< 1 Ihe E Mere 5 >

1 Ọkpara Izrel bụ Ruben. Ma nʼihi na ọ merụrụ ihe ndina nna ya site na idinakwuru nwunye nna ya, a napụrụ ya ọnọdụ ọkpara ya were ya nye ụmụ nwanne ya Josef mụtara. Nʼihi ya, akwụkwọ akụkọ usoro ọmụmụ ụmụ Izrel akpọghị Ruben ọkpara.
Wana wa Rubeni mzaliwa wa kwanza wa Israeli - sasa Rubeni alikuwa mzaliwa wa kwanza wa Israeli, lakini haki yake ya mzaliwa wa kwanza ilipewa kwa wana wa Yusufu mwana wa Israeli kwa sababu Rubeni alinajisi kochi la baba yake. Hivyo hajanakiliwa kama mwana wa kwanza.
2 Ọ bụ ezie na Juda dị ike karịa ụmụnna ya, bụrụkwa eziokwu na onyendu si na Juda pụta, maọbụ Josef ka e nyere oke ruuru ọkpara.
Yuda alikuwa mwenye nguvu kuliko kaka zake, na kiongozi ata toka kwake. Lakini haki ya mzaliwa wa kwanza ilikuwa ya Yusufu -
3 Ruben, ọkpara Izrel mụrụ ndị ikom ndị a: Hanok, na Palu, na Hezrọn, na Kami.
wana wa Rubeni, mzaliwa wa kwanza wa Israeli alikuwa Hanoki, Palu, Hezroni, na Karmi.
4 Juel mụrụ Shemaya, nna Gog, Gog mụrụ Shimei.
Uzao wa Yoeli ulikuwa huu: Mwana wa Yoeli alikuwa Shemaia. Mwana wa Shemaia alikuwa Gogi. Mwana wa Gogi alikuwa Shimei.
5 Shimei mụrụ Maịka, Maịka amụọ Reaya. Reaya amụọ Baal.
Mwana wa Shimei alikuwa Mika. Mwana wa Mika alikuwa Reaia. Mwana wa Reaia alikuwa Baali.
6 Baal mụrụ Beera, onye Tiglat-Pilesa eze ndị Asịrịa dọtara nʼagha. Beera bụkwa onyendu ndị Ruben.
Mwana wa Baali alikuwa Bera, ambaye Tiligathi Pileseri alimpeleka matekani kule Assiria. Bera alikuwa kiongozi katika kabila la Rubeni.
7 Ndị ụmụnna ha dịka agbụrụ niile ha si dị, bụ ndị e depụtara aha ha dịka usoro ọmụmụ ha si dị; Jeiel onyeisi, na Zekaraya,
Ndugu wa Bera kwa makabila yao ni hawa wafuatao, wameorodheshwa katika nakala za uzao wao: Yeieli wa kwanza, Zekaria, na
8 na Bela nwa Azaz nwa Shema, nwa Juel. Ha nwere ebe obibi ha site nʼAroea ruo nʼugwu Nebo, rukwaa Baal-Meon.
Bela mwana wa Azazi mwana wa Shema mwana wa Yoeli. Waliishi Aroeri, kwa umbali wa Nebo na Baali Meoni,
9 Ha bụ ndị ọzụzụ atụrụ, nwekwa ọtụtụ igwe anụ ụlọ. Ọ bụkwa nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, nʼọnụ ọzara ruo nʼosimiri Yufretis ka ha na-azụ ha, nʼihi na anụ ụlọ ha nwere bara ụba na Gilead.
na mwanzo wa mashariki mwa jangwa lenye umbali wa hadi Mto Efarati. Hii ni kwa sababu walikuwa na mifugo mingi katika nchi ya Gileadi.
10 Nʼoge Sọl bụ eze Izrel, ụmụ Ruben meriri ndị Haga nʼagha, bichie ala ha niile dị nʼọwụwa anyanwụ Gilead.
Katika siku za Sauli, kabila la Rubeni lilishambulia Wahagiri na kuwa shinda. Wakaishi ndani ya hema za Wahagiri katika nchi yote mashariki mwa Gileadi.
11 Ụmụ Gad bi nʼakụkụ ha site na Bashan ruo Saleka.
Kabila la Gadi liliishi karibu nao, katika nchi ya Bashani umbali wa Saleka.
12 Juel bụ onyendu na Bashan, Shafam na-esote ya, ya na Janai na Shafat.
Viongozi wao walikuwa Yoeli, aliyekuwa kichwa wa ukoo, na Shafamu alikuwa kichwa wa ukoo mwingine, na Yanai na Shafati walikuwa wa Bashani.
13 Ụmụnna ha, ndị bụ ndị ndu ikwu asaa a bụ, Maikel, na Meshulam, na Sheba, na Jorai, na Jakan, na Zia, na Eba.
Ndugu zao, kwa familia za baba yao, walikuwa Mikaeli, Meshulamu, Sheba, Yorai, Yakani, na Eberi - jumla saba wote.
14 Ndị a bụ ụmụ ndị ikom Abihail, nwa Huri, nwa Jaroa, nwa Gilead, nwa Maikel, nwa Jehishai, nwa Jado, nwa Buz.
Hawa watu walio tajwa hapo juu ni uzao wa Abihaili, na Abihaili alikuwa mwana wa Huri. Huri alikuwa mwana w a Yaroa. Yaroa alikuwa mwana wa Gileadi. Gileadi alikuwa mwana wa Mikaeli. Mikaeli alikuwa mwana wa Yeshishai. Yeshishai alikuwa mwana wa Yado. Yado alikuwa mwana wa Buzi.
