< 1 Ndị Kọrint 10 >
1 Ụmụnna m, achọghị m ka unu chefuo ihe mere nna nna anyị ha mgbe ha jere ije nʼime ọzara. O ji igwe ojii duo ha. O mekwara ka ha si nʼetiti Osimiri Uhie gafee.
Ngoba, bazalwane, kangifuni ukuthi lingalazi iqiniso lokuthi okhokho babengaphansi kweyezi kanye lokuthi bonke badabula phakathi kolwandle.
2 Nʼime igwe ojii ahụ, na nʼime osimiri ahụ e tinyere ha niile na baptizim, dịka ndị na-eso ụzọ Mosis.
Bonke babhaphathizelwa kuMosi eyezini kanye lasolwandle.
3 Ha niile rikwara ihe oriri nke mmụọ ahụ.
Bonke badla kudla kunye komoya
4 Ha ṅụkwara mmiri mmụọ ahụ, mmiri sitere nʼoke nkume mmụọ ahụ, nke na-eso ha. Oke nkume ahụ bụ Kraịst nʼonwe ya.
banatha okunathwayo kunye komoya, ngoba banatha edwaleni lomoya elalihamba labo, njalo lelodwala lalinguKhristu.
5 Nʼihe ndị a niile, omume ha amasịghị Chineke. Nʼihi nke a, ọ lara ha nʼiyi nʼime ọzara.
Kodwa uNkulunkulu kathokozanga ngenengi labo, ngakho imizimba yabo yahlakazwa enkangala.
6 Ugbu a, ihe ndị a niile bụkwa ihe ịdọ aka na ntị nye anyị, ka anyị hapụ ịbụ ndị agụụ ime ihe ọjọọ na-agụ dịka ha.
Lezizinto zenzakala njengezibonelo, ukuba zisinqabele ekubekeni inhliziyo zethu ezintweni ezimbi njengalokhu abakwenzayo.
7 Unu abụla ndị na-ekpere arụsị dịka ụfọdụ ha mere. Dịka e dere ya, “Ndị a nọdụrụ ala iri ihe na ịṅụ ihe ọṅụṅụ, biliekwa ọtọ gwurie egwu ime onwe ha obi ụtọ.”
Lingakhonzi izithombe, njengokwenziwa ngabanye babo; njengoba kulotshiwe ukuthi: “Abantu bahlala phansi badla, banatha, basukuma bagida.”
8 Ka anyị ghara ịkwa iko dịka ụfọdụ nʼime ha mere, iri puku mmadụ abụọ na atọ nʼime ha nwụọ nʼotu ụbọchị.
Akumelanga sihlobonge njengokwenziwa ngabanye babo, njalo ngosuku olulodwa kwafa abazinkulungwane ezingamatshumi amabili lantathu.
9 Ka anyị hapụ ịnwa Kraịst ọnwụnwa dịka ụfọdụ nʼime ha si nwaa Chineke. E mere ka agwọ tagbusie ha.
Akumelanga silinge uKhristu njengokwenziwa ngabanye babo, babulawa zinyoka.
10 Ka anyị hapụkwa itamu ntamu dịka ụfọdụ ha mere ma bụrụ ndị Mmụọ ozi ọnwụ tigburu.
Lingakhononi, njengokwenziwa ngabanye babo, babulawa yingilosi ebhubhisayo.
11 Ihe ndị a niile dakwasịrị ha ka ọ bụrụ ihe ilere anya nye anyị. E dekwara ha nʼakwụkwọ ka ha bụrụ anyị ihe ịdọ aka na ntị nʼihi na anyị bi nʼoge a mgbe ọgwụgwụ ihe niile dị nso. (aiōn )
Izinto lezi zenzakala kubo njengezibonelo njalo zalotshwa njengezixwayiso kithi, osekufike kubo ukugcwaliseka kwezikhathi. (aiōn )
12 Ya mere, ọ bụrụ na ị na-eche na ị guzosiri ike, lezie anya ka ị ghara ịda.
Ngakho nxa licabanga ukuthi limi liqinile, qaphelani ukuba lingawi.
