< 1 Ihe E Mere 4 >

1 Ndị ikwu Juda bụ Perez, Hezrọn, Kami, Hua na Shobal.
유다의 아들들은 베레스와 헤스론과 갈미와 훌과 소발이라
2 Shobal mụrụ Reaya, onye bụ nna Jahat. Jahat bụ nna Ahumai na Lahad, ndị a bụ ndị ikwu Zorat.
소발의 아들 르아야는 야핫을 낳았고 야핫은 아후매와 라핫을 낳았으니 이는 소라 사람의 족속이며
3 Ndị a bụ ụmụ Etam: Jezril, na Ishma, na Idbash, aha nwanne ha nwanyị bụ Hazelelponi.
에담 조상의 자손들은 이스르엘과 이스마와 잇바스와 저희의 매제 하술렐보니와
4 Penuel bụ nna Gedoa, Eza bụ nna Husha. Ndị a bụ ụmụ Hua, bụ ọkpara Efrata, nna Betlehem.
그들의 아비 브누엘과 후사의 아비 에셀이니 이는 다 베들레헴의 아비 에브라다의 맏아들 훌의 소생이며
5 Ashua nna Tekoa lụrụ ndị nwunye abụọ: Hela na Naara.
드고아의 아비 아스훌의 두 아내는 헬라와 나아라라
6 Naara mụtaara ya Ahuzam, na Hefa, na Temeni, na Haahashitari. Ndị a bụ ụmụ ndị ikom Naara.
나아라는 그로 말미암아 아훗삼과 헤벨과 데므니와 하아하스다리를 낳았으니 이는 나아라의 소생이요
7 Ụmụ ndị ikom Hela mụtara bụ Zeret, Zoha, Etnan
헬라의 아들들은 세렛과 이소할과 에드난이며
8 na Koz, onye bụ nna Anub na Hazobeba, nakwa nke ikwu Ahahel, nwa Harum.
고스는 아눕과 소베바와 하룸의 아들 아하헬 족속들을 낳았으며
9 Jabez bụ nwoke a na-asọpụrụ karịa ụmụnne ya ndị ikom niile. Nne ya kpọrọ aha ya Jabez, sị, “A mụrụ m ya nʼihe mgbu.”
야베스는 그 형제보다 존귀한 자라 그 어미가 이름하여 야베스라 하였으니 이는 내가 수고로이 낳았다 함이었더라
10 Jabez tikuru Chineke Izrel mkpu akwa sị ya, “Biko gọzie m, mee ka oke ala m saa mbara. Kwere ka aka gị dịkwasị m, ma wezuga m site nʼihe mmerụ ahụ ọbụla, ka m si otu a gbanarị ihe mgbu.” Chineke zara ekpere ya meere ya ihe ọ rịọrọ.
야베스가 이스라엘 하나님께 아뢰어 가로되 원컨대 주께서 내게 복에 복을 더하사 나의 지경을 넓히시고 주의 손으로 나를 도우사 나로 환난을 벗어나 근심이 없게 하옵소서 하였더니 하나님이 그 구하는 것을 허락하셨더라
11 Kelub, nwanne nwoke Shua mụrụ Mehia, nna Eshton,
수하의 형 글룹이 므힐을 낳았으니 므힐은 에스돈의 아비요
12 Eshton mụrụ Bet-Raafa, na Pasea, na Tihina. Tihina mụrụ Ir Nahash. Ndị a niile bụ ndị ikwu Reka.
에스돈은 베드라바와 바세아와 이르나하스의 아비 드힌나를 낳았으니 이는 다 레가 사람이며
13 Ụmụ ndị ikom Kenaz mụtara bụ, Otniel na Seraya. Otniel amụta Hatat na Meonotai.
그나스의 아들들은 옷니엘과 스라야요 옷니엘의 아들은 하닷이며
14 Meonotai bụ nna Ofra. Seraya bụ nna Joab, Joab bụ nna Ge Harashim. A kpọrọ ha Ge Harashim nʼihi na ha bụ ndị ǹka.
므오노대는 오브라를 낳았고 스라야는 요압을 낳았으니 요압은 게하라심의 조상이라 저희들은 공장이었더라
15 Kaleb nwa Jefune mụrụ Iru, Elaa na Naam. Ma Elaa mụrụ Kenaz.
여분네의 아들 갈렙의 자손은 이루와 엘라와 나암과 엘라의 자손과 그나스요
16 Ụmụ ndị ikom Jehalelel mụrụ bụ ndị a: Zif, Zifa, Tiria na Asarel.
