< 1 Ihe E Mere 3 >
1 Ndị a bụ ụmụ ndị ikom Devid, ndị amụụrụ ya mgbe ọ nọ na Hebrọn. Ọkpara ya bụ Amnọn, nke Ahinoam bụ nwanyị Jezril mụrụ. Nwa ya nke abụọ bụ Daniel, onye nne ya bụ Abigel onye Kamel.
A ovo su sinovi Davidovi koji mu se rodiše u Hevronu: prvenac Amnon od Ahinoame Jezraeljanke, drugi Danilo od Avigeje Karmilke,
2 Nke atọ bụ Absalọm, nwa Maaka, nwa nwanyị Talmai, bụ eze Geshua. Nke anọ bụ Adonaịja, nwa nwoke Hagit
Treæi Avesalom, sin Mahe kæeri Talmaja cara Gesurskoga, èetvrti Adonija, sin Agitin,
3 Nke ise bụ Shefataya, nwa Abital. Nke isii bụ Itream, nke nwunye ya bụ Egla mụrụ.
Peti Sefatija od Avitale, šesti Itram od Egle žene njegove.
4 Ụmụ ndị ikom isii ndị a ka a mụtaara Devid na Hebrọn, ebe ọ nọ chịa dịka eze afọ asaa na ọnwa isii. Devid chịrị na Jerusalem iri afọ atọ na atọ.
Šest mu se rodi u Hevronu, gdje carova sedam godina i šest mjeseca, a trideset i tri carova u Jerusalimu.
5 Ndị a bụkwa ụmụ a mụụrụ ya nʼebe ahụ: Shamua, Shobab, Netan na Solomọn. Mmadụ anọ ndị a bụ ndị Batsheba nwa nwanyị Amiel mụrụ.
A ovi mu se rodiše u Jerusalimu: Samaja i Sovav i Natan i Solomun, èetiri, od Vitsaveje kæeri Amilove.
6 Ndị ọzọ bụkwa Ibha, Elishua, Elifelet,
I Jevar i Elisama i Elifalet,
8 Elishama, Eliada na Elifelet. Ha niile dị itoolu nʼọnụọgụgụ.
I Elisama i Elijada i Elifelet, devet,
9 Ndị a niile bụ ụmụ ndị ikom Devid, na-agụnyeghị ụmụ ndị ikom ndị iko ya nwanyị mụtara. Tama bụ nwanne ha nwanyị.
Sve sinovi Davidovi osim sinova inoèa njegovijeh i osim Tamare sestre njihove.
10 Ndị a bụ ụmụ Solomọn: Rehoboam, na Abija, na Asa, na Jehoshafat,
A sin Solomunov bijaše Rovoam, a njegov sin Avija, a njegov sin Asa, a njegov sin Josafat,
11 na Joram, na Ahazaya, na Joash,
A njegov sin Joram, a njegov sin Ohozija, a njegov sin Joas,
12 na Amazaya, na Azaraya, na Jotam,
A njegov sin Amasija, a njegov sin Azarija, a njegov sin Jotam,
13 na Ehaz, na Hezekaya, na Manase,
A njegov sin Ahaz, a njegov sin Jezekija, a njegov sin Manasija,
A njegov sin Amon, a njegov sin Josija.
15 Ụmụ ndị ikom Josaya: Johanan nwa mbụ ya, na Jehoiakim nwa ya nke abụọ, na Zedekaya nwa ya nke atọ, na Shalum nwa ya nke anọ.
A sinovi Josijini: prvenac Joanan, drugi Joakim, treæi Sedekija, èetvrti Salum.
16 Ụmụ Jehoiakim bụ ndị a, Jehoiakin nwa ya, na Zedekaya.
A sinovi Joakimovi: Jehonija sin mu, i njegov sin Sedekija.
17 Ndị a bụ ụmụ ndị ikom Jehoiakin, eze ahụ a dọtara nʼagha: Shealtiel, nwa ya,
A sinovi Jehonije sužnja: Salatilo sin mu.
18 Malkiram, Pedaya, Shenaza, Jekamaya, Hoshama na Nedabaya.
A njegovi sinovi Malhiram i Fedaja i Senasar, Jekamija, Osama i Nedavija.
19 Ụmụ ndị ikom Pedaya bụ Zerubabel na Shimei. Ụmụ ndị ikom Zerubabel bụ ndị a: Meshulam na Hananaya. Shelomit bụ nwanne ha nwanyị.
A sinovi Fedajini: Zorovavelj i Simej; a sinovi Zorovaveljevi: Mesulam i Ananija i sestra im Selometa.
20 E nwekwara ndị ikom ise ọzọ aha ha bụ Hashuba, Ohel, Berekaya, Hasadaya na Jushab-Hesed.
A sinovi Mesulamovi: Asuva i Oilo i Varahija i Asadija i Jusavesed, pet.
21 Ụmụ Hananaya mụrụ bụ Pelataya na Jeshaya. Jeshaya mụrụ Refaya; Refaya mụrụ Anan na Ọbadaya, Ọbadaya mụrụ Shekanaya.
A sinovi Ananijini: Felatija i Jesaja, sinovi Refajini, sinovi Arnanovi, sinovi Ovadijini, sinovi Sehanijini.
22 Ụmụ Shekanaya bụ ndị a: Shemaya na ụmụ ya ndị ikom: Hatush, Igal, Bariya, Nearaya na Shafat. Ha dị isii nʼọnụọgụgụ.
A sinovi Sehanijini: Semaja, i sinovi Semajini: Hatus i Igeal i Varija i Nearija i Safat, šest.
23 Ụmụ Nearaya bụ ndị a, Elioenai, Hezekaya na Azrikam. Ha dị atọ nʼọnụọgụgụ.
A sinovi Nearijini: Elioinaj i Jezekija i Azrikam, tri.
24 Ndị Elioenai mụrụ bụ ndị a: Hodavaya, Eliashib, Pelaya, Akub, Johanan, Delaya na Ananị. Ha niile dị asaa nʼọnụọgụgụ.
A sinovi Elioinajevi: Odaja i Eliasiv i Felaja i Akuv i Joanan i Dalaja i Anan, sedam.