13 O nweghị ọnwụnwa ọbụla nwara unu nke abịakwutebeghị mmadụ. Chineke kwesiri ntụkwasị obi, ọ gaghị ekwe ka a nwaa unu karịa ike unu. Kama mgbe a na-anwa unu, ọ ga-enye unu ike imeri ọnwụnwa ma gosikwa unu ụzọ mgbapụ nʼime ya.
Akulazilingo ezilehleleyo ngaphandle kokwejayelekileyo ebantwini. Njalo uNkulunkulu uthembekile; akayikuvumela ukuba lilingwe ngokwedlula lokho elingakumela. Kodwa lapho lilingwa, uzalinika indlela yokuphunyuka ukuze limelane lakho.
14 Ya mere, ndị enyi m hụrụ nʼanya, gbaaranụ ikpere arụsị ọsọ.
Ngakho-ke, bangane bami abathandekayo, balekelani ukukhonza izithombe.
15 Ana m agwa ndị nwere uche okwu, unu onwe unu tulenụ ihe m na-ekwu.
Ngikhuluma labantu abalengqondo; zenzeleni esenu isinqumo ngalokho engikutshoyo.
16 Iko ngọzị ahụ nke anyị na-agọzi, ọ bụghị iketa oke site nʼọbara Kraịst? Achịcha nke anyị na-anyawa, ọ bụghị iketa oke nʼahụ Kraịst?
Konje inkezo yokubonga esiyibongelayo kayisikuhlanganyela egazini likaKhristu na? Lesinkwa esisihlephunayo kasisisokuhlanganyela emzimbeni kaKhristu na?
17 Nʼihi na otu achịcha dị, ọ bụ ezie na anyị dị ọtụtụ, anyị bụ otu ahụ, nʼihi na anyị niile na-eketa oke nʼotu ogbe achịcha ahụ.
Njengoba kulesinkwa sinye, thina abanengi, singumzimba munye, ngoba sonke sihlanganyela lesosinkwa sinye.
18 Chetanụ ka ndị Izrel siri mee: ọ bụ na ndị na-eri ihe eji chụọ aja abụghị ndị nnwekọ nʼebe ịchụ aja?
Khumbulani abantu bako-Israyeli: Kakusikho yini ukuthi labo abadla imihlatshelo balokuhlanganyela e-alithareni na?
19 Gịnị ka okwu ndị a m na-ekwu pụtara? Na arụsị, maọbụ ihe a chụrụ nʼaja nye arụsị bụ ihe ọbụla, maọbụ na ọ bụghị ihe?
Pho ngitsho ukuthi umhlatshelo onikelwe esithombeni uyilutho, loba ukuthi isithombe siyilutho na?
20 Mba! Ihe m na-ekwu bụ na ndị niile na-achụrụ arụsị aja jikọtara onwe ha nʼotu obi ịchụrụ ekwensu aja ahụ. Ọ bụghị Chineke. Achọkwaghị m ka unu bụrụ ndị e jikọtara ha na ekwensu.
Hatshi, kodwa imihlatshelo yabangakholwayo inikelwa emadimonini hatshi kuNkulunkulu, njalo kangifuni ukuba libe ngabahlanganyela lamadimoni.
21 Unu apụghị ịṅụ site nʼiko Onyenwe anyị ma ṅụọkwa site nʼiko ekwensu; unu apụghịkwa inwe oke site na tebul Onyenwe anyị na tebul ekwensu.
Kalingeke linathe inkezo yeNkosi lenkezo yamadimoni njalo, alingeke libe lokuhlanganyela etafuleni yeNkosi lasetafuleni yamadimoni.
22 Anyị na-achọ ime ka iwe wee Onyenwe anyị? Anyị dị ike karịa ya?
Sizama ukuvusa umona weNkosi na? Kambe silamandla kulayo na?
