< 1 Ihe E Mere 7 >
1 Isaka mụrụ ụmụ anọ: Tola, na Pua, na Jashub, na Shịmrọn.
Isiakari alikuwa na wana wanne Tola, Pua, Yashubi, na Shimironi.
2 Ụmụ Tola ndị ghọrọ ndịisi ezi bụ ndị a: Uzi, na Refaya, na Jeriel, na Jamai, na Ibsam, na Samuel. Nʼoge Devid bụ eze, ọnụọgụgụ ndị agha sitere nʼetiti ha dị iri puku abụọ na abụọ, na narị isii.
Wana wa Tola walikuwa Uzi, Refaia, Yerie, Yamai, Ibisami, Shemueli. Walikua vichwa katika nyumba za baba yao, toka uzao wa Tola na waliorodheshwa kama mashujaa hodari miongoni mwa kizazi chao. Katika siku za Daudi walikua na idadi ya 22, 600.
3 Uzi mụrụ Izrahaya. Izrahaya amụta ndị a: Maikel, Ọbadaya, Juel na Ishaya. Ha niile bụkwa ndịisi ikwu ha.
Mwana wa Uzi alikua Izrahia. Mwana wake alikua Michaeli, Obadia, Yoeli, na Ishia, wote watano walikua viongozi wa ukoo
4 Ndị bụ ndị agha nʼetiti ụmụ ụmụ ha nʼoge Devid bụ eze ruru iri puku atọ na isii, nʼihi na ha niile lụrụ ọtụtụ ndị inyom, mụọ ọtụtụ ụmụ.
Pamoja nao walikua na jeshi la watu elfu thelathini na sita kwa mapambano, Kwa mujibu wa orodha zilizomilikiwa na koo za mababu zao, kwa kuwa walikuwa na wake wengi pamoja na wana.
5 Ụmụnne ha bụ ndị na-alụ agha bụ ndị agbụrụ Isaka dị iri puku asatọ na asaa nʼọnụọgụgụ, dịka e depụtara aha ha nʼakwụkwọ usoro ọmụmụ.
Kaka zao, kabila la Isakari, walikua na wanaume wa vita themanini na saba, kwa mujibu wa orodha zilizomilikiwa na koo za mababu zao.
6 Benjamin mụrụ ndị ikom atọ: Bela, Beka na Jediael,
Wana watatu wa Benjamini walikuwa Bela, Beka, na Yediaeli.
7 Bela mụrụ ụmụ ise: Ezbon, Uzi, Uziel, Jerimot na Iri. Ha niile bụ ndịisi ezi. Ọnụọgụgụ ndị agha ha dị iri puku abụọ na abụọ na iri atọ na anọ. E dekwara aha ndị a niile nʼakwụkwọ usoro ọmụmụ.
Wana watano wa Bela walikuwa Ezibono, Uzi, Uzieli, Yerimoti, na Iri. Walikua ni wanajeshi na waanzilishi wa koo. Watu wao walikuwa na idadi ya wanaume wa vita 22, 034, kwa mujibu wa orodha zilizomilikiwa na koo za mababu zao.
8 Ụmụ ndị ikom Beka mụrụ bụ Zemira, Joash, Elieza, Elioenai, Omri, Jeremot, Abija, Anatot na Alemet.
Wana wa Beka walikuwa Zemira, Yoashi, Elieza, Elionai, Omri, Yeremoti, Abiya, Anatoti, na Alemeti. Wote hawa walikuwa wana wake.
9 Akwụkwọ ebe e dere usoro ọmụmụ ha depụtara aha ndịisi ezinaụlọ, na iri puku ndị agha abụọ na narị abụọ.
Orodha ya koo zao ilikua na idadi ya 20, 200 viongozi wa familia na wanaume wa vita.
10 Jediael mụrụ otu nwa nwoke: aha ya bụ Bilhan. Ụmụ Bilhan bụ Jeush, Benjamin, Ehud, Kenaana, Zetan, Tashish na Ahishaha.
Mwana wa Yediaeli alikuwa Bilhani. Wana wa Bilhani walikuwa Yeushi, Benjamini, Ehudi, Kenaana, Zetani, Tarishishi, na Ahishahari.
11 Ụmụ ndị ikom Jediael ndị a bụ ndịisi ezinaụlọ. E nwere nʼetiti ha ndị agha ọnụọgụgụ ha dị puku iri na asaa na narị abụọ, ndị nọ na njikere ibu agha.
