< 1 Ndị Kọrint 10 >

1 Ụmụnna m, achọghị m ka unu chefuo ihe mere nna nna anyị ha mgbe ha jere ije nʼime ọzara. O ji igwe ojii duo ha. O mekwara ka ha si nʼetiti Osimiri Uhie gafee.
For I would not, brethren, have you ignorant, how that our fathers were all under the cloud, and all passed through the sea;
2 Nʼime igwe ojii ahụ, na nʼime osimiri ahụ e tinyere ha niile na baptizim, dịka ndị na-eso ụzọ Mosis.
and were all baptized unto Moses in the cloud and in the sea;
3 Ha niile rikwara ihe oriri nke mmụọ ahụ.
and did all eat the same spiritual meat;
4 Ha ṅụkwara mmiri mmụọ ahụ, mmiri sitere nʼoke nkume mmụọ ahụ, nke na-eso ha. Oke nkume ahụ bụ Kraịst nʼonwe ya.
and did all drink the same spiritual drink: for they drank of a spiritual rock that followed them: and the rock was Christ.
5 Nʼihe ndị a niile, omume ha amasịghị Chineke. Nʼihi nke a, ọ lara ha nʼiyi nʼime ọzara.
Howbeit with most of them God was not well pleased: for they were overthrown in the wilderness.
6 Ugbu a, ihe ndị a niile bụkwa ihe ịdọ aka na ntị nye anyị, ka anyị hapụ ịbụ ndị agụụ ime ihe ọjọọ na-agụ dịka ha.
Now these things were our examples, to the intent we should not lust after evil things, as they also lusted.
7 Unu abụla ndị na-ekpere arụsị dịka ụfọdụ ha mere. Dịka e dere ya, “Ndị a nọdụrụ ala iri ihe na ịṅụ ihe ọṅụṅụ, biliekwa ọtọ gwurie egwu ime onwe ha obi ụtọ.”
Neither be ye idolaters, as were some of them; as it is written, The people sat down to eat and drink, and rose up to play.
8 Ka anyị ghara ịkwa iko dịka ụfọdụ nʼime ha mere, iri puku mmadụ abụọ na atọ nʼime ha nwụọ nʼotu ụbọchị.
Neither let us commit fornication, as some of them committed, and fell in one day three and twenty thousand.
9 Ka anyị hapụ ịnwa Kraịst ọnwụnwa dịka ụfọdụ nʼime ha si nwaa Chineke. E mere ka agwọ tagbusie ha.
Neither let us tempt the Lord, as some of them tempted, and perished by the serpents.
10 Ka anyị hapụkwa itamu ntamu dịka ụfọdụ ha mere ma bụrụ ndị Mmụọ ozi ọnwụ tigburu.
Neither murmur ye, as some of them murmured, and perished by the destroyer.
11 Ihe ndị a niile dakwasịrị ha ka ọ bụrụ ihe ilere anya nye anyị. E dekwara ha nʼakwụkwọ ka ha bụrụ anyị ihe ịdọ aka na ntị nʼihi na anyị bi nʼoge a mgbe ọgwụgwụ ihe niile dị nso. (aiōn g165)
Now these things happened unto them by way of example; and they were written for our admonition, upon whom the ends of the ages are come. (aiōn g165)
12 Ya mere, ọ bụrụ na ị na-eche na ị guzosiri ike, lezie anya ka ị ghara ịda.
Wherefore let him that thinketh he standeth take heed lest he fall.
13 O nweghị ọnwụnwa ọbụla nwara unu nke abịakwutebeghị mmadụ. Chineke kwesiri ntụkwasị obi, ọ gaghị ekwe ka a nwaa unu karịa ike unu. Kama mgbe a na-anwa unu, ọ ga-enye unu ike imeri ọnwụnwa ma gosikwa unu ụzọ mgbapụ nʼime ya.
There hath no temptation taken you but such as man can bear: but God is faithful, who will not suffer you to be tempted above that ye are able; but will with the temptation make also the way of escape, that ye may be able to endure it.
14 Ya mere, ndị enyi m hụrụ nʼanya, gbaaranụ ikpere arụsị ọsọ.
Wherefore, my beloved, flee from idolatry.
15 Ana m agwa ndị nwere uche okwu, unu onwe unu tulenụ ihe m na-ekwu.
I speak as to wise men; judge ye what I say.
16 Iko ngọzị ahụ nke anyị na-agọzi, ọ bụghị iketa oke site nʼọbara Kraịst? Achịcha nke anyị na-anyawa, ọ bụghị iketa oke nʼahụ Kraịst?
The cup of blessing which we bless, is it not a communion of the blood of Christ? The bread which we break, is it not a communion of the body of Christ?
17 Nʼihi na otu achịcha dị, ọ bụ ezie na anyị dị ọtụtụ, anyị bụ otu ahụ, nʼihi na anyị niile na-eketa oke nʼotu ogbe achịcha ahụ.
seeing that we, who are many, are one bread, one body: for we all partake of the one bread.
