< 1 Ihe E Mere 4 >

1 Ndị ikwu Juda bụ Perez, Hezrọn, Kami, Hua na Shobal.
Uzao wa Yuda ulikuwa Peresi, Hesroni, Karmi, Huri, na Shobali.
2 Shobal mụrụ Reaya, onye bụ nna Jahat. Jahat bụ nna Ahumai na Lahad, ndị a bụ ndị ikwu Zorat.
Shobali alikuwa baba wa Reaya. Reaya alikuwa baba wa Yahathi. Yahathi alikuwa baba wa Ahumai na Lahadi. Hawa walikuwa mababu wa koo za Wasorathi.
3 Ndị a bụ ụmụ Etam: Jezril, na Ishma, na Idbash, aha nwanne ha nwanyị bụ Hazelelponi.
Hawa walikuwa mababu wa ukoo katika mji wa Etamu: Yezreeli, Ishma, na Idbashi. Babu yao alikuwa Haselelponi.
4 Penuel bụ nna Gedoa, Eza bụ nna Husha. Ndị a bụ ụmụ Hua, bụ ọkpara Efrata, nna Betlehem.
Penueli alikuwa babu wa koo katika mji wa Gedori. Ezeri alikuwa muanzilishi wa koo katika Husha. Hawa walikuwa uzao wa Huri, mzaliwa wa kwanza wa Efrathi na muanzilishi wa Bethelehemu.
5 Ashua nna Tekoa lụrụ ndị nwunye abụọ: Hela na Naara.
Ashuri baba wa Tekoa alikuwa na wake wawili, Hela na Naara.
6 Naara mụtaara ya Ahuzam, na Hefa, na Temeni, na Haahashitari. Ndị a bụ ụmụ ndị ikom Naara.
Naara alimzalia Ahuzamu, Heferi, Temeni na Ahashtari. Hawa walikua wana wa Naara.
7 Ụmụ ndị ikom Hela mụtara bụ Zeret, Zoha, Etnan
Wana wa Hela walikua Serethi, Ishari, Ethnani,
8 na Koz, onye bụ nna Anub na Hazobeba, nakwa nke ikwu Ahahel, nwa Harum.
na Kozi, alikua baba wa Anubu na Sobeba, na koo zilizotoka kwa Aharheli mwana wa Harumu.
9 Jabez bụ nwoke a na-asọpụrụ karịa ụmụnne ya ndị ikom niile. Nne ya kpọrọ aha ya Jabez, sị, “A mụrụ m ya nʼihe mgbu.”
Yabesi aliheshimika zaidi ya kaka zake. Mama yake alimuita Yabesi. Alisema, “Kwasababu nimemzaa katika huzuni.”
10 Jabez tikuru Chineke Izrel mkpu akwa sị ya, “Biko gọzie m, mee ka oke ala m saa mbara. Kwere ka aka gị dịkwasị m, ma wezuga m site nʼihe mmerụ ahụ ọbụla, ka m si otu a gbanarị ihe mgbu.” Chineke zara ekpere ya meere ya ihe ọ rịọrọ.
Yabesi akamuita Mungu wa Israeli na kusema, “Kama tu utanibariki mimi, ongeza mipaka yangu, na mkono wako ukuwa juu yangu. Ukifanya hivi utaninusuru na mabaya, ili kwamba niwe huru na huzuni!” Kwa hivyo Mungu akamjalia maombi yake.
11 Kelub, nwanne nwoke Shua mụrụ Mehia, nna Eshton,
Kelubu kaka wa Shuha akawa baba wa Mehiri, aliyekuwa baba wa Eshtoni.
12 Eshton mụrụ Bet-Raafa, na Pasea, na Tihina. Tihina mụrụ Ir Nahash. Ndị a niile bụ ndị ikwu Reka.
Eshtoni akawa baba wa Beth-Rafa, Pasea, na Tehina, ambaye alianzisha mji wa Nahashi. Hawa ni wanaume walioishi Reka.
13 Ụmụ ndị ikom Kenaz mụtara bụ, Otniel na Seraya. Otniel amụta Hatat na Meonotai.
Wana wa Kenazi walikua Othinieli na Seraia. Wana wa Othinieli walikuwa Hathathi na Meonothai.
14 Meonotai bụ nna Ofra. Seraya bụ nna Joab, Joab bụ nna Ge Harashim. A kpọrọ ha Ge Harashim nʼihi na ha bụ ndị ǹka.
Meonothai akawa baba wa Ofara, na Seraia akawa baba wa Yohabu, mwanzilishi wa Ge Harashimu, ambao watu wake walikua wahunzi.
