< 1 Ndị Kọrint 15 >
1 Ụmụnna m, ugbu a achọrọ m ime ka unu cheta oziọma ahụ m ziri unu mgbe m buru ụzọ bịakwute unu, nke unu kweere na ya, na nke unu guzosikwara ike nʼelu ya.
Eshi embizusya bha kolo na mwailombo juu yizu lyana bhalombeleye amba mwaliposheye na hwemelele nalyo.
2 E si nʼoziọma a zọpụta unu, ma ọ bụrụ na unu ejiri obi unu niile jidesie ihe unu kweere na ya ike. Inwe okwukwe nʼihe ọzọ dị iche agaghị enyere unu aka.
Katika izu eli mwaushe nkashele mubhalikhate imara izu lyanabhalombeleye amwe afanaje mwaheteshe wene.
3 Ihe m nyefere unu nʼaka na mbụ bụ ozi ahụ m natara ị debe, nke dị oke mkpa, na Kraịst nwụrụ ọnwụ nʼihi mmehie anyị, dịka akwụkwọ nsọ kwuru na ọ ga-anwụ.
Nkashele pawandilo shanaposheye humuhimu naletile hwilimwe: neshe shehweli aje arengane ne nsimbo, Kristi afwiye kwajili yembibhi zwetu,
4 Na e liri ya, ma e mere ka o si nʼọnwụ bilie nʼụbọchị nke atọ, dịka akwụkwọ nsọ kwukwara na ọ ga-eme.
alengane nensimbo asyelelwe naje azwoshele isiku elyatatu.
5 O gosiri Sefas onwe ya, emesịa, ndị ozi iri na abụọ ahụ hụkwara ya.
Naje abhonesha bhwa Kefa, antele hwabhala kumi na bhabhele.
6 Emesịakwa, o gosiri ihe karịrị narị mmadụ ise nʼime ụmụnna onwe ya, nʼotu mgbe, ọtụtụ nʼime ndị ahụ ka nọ ndụ taa, ọ bụ ezie na ụfọdụ nʼime ha adaala nʼụra ọnwụ.
Antele abhoneshe hwa wakati umo abhoneshe hwa kolo na hwayiombo zaidi ya bhantu mia zisanu. Abhinji bado bhali womi, lelo bhamo bhagonile utulo.
7 Emesịa, Jemis hụrụ ya; o mekwara ka ndị ozi niile hụ ya.
Antele abhoneshe hwa Yakobo, antele abhonesha hwa tumwa bhonti.
8 Nʼikpeazụ, mụ onwe m hụkwara ya, dịka a ga-asị na m bụ nwa a na-amụghị nʼoge.
Mwisho wa gonti, abhoneshe hwiline neshe shila hwa mwana yapepwe husiku zwasezilisawa.
9 Nʼihi na ọ bụ m kachasị nta nʼime ndị ozi. O kwesikwaghị ka a akpọọ m onyeozi ya nʼihi na alụsoro m nzukọ Chineke ọgụ nke ukwuu.
Afwanaje ane endi dodo hwa mitume. Sehwanziwa akwiziwe mtume, eshabhanza esha Ngolobhe
10 Ma site nʼamara nke Chineke, abụ m ihe m bụ. Ọ pụtakwara na amara ya nʼebe m nọ abụghị ihe efu. Kama arụsịrị m ọrụ ike karịchasịa ndị ozi niile. Ma nʼezie, ọ bụghị m na-arụ ọrụ a, kama ọ bụ Chineke nʼonwe ya na-arụ ọrụ ya nʼime m.
Lelo hu neema eya Ngolobhe endi neshe shehali na neema yakwe hwaline seyali yewene. Badala yakwe nabhombile ebidii ashile wonti. Lelo senaline ne bali neema eya Ngolobhe yeli mhati yane.
11 Ma ọ bụ m, maọbụ ndị ọzọ, otu a ka anyị siri kwusaa, otu a ka unu sikwa kwere.
Eshi nkashile nene au bhebho ulombelela esho taminile esho.
12 Ma ọ bụrụ na a na-ekwusa na Kraịst si nʼọnwụ bilie, gịnị mere ụfọdụ unu ji na-ekwu na ndị nwụrụ anwụ apụghị isi nʼọnwụ bilie ọzọ.
Eshe nkashele Kristi alombele we aje asyoshele hwa bhafwe, ebhe hwele mubhabhobho muyigo nahumo azwoshe bhabhafwiye?