여할렐렐의 아들은 십과 시바와 디리아와 아사렐이요
17 Ụmụ Ezra bụ Jeta, Mered, Efaa na Jalon. Otu nʼime ndị nwunye Mered lụrụ mụtara Miriam, Shamai na Ishba, bụ nna Eshtemoa.
에스라의 아들들은 예델과 메렛과 에벨과 얄론이며 메렛은 미리암과 삼매와 에스도모아의 조상 이스바를 낳았으니
18 Ndị a bụkwa ụmụ ndị ikom Bitaya, bụ nwa nwanyị Fero, nke Mered lụrụ. Nwunye ya nke si nʼebo Juda mụrụ Jered bụ nna Gedoa, Heba nna Soko na Jekutiel nna Zanoa.
이는 메렛의 취한 바로의 딸 비디아의 아들들이며 또 그 아내 여후디야는 그돌의 조상 예렛과 소고의 조상 헤벨과 사노아의 조상 여구디엘을 낳았으며
19 Ụmụ ndị ikom nwunye Hodia, nwanne nwanyị Naham, bụ nna Keila onye Gam na Eshtemoa onye Maaka.
나함의 누이인 호디야의 아내의 아들들은 가미 사람 그일라의 아비와 마아가 사람 에스드모아며
20 Ụmụ ndị ikom Shimon mụrụ bụ Amnọn, Rina, Ben-Hanan na Tilon. Ishi mụrụ Zohet na Ben-Zohet.
시몬의 아들들은 암논과 린나와 벤하난과 딜론이요 이시의 아들들은 소헷과 벤소헷이더라
21 Ụmụ Shela nwa Juda mụrụ bụ Ịa, nna Leka, Laada, nna Maresha, na ikwu ndị ọrụ ịkpa ezi akwa ọcha nọ na Bet Ashbea
유다의 아들 셀라의 자손은 레가의 아비 에르와 마레사의 아비 라아다와 세마포 짜는 자의 집 곧 아스베야의 집 족속과
22 na Jokim, ndị ikom Koziba, na Joash na Saraf, ndị chịrị na Moab na Jashubi Lehem. Aha ndị a sitere nʼakwụkwọ akụkọ mgbe ochie.
또 요김과 고세바 사람들과 요아스와 모압을 다스리던 사람과 야수비네헴이니 이는 다 옛 기록에 의지한 것이라
23 Ha bụ ndị ọkpụ ite, ndị biri na Netaim ya na Gedera. Ha biri nʼebe ahụ nʼihi ịrụrụ eze ọrụ.
이 모든 사람은 옹기장이가 되어 수풀과 산울 가운데 거하는 자로서 거기서 왕과 함께 거하여 왕의 일을 하였더라
24 Simiọn mụrụ Nemuel, Jamin, Jarib, Zera na Shaul.
시므온의 아들들은 느무엘과 야민과 야립과 세라와 사울이요
25 Shaul mụrụ Shalum nna Mibsam. Mibsam bụkwa nna Mishma.
사울의 아들은 살룸이요 그 아들은 밉삼이요 그 아들은 미스마요
26 Ụmụ Mishma mụrụ bụ Hamuel nwa ya, Zakua nwa ya na Shimei nwa ya.
미스마의 아들은 함무엘이요 그 아들은 삭굴이요 그 아들은 시므이라
27 Shimei mụrụ ndị ikom iri na isii, na ndị inyom isii. Ụmụnne ya ndị ikom enweghị ọtụtụ ụmụ dịka ya onwe ya. Nʼihi ya, ndị ikwu ya adịghị ukwu nʼọnụọgụgụ dịka ndị ọzọ na Juda.
