< 1 Ihe E Mere 7 >

1 Isaka mụrụ ụmụ anọ: Tola, na Pua, na Jashub, na Shịmrọn.
The sons of Issachar: Tola, Puah, Jashub, and Shimron—four in all.
2 Ụmụ Tola ndị ghọrọ ndịisi ezi bụ ndị a: Uzi, na Refaya, na Jeriel, na Jamai, na Ibsam, na Samuel. Nʼoge Devid bụ eze, ọnụọgụgụ ndị agha sitere nʼetiti ha dị iri puku abụọ na abụọ, na narị isii.
The sons of Tola: Uzzi, Rephaiah, Jeriel, Jahmai, Ibsam, and Shemuel, the heads of their families. In the days of David, 22,600 descendants of Tola were numbered in their genealogies as mighty men of valor.
3 Uzi mụrụ Izrahaya. Izrahaya amụta ndị a: Maikel, Ọbadaya, Juel na Ishaya. Ha niile bụkwa ndịisi ikwu ha.
The son of Uzzi: Izrahiah. The sons of Izrahiah: Michael, Obadiah, Joel, and Isshiah. All five of them were chiefs.
4 Ndị bụ ndị agha nʼetiti ụmụ ụmụ ha nʼoge Devid bụ eze ruru iri puku atọ na isii, nʼihi na ha niile lụrụ ọtụtụ ndị inyom, mụọ ọtụtụ ụmụ.
In addition to them, according to their genealogy, they had 36,000 troops for battle, for they had many wives and children.
5 Ụmụnne ha bụ ndị na-alụ agha bụ ndị agbụrụ Isaka dị iri puku asatọ na asaa nʼọnụọgụgụ, dịka e depụtara aha ha nʼakwụkwọ usoro ọmụmụ.
Their kinsmen belonging to all the families of Issachar who were mighty men of valor totaled 87,000, as listed in their genealogies.
6 Benjamin mụrụ ndị ikom atọ: Bela, Beka na Jediael,
The three sons of Benjamin: Bela, Becher, and Jediael.
7 Bela mụrụ ụmụ ise: Ezbon, Uzi, Uziel, Jerimot na Iri. Ha niile bụ ndịisi ezi. Ọnụọgụgụ ndị agha ha dị iri puku abụọ na abụọ na iri atọ na anọ. E dekwara aha ndị a niile nʼakwụkwọ usoro ọmụmụ.
The sons of Bela: Ezbon, Uzzi, Uzziel, Jerimoth, and Iri, heads of their families—five in all. There were 22,034 mighty men of valor listed in their genealogies.
8 Ụmụ ndị ikom Beka mụrụ bụ Zemira, Joash, Elieza, Elioenai, Omri, Jeremot, Abija, Anatot na Alemet.
The sons of Becher: Zemirah, Joash, Eliezer, Elioenai, Omri, Jeremoth, Abijah, Anathoth, and Alemeth; all these were Becher’s sons.
9 Akwụkwọ ebe e dere usoro ọmụmụ ha depụtara aha ndịisi ezinaụlọ, na iri puku ndị agha abụọ na narị abụọ.
Their genealogies were recorded according to the heads of their families—20,200 mighty men of valor.
10 Jediael mụrụ otu nwa nwoke: aha ya bụ Bilhan. Ụmụ Bilhan bụ Jeush, Benjamin, Ehud, Kenaana, Zetan, Tashish na Ahishaha.
The son of Jediael: Bilhan. The sons of Bilhan: Jeush, Benjamin, Ehud, Chenaanah, Zethan, Tarshish, and Ahishahar.
11 Ụmụ ndị ikom Jediael ndị a bụ ndịisi ezinaụlọ. E nwere nʼetiti ha ndị agha ọnụọgụgụ ha dị puku iri na asaa na narị abụọ, ndị nọ na njikere ibu agha.
All these sons of Jediael were heads of their families, mighty men of valor; there were 17,200 fit for battle.
12 Ndị Shupim na ndị Hupim bụ ụmụ ụmụ Er ebe ndị Hushim bụ ụmụ ụmụ Aha.
The Shuppites and Huppites were descendants of Ir, and the Hushites were descendants of Aher.
13 Ụmụ Naftalị mụtara bụ Jaziel, Guni, Jeza na Shalum bụ ụmụ Bilha.
The sons of Naphtali: Jahziel, Guni, Jezer, and Shallum —the descendants of Bilhah.
14 Ụmụ Manase: Asriel, onye iko ya nwanyị bụ onye Aram mụtara, na Makia. Makia bụ nna Gilead.
The descendants of Manasseh: Through his Aramean concubine, Asriel, as well as Machir the father of Gilead.
15 Makia sitere nʼetiti ndị Hupim na Shupim lụọ nwunye. Aha nwanne ya nwanyị bụ Maaka. Otu onye ọzọ si nʼagbụrụ Manase bụ Zelofehad, onye mụtara naanị ụmụ ndị inyom.
Machir took a wife from among the Huppites and Shuppites. The name of his sister was Maacah. Another descendant was named Zelophehad, who had only daughters.
16 Maaka nwunye Makia mụtara otu nwa nwoke ọ gụrụ Peresh. Aha nwanne ya bụ Sheresh, onye mụtara Ụlam na Rakem.
Machir’s wife Maacah gave birth to a son, and she named him Peresh. His brother was named Sheresh, and his sons were Ulam and Rekem.
17 Nwa nwoke Ụlam mụtara bụ Bedan. Ndị a bụ ụmụ Gilead, nwa nwa Makia, nwa Manase.
The son of Ulam: Bedan. These were the sons of Gilead son of Machir, the son of Manasseh.