13 Ọ bụrụ na ndị nwụrụ anwụ a pụghị i si nʼọnwụ bilie, nke a pụtara na e meghị ka Kraịst site nʼọnwụ bilie.
Lelo nkashele nahumo azwoshe abhafwe basi hata Kristi sagazweshele.
14 Ọ bụrụkwa na e meghị ka Kraịst si nʼọnwụ bilie, ihe anyị na-ezisa bụ ihe efu, okwukwe unu nwere bụkwa ihe efu.
Na nkashile Kristi sagazwoshele esho alombelele hwetu hubhe hwewene imani yetu abhe yewene.
15 Ma karịa nke a, a na-ahụta anyị ka ndị ama ụgha nke Chineke, nʼihi na anyị gbara ama banyere Chineke, na-asị na o mere ka Kraịst si nʼọnwụ bilie, bụ onye ọ na-emeghị ka o si nʼọnwụ bilie ma ọ bụrụ na-emeghị ka ndị nwụrụ anwụ dị ndụ ọzọ.
Na tipatihene aje bhashahidi bhwilenka ahusu Ungolobhe kwa sababu tishuhudie Ungolobhe sha hwisalo aje azwozwe Kristi wakati sagazwozwezwe.
16 Nʼihi na, ọ bụrụ na a pụghị ime ka ndị nwụrụ anwụ bilie dị ndụ ọzọ, emekwaghị ka Kraịst si nʼọnwụ bilie.
Nkashile abhafwe sebhazwoha, U Yesu wape sagazwoshele.
17 Ma ọ bụrụ na-emeghị ka Kraịst si nʼọnwụ bilie, okwukwe unu bụ ihe efu, unu ka ga-anwụ na mmehie unu.
Nkashile Kristi sagazwoshele ahwamini hwetu ni bure na msele mlimbibhi zwenyu.
18 Mgbe ahụ ndị nwụrụ anwụ nʼime Kraịst lara nʼiyi.
Esho hata bhala bhabhafwiye katika Kristi bhape bhatejele.
19 Ọ bụrụkwa na olileanya anyị nʼime Kraịst gwụrụ naanị na ndụ anyị nʼime ụwa a, anyị bụ ndị e kwesiri ka e mere ebere.
Nkashele humaisha ega gene yaje tilinoujasili hwa wakati wa wayenza mhati mwa Kristi abhantu wonti, atee tibhalongwe zaidi ya bhantu wonti.
20 Ma e mere ka Kraịst si nʼọnwụ bilie nʼezie, onye mbụ nʼetiti ndị niile nwụrụ anwụ.
Lelo eshi Kristi azwoshele afume hwabhafwiye, madodo agahwande gabhala bhabhafwiye.
21 Nʼihi na dịka ọnwụ si site nʼaka otu nwoke bịa, otu a kwa ka mbilite nʼọnwụ si site nʼaka otu nwoke bịa.
Afwanaje efwa ehenzele ashilile umuntu, antele ashilile muntu azwosyewe hwa bhabhafwiye.
22 Dịka mmadụ niile si anwụ site nʼaka Adam, otu a kwa ka mmadụ niile ga-esi dịkwa ndụ nʼime Kraịst.
Afwatanaje nkashele katika u Adamu bhantu bhonti bhafwa, esho nantele katika Kristi bhayibhombwa womi wakati ubhenze hwakwe.
23 Onye ọbụla ga-ebili nʼusoro nke ya, Kraịst mkpụrụ mbụ si nʼọnwụ bilie. Mgbe ọ lọghachiri, ndị niile bụ ndị nke Kraịst ga-esote.
Lelo kila muntu katika shapajile hwakwe kristi madondo aga hwande antele bhala bhabhli Kristi bhayibhomba bhomi wakati uwahwenza hwakwe.
24 Mgbe nke a gasịrị, ọgwụgwụ ihe niile ga-abịa, mgbe ọ ga-enyefe alaeze nʼaka Chineke bụ Nna, nʼihi na o meriela ịchị isi niile, na ikike niile na ike niile.
Ndipo waibha umalilo, pala uKristi nayibha akabidhi umwene uwa Ngolobhe uBaba. Ene pala nayibha akomesya oungozi wonti nemamlaka gonti ne nguvu zwonti.
25 Nʼihi na ọ ga-abụ eze tutu ruo mgbe ọ lụgburu ndị iro ya niile, doo ha nʼokpuru ụkwụ ya.
Afwatanaje lazima atawale mpaka nayibhabheha abhibhibha kwe pansi eye magagakwe.
