< 1 Ndị Kọrint 14 >
1 Ka ịhụnanya bụrụ isi ihe unu na-achọ. Chọsienụ onyinye nke Mmụọ Nsọ ike, nke ka nke onyinye inwe ike ibu amụma.
Дбайте про любов і жадайте духовного, найбільше ж, щоб пророкувати.
2 Onye ọbụla na-asụ asụsụ ọ na-amụghị amụ, bụ Chineke ka ọ na-agwa okwu, ọ bụghị mmadụ. Nʼezie, ọ dịghị onye na-aghọta ihe ọ na-ekwu; nʼihi na okwu ọ na-ekwu bụ ihe omimi site nʼike Mmụọ Nsọ.
Бо, хто говорить (чужою) мовою, не людям говорить, а Богу; бо нїхто не чує його; а духом він говорить тайне.
3 Ma onye ọbụla na-ebu amụma na-ezisa ozi na-enyere ndị mmadụ aka ito eto. Ọ na-agwakwa ha okwu nkasiobi na okwu na-ebuli mmụọ ha elu.
Хто ж пророкує, людям говорить на збудованнє, і напоминаннє і утїшеннє.
4 Ya mere, onye ahụ na-ebu amụma na-enyere chọọchị aka, ma onye ahụ na-asụ asụsụ ọzọ, na-enyere naanị onwe ya aka.
Хто говорить (чужою) мовою, себе збудовує; а хто пророкує, церкву збудовує.
5 Ọ gaara atọ m ụtọ ma a sị na unu niile nwere onyinye ịsụ asụsụ dị iche iche; ma ọ ga-atọ m karịa ma ọ bụrụ na unu niile enwee onyinye ibu amụma. Nke a bụ nʼihi na onye ahụ na-ebu amụma bara uru karịa onye na-asụ asụsụ dị iche iche. Ịsụ asụsụ ya ga-aba uru ma ọ bụrụ na ọ dị onye na-aghọta ihe ọ na-asụ, ka e nwee ike wulie chọọchị.
Хочу ж, щоб усї ви говорили мовами, та раднїщ, щоб пророкували; більший бо хто пророкує, ніж хто говорить мовами, хиба що й вияснює, щоб церква збудованнє прийняла.
6 Ụmụnna m ọ bụrụ na m bịakwutere unu malite ịsụ asụsụ unu na-adịghị aghọta, ole uru m baara unu, ma ọ bụghị ma m na-ekwu okwu banyere ihe ekpughere gosi m, maọbụ ihe niile m maara, maọbụ ihe gaje ime, maọbụ ihe nkuzi?
Тепер же, браттє, коли прийду до вас, мовами говорячи, то що вам за користь, коли вам не говорити му або одкриттєм, або знаннєм, або пророцтвом, або наукою?
7 Ọ bụkwa otu a ka ọ dị nʼetiti ihe niile na-enweghị ndụ, nke na-ada ụda, dịka ọja, maọbụ ụbọ akwara. Ọ bụrụ na ha enyeghị ụda dị iche site na nke ọzọ, olee ụzọ mmadụ ga-eji mara maọbụ ọja ka a na-afụ, maọbụ ụbọ akwara ka a na-akpọ.
Ба й бездушне, що дає голос, чи сопілка, чи гуслї, коли різноти голосу не дає, як розуміти, що виграєть ся в сопілку або в гуслї.
8 Ọ bụrụkwa na opi ike e ji akpọ ndị agha oku adapụtaghị ụda nke ọma, onye ga-ejikere ije agha?
Бо коли й сурма невиразний голос дає, то хто готовити меть ся до бою?
9 Nʼotu aka ahụ kwa, ọ bụrụ na ị na-agwa mmadụ okwu nʼasụsụ ọ na-adịghị anụ, olee otu ọ ga-esi ghọta ihe ị na-ekwu? Nʼoge ahụ, ifufe ka unu na-agwa okwu.
Так само й ви, коли подасте мовою незрозуміле слово, як зрозумієть ся говорене? на вітер бо говорити мете.
10 Asụsụ a na-asụ nʼụwa a dị ukwuu, ma ha niile bara uru nye ndị na-anụ ha.
Стільки, як от буває, родів слів на сьвітї, і ні одно з них без голосу.
11 Ọ bụrụ na m aghọtaghị ihe onye na-asụ otu nʼime asụsụ ndị a na-ekwu, aga m abụ ọbịa nʼebe onye na-asụ asụsụ ahụ nọ, ya onwe ya ga-abụkwa ọbịa nʼebe m nọ.
Коли ж не зрозумію значіння слів, буду тому, хто говорить, чужоземець, і хто говорить, чужоземець менї.
12 Ebe ọ na-agụ unu agụụ inweta onyinye nke Mmụọ Nsọ, chọọnụ onyinye ndị ahụ ga-enyere unu aka iwuli nzukọ elu.
Так і ви, коли дбаєте про дари духовні, то гледїть, щоб збагатіли ними на збудованнє церкві.