18 Chetanụ ka ndị Izrel siri mee: ọ bụ na ndị na-eri ihe eji chụọ aja abụghị ndị nnwekọ nʼebe ịchụ aja?
Behold Israel after the flesh: have not they which eat the sacrifices communion with the altar?
19 Gịnị ka okwu ndị a m na-ekwu pụtara? Na arụsị, maọbụ ihe a chụrụ nʼaja nye arụsị bụ ihe ọbụla, maọbụ na ọ bụghị ihe?
What say I then? that a thing sacrificed to idols is anything, or that an idol is anything?
20 Mba! Ihe m na-ekwu bụ na ndị niile na-achụrụ arụsị aja jikọtara onwe ha nʼotu obi ịchụrụ ekwensu aja ahụ. Ọ bụghị Chineke. Achọkwaghị m ka unu bụrụ ndị e jikọtara ha na ekwensu.
But [I say], that the things which the Gentiles sacrifice, they sacrifice to devils, and not to God: and I would not that ye should have communion with devils.
21 Unu apụghị ịṅụ site nʼiko Onyenwe anyị ma ṅụọkwa site nʼiko ekwensu; unu apụghịkwa inwe oke site na tebul Onyenwe anyị na tebul ekwensu.
Ye cannot drink the cup of the Lord, and the cup of devils: ye cannot partake of the table of the Lord, and of the table of devils.
22 Anyị na-achọ ime ka iwe wee Onyenwe anyị? Anyị dị ike karịa ya?
Or do we provoke the Lord to jealousy? are we stronger than he?
23 Ị na-asị, “Enwere m ike ime ihe niile m maara na m kwesiri ime,” ma ọ bụghị ihe niile ga-abara m uru. “Enwere m ike ime ihe niile m maara ziri ezi,” ma ọ bụghị ihe niile nwere ike inyere anyị aka.
All things are lawful; but all things are not expedient. All things are lawful; but all things edify not.
24 Ka onye ọbụla hapụ ịchọ ọdịmma nke onwe ya, kama ọdịmma nke ndị ọzọ.
Let no man seek his own, but [each] his neighbour’s [good].
25 Rie ihe bụ anụ ọbụla e rere nʼahịa na-ajụghị ajụjụ ọbụla nʼihi akọnuche.
Whatsoever is sold in the shambles, eat, asking no question for conscience sake;
26 Nʼihi na, “Ụwa na ihe niile dị nʼime ya bụ nke Onyenwe anyị.”
for the earth is the Lord’s, and the fulness thereof.
27 Ọ bụrụ na onye na-ekweghị ekwe akpọọ unu oriri, unu kpebie ije, riekwanụ nri ọbụla e nyere unu na-ajụghị ajụjụ nʼihi akọnuche.
If one of them that believe not biddeth you [to a feast], and ye are disposed to go; whatsoever is set before you, eat, asking no question for conscience sake.
28 Ma ọ buru na e nwee onye gwara gị, “A chụrụ ihe a nʼaja.” Unu erila nri ahụ, maka onye ahụ mere ka unu mata, na nʼihi akọnuche.
But if any man say unto you, This hath been offered in sacrifice, eat not, for his sake that shewed it, and for conscience sake:
29 Akọnuche nke m na-ekwu maka ya abụghị nke gị, kama ọ bụ maka nke onye ahụ. Nʼihi gịnị ka mnwere onwe m ga-eji bụrụ ihe akọnuche onye ọzọ ga-ekpe ikpe?
conscience, I say, not thine own, but the other’s; for why is my liberty judged by another conscience?
30 Ọ bụrụ na m nwere ike inye ekele, were nri m rie, olee otu e si ekwutọ m nʼihi ihe ahụ m nyere Chineke ekele banyere ya?
If I by grace partake, why am I evil spoken of for that for which I give thanks?
31 Ihe ọbụla ị na-eme, ma unu na-eri ihe maọbụ na-aṅụ ihe, na-emenụ ha niile maka otuto nke Chineke.
Whether therefore ye eat, or drink, or whatsoever ye do, do all to the glory of God.
32 Unu emejọla ndị Juu maọbụ ndị Griik, ma ọ bụkwanụ nzukọ Chineke.
Give no occasion of stumbling, either to Jews, or to Greeks, or to the church of God:
33 Na-agbalịsinụ ike ime dịka m si eme. Nʼihe ọbụla m na-eme, ana m ejisi ike ime ihe ga-atọ onye ọbụla ụtọ. Anaghị m achọ ọdịmma nke m naanị, kama ọ bụ ọdịmma nke mmadụ ibe m, ime ka a zọpụta ha.
even as I also please all men in all things, not seeking mine own profit, but the [profit] of the many, that they may be saved.

< 1 Ndị Kọrint 10 >