< 1 Ndị Kọrint 11 >

1 Unu bụrụ ndị na-eṅomi m, dịka m si eṅomi Kraịst.
لاسایی من بکەنەوە هەروەک چۆن منیش لاسایی مەسیح دەکەمەوە.
2 Ana m aja unu nʼihi na unu na-echeta m nʼihi niile, nakwa nʼihi na unu na-ejisikwa ozizi ahụ enyere unu nʼaka ike, dịka m nyere ha nʼaka unu idebe.
جا ستایشتان دەکەم کە لە هەموو شتێکدا یادم دەکەن، ئەو دابونەریتانە دەپارێزن هەروەک پێمداون.
3 Ma achọrọ m ka unu mata na dịka Kraịst bụ isi nwoke ọbụla, otu a ka nwoke ọbụla si bụrụ isi nwunye ya. Chineke bụkwa isi Kraịst.
بەڵام دەمەوێت بزانن کە سەری هەموو پیاوێک مەسیحە و سەری ژنیش پیاوە و سەری مەسیحیش خودایە.
4 Nwoke ọbụla kpuchiri isi ya mgbe ọ na-ekpe ekpere maọbụ na-ebu amụma na-emenye isi ya ihere.
هەر پیاوێک بە سەری داپۆشراو نوێژ بکات یان پەیامی خودا ڕابگەیەنێت، ئەوا سەری خۆی شۆڕ دەکات.
5 Ma nwanyị ọbụla na-ekpe ekpere maọbụ na-ebu amụma, ma o kpuchighị isi ya, na-emenye isi ya ihe ihere, nʼihi na ọ dịka nwanyị kpụchara isi ya.
هەر ژنێکیش بە سەر دانەپۆشراوی نوێژ بکات یان پەیامی خودا ڕابگەیەنێت، ئەوا سەری خۆی شۆڕ دەکات، چونکە ئەو و ژنێکی سەرتاشراو هەمان شتن و یەکن.
6 Ọ bụrụ na nwanyị ọbụla achọghị ikechi isi ya, ya kpụchaa ya. A sịkwa na ọ bụkwanụ ihe ihere na nwanyị kpụchara isi ya, ka nwanyị kechie isi ya.
ئەگەر ژن سەری دانەپۆشێت، با قژی ببڕێت، بەڵام ئەگەر بۆ ژن شورەیی بوو قژی ببڕێت یاخود بیتاشێت، با سەری داپۆشێت.
7 Ma nwoke ekwesighị ikpuchi isi ya, nʼihi na nwoke bụ onyinyo na otuto nke Chineke, ebe nwanyị bụ otuto nke nwoke.
کەواتە پیاو نابێت سەری داپۆشێت، کە وێنە و شکۆی خودایە. بەڵام ژن شکۆی پیاوە،
8 E si na nwoke kee nwanyị, ma e sighị na nwanyị kee nwoke.
چونکە پیاو لە ژن نەهاتووە، بەڵکو ژن لە پیاوە.
9 E keghị nwoke maka nwanyị, ma e kere nwanyị maka nwoke.
پیاویش لە پێناوی ژن بەدی نەهێنراوە، بەڵکو ژن لە پێناوی پیاو.
10 Nʼihi nke a, nwanyị kwesiri ikpuchi isi ya igosi na ọ nọ nʼokpuru di ya, maka ndị mmụọ ozi.
لەبەر ئەمە و لەبەر فریشتەکان، پێویستە ژن نیشانەی دەسەڵاتی بەسەر سەرییەوە هەبێت.
11 Ma otu ihe si dị nʼime ndụ anyị na-adị nʼime Onyenwe anyị, nwoke adịghị ma e wepụ nwanyị, nwanyị adịghịkwa ma e wepụ nwoke.
لەگەڵ ئەوەشدا، لە پاشایەتی مەسیحی خاوەن شکۆماندا ژن سەبارەت بە پیاو سەربەخۆ نییە و پیاویش سەبارەت بە ژن سەربەخۆ نییە،
12 Nʼihi na dịka nwanyị siri na nwoke pụta na mbụ, otu a ka a na-esitekwa nʼahụ nwanyị mụpụta nwoke. Ma ha niile si nʼaka Chineke pụta.
چونکە وەک ژن لە پیاوە، ئاواش پیاو بەهۆی ژن لەدایک دەبێت، بەڵام هەموو شتێک لە خوداوەیە.
