mewa yati akutiyukisa kwa makakala gaki.
15 Ọ bụ na unu amataghị na ahụ unu bụ akụkụ ahụ Kraịst? Ọ dị mma na m ga-eji ahụ Kraịst mee ka e jikọtaa ya na ahụ nwanyị akwụna? Tụfiaa!
Wu, mmanyi lepi kuvya higa yinu ndi viwungo vya higa ya Kilisitu? Wu, nitola viungu vya Kilisitu niviwunganisayi na viwungu vya mkemi? Pehe!
16 Ọ bụ na unu amataghị na onye ya na nwanyị akwụna na-enwe mmekọrịta, ya na nwanyị ahụ bụ otu ahụ? Nʼihi na e kwuru, “Ha abụọ ga-abụ otu anụ ahụ.”
Muni, ngati chaumanyili, mwaiwungana na mkemi vivya higa yimonga, ngati chagijova Mayandiku Gamsopi, “Na vavili yati vivya higa yimonga.”
17 Ma onye ọbụla e jikọtara ya na Onyenwe anyị, ya na onye ahụ ga-abụ otu nʼime mmụọ.
Nambu mwajiwungi na BAMBU vivya Mpungu umonga na mwene.
18 Gbaaranụ mmehie ịkwa iko ọsọ. Ọ dịghị mmehie ọzọ na-emetụta anụ ahụ mmadụ dịka mmehie ịkwa iko. Ọ bụ mmehie mmadụ na-eme megide anụ ahụ ya.
Muleka kukita ugoni. Kumbudila Chapanga kungi kwoha kukitiwa kuvala ya higa nambu mkemi akumbudila chapanga ayikitila higa yaki mwene.
19 Ọ bụ na unu amataghị na ahụ unu bụ ụlọnsọ nke Mmụọ Nsọ ahụ Chineke nyere unu, onye bi nʼime unu? Anụ ahụ unu abụkwaghị nke unu onwe unu, kama unu bụ nke Chineke.
Wu, mmanyi lepi kuvya higa yinu ndi Nyumba ya Mpungu Msopi mweavimugati yinu, ndi mwemwampokili kuhuma kwa Chapanga? Nyenye, vindu vinu lepi mwavene nambu vindu vya Chapanga.
20 E jiri oke ọnụahịa zọpụta unu. Ya mere jirinụ anụ ahụ unu nye Chineke otuto.
Mwaguliwi kwa mashonga gamahele. Ndi muyihengelai higa yinu kwa kumlumba Chapanga.

< 1 Ndị Kọrint 6 >