15 Kaleb nwa Jefune mụrụ Iru, Elaa na Naam. Ma Elaa mụrụ Kenaz.
Wana wa Kalebu mwana wa Yefune walikua Iru, Ele na Namu. Wana wa Ela alikua Kenazi.
16 Ụmụ ndị ikom Jehalelel mụrụ bụ ndị a: Zif, Zifa, Tiria na Asarel.
Wana wa Yehaleli walikua Zifi, Zifa, Tiriya, na Azareli.
17 Ụmụ Ezra bụ Jeta, Mered, Efaa na Jalon. Otu nʼime ndị nwunye Mered lụrụ mụtara Miriam, Shamai na Ishba, bụ nna Eshtemoa.
Wana wa Ezra walikua Yetheri, Meredi, Eferi, na Yaloni.
18 Ndị a bụkwa ụmụ ndị ikom Bitaya, bụ nwa nwanyị Fero, nke Mered lụrụ. Nwunye ya nke si nʼebo Juda mụrụ Jered bụ nna Gedoa, Heba nna Soko na Jekutiel nna Zanoa.
Mke wake Meredi wa Kimisri alimzalia Miriamu, Shamai, na Ishibahi, aliyekua baba wa Eshitemoa. Hawa walikua wana wa Bithia, binti wa Farao, ambaye Meredi alimuoa. Mke wa Kiyahudi wa Meredi alimzalia Yeredi, ambaye alikua baba wa Gedore; Heberi, aliyekua baba wa Soko; na Yekuthieli aliyekua baba wa Zanoa.
19 Ụmụ ndị ikom nwunye Hodia, nwanne nwanyị Naham, bụ nna Keila onye Gam na Eshtemoa onye Maaka.
Kati ya watoto wawili wa mke wa Hodia, dada wa Nahamu, mmoja wao kawa baba wa Keila Mgarimite. Mwingine alikua Eshitemoa Mmakathite.
20 Ụmụ ndị ikom Shimon mụrụ bụ Amnọn, Rina, Ben-Hanan na Tilon. Ishi mụrụ Zohet na Ben-Zohet.
Wana wa Shimoni walikua Amnoni, Rina, Beni Hanani, na Tilon. Wana wa Ishi walikua Zohethi na Beni Zoheti.
21 Ụmụ Shela nwa Juda mụrụ bụ Ịa, nna Leka, Laada, nna Maresha, na ikwu ndị ọrụ ịkpa ezi akwa ọcha nọ na Bet Ashbea
Uzao wa Shela mwana wa Yuda, Ulikua ni Eri baba wa Leka, Laada baba wa Maresha na koo za wafanyakazi wa kushona kule Beth Ashbea,
22 na Jokim, ndị ikom Koziba, na Joash na Saraf, ndị chịrị na Moab na Jashubi Lehem. Aha ndị a sitere nʼakwụkwọ akụkọ mgbe ochie.
Yoakimu, Wanaume wa Kozeba, na Yoashi na Sarafi, waliokua na mali huko Moabu, lakini walirudi Bethlehemu. ( Maelezo haya yametoka kwenye nakala za zamani.)
23 Ha bụ ndị ọkpụ ite, ndị biri na Netaim ya na Gedera. Ha biri nʼebe ahụ nʼihi ịrụrụ eze ọrụ.
Baadhi ya watu hawa walikuwa ni wafinyanzi walioishi Netaimu na Gedera na wakawa wafanyakazi wa Mfalme.
24 Simiọn mụrụ Nemuel, Jamin, Jarib, Zera na Shaul.
Uzao wa Simeoni ulikua Jamini, Jaribu, Zera, na Shauli.
25 Shaul mụrụ Shalum nna Mibsam. Mibsam bụkwa nna Mishma.
Shalumu alikua mwana wa Shauli, Mibisamu mwana wa Shalumu, na Mishima mwana wa Mibisamu.
26 Ụmụ Mishma mụrụ bụ Hamuel nwa ya, Zakua nwa ya na Shimei nwa ya.
Ukoo wa Mishima ulikua Hamueli mwana wake, Zakuri mjukuu wake, na Shimei kitukuu chake.
27 Shimei mụrụ ndị ikom iri na isii, na ndị inyom isii. Ụmụnne ya ndị ikom enweghị ọtụtụ ụmụ dịka ya onwe ya. Nʼihi ya, ndị ikwu ya adịghị ukwu nʼọnụọgụgụ dịka ndị ọzọ na Juda.
Shimei alikua na wana kumi na sita na mabinti sita. Kaka yake hakua na watoto wengi, Hivyo koo zao hazikuongezeka kwa idadi kubwa kama wato wa Yuda walivyoongezeka.