13 Achọrọ m ka unu tule ihe a nʼonwe unu, ọ dị mma ka nwanyị ghebe isi ya oghe mgbe ọ na-ekpe ekpere nye Chineke?
ئێوە حوکم بۆ خۆتان بدەن: ئایا دەشێت ژن بە سەر دانەپۆشراوی نوێژ بۆ خودا بکات؟
14 Unu matakwara nke ọma na ọ bụ ihe ihere na nwoke ga-ebu agịrị isi dị ogologo.
باشە سروشت خۆی فێرتان ناکات کە شەرمەزارییە بۆ پیاو قژی درێژ بکات،
15 Ma ọ bụrụ na nwanyị enwee agịrị isi dị ogologo ọ bụ ihe otuto nye ya nʼihi na e nyere ya agịrị isi dị ogologo ka ọ bụrụ ihe mkpuchi.
بەڵام بۆ ژن شکۆمەندییە ئەگەر قژی درێژ بکات؟ چونکە لە جیاتی پۆشەر قژی دراوەتێ.
16 Ọ bụrụ na onye ọbụla na-arụ ụka banyere omenaala nke a, anyị onwe anyị na nzukọ Chineke niile enweghị omenaala ọzọ banyere nke a.
بەڵام ئەگەر یەکێک حەزی لە ناکۆکییە، ئێمە و کڵێساکانی خوداش جگە لەمە نەریتێکی دیکەمان نییە.
17 Nʼime ntụziaka ndị a, enweghị m otuto nye unu nʼihi na mgbe unu zukọtara omume unu na-eweta ihe ọjọọ karịa ihe ọma.
بەم ئامۆژگارییە ستایشتان ناکەم، چونکە کۆبوونەوەکانتان زیانی لە سوود زیاترە.
18 Na mmalite, ihe m na-anụ bụ na mgbe niile unu zukọrọ dịka chọọchị, ịrụ ụka nke na-ebute nkewa na-adị nʼetiti unu. E kwenyekwara m na ụfọdụ ihe ndị a m nụrụ bụ eziokwu.
پێش هەموو شتێک، دەبیستم کاتێک وەک کڵێسا کۆدەبنەوە دووبەرەکی لەنێوانتاندا هەیە و هەتا ڕادەیەکیش باوەڕ دەکەم.
19 Nʼezie ụdị nkewa dị otu a aghaghị ịdị nʼetiti unu ka e nwee ike mara ndị Chineke nabatara.
بێگومان دەبێت لەنێوانتاندا ناکۆکی و دووبەرەکی هەبێت، تاکو ئەو باوەڕدارانەی کە جێی ڕەزامەندی خودان دەربکەون.
20 Mgbe unu zukọtara, ọ bụghị nri anyasị nke Onyenwe anyị ka unu na-eri.
بۆیە کاتێک کۆدەبنەوە، بۆ خواردنی شێوی مەسیحی خاوەن شکۆ نییە،
21 Nʼihi na mgbe unu na-eri nri, ụfọdụ nʼime unu na-eri nri anyasị nke aka ha. Nke mere, nʼotu onye na-anọ agụụ ebe onye ọzọ na-aṅụbigakwa mmanya oke.
چونکە هەریەکە زوو شێوی خۆی لە خواردندا دەبات، جا یەکێک برسی دەبێت، ئەوی دیکە سەرخۆش دەبێت.
22 A ga-akpọ nke a gịnị? Ọ bụ na unu enweghị ụlọ ebe unu ga-anọ rijuo afọ ma ṅụjuokwa afọ? Ka ọ bụ na unu na-elelị nzukọ Chineke na emenye ndị na-enweghị ihe ihere? Gịnị ka m ga-agwa unu? Aga m eto unu maka nke a? Agaghị m eto unu maka nke a.
ئایا ماڵتان نییە تێیدا بخۆن و بخۆنەوە؟ یاخود کڵێسای خودا سووک دەکەن و ئەوانە تەریق دەکەنەوە کە هەژار و نەدارن؟ چیتان پێ بڵێم؟ ئایا لەسەر ئەمە ستایشتان بکەم؟ بێگومان نەخێر!
23 Nʼihi na ihe m ziri unu bụ ihe Onyenwe anyị ziri m. Nʼabalị ụbọchị ahụ a rara ya nye, Onyenwe anyị Jisọs weere otu ogbe achịcha.
ئەوەی بە ئێوەم دا لە مەسیحی خاوەن شکۆم وەرگرتووە: ئەوە بوو عیسای خاوەن شکۆ لەو شەوەی تێیدا بە گرتن درا، نانێکی هەڵگرت،
24 Mgbe o nyechara ekele, ọ nyawara ya sị, “Nke a bụ ahụ m nke a na-enye maka unu. Na-emenụ nke a iji cheta m.”
سوپاسی خودای کرد و لەتی کرد و فەرمووی: «ئەمە جەستەی منە کە لە پێناوی ئێوەیە. ئەمە بۆ یادکردنەوەی من بکەن.»