13 Onye ọbụla na-asụ asụsụ nʼolu dị iche iche, ga-ekpe ekpere ka e nye ya onyinye ịkọwa olu dị iche iche.
Так, хто говорить (чужою) мовою, нехай молить ся, щоб міг вияснювати.
14 Ọ bụrụ na m ji asụsụ dị iche na-ekpe ekpere, mmụọ m ga-eso m na-ekpe ekpere ahụ, ma uche m agaghị aghọta ekpere m na-ekpe.
Коли бо молюсь (чужою) мовою, дух мій молить ся, розуміннє ж моє без'овочне.
15 Ọ bụrụ na ọ dị otu a, olee ihe m ga-eme? Aga m eji mmụọ m kpee ekpere, jirikwa uche kpee ekpere. Aga m ejikwa mmụọ m bụọ abụ, jirikwa uche m bụọ abụ.
Що ж (робити)? Молити мусь духом, молити мусь же й розуміннєм; співати му духом, співати му й розуміннєм.
16 Ma o bụghị otu a, mgbe i ji asụsụ ọzọ nke a na-amaghị na-eto Chineke nʼime mmụọ, olee otu ndị niile nọ nʼụlọ nzukọ ahụ na-aghọtaghị ihe ị na-ekwu ga-esi zaa Amen?
Бо коли благословити меш духом, то як той, хто займе місце невче-ного, скаже на твоє дякуваннє, коли він не знає, що говориш.
17 Ọ bụ ezie na ị na-enye ekele nke ọma, ma ọ naghị ewuli onye ọbụla elu.
Ти бо добре дякуєш, тільки ж другий не збудовуєть ся.
18 Ana m ekele Chineke nʼihi na ana m asụ asụsụ dị iche iche karịa unu niile.
Дякую Богу моєму, що я більш усіх вас говорю мовами.
19 Ma mgbe ọbụla a gbakọrọ na nzukọ ife ofufe, ọ na-akara m mma ikwu naanị mkpụrụ okwu ise nke mmadụ niile ga-aghọta na nke ga-abakwara ha uru, karịa na m kwuru puku mkpụrụ okwu iri nʼasụsụ dị iche iche nke onye ọbụla na-apụghị ịghọta.
Тільки ж у церкві лучче мені пять слів промовити розуміннєм моїм, щоб і инших навчити, нїж десять тисяч слів (чужою) мовою.
20 Ụmụnna m, unu abụla ụmụntakịrị nʼechiche unu. Bụrụnụ ụmụntakịrị nʼihe gbasara ime ihe ọjọọ, ma bụrụnụ ndị nwere uche nʼihe gbasara ụdị okwu a.
Браттє, не бувайте дїти розуміннєм; нї, в лихому бувайте малолїтниками, у розумінню ж звершеними.
21 E dere ya nʼakwụkwọ iwu, “Site na egbugbere ọnụ ndị mba ọzọ sitekwa nʼire ndị na-asụ iche iche ka m ga-agwa ndị a okwu, ma ọbụladị otu a, ha agaghị ege m ntị, ka Onyenwe anyị kwuru.”
В законї писано: Чужими язиками й чужими устами говорити му людям сим, та й так не послухають мене, глаголе Господь.
22 Ịsụ asụsụ dị iche iche abụghị ihe nlere anya nye ndị kwere ekwe, kama ọ bụ ihe ama nye ndị na-ekweghị ekwe. Ma ibu amụma bụ maka ndị kwere ekwe, ọ bụghị maka ndị na-ekweghị ekwe.
Тимже язики на ознаку не тим, хто вірує, а невірним; пророцтво ж не невірним, а віруючим.
23 Ọ bụrụ na nzukọ niile ezukọọ nʼọgbakọ ekpere, mmadụ niile a na-asụ nʼolu dị iche iche nʼotu mgbe, ọ bụrụkwa na ndị na-aghọtaghị, maọbụ ndị na-ekweghị ekwe abata nʼebe ahụ, gịnị ka ha ga-ekwu? Ha ọ gaghị asị na isi emebiela ndị a?
Коли оце зійдеть ся вся церква докупи, і всі чужими мовами заговорять, увійдуть же і невчені або невірні, то чи не скажуть, що ви дурієте?
24 Ma ọ bụrụ na onye na-ekweghị ekwe maọbụ onye ọhụrụ abata mgbe onye ọbụla na-ebu amụma, ha ga-abụ ndị mmadụ niile ga-atụ mmehie ha nʼanya maakwa ha ikpe mmehie.
Коли ж усї пророкують і ввійде хто невірний або невчений, то від усїх буде докорений і від усіх суджений.
25 Mgbe a na-eme ka ihe nzuzo nke obi ha niile pụta ìhè, onye dị otu a ga-egbu ikpere nʼala kpọọ isiala nye Chineke sị, “Nʼezie, Chineke nọ nʼetiti unu.”
І так тайни серця його виявлять ся, і так припавши лицем, поклонить ся Богові, звіщаючи, що справді з вами Бог.