28 Ha biri na Bịasheba, Molada, Haza Shual,
Waliishi Beasheba, Molada, na Hazari Shuali.
29 Bilha, Ezem, Tolad,
Pia waliishi Bilha, Ezemu, Toladi,
30 Betuel, Homa, Ziklag,
Bethueli, Horma, Zikilagi,
31 Bet-Makabot, Haza-Susim, Bet-Biri na Shaaraim. Ọ bụ ha bi nʼobodo ndị a niile tutu ruo nʼoge ọchịchị Devid.
Bethi Markabothi, Hazari Susimi, Bethi Biri, na Shaaraimu. Hii ilikua miji yao mpaka utawala wa Daudi.
32 Obodo gbara ha gburugburu bụ Etam, Ain, Rimọn, Token na Ashan, obodo ise,
Vijiji vyao vitano vilikua Etamu, Aini, Tocheni, na Ashani,
33 tinyere obodo nta niile gbara obodo ndị a gburugburu ruo na Baalat. Ndị a bụ ebe obibi ha. Ha nwekwara akwụkwọ usoro ọmụmụ.
pamoja na mipaka ya vijiji kwa umbali wa Baali. Haya yalikua makazi yao, na walitunza kumbukumbu za uzao wao.
34 Meshobab, Jamlek, Josha nwa Amazaya,
Viongozi wa ukoo walikua Meshobabu, Yamileki, Yoshahi mwana wa Amazia,
35 Juel, Jehu nwa Joshibaya, nwa Seraya, nwa Asiel,
Yoeli, Yehu mwana wa Yoshibia mwana wa Seraia mwana wa Asieli,
36 nakwa Elioenai, Jaakoba, Jeshohaya, Asaya, Adiel, Jesimiel na Benaya,
Elioenai, Yaakoba, Yeshohaia, Asaia, Adieli, Yesimieli, Benaia,
37 na Ziza nwa Shifi, nwa Alon, nwa Jedaya, nwa Shimri, nwa Shemaya.
na Ziza mwana wa Shifi mwana wa Aloni mwana wa Yedaia mwana wa Shimiri mwana wa Shemaia.
38 Ndị ikom ndị a e depụtara aha ha bụ ndị ndu ikwu ha. Ezinaụlọ ha mụbara nke ukwuu,
Hawa walio orodheshwa kwa majina walikua viongozi wa koo zao, na koo zao ziliongezeka sana.
39 ha gakwara na mpụta Gedoa nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ ndagwurugwu ịchọrọ igwe anụ ụlọ ha ebe ịta nri.
Walienda karibu na Gedori, mashariki mwa bonde, kutafuta malisho ya mifugo yao.
40 Ha chọtara ebe ịta ahịhịa anụ ụlọ mara mma, nke sara mbara, nke dị jụụ, bụrụkwa ebe nsogbu na-adịghị. Ụfọdụ nʼime ụmụ Ham ebiela nʼebe ahụ na mbụ.
Walipata malisho mengi na mazuri. Nchi ilikua tambarare, tulivu na ya amani. Wahamu waliishi hapo awali.
41 Ndị ikom ndị a e dere aha ha nʼakwụkwọ usoro ọmụmụ bịara nʼoge Hezekaya na-achị dịka eze Juda. Ha busoro ụmụ Ham agha nʼebe obibi ha, busokwa ndị Meunim bi nʼebe ahụ agha, bibie ha kpamkpam, dịka ọ dị ruo taa. Emesịa ha bichiri ebe ahụ nʼihi na ebe ịta ahịhịa nke igwe anụ ụlọ ha nʼebe ahụ.
Hao walio orodheshwa hapo kwa majina walikuja katika siku za Hezekia mfalme wa Yuda, na wakashambulia makazi ya Wahamu na Wameuni, ambao pia walikua hapo. Waliwaangamiza kabisa na kuishi hapo sababu walipata malisho kwa ajili ya mifugo yao.
42 Ọzọkwa, narị ndị ikom ise nʼime ndị a si nʼebo Simiọn, ndị ndu ha bụ Pelataya, Nearaya, Refaya na Uziel, ụmụ Ishi busoro obodo ugwu ugwu Sia agha.
Wanaume mia tano wa kabila la Simeoni walienda katika mlima Seiri, na viongozi wao Pelatia, Nearia, Refaia, na Uzieli, wana wa Ishi.
43 Ha gburu ndị Amalek fọdụrụ ndụ nʼebe ahụ, bichie ala ahụ ruo taa.
Waliwashinda wakimbizi wa Waamaleki waliobakia, na wakaishi hapo hadi siku hii.

< 1 Ihe E Mere 4 >