26 Onye iro ikpeazụ a ga-emeri bụ ọnwụ.
Ubhibhi uamalishile uwnankayiziwe efwa.
27 Nʼihi na “O doola ihe niile nʼokpuru ụkwụ ya.” Ma mgbe ọbụla asịrị, “e doola ihe niile” nʼokpuru ụkwụ ya, o doro anya na Chineke agụnyeghị onwe ya, nʼihi na ọ bụ ya tinyere ihe niile nʼokpuru Kraịst.
Afwanaje “abheshele kila hantu pansi pamanamagakwe.” Lelo neyanga abheshele kila hantu ni wazi aje ene sehusizwa bhala bhabhabhehwelwe kila muntu pansi yakwe yoyo.
28 Mgbe e merela ka ihe niile nọrọ nʼokpuru ya, mgbe ahụ, Ọkpara ya nʼonwe ya, ga-edobe onwe ya nʼokpuru onye ahụ dobere ihe niile nʼokpuru ya, ka Chineke bụrụ onye na-achị ihe niile.
Wakati evintu vyonti vibhehwelwe pansi yakwe, antele Umwana wakwe yoyo ayibhelwa pansi ya mwahele ambaye abheshele evintu vyonti pansi yakwe. Ene ebhoneshe ili kwamba Ungolobhe uBaba abhe gonti katika vyonti.
29 Ma ọ bụghị otu a, gịnị mere ụfọdụ ji eme ndị otu ha baptizim nʼọnọdụ ndị nwụrụ anwụ? Ọ bụrụ na e meghị ka ndị nwụrụ anwụ si nʼọnwụ bilie ma ọlị, nʼihi gịnị ka a na-eme mmadụ ndị a baptizim nʼọnọdụ ha?
Au nantele bhabhombe yenu bhala bhabhahozwe kwajili bhabhafweye? Nkashile abhafwa sebhazwoha tee, yenu antele bhahozi wa kwajili yabho?
30 Gịnị mere anyị ji nọrọ nʼize ndụ nʼoge awa ọbụla?
Naye nu tilimhatari kila sala?
31 Nʼịgwa unu eziokwu, ụmụnna m, ana m ezute ọnwụ kwa ụbọchị. Ihe m ji kwupụta nke a bụ nʼihi ịnya isi nke m ji unu anya nʼime Jisọs Kraịst, Onyenwe anyị.
Kolo na Yilombo bhane ashilile ahwisifu hwane katika amwe ambayo endinayo o katika Kristi Yesu Gosi wetu etangazwa eshe efwa kila lisiku.
32 Ọ bụrụ na ndụ anyị na-agwụ nʼụwa a, dịka ndị mmadụ na-ekwu, gịnị bụkwanụ uru m nwere nʼihi ọgụ m na-alụso anụ ọhịa, bụ ndị ikom Efesọs? Ọ bụrụ na a gaghị eme ka ndị nwụrụ anwụ bilie, “Ka anyị rienụ, ṅụọkwanụ, nʼihi na echi anyị ga-anwụ.”
Esaidila yenu katika enyelezwo ezwe bhanadamu nkashele nakhomene wanyama akhali ohwo hwa Efeso, nkashile bhabhafwiye? “Sebhazwoha leha basi tilyaje na mwele, afwanaje sandabho taifwa.”
33 Unu ekwela ka e duhie unu. Nʼihi na mkparịkọta agwa ọjọọ na-emebi ezi agwa.
Mganje akhopelwe sololile amabhibhi gunankanya etabia enyinza.
34 Sitenụ na ndụ enweghị nghọta unu lọghachita dịka unu kwesiri, unu emehiekwala ọzọ. Nʼihi na-enwere ụfọdụ bụ ndị na-amaghị Chineke. Ana m ekwu nke a ka ihere mee unu.
“Mubhanje nekiasi! mkhalaje katika lyoli mgaje ahwendele abhombo embibhi. Afwanaje bhamobhamo kati yenyu sebhanowelewa uwa Ngolobhe eyanga eshi kwa esoni zwenyu.
35 Ma ụfọdụ ga-ajụ, “Olee otu a ga-esi mee ka onye nwụrụ anwụ bilie? Olee ụdị ahụ ha ga-enwe mgbe ha ga-apụta?”
Lelo umuntu uhwenje abhayanje, Hwele abhafwe bhazwoha? Wape bhayenza neshe hwelebhwele nobele?”