시므이는 아들 열여섯과 딸 여섯이 있으나 그 형제에게는 자녀가 몇이 못되니 그 온 족속이 유다 자손처럼 번성하지 못하였더라
28 Ha biri na Bịasheba, Molada, Haza Shual,
시므온 자손의 거한 곳은 브엘세바와 몰라다와 하살수알과
29 Bilha, Ezem, Tolad,
빌하와 에셈과 돌랏과
30 Betuel, Homa, Ziklag,
브두엘과 호르마와 시글락과
31 Bet-Makabot, Haza-Susim, Bet-Biri na Shaaraim. Ọ bụ ha bi nʼobodo ndị a niile tutu ruo nʼoge ọchịchị Devid.
벧말가봇과 하살수심과 벧비리와 사아라임이니 다윗 왕 때까지 이 모든 성읍이 저희에게 속하였으며
32 Obodo gbara ha gburugburu bụ Etam, Ain, Rimọn, Token na Ashan, obodo ise,
그 향촌은 에담과 아인과 림몬과 도겐과 아산 다섯 성읍이요
33 tinyere obodo nta niile gbara obodo ndị a gburugburu ruo na Baalat. Ndị a bụ ebe obibi ha. Ha nwekwara akwụkwọ usoro ọmụmụ.
또 그 각 성읍 사면에 촌이 있어 바알까지 미쳤으니 시므온 자손의 주소가 이러하고 각기 보계가 있더라
34 Meshobab, Jamlek, Josha nwa Amazaya,
또 메소밥과 야믈렉과 아마시야의 아들 요사와
35 Juel, Jehu nwa Joshibaya, nwa Seraya, nwa Asiel,
요엘과 아시엘의 증손 스라야의 손자 요시비야의 아들 예후와
36 nakwa Elioenai, Jaakoba, Jeshohaya, Asaya, Adiel, Jesimiel na Benaya,
또 엘료에내와 야아고바와 여소하야와 아사야와 아디엘과 여시미엘과 브나야와
37 na Ziza nwa Shifi, nwa Alon, nwa Jedaya, nwa Shimri, nwa Shemaya.
또 스마야의 오대손 시므리의 현손 여다야의 증손 알론의 손자 시비의 아들 시사니
38 Ndị ikom ndị a e depụtara aha ha bụ ndị ndu ikwu ha. Ezinaụlọ ha mụbara nke ukwuu,
이 위에 녹명된 자는 다 그 본족의 족장이라 그 종족이 더욱 번성한지라
39 ha gakwara na mpụta Gedoa nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ ndagwurugwu ịchọrọ igwe anụ ụlọ ha ebe ịta nri.
저희가 그 양떼를 위하여 목장을 구하고자 하여 골짜기 동편 그돌 지경에 이르러
40 Ha chọtara ebe ịta ahịhịa anụ ụlọ mara mma, nke sara mbara, nke dị jụụ, bụrụkwa ebe nsogbu na-adịghị. Ụfọdụ nʼime ụmụ Ham ebiela nʼebe ahụ na mbụ.
아름답고 기름진 목장을 발견하였는데 그 땅이 광활하고 안정하니 이는 옛적부터 거기 거한 사람은 함의 자손인 까닭이라
41 Ndị ikom ndị a e dere aha ha nʼakwụkwọ usoro ọmụmụ bịara nʼoge Hezekaya na-achị dịka eze Juda. Ha busoro ụmụ Ham agha nʼebe obibi ha, busokwa ndị Meunim bi nʼebe ahụ agha, bibie ha kpamkpam, dịka ọ dị ruo taa. Emesịa ha bichiri ebe ahụ nʼihi na ebe ịta ahịhịa nke igwe anụ ụlọ ha nʼebe ahụ.
이 위에 녹명된 자가 유다 왕 히스기야 때에 가서 저희의 장막을 쳐서 파하고 거기 있는 모우님 사람을 쳐서 진멸하고 대신하여 오늘까지 거기 거하였으니 이는 그 양떼를 먹일 목장이 거기 있음이며
42 Ọzọkwa, narị ndị ikom ise nʼime ndị a si nʼebo Simiọn, ndị ndu ha bụ Pelataya, Nearaya, Refaya na Uziel, ụmụ Ishi busoro obodo ugwu ugwu Sia agha.
또 시므온 자손 중에 오백 명이 이시의 아들 블라댜와 느아랴와 르바야와 웃시엘로 두목을 삼고 세일 산으로 가서
43 Ha gburu ndị Amalek fọdụrụ ndụ nʼebe ahụ, bichie ala ahụ ruo taa.
피하여 남아 있는 아말렉 사람을 치고 오늘까지 거기 거하였더라

< 1 Ihe E Mere 4 >