< 1 Ndị Kọrint 2 >
1 Ụmụnna m, mgbe m bịakwutere unu na mbụ, ejighị m mmụta m na oke okwu megharịa unu anya banyere ihe omimi niile nke okwu Chineke.
Pandakauya kwamuri, hama, handina kuuya nokugona kutaura kana uchenjeri hwapamusoro, pandakaparidza kwamuri uchapupu hwezvaMwari.
2 Nʼihi na ekpebiri m na naanị ihe m ga-ama nʼetiti unu bụ naanị ihe banyere Jisọs Kraịst na mkpọgbu a kpọgburu ya nʼelu obe.
Nokuti ndakati handidi kuziva chinhu pandakanga ndiri pakati penyu, asi Jesu Kristu, uye akarovererwa pamuchinjikwa.
3 Abịakwutere m unu nʼọnọdụ adịghị ike, oke ụjọ na ahụ ịma jijiji.
Ndakauya kwamuri muutera nokutya uye nokudedera kukuru.
4 Okwu m na ihe m kwusara abịakwaghị dịka okwu ire ụtọ na nke oke mmụta, ime ka ndị mmadụ kwere, kama ha bịara nʼụzọ igosi ọrụ nke Mmụọ Nsọ na ike ya.
Shoko rangu nokuparidza kwangu zvakanga zvisina mashoko okugombedzera nouchenjeri, asi nokuratidza kwesimba raMweya,
5 Ka okwukwe unu ghara ịdabere nʼamamihe mmadụ, kama ka ọ dabere nʼike Chineke.
kuti kutenda kwenyu kurege kuva kwouchenjeri hwavanhu, asi kuve kwesimba raMwari.
6 Ma otu ọ dị, anyị na-ekwu okwu amamihe nʼebe ndị tozuru oke nọ. Ma ọ bụghị amamihe nke oge a, maọbụ nke ndị na-achị ụwa taa, bụ ndị na-aghaghị ịla nʼiyi. (aiōn )
Zvisinei, tinotaura mashoko ouchenjeri pakati pavanhu vakura, asi kwete uchenjeri hwenyika ino, kana hwavabati venyika ino vachashayiwa simba. (aiōn )
7 Kama anyị na-ekwu okwu amamihe nke Chineke nʼụzọ dị omimi, bụ amamihe Chineke zonarịrị ụmụ mmadụ site na mbụ, nke Chineke kara aka tupu e kee ụwa na a ga-ekpughe ya nʼoge a maka iwetara anyị otuto. (aiōn )
Kwete, tinotaura uchenjeri hwaMwari hwakavanzika, uchenjeri hwakanga hwakafukidzwa uye hwakatemerwa kubwinya kwedu naMwari nyika isati yavapo. (aiōn )
8 O nweghị onye ọbụla nʼime ndị ọchịchị nke ọgbọ a ghọtara ihe banyere nzube a. Nʼihi na ọ bụrụ na ha maara ya, ha agaraghị akpọgbu Onyenwe otuto ahụ nʼobe. (aiōn )
Hakuna kana nomumwe wavabati venyika ino akahunzwisisa, nokuti dai vakahunzwisisa vangadai vasina kuroverera Ishe wokubwinya pamuchinjikwa. (aiōn )
9 Ma dịka e dere ya, “Ihe ahụ anya mmadụ na-ahụbeghị, ihe ahụ ntị mmadụ na-anụbeghị, ihe ahụ mmadụ na-echebeghị nʼobi ya, bụ ihe Chineke kwadoro, debere ndị niile hụrụ ya nʼanya.”
Asi sezvazvakanyorwa zvichinzi: “Hakuna ziso rakaona, hakuna nzeve yakanzwa; hakuna zvakapinda mumurangariro womunhu, zvakagadzirirwa naMwari vaya vanomuda.”
10 Ma Chineke e kpugherela anyị ihe omimi ndị a site na Mmụọ Nsọ ya. Mmụọ Nsọ bụ onye na-enyochapụta ihe omimi na ihe nzuzo niile dị Chineke nʼobi.
Asi Mwari akazviratidza kwatiri isu noMweya wake. Mweya anonzvera zvinhu zvose, kunyange nezvakadzika zvaMwari.
11 Ọ dịghị onye ọbụla pụrụ ịma ihe onye ọzọ na-eche nʼobi ya. Ọ bụ naanị mmụọ nọ nʼime onye ahụ bụ onye mara ihe niile banyere ya. Ọ dịkwaghị onye pụrụ ịmata ihe Chineke na-eche nʼobi ya, ma ọ bụghị naanị Mmụọ nke Chineke.
Nokuti ndianiko pakati pavanhu anoziva ndangariro dzomunhu kunze kwomweya womunhu uri mukati make? Saizvozvowo hakuna munhu anoziva ndangariro dzaMwari kunze kwoMweya waMwari.
12 Ma mmụọ nke anyị natara abụghị mmụọ nke ụwa, kama ọ bụ Mmụọ nke sitere na Chineke, ka anyị nwee ike ịghọta onyinye amara niile Chineke nyere anyị.
Hatina kugamuchira mweya wenyika ino asi Mweya unobva kuna Mwari; kuti tinzwisise zvatakapiwa naMwari pachena.
13 Nke a bụ ihe anyị na-ekwu, ọ bụghị nʼokwu a kuziiri anyị site nʼamamihe mmadụ, kama site nʼokwu nke Mmụọ kuziri anyị; anyị ji okwu nke Mmụọ na-akọwa eziokwu nke mmụọ.
Izvi ndizvo zvatinotaura, tisingatauri namashoko atinodzidziswa nouchenjeri hwavanhu, asi namashoko atinodzidziswa naMweya, tichidudzira zvokwadi zvomweya namashoko omweya.
14 Ma mmadụ ahụ Mmụọ na-adịghị nʼime ya adịghị anabata ihe ndị ahụ sị na Mmụọ nke Chineke bịa, nʼihi na ha bụ nzuzu nʼebe onye ahụ nọ. Ọ naghị aghọta ha, nʼihi na ha bụ ihe a na-aghọta naanị site nʼike nke Mmụọ.
Munhu asina Mweya haangagamuchiri zvinhu zvinobva kuMweya waMwari, nokuti zvinonzwisisika nomweya.
15 Onye ahụ Mmụọ Nsọ na-achị achị na ndụ ya, nwere ike ịghọta ihe ọbụla ma ya onwe ya bụ onye mmadụ ọbụla na-enweghị ike ịghọta.
Munhu ari muMweya anonzwisisa zvinhu zvose, asi iye pachake haanganzwisiswi nomunhu:
16 Nʼihi na, “Onye maara uche Onyenwe anyị ruo na ọ ga-ezi ya ụzọ?” Ma anyị onwe anyị nwere uche nke Kraịst.
“Nokuti, ndianiko akaziva murangariro waShe kuti amudzidzise?” Asi isu tino murangariro waKristu.