< 1 Ndị Kọrint 12 >

1 Ugbu a ụmụnna m, achọrọ m ka unu mata ihe gbasara onyinye nke Mmụọ Nsọ na-enye.
Now, concerning spiritual gifts, brethren, I would not have you ignorant.
2 Unu matara na mgbe unu bụ ndị na-amaghị Chineke, e duru unu nʼotu ụzọ maọbụ nke ọzọ, duhie unu ụzọ iso arụsị ndị ahụ dara ogbi.
You know that you were Gentiles, led away to dumb idols, even as you happened to be led.
3 Ya mere, achọrọ m ka unu ghọta nke ọma na ọ dịghị onye ọbụla na-ekwu okwu site nʼodudu Mmụọ nke Chineke, pụrụ ị sị, “Ka Jisọs bụrụ onye a bụrụ ọnụ.” Ọ dịkwaghị onye ọbụla pụrụ ikwu, na “Jisọs bụ Onyenwe anyị,” ma ọ bụghị site na Mmụọ Nsọ.
Wherefore, I inform you, that no one, speaking by the Spirit of God, pronounces Jesus accursed; and, that no one can declare Jesus Lord, except by the Holy Spirit.
4 Onyinye amara dị iche iche dị, ma otu Mmụọ Nsọ ahụ na-enye ha niile.
Now, there are diversities of gifts, but the same spirit.
5 E nwekwara ụdị ije ozi dị iche iche, maọbụ otu Onyenwe anyị ahụ ka a na-ejere ozi.
And there are diversities of ministries, but the same Lord.
6 Ụdị ike dị iche iche nke eji arụ ọrụ dịkwa, ma otu Chineke ahụ na-etinye ike ndị a nʼime onye ọbụla iji jee ozi.
And there are diversities of operations, but the same God, who works all in all.
7 Ọ na-enyekwa onye ọbụla amara izipụta ike nke Mmụọ Nsọ maka ọdịmma mmadụ niile.
And to each is given this manifestation of the Spirit, for the advantage of all.
8 Mmụọ Nsọ na-enye otu onye onyinye ikwu okwu amamihe, na-enyekwa onye ọzọ onyinye ịma ihe ọmụma, site nʼotu Mmụọ ahụ.
For to one, indeed, is given, by the Spirit, the word of wisdom: and to another, the word of knowledge, according to the same Spirit.
9 Otu Mmụọ nsọ a na-enye onye ọzọ onyinye inwe okwukwe, na-enyekwa onye ọzọ onyinye inwe ike ịgwọ ọrịa.
And to another, faith, by the same Spirit: and to another, healing, by the same Spirit:
10 Onye ọzọ ka ọ na-enye onyinye ịrụ ọrụ ịtụnanya, onye ọzọ ike ibu amụma. Onye ọzọ ka ọ na-enye ike ịkọwa ụdị mmụọ dị iche iche, ma onye ọzọkwa ka ọ na-enye ike ịsụ asụsụ dị iche iche. Ma ọ na-enyekwa onye ọzọ ike ịkọwa ihe onye na-asụ asụsụ ndị a na-ekwu.
and to another, the operations of powers: and to another, prophecy: and to another, diverse kinds of foreign tongues: and to another, the interpretation of foreign tongues.
11 Ọ bụ otu Mmụọ ahụ na-enye onyinye ndị a niile. Ọ na-enye onye ọbụla onyinye dị iche iche dịka Mmụọ Nsọ si kpebie.
Now, all these does the one and the same Spirit effectively work; distributing to each, respectively, as he pleases.
12 Dịka ahụ anyị si nwe akụkụ dị iche iche, ma bụrụkwa otu ahụ, nʼagbanyeghị na o nwere ọtụtụ akụkụ, otu a ka anụ ahụ Kraịst dịkwa.
For, as the body is one, although it have many members; and all the members of that one body, being many, are one body, so also is Christ.
13 Site nʼotu Mmụọ Nsọ ahụ ka e mere anyị niile baptizim nʼotu nʼotu, ma ndị Juu ma ndị Griik, ma ohu ma ndị nwe onwe ha. E meela ka anyị ṅụọ ọbara ya, nʼime njikọ nke otu Mmụọ Nsọ ahụ.
For, indeed, by one Spirit, we all have been immersed into one body; whether Jews or Greeks, whether slaves or freemen; and all have been made to drink of one Spirit.
14 Ahụ mmadụ abụghị naanị otu akụkụ, kama o nwere ọtụtụ akụkụ ahụ.
Since, then, the body is not one member, but many;
15 Ọ bụrụ na ụkwụ asị, “Nʼihi na-abụghị m aka, esoghị nʼahụ,” nke a agaghị egbochi ya ka ọ gharakwa ịbụ otu nʼakụkụ anụ ahụ.
if the foot shall say, Because I am not the hand, I am not of the body; is it, for this, not of the body?