23 Ị na-asị, “Enwere m ike ime ihe niile m maara na m kwesiri ime,” ma ọ bụghị ihe niile ga-abara m uru. “Enwere m ike ime ihe niile m maara ziri ezi,” ma ọ bụghị ihe niile nwere ike inyere anyị aka.
“Ngilelungelo lokwenza loba yini,” kodwa akusizinto zonke ezilosizo. “Ngilelungelo lokwenza loba yini,” kodwa akusizinto zonke ezakhayo.
24 Ka onye ọbụla hapụ ịchọ ọdịmma nke onwe ya, kama ọdịmma nke ndị ọzọ.
Akulamuntu omele azidingele okuhle, kodwa okuhle kwabanye.
25 Rie ihe bụ anụ ọbụla e rere nʼahịa na-ajụghị ajụjụ ọbụla nʼihi akọnuche.
Dlanini konke okuthengiswa lapho okuthengiswa khona inyama kungekho kubuza imibuzo yesazela,
26 Nʼihi na, “Ụwa na ihe niile dị nʼime ya bụ nke Onyenwe anyị.”
ngoba, “Umhlaba ngokaThixo, lakho konke okukuwo.”
27 Ọ bụrụ na onye na-ekweghị ekwe akpọọ unu oriri, unu kpebie ije, riekwanụ nri ọbụla e nyere unu na-ajụghị ajụjụ nʼihi akọnuche.
Nxa omunye wabangakholwayo elibizela ukudla njalo lifuna ukuhamba, dlanini loba kuyini okubekwe phambi kwenu kungekho kubuza imibuzo yesazela.
28 Ma ọ buru na e nwee onye gwara gị, “A chụrụ ihe a nʼaja.” Unu erila nri ahụ, maka onye ahụ mere ka unu mata, na nʼihi akọnuche.
Kodwa nxa omunye esithi kini, “Lokhu kunikelwe njengomhlatshelo,” lokho-ke lingakudli, ngenxa yomuntu lowo olitshelileyo langenxa yesazela,
29 Akọnuche nke m na-ekwu maka ya abụghị nke gị, kama ọ bụ maka nke onye ahụ. Nʼihi gịnị ka mnwere onwe m ga-eji bụrụ ihe akọnuche onye ọzọ ga-ekpe ikpe?
ngitsho isazela salowomuntu, hatshi esenu. Kungani ukukhululeka kwami kumele kwahlulelwe ngesazela somunye na?
30 Ọ bụrụ na m nwere ike inye ekele, were nri m rie, olee otu e si ekwutọ m nʼihi ihe ahụ m nyere Chineke ekele banyere ya?
Nxa ngihlanganyela ekudleni ngokubonga, kungani ngisolwa ngolutho engilubongela iNkosi na?
31 Ihe ọbụla ị na-eme, ma unu na-eri ihe maọbụ na-aṅụ ihe, na-emenụ ha niile maka otuto nke Chineke.
Ngakho ingabe liyadla kumbe liyanatha, loba kuyikuphi elikwenzayo, kwenzeleni udumo lukaNkulunkulu.
32 Unu emejọla ndị Juu maọbụ ndị Griik, ma ọ bụkwanụ nzukọ Chineke.
Lingakhubekisi muntu, loba kungamaJuda, amaGrikhi loba ibandla likaNkulunkulu,
33 Na-agbalịsinụ ike ime dịka m si eme. Nʼihe ọbụla m na-eme, ana m ejisi ike ime ihe ga-atọ onye ọbụla ụtọ. Anaghị m achọ ọdịmma nke m naanị, kama ọ bụ ọdịmma nke mmadụ ibe m, ime ka a zọpụta ha.
lalapho ngizama ukuthokozisa abantu bonke ngezindlela zonke. Ngoba kangidingi okuhle kwami, kodwa okuhle kwabanengi, ukuze basindiswe.