36 Onye nzuzu! Mkpụrụ ọka i tinyere nʼala agaghị epu ma ọ bụrụ na o bughị ụzọ nwụọ.
Awe ulilema tee! shila shahatotile seshiwezizwe ahwande amele isipokua shifwiye.
37 Mgbe ị na-agha mkpụrụ, ọ bụghị anụ ahụ nke ga-apụta ka ị na-agha, kama ọ bụ naanị mkpụrụ nkịtị, eleghị anya mkpụrụ ọka wiiti, maọbụ mkpụrụ ọzọ.
Na shila shotota se bele ambao gwaibha bali mbeyu yechi puye ahwezizwe abhengano au hantu ahamwao.
38 Ma Chineke na-enye ya ahụ dịka o si chọọ. Ọ na-enyekwa mkpụrụ ọbụla nʼime mkpụrụ niile ahụ nke kwesiri ya.
Lelo Ungolobhe ayipela ubele shasongwelwe umwahale na katika kila mbeyu bele ngwakwe mwenyewe.
39 Anụ ahụ niile abụghị otu, mmadụ nwere anụ ahụ dị iche, anụ ọhịa nwere ụdị anụ ahụ nke ha. Anụ ufe nwere anụ ahụ ha, azụ nwekwara nke ha.
Amabele gonti segelengene isipokuwa gahweli amabele gwa bhantu ubele gumo gwe makoko na ubele gumo wenyonyi gumo kwe samaki.
40 Ahụ nke eluigwe na ahụ nke ụwa dịkwa. Ma ịma mma na ebube nke ahụ nke eluigwe bụ otu, ịma mma na ebube nke ahụ nke ụwa dịkwa iche.
Antele gahweli amabele amwanya na mabele agapansi. Lelo uhwinza wakwe ubele ugwamwanya ni halimo nowa pansi hwenje.
41 Anyanwụ nwere ebube nke ya, ọnwa nwekwa nke ya, kpakpando nwekwara ebube nke ya. Kpakpando dịkwa iche site nʼibe ya nʼịma mma na ebube.
Huli uwinza umo wisaya na uwinza umo wemwezi, na uwinza umo wentondwe afwatanaje entondwe emo elegene nento ndwe uwinza.
42 Otu a ka ọ dị nʼebe mbilite nʼọnwụ ndị nwụrụ anwụ dị. Mgbe e liri anụ ahụ anyị, ihe nwụrụ anwụ na nke pụrụ ire ure ka ọ bụ, ma mgbe e mere ka o si nʼọnwụ bilie, ọ gaghị anwụkwa ọzọ.
Esho shashihweli nante azwozwewe bhabhafwiye shitotwa shinanjiha shashimela seshinanjiha.
43 A na-eli ahụ onye nwụrụ anwụ dịka ihe enweghị ugwu, ma a na-eme ka o si nʼọnwụ bilie nʼebube. A na-eli onye nwụrụ anwụ nʼadịghị ike, ma a na-eme ka o si nʼọnwụ bilie nʼịdị ike.
Shitolilwe katika amatumizi agekawada shimezewa katika uwinza shitotilwa katika uswogusu shimezewa katika enguvu.
44 A na-eli onye nwụrụ anwụ dịka anụ ahụ nkịtị, ma a na-eme ka o jiri ahụ nke mmụọ kulite. Ọ bụrụ na e nwere anụ ahụ nkịtị, e nwekwara ahụ nke mmụọ.
Shitotilwe katika ubele wa silishimezwa katika ubele ushiroho nkashile kuguhweli ubele ugwe asili gwape ugweshiro guhweli.
45 E dere ya, “Mmadụ mbụ, bụ Adam, ghọrọ mkpụrụobi dị ndụ, Adam nke ikpeazụ bụ mmụọ na-enye ndụ.”
Esho antele esimbwilwe muntu uwa hwanda yuadamu abhombwelwe roho yekhala.” u Adamu uwamalisholo abhombeshe roho yefumya owomi.
46 Ma mmụọ e bughị ụzọ, kama ọ bụ ahụ nkịtị, ma mmụọ bịara nʼikpeazụ.
Lelo uwe shiroho sagahenzele kwanza bali uwe asili napande uweshiroho.
47 Mmadụ nke nwoke sitere nʼala, ejikwa aja kpụọ ya; mmadụ nke abụọ si nʼeluigwe bịa.
Umuntu uwa hwande wa pansi alengenyezewe humankondi. Umuntu uwabhele afumile umwanya.