18 Hamoleket, nwanne nwanyị Makia mụrụ Ishod, Abieza na Mahla.
His sister Hammolecheth gave birth to Ishhod, Abiezer, and Mahlah.
19 Shemida mụrụ ụmụ ikom ndị a: Ahian, Shekem, Liiki na Aniam.
And these were the sons of Shemida: Ahian, Shechem, Likhi, and Aniam.
20 Ụmụ Ifrem bụ Shutela, Bered, Tahat, Eleada, Tahat
The descendants of Ephraim: Shuthelah, Bered his son, Tahath his son, Eleadah his son, Tahath his son,
21 na Zabad nwa ya, na Shutela nwa ya. Eza na Elead bụ ndị gara ịchịkọrọ anụ ụlọ ndị Gat, ndị ikom nwe obodo ahụ jidere ha gbuo ha nʼebe ahụ.
Zabad his son, and Shuthelah his son. Ezer and Elead were killed by the natives of Gath, because they went down to steal their livestock.
22 Ifrem nna ha ruru ụjụ nke ukwuu nʼihi ọnwụ ha, ma ụmụnna ya kasịrị ya obi.
Their father Ephraim mourned for many days, and his relatives came to comfort him.
23 Mgbe nwunye ya mụrụ nwa nwoke ọzọ, ọ kpọrọ aha ya Beriya, nke pụtara, Ihe ndaba ọjọọ, nʼihi ọnwụ Elead na Eza.
And again he slept with his wife, and she conceived and gave birth to a son. So he named him Beriah, because tragedy had come upon his house.
24 Aha nwa Ifrem nke nwanyị bụ Sheera. Sheera bụ onye wuru akụkụ ugwu na ndịda Bet-Horon, wuokwa Uzen-Sheera.
His daughter was Sheerah, who built Lower and Upper Beth-horon, as well as Uzzen-sheerah.
25 Ndị a bụkwa ụmụ Ifrem: Refa, nna Reshef, onye bụ nna Tela. Tela bụ nna Tahan,
Additionally, Rephah was his son, Resheph his son, Telah his son, Tahan his son,
26 onye bụ nna Ladan, Ladan bụ nna Amihud, onye bụ nna Elishama.
Ladan his son, Ammihud his son, Elishama his son,
27 Elishama bụ nna Nun, onye bụ nna Joshua.
Nun his son, and Joshua his son.
28 Betel na obodo ndị ọzọ gbara ya gburugburu, ya bụ Naaran, nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, na Gaza na obodo nta ya, ndị dị nʼọdịda anyanwụ, na Shekem, na obodo ndị ọzọ, tutu ruo Aya, na obodo nta ya niile, so nʼala ha.
Their holdings and settlements included Bethel and its villages, Naaran to the east, Gezer and its villages to the west, and Shechem and its villages as far as Ayyah and its villages.
29 Ụmụ Manase, nwa Josef, nwa nwa Izrel, bikwa nʼobodo ndị a dị nʼoke ala ha: Bet-Shan, na Teanak, na Megido, na Doa, tinyere obodo nta ha niile.
And along the borders of Manasseh were Beth-shean, Taanach, Megiddo, and Dor, together with their villages. The descendants of Joseph son of Israel lived in these towns.
30 Asha mụrụ ndị a: Imna, Ishva, Ishvi na Beriya. Nwa ya nwanyị bụ Sera.
The children of Asher: Imnah, Ishvah, Ishvi, Beriah, and their sister Serah.
31 Beriya amụta ndị a: Heba na Malkiel, onye bụ nna Biazait.
The sons of Beriah: Heber, as well as Malchiel, who was the father of Birzaith.
32 Heba bụ onye mụrụ Jaflet, Shoma na Hotam. Nwanne ha nwanyị bụ Shua.
Heber was the father of Japhlet, Shomer, and Hotham, and of their sister Shua.
33 Ụmụ Jaflet mụrụ bụ Pasak, Bimhal na Ashvat. Ndị a bụ ụmụ Jaflet.
The sons of Japhlet: Pasach, Bimhal, and Ashvath. These were Japhlet’s sons.
34 Shoma amụọ Ahi, Roga, Huba na Aram.
The sons of Shemer: Ahi, Rohgah, Hubbah, and Aram.
35 Nwanne ya nwoke Helem mụrụ Zofa, Imana, Shelesh na Amal.
The sons of his brother Helem: Zophah, Imna, Shelesh, and Amal.
36 Zofa amụta ndị a: Sua, Hanefa, Shual, Beri, Imra,
The sons of Zophah: Suah, Harnepher, Shual, Beri, Imrah,
37 Beza, Hod, Shama, Shilsha, Itran na Beera.
Bezer, Hod, Shamma, Shilshah, Ithran, and Beera.
38 Jeta mụtara Jefune, Pispa na Ara.
The sons of Jether: Jephunneh, Pispa, and Ara.
39 Ụla amụta Ara, Haniel na Rizia.
The sons of Ulla: Arah, Hanniel, and Rizia.
40 Ụmụ ụmụ Asha ndị a niile bụ ndịisi ezi, ndị a sara anya na mmiri họpụta, ndị bụ dimkpa nʼagha, ndị ndu a ma ama. Ọnụọgụgụ ndị ha tozuru ije agha dị puku iri abụọ na isii, ndị e depụtara aha ha nʼakwụkwọ usoro ọmụmụ.
All these were the descendants of Asher—heads of their families, choice and mighty men of valor, and chiefs among the leaders. The number of men fit for battle, recorded in their genealogies, was 26,000.

< 1 Ihe E Mere 7 >