< 1 Ndị Kọrint 3 >

1 Ụmụnna m, o siiri m ike ịgwa unu okwu dịka a ga-asị na unu bụ ndị tozuru etozu nʼime Mmụọ, kama agwara m unu okwu dịka ndị anụ ahụ ha na-achị, ndị bụ ụmụntakịrị nʼime Kraịst.
Nunene, kaka niadada ane, singa aentambue nunyenye anga miantu akinkolo, kuite anga miantu amuili. Anga niang'enye nianiino mung'wa Kilisto.
2 Ejighị m nri siri ike na-azụ unu, kama eji m mmiri ara na-azụ unu, nʼihi na unu apụghị iri nri dị ike. Nʼezie, ọ bụladị ugbu a, unu erubeghị iri nri siri ike.
Aenumung'wensilyo maele hange singa nyama, kunsoko aemuhitile kulya inyama. Sunga nitungu gaa muhitile.
3 Nʼihi na unu na-adị ndụ dịka ndị bi nʼụwa, ebe ọ bụ na ekworo na esemokwu na-adị nʼetiti unu, nke a o zipụtaghị na unu na-eme dịka ndị ụwa, dịka ndị mmadụ efu nọ nʼụwa.
Kunsoko unye keli miamuili. Kunsoko uwelu nukilolya keli yukigeeleka mitalanyu. Itee, shamukikie anga muili, Hange itee? Shamukugenda anga antuune?
4 Nʼihi na mgbe otu onye na-asị, “Abụ m nke Pọl,” onye ọzọ na-asịkwa, “Abụ m nke Apọlọs,” o gosighị na unu na-akpa agwa dịka ndị bi nʼụwa?
Kunsoko ung'wi wilunga, “Numutyatile Paulo” Numuya wilunga, “NUmulyatile Apolo, Shamikie anga antu nee?
5 Onye bụ Apọlọs? Onye bụ Pọl? Ọ bụ na anyị abụghị ndị na-eje ozi, ndị wetaara unu oziọma unu kweere nʼime ya. Ọrụ dị iche iche anyị rụrụ bụkwa nke anyị rụrụ dịka Onyenwe anyị si kenye anyị ọrụ ahụ.
U Apolo nyenyu? nu Paulo nyenyu? inge itumi ang'wa yuyu nemumukuie, kukela uyu nu Mukulu aumpee umulemo.
6 Ọ bụ m kụrụ mkpụrụ ahụ, Apọlọs bụkwa onye gbara mkpụrụ ahụ mmiri, maọbụ Chineke mere ka o too.
Unene aentemee, u Apolo wikihila imazi, kuile Itunda ukukulisa.
7 Onye kụrụ mkpụrụ ahụ na onye gbara mkpụrụ ahụ mmiri adịghị mkpa. Ọ bụ Chineke onye mere ka ha too dị mkpa.
Kuite, singa nutemee ang'wi nuehie imazi ukete kehi. Kuite Itunda ukukulisa.
8 O nweghị ihe dị iche nʼetiti mụ bụ onye kụrụ mkpụrụ ahụ na Apọlọs onye gbara mkpụrụ ahụ mmiri. Ọ bụ otu ihe ahụ ka anyị bu nʼobi. Onye ọbụla ga-anata ụgwọ ọrụ ya.
Itungo ile nutemee nuyu nuehie imazi ehi epalung'wi, hange kela ung'wi ukusingiilya ikinyamulimo kakwe anga muitumie umulimo wakwe.
9 Anyị so Chineke na-arụ ọrụ. Unu onwe unu bụkwanụ ubi Chineke bụrụkwa ụlọ ya a na-ewuli elu.
Kunsoko usese keituma mulimo wang'wi Tunda, unye mukiluilo kang'wi Tunda, minyumba ang'wi Tunda.
10 Eji m onyinye amara Chineke nyere m tọọ ntọala ọrụ a, dịka ezi onye ọka nʼiwu ụlọ, onye ọzọ amalitela iwukwasị ụlọ nʼelu ntọala ahụ. Ma ka onye ọbụla kpachapụ anya otu o si ewu.
Kunsoko aukende nuang'wi Tunda naempegilwe ange muzengi numukulu, aembikile ikitako, numungiza wikazenga migulya lakwe. Kuite umuntu watula wikesa nukuzenga migulya lakwe.
11 O nweghị onye ọzọ pụrụ ịtọ ntọala karịrị ntọala ahụ e bururị ụzọ tọọ. Jisọs Kraịst bụkwa ntọala ahụ.
Kunsoko kutile numungiza nukumile kuzenga ikitako nikingiza kukila nikizengilwe, nuanso Yesu Kilisto.