15 Ahi nwa Abdiel, nwa Guni bụ onyeisi nʼetiti ụmụnna ya.
Ahi mwana wa Abidieli mwana wa Guni, alikuwa kichwa cha familia ya baba yake.
16 Ndị Gad nwere ebe obibi na Gilead nʼime Bashan, na nʼobodo nta niile gbara ya gburugburu. Ha bikwa nʼebe ahịhịa anụ ụlọ na-ata jupụtara na Sharọn ruo nʼebe oke ala ha kwụsịrị.
Waliishi Gileadi, Bashani, katika miji, na katika nchi zote za malisho ya Sharoni kwa umbali wa mipaka yake.
17 E denyere aha ndị a niile nʼakwụkwọ usoro ọmụmụ nʼoge Jotam bụ eze Juda, na nʼoge Jeroboam bụ eze Izrel.
Hawa wote waliorodheshwa katika nakaka za uzao katika siku za Yothamu mfalme wa Yuda na Yeroboamu mfalme wa Israeli.
18 Ndị Ruben na ndị Gad, na ọkara ebo Manase nwere iri puku mmadụ anọ na anọ na narị asaa na iri isii ndị jikeere ije agha, ndị dị ike, ndị a zụrụ iji ọta na mma agha, na ụta ibu agha.
Warubeni, Wagadi, na nusu ya kabila la Manase walikuwa na wana jeshi elfu arobaini na nne walio fuzu kwa vita, walio beba ngao na upanga, na pinde na mishale.
19 Ha busoro ndị Haga, na Jetua, na Nafish na ndị Nodab agha.
Waliwashambulia Wahagri, Yeturi, Nafishi, na Nodabu.
20 E nyeere ha aka ibuso ha agha, Chineke nyefere ndị Haga na ndị niile na-enyere ha aka nʼaka ha, nʼihi na ha kpọkuru ya nʼoge ọgụ ahụ. Ọ zara ekpere ha nʼihi na ha tụkwasịrị ya obi.
Walipokea msaada wa Kimungu dhidi yao. Katika hili Wahagri na wote walio kuwa nao walishindwa. Hii ni kwa sababu Waisraeli walipaza sauti katika vita, na yeye akawajibu, kwa sababu waliweka tumaini lao kwake.
21 Ha ji ike chịkọrọ anụ ụlọ ndị Haga, dị iri puku ịnyịnya kamel ise, narị puku atụrụ abụọ na iri puku ise, puku ịnyịnya ibu abụọ. Ha dọkpụkwara narị puku ndị mmadụ nʼagha.
Walikamata wanya wao, pamoja na ngamia elfu hamsini, kondoo 250, 000, punda elfu mbili, na wanaume 100, 000.
22 E gbukwara ọtụtụ ndị mmadụ nʼihi na agha ahụ bụ nke Chineke lụrụ nʼonwe ya. Ha bichiri ala ahụ tutu ruo mgbe a dọọrọ Izrel niile nʼagha.
Kwa sababu Mungu aliwapigania, waliua maadui wengi. Waliishi katika nchi yao mpaka mateka.
23 Ọkara ebo Manase dị ukwuu nʼọnụọgụgụ; ha nwere ebe obibi ha site nʼala Bashan ruo Baal-Hemon, ya bụ, ruo Senia, ugwu Hemon.
Baadhi ya watu wa kabila la Manase waliishi katika nchi ya Bashani kwa umbali wa Hermoni na Seniri (hiyo ni, Mlima Hermoni).
24 Ndịisi ikwu ha niile bụ ndị a: Efaa, Ishi, Eliel, Azriel, Jeremaya, Hodavaya na Jadiel. Ndị a niile bụ dimkpa nʼagha, ndị a ma ama na ndịisi ezinaụlọ.
Hawa walikuwa viongozi wa familia zao: Eferi, Ishi, Elieli, Azrieli, Yeremia, Hodavia, na Yahdieli. Walikuwa wenye nguvu na wanaume wa jasiri, wanaume maharufu, viongozi wa familia zao.
25 Ma ha bụ ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi nye Chineke nna nna ha. Kama ha merụrụ onwe ha site nʼife chi niile nke ndị bi nʼala ahụ na mbụ, bụ ndị Chineke lara nʼiyi nʼihu ha.
Lakini walikuwa sio wa aminifu kwa Mungu wa babu zao. Badala yake, waliabudu miungu ya watu waio nchi, ambao Mungu aliwaangamiza mbele yao.
26 Nʼihi nke a, Chineke nke Izrel kpaliri mmụọ Pul, bụ eze Asịrịa (ya bụ Tiglat-Pilesa eze ndị Asịrịa), ka o bilie megide ndị Ruben, ndị Gad na ọkara ebo Manase, dọta ha nʼagha, buru ha gaa Hala, na Hoboa, na Hara na osimiri Gozan, ebe ha nọ ruo taa.
Mungu wa Israeli alimchochea Puli mfalme wa Assiria ( ambaye pia uitwa Tiligathi Pileseri, mfalme wa Assiria). Aliwa peleka matekani Warubeni, Wagadi, na nusu ya kabila la Manase. Aliwaleta kwa Hala, Habori, Hara, na kwenye mto wa Gozani, ambapo wapo adi leo.

< 1 Ihe E Mere 5 >