26 Ugbu a, ụmụnna m, kedụ otu o kwesiri ịdị? Mgbe ọbụla unu zukọrọ, ụfọdụ kwesiri ịbụ abụ, onye ọzọ ga-ezi unu ihe; maọbụ gwa unu ozi dị mkpa e gosiri ya, maọbụ jiri asụsụ nke ọ na-amụghị gwa unu okwu, ka onye ọzọ kọwaa ihe onye ji asụsụ a dị iche kwuo okwu kwuru. Ma ka ihe ọbụla e mere nʼime ụlọ chọọchị bụrụ ihe ga-ewuli onye ọbụla elu.
Що ж (треба робити), браттє? Коли сходитесь, і кожен псальму має, науку має, мову має, одкритте має, виясненнє має, - усе на збудованнє нехай буде.
27 A sịkwa na ọ dị ndị chọrọ iji asụsụ dị iche kwuo okwu, ka mmadụ abụọ maọbụ atọ kwuo. Kama ka ha kwuo nʼotu nʼotu nʼusoro. Ka onye ga-akọwa ihe ha kwuru nọrọkwa nʼebe ahụ.
Коли хто (чужою) мовою говорить, (говоріть) по двоє, а найбільш по троє, і чергами, а один нехай вияснює.
28 Ọ bụrụ na ọ dịghị onye ga-akọwa ihe ha na-asụ, ka onye ahụ na-asụ asụsụ dị iche na chọọchị mechie ọnụ ya. Ya na Chineke sụrịta ya.
Коли ж нема вияснювателя, то нехай мовчить у церкві; собі ж нехай говорить та Богові.
29 Ka mmadụ abụọ maọbụ atọ nwere onyinye ibu amụma kwuo okwu nʼotu nʼotu, ka ndị ọzọ tulee ihe ha kwuru.
Пророки ж нехай по двоє і по троє говорять, а инші нехай міркують.
30 Ọ bụrụ na-ekpughere onye ọzọ nọdụ nʼakụkụ ya ihe, ka onye mbụ mechie ọnụ ya.
Коли ж другому, що сидить, одкриєть ся (що), перший нехай мовчить.
31 Nʼihi na unu nwere ike ibu amụma nʼotu nʼotu, ka mmadụ niile nwee ike ịmụta ihe ma bụrụkwa ndị a gbara ume.
Можете бо всї один за одним пророкувати, щоб усї навчались і всі утішались.
32 Mmụọ niile nke ndị amụma ka a na-edokwa nʼokpuru ndị amụma.
І духи пророцькі пророкам корять ся.
33 Nʼihi na Chineke abụghị Chineke nke aghara, kama ọ bụ nke udo. Otu a ka ọ dị nʼime ọgbakọ niile nke ndị nsọ.
Не єсть бо Бог безладу, а впокою, як по всіх церквах у сьвятих.
34 Ụmụ nwanyị ekwesighị ikwu okwu nʼime chọọchị. Ha ekwesighị itinye ọnụ na ntụgha ụka ọbụla, nʼihi na iwu kwuru ka ha debe onwe ha nʼokpuru ndị ọchịchị.
Жінки ваші в церквах нехай мовчять; бо не дозволено їм говорити, а щоб корили ся, яко ж закон глаголе.
35 Ọ bụrụ na ọ dị ihe ha chọrọ ịmata, ha jụọ di ha mgbe ha lara nʼụlọ. Nʼihi na ọ bụ ihe ihere na nwanyị ga-ekwu okwu nʼime ọgbakọ chọọchị.
Коли ж хочуть чого навчитись, нехай дома в своїх чоловіків питають; сором бо жінкам у церкві говорити.
36 Unu chere na okwu Chineke malitere nʼaka unu? Unu chekwara na ọ ga-akwụsị nʼaka unu? Ụgha!
Хиба од вас слово Боже вийшло? або до вас одних досягло?
37 Ọ bụrụ na ọ dị onye na-eche na ya bụ onye amụma, maọbụ na ya nwere onyinye nke Mmụọ Nsọ, naanị ihe m na-achọ ka ọ ghọta bụ na ihe m na-edere unu bụ iwu Onyenwe anyị nʼonwe ya nyere m.
Коли хто думає пророком бути або духовним, нехай розуміє, що те що пишу вам, се заповіді Господні.
38 Ọ bụrụ na ọ dị onye nọgidere jụ ịnabata ihe ndị a, unu aṅala ya ntị.
Коли ж хто не розуміє, нехай не розуміє.
39 Ya mere, ụmụnna m, ka ibu amụma bụrụ ihe na-agụ unu agụụ, unu egbochikwala onyinye nke ịsụ nʼire dị iche iche.
Тимже, браттє, бажайте пророкувати, та й говорити мовами не боронїть.
40 Ma meenụ ihe niile nʼụzọ dị mma, ka ha dịkwa nʼusoro.
Усе нехай поважно та до ладу робить ся.