Wote hawa waikuwa wana wa Yediaeli. Waliorodheshwa katika ukoo orodha ilikuwa 17, 200 viongozi na wanaume wa vita imara kwa kazi ya jeshi.
12 Ndị Shupim na ndị Hupim bụ ụmụ ụmụ Er ebe ndị Hushim bụ ụmụ ụmụ Aha.
(Shupimu na Hupimu walikuwa wana wa Iri, na Hushimu alikuwa mwana wa Aheri.)
13 Ụmụ Naftalị mụtara bụ Jaziel, Guni, Jeza na Shalum bụ ụmụ Bilha.
Wana wa Naftali walikuwa Yazieli, Guni, Yezeri, na Shalumu. Hawa walikuwa wajukuu wa Bilhahi.
14 Ụmụ Manase: Asriel, onye iko ya nwanyị bụ onye Aram mụtara, na Makia. Makia bụ nna Gilead.
Manasse alikua na mtoto wa kiume aliitwa Asrieli, Ambaye suria wake wa Kiaramia alimzalia. Pia alimzaa na Makiri, baba wa Gileadi.
15 Makia sitere nʼetiti ndị Hupim na Shupim lụọ nwunye. Aha nwanne ya nwanyị bụ Maaka. Otu onye ọzọ si nʼagbụrụ Manase bụ Zelofehad, onye mụtara naanị ụmụ ndị inyom.
Makiri alimchukua mke wake kutoka Hupite na Shupite. Jina la dada yake lilikuwa Maaka. Mwingine wa uzao wa Manasse alikuwa Zalofehadi, ambaye alikuwa na mabinti pekee.
16 Maaka nwunye Makia mụtara otu nwa nwoke ọ gụrụ Peresh. Aha nwanne ya bụ Sheresh, onye mụtara Ụlam na Rakem.
Maaka mke wa Makiri, alimzaa mwana na alimuita Pereshi. Kaka yake aliitwa Shereshi, na wana wake walikuwa Ulamu na Rakemu.
17 Nwa nwoke Ụlam mụtara bụ Bedan. Ndị a bụ ụmụ Gilead, nwa nwa Makia, nwa Manase.
Mwana wa Ulami alikuwa Bedani. Hawa walikuwa uzao wa Gileadi mwana wa Makiri mwana wa Manase.
18 Hamoleket, nwanne nwanyị Makia mụrụ Ishod, Abieza na Mahla.
Dada wa Gileadi Hamoleketi alimzaa Ishihodi, Abi Ezeri, na Mahila.
19 Shemida mụrụ ụmụ ikom ndị a: Ahian, Shekem, Liiki na Aniam.
Wana wa Shemida walikuwa Ahiana, Shekemu, Liki, na Aniamu.
20 Ụmụ Ifrem bụ Shutela, Bered, Tahat, Eleada, Tahat
Uzao wa Efraimu ulikuwa kama ifuatavyo: Efraimu mwana wa Shutela. Shutela mwana wa Beredi. Beredi mwana wa Tahati.
21 na Zabad nwa ya, na Shutela nwa ya. Eza na Elead bụ ndị gara ịchịkọrọ anụ ụlọ ndị Gat, ndị ikom nwe obodo ahụ jidere ha gbuo ha nʼebe ahụ.
Tahati mwana wa Eleada. Eleada mwana wa Shutela. (Eza na Eleadi waliuawa na wanaume wa Gati, wenyeji wa nchi, walipoenda kuiba mifugo yao.
22 Ifrem nna ha ruru ụjụ nke ukwuu nʼihi ọnwụ ha, ma ụmụnna ya kasịrị ya obi.
Efraimu baba yao aliomboleza kwa siku nyingi, na kaka zake walikuja kumfariji.
23 Mgbe nwunye ya mụrụ nwa nwoke ọzọ, ọ kpọrọ aha ya Beriya, nke pụtara, Ihe ndaba ọjọọ, nʼihi ọnwụ Elead na Eza.
Alilala na mkewe. Akapata mimba akamzaa mwana. Efraimu akamuita Beria, kwa sababu maafa yalishakuja nyumbani mwake.
24 Aha nwa Ifrem nke nwanyị bụ Sheera. Sheera bụ onye wuru akụkụ ugwu na ndịda Bet-Horon, wuokwa Uzen-Sheera.
Binti yake alikuwa Sheera, ambaye alijenga miji juu na chini Beth Horon na Uzzen Sheerah.)
