< 1 Ndị Kọrint 5 >

1 Ọ bụ akụkọ doro anya na-enwe ịkwa iko nʼetiti unu, ụdị nke ndị na-ekweghị ekwe na-apụghị ime, ka unu na-eme. Otu onye nʼime ụlọ unu kpọọrọ nwunye nna ya, ha abụọ e biri.
Ὅλως ἀκούεται ἐν ὑμῖν πορνεία, καὶ τοιαύτη πορνεία ἥτις οὐδὲ ἐν τοῖς ἔθνεσιν, ὥστε γυναῖκά τινα τοῦ πατρὸς ἔχειν.
2 Ma unu na-akpa nganga? Ihe unu kwesiri ime ọ bụghị ịkwa akwa na iru ụjụ, na ime ka onye mere ihe dị otu a si nʼọgbakọ unu pụọ?
καὶ ὑμεῖς πεφυσιωμένοι ἐστέ, καὶ οὐχὶ μᾶλλον ἐπενθήσατε, ἵνα ἀρθῇ ἐκ μέσου ὑμῶν ὁ τὸ ἔργον τοῦτο πράξας;
3 Ọ bụ ezie na mụ na unu anọghị ugbu a, ma mụ na unu nọkwa nʼime mmụọ. Amaala m rịị onye ahụ ikpe dịka a ga-asị na mụ na unu nọ.
ἐγὼ μὲν γάρ, ἀπὼν τῷ σώματι παρὼν δὲ τῷ πνεύματι, ἤδη κέκρικα ὡς παρὼν τὸν οὕτως τοῦτο κατεργασάμενον
4 Eji m aha Onyenwe anyị ma ya ikpe. Mgbe unu zukọrọ, aga m anọnyere unu na mmụọ. Nʼoge ahụ, site nʼike Onyenwe anyị Jisọs,
ἐν τῷ ὀνόματι τοῦ κυρίου Ἰησοῦ, συναχθέντων ὑμῶν καὶ τοῦ ἐμοῦ πνεύματος σὺν τῇ δυνάμει τοῦ κυρίου ἡμῶν Ἰησοῦ,
5 werenụ nwoke a nyefee nʼaka ekwensu, ka ọ taa anụ ahụ ya ahụhụ, ka e nwee ike ịzọpụta mmụọ ya, mgbe Onyenwe anyị lọghachiri.
παραδοῦναι τὸν τοιοῦτον τῷ σατανᾷ εἰς ὄλεθρον τῆς σαρκός, ἵνα τὸ πνεῦμα σωθῇ ἐν τῇ ἡμέρᾳ τοῦ κυρίου Ἰησοῦ.
6 Ịnya isi unu ezighị ezi. Ọ bụ unu amaghị na nwantakịrị yiist a gwakọrọ nʼụtụ ọka na-eme ka o koo?
Οὐ καλὸν τὸ καύχημα ὑμῶν. οὐκ οἴδατε ὅτι μικρὰ ζύμη ὅλον τὸ φύραμα ζυμοῖ;
7 Wepụnụ ihe nʼeko achịcha a nọ nʼetiti unu, ka unu bụrụ ndị dị ọhụrụ, na ndị dị ọcha. Nʼihi na a chụọlarị Kraịst, bụ aja nwa atụrụ, nke Ngabiga anyị.
ἐκκαθάρατε τὴν παλαιὰν ζύμην, ἵνα ἦτε νέον φύραμα, καθώς ἐστε ἄζυμοι· καὶ γὰρ τὸ πάσχα ἡμῶν ἐτύθη Χριστός·
8 Nʼihi ya ka anyị mee mmemme a na-ejighị ihe na-eko achịcha nke bụ ihe ọjọọ na obi ọjọọ, kama ka anyị jiri achịcha na-ekoghị eko nke bụ obi ọcha na eziokwu.
ὥστε ἑορτάζωμεν, μὴ ἐν ζύμῃ παλαιᾷ μηδὲ ἐν ζύμῃ κακίας καὶ πονηρίας, ἀλλ’ ἐν ἀζύμοις εἰλικρινίας καὶ ἀληθείας.
9 E dere m unu nʼime akwụkwọ ozi m, ka unu na ndị na-akwa iko ghara inwe mmekọ ọbụla.
Ἔγραψα ὑμῖν ἐν τῇ ἐπιστολῇ μὴ συναναμίγνυσθαι πόρνοις,
10 Ọ bụghị ihe gbasara ndị nke ụwa ndị na-akwa iko, maọbụ ndị anya ukwu, na ndị na-apụnara mmadụ ihe, maọbụ ndị na-ekpere arụsị. Ọ bụrụ otu a, ọ pụtara na unu ga-esi nʼụwa pụọ.
οὐ πάντως τοῖς πόρνοις τοῦ κόσμου τούτου ἢ τοῖς πλεονέκταις καὶ ἅρπαξιν ἢ εἰδωλολάτραις, ἐπεὶ ὠφείλετε ἄρα ἐκ τοῦ κόσμου ἐξελθεῖν.
11 Ma ugbu a, a na m edere unu ka unu na onye ọbụla nke na-akpọ onwe ya nwanna nwoke maọbụ nwanna nwanyị ghara imekọ ihe, ma ọ bụrụ na ọ na-ebi ndụ ịkwa iko, maọbụ nwee anya ukwu, maọbụ na-ekpere arụsị, onye na-ekwutọ ibe ya, onye na-aṅụbiga mmanya oke, maọbụ onye na-apụnara mmadụ ihe. Unu na ndị dị otu a erikọla nri.
νυνὶ δὲ ἔγραψα ὑμῖν μὴ συναναμίγνυσθαι ἐάν τις ἀδελφὸς ὀνομαζόμενος ᾖ πόρνος ἢ πλεονέκτης ἢ εἰδωλολάτρης ἢ λοίδορος ἢ μέθυσος ἢ ἅρπαξ, τῷ τοιούτῳ μηδὲ συνεσθίειν.
12 Kedụ nke gbasara m ikpe ndị na-esoghị na chọọchị ikpe? Ọ bụghị ndị nọ nʼime ka unu ga-ekpe ikpe.
τί γάρ μοι τοὺς ἔξω κρίνειν; οὐχὶ τοὺς ἔσω ὑμεῖς κρίνετε;
13 Chineke ga-ekpe ndị nọ nʼezi ikpe. “Chụpụnụ onye ajọọ mmadụ ahụ site nʼetiti unu.”
τοὺς δὲ ἔξω ὁ θεὸς κρινεῖ. ἐξάρατε τὸν πονηρὸν ἐξ ὑμῶν αὐτῶν.

< 1 Ndị Kọrint 5 >