< 1 Ndị Kọrint 13 >
1 A sị na m na-asụ asụsụ dị iche iche nke ndị mmadụ maọbụ nke ndị mmụọ ozi, ma ahụghị m mmadụ ibe m nʼanya, abụ m naanị ogene na-eme ụzụ maọbụ mbadamba efere na-ada ụda.
Kulunge kina kunene kuntambu akeuntu niye naamalaika. Kuile ang'wi numugila uulowa, anga ishaba nilila ang'wi uupatu nuijika.
2 A sịkwa na m nwere onyinye ibu amụma, bụrụ onye pụrụ ikwu ihe niile gaje ime nʼoge dị nʼihu, na onye maara ihe niile, a sịkwa na m nwere okwukwe nke m pụrụ isite na ya nye ugwu buru ibu iwu sị ya site nʼebe ọ nọ gaa nʼebe ọzọ, ma ahụghị m mmadụ ibe m nʼanya, abụghị m ihe ọbụla.
Hange kulunge kina nkete kipegwa kakinyakidagu nuulengi nuatai neyipihile nimahala, nikina nkete uhueli nuakuhamya imalugulu. Kuite ang'wi nemugila uulowa, unene singa kentu.
3 A sịkwa na m ewere ihe niile m nwere nye ndị ogbenye, werekwa anụ ahụ m nye ka ere ya ọkụ nʼihi ka m nyaa isi, ihe ndị a niile abaghị uru, ma m enweghị ịhụnanya.
Hange kulunga kina kupumya insao yane yehi nukualesa iaula, nehange kupumya umuili wane upye umoto. Kuite ang'wi numugila uulowa, shayukunzailya anga kentu.
4 Ịhụnanya na-enwe ogologo ntachiobi, na-enwekwa obi ebere. Ọ dịghị ekwo ekworo, ọ naghị enwe anya ukwu, ọ naghị anya isi. Ọ nakwaghị ebuli onwe ya elu.
Uulowa wigigimiilya nukupumya. Uulowa singa wikulya ang'wi kilolya. Ugila ulogoha,
5 Ọ naghị eme ihe na-akpasu iwe, ọ naghị achọ ihe nke naanị ya, ọ naghị ewe iwe ọsịịsọ. Ọ nakwaghị agụkọ ihe ọjọọ niile e mere ya.
ang'wi uulei. Shawiduma imakani akwe, shawikaya kuona uuwai, ang'wi kualya nimabii.
6 Ọ dịghị aṅụrị ọṅụ nʼihe ọjọọ, kama ọ na-aṅụrị nʼeziokwu.
Shawilowa uubi. Kuleka ite, wilowa mutai.
7 Ọ na-edi ihe niile, ọ na-ekwerekwa ihe niile, ọ na-enwekwa olileanya na-anagide ihe ọbụla dapụtara.
Ulowa wigigimiilya mumakani ehi, wihuela imakani ehi, ukete ugimya mumakani ehi, nukikie mumakani ehi.
8 Ịhụnanya adịghị agwụ agwụ. Ma ibu amụma niile ga-emesịa kwụsị, onyinye ịsụ asụsụ dị iche iche ga-akwụsịkwa. Otu a, ihe ọmụma niile ga-agabiga.
Ulowa shawihila. Angeze kikole kidagu, ukukila wehi. Angeze ukole uneni ukuhila. Angeze akole mahala akukila.
9 Nʼihi na ọmụma anyị ezughị oke, ibu amụma anyị ezukwaghị oke.
Kunsoko kulengile inino nukutenda ikidagu ininoo.
10 Ma mgbe anyị ruru nʼizuoke, ezughị oke agaghị adịkwa.
Kuite iye nekondile, iye neshangekondile ikikila.
11 Mgbe m bụ nwata, ekwuru m okwu dịka nwata, echiche m niile bụ echiche nwata. Izuzu obi m niile bụkwa nke nwata. Ma mgbe m toro ghọọ dimkpa, adịghịkwa m akpa agwa dịka nwata ọzọ.
Nae nemung'enya, aenamue anga numung'enya. Penanekatula nemuntu mukulu, nikaika kuli imakani aking'enya.
12 Ugbu a, anyị na-ahụ inyogho inyogho dịka anyị na-ele anya nʼenyo ma mgbe ahụ anyị ga-ahụ ihu na ihu. Ugbu a, ihe m mara ezughị oke, ma mgbe ahụ aga m amazu, dịka m bụ onye a mazuru.
Kunsoko itungo ele kuuone anga mukioo, anga esula mukiti kuite imatungo nanso kuuona usu nu usu. Itungo ele nengile ininoo, kuite kumatungo nanso kulenga kukila anga nunene nenengekile kukila.
13 Ọ dị ihe atọ na-adịgide adịgide. Ha bụ okwukwe, olileanya, na ịhụnanya. Ma nʼime ha niile, ihe kachasị ha niile bụ ịhụnanya.
Kuite itungo ele imakani aya nataatu akusaga: kuhuela, uhueli nuupembilye, nuulowa. Kuile lekole nikulu kukila aya inge ulowa.