< 1 Ndị Kọrint 2 >
1 Ụmụnna m, mgbe m bịakwutere unu na mbụ, ejighị m mmụta m na oke okwu megharịa unu anya banyere ihe omimi niile nke okwu Chineke.
弟兄们,从前我到你们那里去,并没有用高言大智对你们宣传 神的奥秘。
2 Nʼihi na ekpebiri m na naanị ihe m ga-ama nʼetiti unu bụ naanị ihe banyere Jisọs Kraịst na mkpọgbu a kpọgburu ya nʼelu obe.
因为我曾定了主意,在你们中间不知道别的,只知道耶稣基督并他钉十字架。
3 Abịakwutere m unu nʼọnọdụ adịghị ike, oke ụjọ na ahụ ịma jijiji.
我在你们那里,又软弱,又惧怕又甚战兢。
4 Okwu m na ihe m kwusara abịakwaghị dịka okwu ire ụtọ na nke oke mmụta, ime ka ndị mmadụ kwere, kama ha bịara nʼụzọ igosi ọrụ nke Mmụọ Nsọ na ike ya.
我说的话、讲的道,不是用智慧委婉的言语,乃是用圣灵和大能的明证,
5 Ka okwukwe unu ghara ịdabere nʼamamihe mmadụ, kama ka ọ dabere nʼike Chineke.
叫你们的信不在乎人的智慧,只在乎 神的大能。
6 Ma otu ọ dị, anyị na-ekwu okwu amamihe nʼebe ndị tozuru oke nọ. Ma ọ bụghị amamihe nke oge a, maọbụ nke ndị na-achị ụwa taa, bụ ndị na-aghaghị ịla nʼiyi. (aiōn )
然而,在完全的人中,我们也讲智慧。但不是这世上的智慧,也不是这世上有权有位、将要败亡之人的智慧。 (aiōn )
7 Kama anyị na-ekwu okwu amamihe nke Chineke nʼụzọ dị omimi, bụ amamihe Chineke zonarịrị ụmụ mmadụ site na mbụ, nke Chineke kara aka tupu e kee ụwa na a ga-ekpughe ya nʼoge a maka iwetara anyị otuto. (aiōn )
我们讲的,乃是从前所隐藏、 神奥秘的智慧,就是 神在万世以前预定使我们得荣耀的。 (aiōn )
8 O nweghị onye ọbụla nʼime ndị ọchịchị nke ọgbọ a ghọtara ihe banyere nzube a. Nʼihi na ọ bụrụ na ha maara ya, ha agaraghị akpọgbu Onyenwe otuto ahụ nʼobe. (aiōn )
这智慧世上有权有位的人没有一个知道的,他们若知道,就不把荣耀的主钉在十字架上了。 (aiōn )
9 Ma dịka e dere ya, “Ihe ahụ anya mmadụ na-ahụbeghị, ihe ahụ ntị mmadụ na-anụbeghị, ihe ahụ mmadụ na-echebeghị nʼobi ya, bụ ihe Chineke kwadoro, debere ndị niile hụrụ ya nʼanya.”
如经上所记: 神为爱他的人所预备的 是眼睛未曾看见, 耳朵未曾听见, 人心也未曾想到的。
10 Ma Chineke e kpugherela anyị ihe omimi ndị a site na Mmụọ Nsọ ya. Mmụọ Nsọ bụ onye na-enyochapụta ihe omimi na ihe nzuzo niile dị Chineke nʼobi.
只有 神借着圣灵向我们显明了,因为圣灵参透万事,就是 神深奥的事也参透了。
11 Ọ dịghị onye ọbụla pụrụ ịma ihe onye ọzọ na-eche nʼobi ya. Ọ bụ naanị mmụọ nọ nʼime onye ahụ bụ onye mara ihe niile banyere ya. Ọ dịkwaghị onye pụrụ ịmata ihe Chineke na-eche nʼobi ya, ma ọ bụghị naanị Mmụọ nke Chineke.
除了在人里头的灵,谁知道人的事?像这样,除了 神的灵,也没有人知道 神的事。
12 Ma mmụọ nke anyị natara abụghị mmụọ nke ụwa, kama ọ bụ Mmụọ nke sitere na Chineke, ka anyị nwee ike ịghọta onyinye amara niile Chineke nyere anyị.
我们所领受的,并不是世上的灵,乃是从 神来的灵,叫我们能知道 神开恩赐给我们的事。
13 Nke a bụ ihe anyị na-ekwu, ọ bụghị nʼokwu a kuziiri anyị site nʼamamihe mmadụ, kama site nʼokwu nke Mmụọ kuziri anyị; anyị ji okwu nke Mmụọ na-akọwa eziokwu nke mmụọ.
并且我们讲说这些事,不是用人智慧所指教的言语,乃是用圣灵所指教的言语,将属灵的话解释属灵的事。
14 Ma mmadụ ahụ Mmụọ na-adịghị nʼime ya adịghị anabata ihe ndị ahụ sị na Mmụọ nke Chineke bịa, nʼihi na ha bụ nzuzu nʼebe onye ahụ nọ. Ọ naghị aghọta ha, nʼihi na ha bụ ihe a na-aghọta naanị site nʼike nke Mmụọ.
然而,属血气的人不领会 神圣灵的事,反倒以为愚拙,并且不能知道,因为这些事惟有属灵的人才能看透。
15 Onye ahụ Mmụọ Nsọ na-achị achị na ndụ ya, nwere ike ịghọta ihe ọbụla ma ya onwe ya bụ onye mmadụ ọbụla na-enweghị ike ịghọta.
属灵的人能看透万事,却没有一人能看透了他。
16 Nʼihi na, “Onye maara uche Onyenwe anyị ruo na ọ ga-ezi ya ụzọ?” Ma anyị onwe anyị nwere uche nke Kraịst.
谁曾知道主的心去教导他呢?但我们是有基督的心了。