16 Otu a kwa, ọ bụrụ na ntị asị, “Ebe m na-abụghị anya abụghị m otu akụkụ anụ ahụ.” Okwu a kwa agaghị eme ka ntị ghara ịbụ akụkụ anụ ahụ.
And if the ear shall say, Because I am not the eye, I am not of the body; is it, for this, not of the body?
17 Ọ bụrụ na ahụ niile bụ anya, olee ka ahụ ga-esi nụ ihe? Ọ bụrụkwa na ahụ mmadụ bụ naanị ntị ọ ga-esi aṅaa nụ isisi ihe ọbụla?
If the whole body were an eye, where were the hearing? If the whole were hearing, where were the smelling?
18 Ma otu ihe si dị, Chineke debere nʼotu nʼotu akụkụ niile dị nʼahụ dịka o si chọọ.
But, now, God has placed the members, every one of them, in the body, as he has pleased.
19 A sị na akụkụ niile dị nʼahụ bụ otu ihe, kedụ ebe ahụ ga-adị?
Besides, if all were one member, where were the body?
20 Otu ọ dị, ọ bụ ezie na ihe dị nʼahụ dị ọtụtụ, ma ha niile bụ otu ahụ.
But now, indeed, there are many members, but one body.
21 Nʼihi nke a, anya enweghị ike ịgwa aka sị, “Achọghị m gị, nʼihi na ị dịghị m mkpa.” Isi agakwaghị agwa ụkwụ sị, “Achọghị m inyeaka gị.”
Therefore, the eye can not say to the hand, I have no need of you: nor, again, the head to the feet, I have no need of you.
22 Kama ọ bụ akụkụ ahụ anyị ndị na-esighị ike bụ ndị dị anyị mkpa karịa.
Nay, those members of the body which seem to be more feeble, are necessary.
23 E e, akụkụ ndị ahụ anyị na-eche na ha adịghị mkpa ka anyị na-eji nsọpụrụ na-elekọta. Akụkụ ndị ahụ na-ekwesighị ile anya ka anyị na-enye ugwu, ma na-ekpuchi ha.
And those which we think are less honorable members of the body, around them we throw more abundant honor; and so our uncomely members have more abundant comeliness.
24 Ma anyị adịghị esi otu a elekọta akụkụ ahụ ndị ahụ anya na-ahụ nʼụzọ pụrụ iche, nʼihi na Chineke kpachapụrụ anya mee ka akụkụ ndị ahụ dịkarịsịrị nta bụrụ nke anyị kwesiri inye nsọpụrụ karịa.
But, our comely members have no need. However, God has tempered the body together; having given to the member which wants it, more abundant honor.
25 Nʼụzọ dị otu a, nkewa ọbụla adịghị nʼahụ mmadụ. Akụkụ ọbụla maara mkpa ibe ya, ha na-egborịtakwara onwe ha mkpa ha.
That there may be no schism in the body; but, that the members may have the very same anxious care, one for another.
26 Ọ bụrụ na otu akụkụ enwe nsogbu, akụkụ ndị ọzọ ga-eketa oke na nsogbu ahụ. Ọ bụrụkwa na otu akụkụ emee ihe ga-eweta otuto ọ bụ ahụ niile na-enwe otuto ahụ.
So, whether one member suffer, all the members sympathize; or, one member be honored, all the members rejoice together.
27 Ugbu a, unu niile nʼotu nʼotu bụ otu anụ ahụ Kraịst. Unu bụkwa akụkụ ahụ ya nʼotu nʼotu, bụrụkwa ndị dị mkpa nʼahụ ahụ.
Now, you are Christ's body, and members in particular.
28 Nke a bụ ụfọdụ nʼime akụkụ dị iche iche Chineke tinyere na chọọchị; nke mbụ bụ ndị ozi, ndị amụma, ndị nkuzi, ndị na-arụ ọrụ ịtụnanya, ndị na-agwọ ọrịa, ndị pụrụ inyere mmadụ ibe ha aka, ndị nwere onyinye ịchịkọta ihe niile nʼusoro, na ndị na-asụ asụsụ dị iche iche.
And these, indeed, God has placed in the congregation: first, Apostles; secondly, prophets; thirdly, teachers; next, powers; then, gifts of healing; helpers, directors, kinds of foreign languages.
29 Ha niile, ha bụ ndị ozi? Ha niile ha bụ ndị amụma? Ha niile ha bụ ndị nkuzi? Ha niile ha bụ ndị ọrụ ebube?
Are all Apostles? are all prophets? are all teachers? have all powers?
30 Ha niile ha nwere onyinye ịgwọ ọrịa? Ha niile ha na-asụ nʼolu dị iche iche? Ha niile ha nwere onyinye nke ịkọwa asụsụ dị iche iche?
have all the gift of healing? do all speak in foreign languages? do all interpret?
31 Ugbu a, gbalịsienụ ike inweta onyinye kachasị dị elu karịa. Ma aga m ezi unu ụzọ nke kachasị ihe a niile mma.
Now, ardently desire the best gifts; and yet I show you a more excellent way.

< 1 Ndị Kọrint 12 >