25 Nʼụzọ dị otu a kwa, o bulitere otu iko mmanya mgbe ha risiri nri sị, “Iko a bụ ọgbụgba ndụ ọhụrụ nʼọbara m. Oge ọbụla unu na-aṅụ ya, na-emenụ nke a iji na-echeta m.”
بە هەمان شێوە پاش نانخواردن، جامەکەی هەڵگرت و فەرمووی: «ئەم جامە پەیمانی نوێیە بە خوێنی من. هەر جارێک دەیخۆنەوە، ئەمە بۆ یادکردنەوەی من بکەن.»
26 Nʼihi na mgbe ọbụla unu na-eri achịcha ahụ na-aṅụkwa iko a, unu na-ekwusa ọnwụ Onyenwe anyị ruo mgbe ọ ga-abịa ọzọ.
جا هەر کاتێک لەم نانەتان خوارد و لەم جامەتان خواردەوە، ئەوا مردنی عیسای خاوەن شکۆ ڕادەگەیەنن، هەتا دێتەوە.
27 Ya mere, ọ bụrụ na onye ọbụla erie achịcha Onyenwe anyị maọbụ ṅụọ iko Onyenwe anyị nʼụzọ na-ekwesighị ekwesi, onye ahụ na-emehie megide anụ ahụ Onyenwe anyị na ọbara Onyenwe anyị.
کەواتە ئەوەی بە شێوازێکی ناشایستە نانەکە بخوات یان لە جامەکەی مەسیحی خاوەن شکۆ بخواتەوە، ئەوا بەرامبەر بە جەستە و خوێنی مەسیحی خاوەن شکۆ تاوانبارە.
28 Ọ bụ nke a mere o ji bụrụ ihe dị mkpa ka onye ọbụla nyochaa onwe ya nke ọma tupu o rie achịcha ahụ maọbụ ṅụọ iko ahụ.
با هەرکەسێک خۆی تاقی بکاتەوە، ئینجا لە نانەکە بخوات و لە جامەکە بخواتەوە،
29 Nʼihi na onye ọbụla na-eri achịcha ahụ maọbụ ṅụọ site nʼiko ahụ na-echeghị echiche, ọ na-eri, na-aṅụtakwara onwe ya ikpe ọmụma, ma ọ bụrụ na ọ tuleghị uche banyere ahụ Kraịst.
چونکە ئەوەی بخوات و بخواتەوە و ڕێز لە جەستەی مەسیح نەگرێت، ئەوا بۆ خۆی حوکم دەخوات و دەخواتەوە.
30 Ọ bụ nke a mere ọtụtụ nʼime unu ji bụrụ ndị ahụ na-esighị ike, ndị nọ nʼọrịa na ndị dara nʼụra ọnwụ.
لەبەر ئەمەیە زۆر نەخۆش و لاوازتان تێدایە، هەندێکیش نوستوون.
31 Ọ bụrụ na anyị enyochaa onwe anyị nke ọma, anyị agaghị adaba nʼikpe.
بەڵام ئەگەر خۆمان حوکمی خۆمان بدایە، ئەوا حوکم نەدەدراین.
32 Ma otu ọ dị, mgbe Onyenwe anyị na-ama anyị ikpe nʼụzọ dị otu a, a na-ezi anyị otu e si ebi ezi ndụ nʼihi ka a ghara ịmakọ anyị na ndị ụwa ikpe.
بەڵام کاتێک مەسیحی خاوەن شکۆ حوکممان بدات، ئەوا تەمبێ دەکرێین، تاکو لەگەڵ جیهاندا تاوانبار نەکرێین.
33 Ya mere, ụmụnna m, mgbe unu bịakọtara iri nri, cherenụ ibe unu.
کەواتە ئەی خوشک و برایانم، کاتێک بۆ خواردن کۆدەبنەوە، چاوەڕێی یەکتری بکەن.
34 Ọ bụrụ na agụụ agụọ onye ọbụla ya rie nri nʼụlọ ya, ka ọ hapụ iwetara unu ikpe ọmụma. Aga m enye ntụziaka banyere ihe niile ndị ọzọ mgbe m bịara.
ئەگەر یەکێک برسی بوو با لە ماڵەوە بخوات، نەوەک بۆ حوکمدان کۆببنەوە. کاتێک هاتم بۆ لاتان، ڕێنمایی زیاتریشتان دەدەمێ.

< 1 Ndị Kọrint 11 >