12 Ma ọ bụrụ na mmadụ ọbụla na-eji ọlaedo maọbụ ọlaọcha, ma ọ bụkwanụ nkume dị oke ọnụahịa, osisi maọbụ okporo ọka, ma ọ bụkwanụ ahịhịa na-ewukwasị nʼelu ntọala ahụ,
Itungo ile, ang'wi ung'wi wanyu ukuzenga migulya lakwe kuzahabu, mpia, magwe nansailo, ikota, mafa, ang'wi matutu,
13 ọrụ onye ọbụla ga-egosipụta ihe ọ bụ, nʼihi na Ụbọchị ahụ ga-eme ka ọ pụta ìhè. A ga-eji ọkụ kpughee ya nʼihi na ọ bụ ọkụ ka a ga-eji nwapụta ụdị ọrụ ọ bụ mmadụ ọbụla rụrụ.
umulemu wakwe ukukunukulwa, kuwetu nua mung'wi ukumigeelya. Kunsoko ekigeeligwa kumoto. Umoto ukugema uuza nua mulemo nuakela ung'wi nuitumile.
14 Ọ bụrụ na ọkụ eruchapụghị ihe ọbụla mmadụ ji wuo ụlọ ya nʼelu ntọala ahụ, onye ahụ ga-anata ụgwọ ọrụ.
Anga kehi umuntu nuzengile kekusaga, nuanso ukusingiilya ikipegwa nikiza.
15 Ma ọ bụrụ na ọkụ erechapụ ihe ọbụla mmadụ ji rụọ ọrụ ya, ọrụ ọ rụrụ ga-ala nʼiyi, ma a ga-azọpụta onye ahụ, ma ọ ga-adị ka a ga-asị na e si nʼụlọ na-ere ọkụ zọpụta ya.
Kuite ang'wi umulemo nua muntu ukulimansiila kumoto, ukulija asala. Kuite ung'wenso lukulu ukugunwa, anga uukinega mumoto.
16 Ọ bụ na unu aghọtaghị na unu bụ ụlọnsọ na Mmụọ Nsọ Chineke bi nʼime unu?
Shamuine kina unye menyumba ang'wi Tunda ni kina inkolo ang'wi Tunda ikie mukati anyu?
17 Ọ bụrụ na onye ọbụla emebie ụlọnsọ Chineke, Chineke ga-emebikwa onye ahụ. Nʼihi na ụlọ Chineke bụ ụlọ dị nsọ, unu bụkwa ụlọ ahụ.
Ang'wi umuntu ukumebipya inyumba ang'wi Tunda, Itunda ukumubipya umuntu nuanso. Kunsoko unyumba ang'wi Tunda ntakatifu, mutule uu.
18 Ka onye o bụla ghara ịghọgbu onwe ya, ọ bụrụ na onye ọbụla nʼime unu na-eche nʼobi ya na ya bụ onye maara ihe, dịka ihe ọmụma nke ụwa si dị, ọ ga-akara onye ahụ mma ime onwe ya onye nzuzu, ka o nwe ike bụrụ onye maara ihe. (aiōn g165)
Umuntu waleke kukongela ung'wenso, ang'wi wehi mitalanyu uine ukete ikulyo mumatungo aya, watule anga “mupungu,” uu ukutula nikulyo. (aiōn g165)
19 Nʼihi na ihe ahụ ụwa na-eche na ọ bụ ezi ịma ihe bụ nzuzu nʼanya Chineke. Nʼihi na e dere ya, “Ọ na-ejide ndị oke amamihe nʼaghụghọ ha niile.”
Kunsoko ikulyo nelamihi eye upungu ntongeela ang'wi Tunda, kunsoko iandekilwe, “Neaambisa niakete ikulyo kuhila yao.
20 Ọzọkwa, “Onyenwe anyị maara echiche obi mmadụ, mara na amamihe ya bụ ihe efu.”
Nehangi “Umukulu uine imasigo ao niikuligwa mabi.”
21 Nʼihi nke a, ka onye ọbụla ghara ịnya isi banyere mmadụ. Ihe niile bụ nke gị.
Kuite umuntu aleke kisania antu! Kunsoko imaintu ehi anyu.
22 Ma ọ bụ Pọl, maọbụ Apọlọs, maọbụ Sefas, maọbụ ụwa a, maọbụ ndụ, maọbụ ọnwụ, maọbụ ihe dị taa na ihe niile ga-adị nʼoge dị nʼihu, ha bụ nke unu.
Ang'wi Paulo, ang'wi Apolo, ang'wi Kefa, ang'wi ihe, ang'wi likalo, ang'wi nsha, ang'wi maintu nakole, ang'wi niikatula amole,
23 Unu bụkwa nke Kraịst, Kraịst bụkwa nke Chineke.
ehi anyu nunyenye miang'wa Kilisto, nu Kilisto wang'wi Tunda.

< 1 Ndị Kọrint 3 >