25 Ndị a bụkwa ụmụ Ifrem: Refa, nna Reshef, onye bụ nna Tela. Tela bụ nna Tahan,
Mwana wake alikuwa Rafa. Mwana wa Rafa alikuwa Reshefi. Mwana wa Reshafi alikuwa Tela. Mwana wa Tela alikuwa Tahani.
26 onye bụ nna Ladan, Ladan bụ nna Amihud, onye bụ nna Elishama.
Mwana wa Tahani alikuwa Ladani. Mwana wa Ladani alikuwa Amihudi. Mwana wa Amihudi alikuwa Elishama.
27 Elishama bụ nna Nun, onye bụ nna Joshua.
Mwana wa Elishama alikuwa Nuni. Mwana wa Nuni alikuwa Joshua.
28 Betel na obodo ndị ọzọ gbara ya gburugburu, ya bụ Naaran, nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, na Gaza na obodo nta ya, ndị dị nʼọdịda anyanwụ, na Shekem, na obodo ndị ọzọ, tutu ruo Aya, na obodo nta ya niile, so nʼala ha.
Mali zao na makazi yao yalikuwa Betheli na yalizungukwa na vijiji. Waliongeza upande wa mashariki hadi Naarani na upande wa magharibi hadi Gezeri na vijiji vyake, na Shekemu na vijiji vyake hadi Aya na vijiji vyake.
29 Ụmụ Manase, nwa Josef, nwa nwa Izrel, bikwa nʼobodo ndị a dị nʼoke ala ha: Bet-Shan, na Teanak, na Megido, na Doa, tinyere obodo nta ha niile.
Katika mipaka pamoja na Manasse kulikuwa na Beti shani na vijiji vyake, Taanaki na vijiji vyake, Megido na vijiji vyake, na Dori na vijiji vyake. Katika huu mji waliishi uzao wa Josefu mwana wa Israeli.
30 Asha mụrụ ndị a: Imna, Ishva, Ishvi na Beriya. Nwa ya nwanyị bụ Sera.
Wana wa Asha walikuwa Imna, Ishiva, Ishivi, na Beria. Sera alikuwa dada yao.
31 Beriya amụta ndị a: Heba na Malkiel, onye bụ nna Biazait.
Wana wa Beria walikuwa Heberi na Malchieli, Ambaye alikuwa baba wa Birzaiti.
32 Heba bụ onye mụrụ Jaflet, Shoma na Hotam. Nwanne ha nwanyị bụ Shua.
Wana wa Heberi walikuwa Yafeti, Shomer, na Hotamu. dada yao alikuwa Shua.
33 Ụmụ Jaflet mụrụ bụ Pasak, Bimhal na Ashvat. Ndị a bụ ụmụ Jaflet.
Wana wa Yafeti walikuwa Pasach, Bimhali, na Ashivati. hawa walikuwa watoto wa yafeti.
34 Shoma amụọ Ahi, Roga, Huba na Aram.
shoma, kaka wa Yafeti alikuwa na wana hawa: Roga, Yehuba, Aram.
35 Nwanne ya nwoke Helem mụrụ Zofa, Imana, Shelesh na Amal.
Kaka yake Shema, Helemu, alikuwa na wana hawa: Zofa, Imna, Sheleshi na Amali.
36 Zofa amụta ndị a: Sua, Hanefa, Shual, Beri, Imra,
Wana wa Zofa walikuwa Sua, Harinefa, Shua, Beri, IMra,
37 Beza, Hod, Shama, Shilsha, Itran na Beera.
Beza, Hodi, Shamma, Shilsha, Ithrani, na Beera.
38 Jeta mụtara Jefune, Pispa na Ara.
Wana wa Yeta walikuwa Jefune, Pispa, na Ara.
39 Ụla amụta Ara, Haniel na Rizia.
Wana wa Ulla walikwa Ara, Hannieli, na Rizia.
40 Ụmụ ụmụ Asha ndị a niile bụ ndịisi ezi, ndị a sara anya na mmiri họpụta, ndị bụ dimkpa nʼagha, ndị ndu a ma ama. Ọnụọgụgụ ndị ha tozuru ije agha dị puku iri abụọ na isii, ndị e depụtara aha ha nʼakwụkwọ usoro ọmụmụ.
Hawa wote walikuwa uzao wa Asha. Walikua mababu wa ukoo, viongozi wa familia, wananume wa kipekee, wanaume wa vita, na machifu kati ya viongozi. Kulikuwa na wanaume elfu ishirini na sita walioorodheshwa waliokuwa imara kwa kazi ya jeshi, kwa mujibu wa idadi iliyo orodheshwa.