< 1 Ndị Kọrint 13 >

1 A sị na m na-asụ asụsụ dị iche iche nke ndị mmadụ maọbụ nke ndị mmụọ ozi, ma ahụghị m mmadụ ibe m nʼanya, abụ m naanị ogene na-eme ụzụ maọbụ mbadamba efere na-ada ụda.
THOUGH I speak with the tongues of men and of angels, but have not love, I am become as sounding brass, and tinkling cymbal.
2 A sịkwa na m nwere onyinye ibu amụma, bụrụ onye pụrụ ikwu ihe niile gaje ime nʼoge dị nʼihu, na onye maara ihe niile, a sịkwa na m nwere okwukwe nke m pụrụ isite na ya nye ugwu buru ibu iwu sị ya site nʼebe ọ nọ gaa nʼebe ọzọ, ma ahụghị m mmadụ ibe m nʼanya, abụghị m ihe ọbụla.
And though I have the gift of prophecy, and know all mysteries, and all manner of science; and though I have all faith, so that I could remove mountains, but have not love, I am nothing.
3 A sịkwa na m ewere ihe niile m nwere nye ndị ogbenye, werekwa anụ ahụ m nye ka ere ya ọkụ nʼihi ka m nyaa isi, ihe ndị a niile abaghị uru, ma m enweghị ịhụnanya.
And if I deal out all my goods in alms, and deliver up my body that I should be burned, but have not love, I am nothing advantaged by it.
4 Ịhụnanya na-enwe ogologo ntachiobi, na-enwekwa obi ebere. Ọ dịghị ekwo ekworo, ọ naghị enwe anya ukwu, ọ naghị anya isi. Ọ nakwaghị ebuli onwe ya elu.
Love is long-suffering, is kind; love envieth not; love is no vain boaster, is not inflated with pride,
5 Ọ naghị eme ihe na-akpasu iwe, ọ naghị achọ ihe nke naanị ya, ọ naghị ewe iwe ọsịịsọ. Ọ nakwaghị agụkọ ihe ọjọọ niile e mere ya.
doth not act unseemly, seeketh not her own advantage, is not passionate, thinketh no evil;
6 Ọ dịghị aṅụrị ọṅụ nʼihe ọjọọ, kama ọ na-aṅụrị nʼeziokwu.
rejoiceth not in unrighteousness, but rejoiceth in the truth;
7 Ọ na-edi ihe niile, ọ na-ekwerekwa ihe niile, ọ na-enwekwa olileanya na-anagide ihe ọbụla dapụtara.
beareth all things, believeth all things, hopeth all things, endureth all things.
8 Ịhụnanya adịghị agwụ agwụ. Ma ibu amụma niile ga-emesịa kwụsị, onyinye ịsụ asụsụ dị iche iche ga-akwụsịkwa. Otu a, ihe ọmụma niile ga-agabiga.
Love never faileth: but if there be prophetic gifts, they shall be no more; if tongues, they shall cease; if science, it shall vanish away.
9 Nʼihi na ọmụma anyị ezughị oke, ibu amụma anyị ezukwaghị oke.
For we know partially, and prophesy partially.
10 Ma mgbe anyị ruru nʼizuoke, ezughị oke agaghị adịkwa.
But when that which is perfect cometh, then that which is in part shall be done away.
11 Mgbe m bụ nwata, ekwuru m okwu dịka nwata, echiche m niile bụ echiche nwata. Izuzu obi m niile bụkwa nke nwata. Ma mgbe m toro ghọọ dimkpa, adịghịkwa m akpa agwa dịka nwata ọzọ.
When I was a child, I spake as a child, I thought as a child, I reasoned as a child: but when I grew a man, I put away childish things.
12 Ugbu a, anyị na-ahụ inyogho inyogho dịka anyị na-ele anya nʼenyo ma mgbe ahụ anyị ga-ahụ ihu na ihu. Ugbu a, ihe m mara ezughị oke, ma mgbe ahụ aga m amazu, dịka m bụ onye a mazuru.
For now we see by reflected light, indistinctly; but then face to face: now I know partially; but then shall I know even as I am known.
13 Ọ dị ihe atọ na-adịgide adịgide. Ha bụ okwukwe, olileanya, na ịhụnanya. Ma nʼime ha niile, ihe kachasị ha niile bụ ịhụnanya.
But now abideth faith, hope, love, these three; but the greater of these is love.

< 1 Ndị Kọrint 13 >