48 Dị ka mmadụ nke mbụ ahụ e jiri aja kpụọ dị, otu a ka ndị niile si nʼaja pụta dịkwa. Ma dị ka mmadụ nke eluigwe ahụ dị, otu a ka ndị niile bụ ụmụ eluigwe dịkwa.
Neshe ula yalenganyiziwe humana ondi shesho antele bhala bhabhale ngenywe humankondi. Nkashile ula umuntu umbinguni shahweli nantele bhala abhamwanya.
49 Dịka anyị niile yikwasịrị onyinyo nke nwoke e jiri aja kpụọ, otu ahụkwa ka anyị ga-esi yikwasị onyinyo nke nwoke nke eluigwe.
Kama ambavyo tumebeba mfano wa mtu wa mavumbi, tutabeba pia mfano wa mtu wa mbinguni.
50 Ihe m na-ekwu, ụmụnna m, bụ na anụ ahụ na ọbara enweghị ike iketa alaeze Chineke. Ihe na-ere ure agaghịkwa eketa ereghị ure.
Eshe embabhola kolo na yilombo bhane aje ubele nedanda seviwezizwa aghale umwene uwa Ngolobhe, hata uwanankaye uwaghale wasiunajiha.
51 Ma geenụ ntị ka m gwa unu ihe omimi a! Ọ bụghị anyị niile na-aga ịnwụ, kama, a ga-enye anyị anụ ahụ ọhụrụ nke pụrụ iche.
Enye! Embabhola amwe esiri eyelyoli: Hetaifwa ntenti bali tenti bhonti bhaigalunyiwa.
52 Nʼotu mgbe, nʼotu ntabi anya, mgbe a ga-afụ opi ike ikpeazụ. Nʼihi na opi ga-ada, a ga-eme ka ndị nwụrụ anwụ si nʼọnwụ bilite na-ereghị ure. A ga-agbanwekwa anyị.
Taigalunyizwa katika uwa sizue na damlehwiliso katika endundwe eyahumalisho, afwatanale endundwe zwailila na bhabhafwiye bhaizwoha nehali eyesitenachishe.
53 Nʼihi na a ghaghị ịgbanwe anụ ahụ anyị a nke na-anwụ anwụ, nyekwa anyị ahụ nke na-agaghị anwụ ọzọ.
Maana uu wananjishe lazima ukwate waseunanjiha nogu wa fwa lazima ukwate wasegwa fwe.
54 Mgbe ahụ nke a pụrụ ire ure ga-eyikwasị ereghị ure, nke a pụrụ ịnwụ anwụ ga-eyikwasị anwụghị anwụ. Mgbe ahụ, okwu ahụ e dere nʼakwụkwọ nsọ ga-emezu, okwu ahụ sịrị, “Elomiela ọnwụ, meriekwa ike ya niile.”
Lelo uwakati owo wa nachishe wakwatiziwa sintenachishe huu uwafwe nkaukwate usintefwe, ndipo gwayenza enjango ambao usibwilwe, “Efwa emililwe katika ashindwe.”
55 “Ọnwụ, olee ebe mmeri gị dị? Ọnwụ, olee ebe ihe ụfụ gị dị?” (Hadēs )
“Efwa umenezwe waho ulihwi? Fwa ulihwi ulwoyo ulihwi?” (Hadēs )
56 Nʼihi na ihe ahụ ọnwụ ji agbata mmadụ bụ mmehie, ma ihe na-enye mmehie ike bụ iwu.
Ulyoyo uwefwa ni ubhibhi na enguvu ye ubhibhi ni sheria.
57 Ka ekele dịrị Chineke onye na-enye anyị mmeri site nʼOnyenwe anyị Jisọs Kraịst.
Lelo ehusalifwa Ungolobhe, atipela ate amene ashilile uGosi wetu uYesu Kristi!
58 Ya mere, ụmụnna m ndị m hụrụ nʼanya, kwụsienụ ike, bụrụnụ akwaa akwụrụ. Nọgidenụ nʼọrụ Onyenwe anyị mgbe niile, ebe unu maara na ọrụ unu na-arụ nʼime Onyenwe anyị abụghị ihe efu.
Eshi bhasungwena bhakolo na mwailombo bhanji imara na mgaje ayinje. Antele yibhombi embombo eya Gosi, kwa sababu mumenye aje embombo yenyu katika Gosi sio wene.