< 1 Ihe E Mere 29 >
1 Mgbe ahụ, Devid gwara ọgbakọ Izrel niile okwu sị ha, “Nwa m Solomọn, onye Chineke họpụtara ịbụ eze nʼọnọdụ m, bụ nwantakịrị na-amachabeghị ihe. Ma ọrụ o nwere ịrụ dị ukwuu, nʼihi na ụlọ ukwu a abụghị mmadụ ka ọ dịrị, kama ọ bụ nye Onyenwe anyị Chineke.
Then King David said to everyone gathered there, “My son Solomon, chosen by God alone, is young and inexperienced, and the work to be done is great because this Temple will not be for man, but for the Lord God.
2 Ma nʼike m niile, agbalịala m wetachaa ihe niile a ga-eji wuo ụlọnsọ ukwu Chineke m ebe ha dị ukwuu: ọlaedo a ga-eji kpụọ ihe ọlaedo niile, ọlaọcha a ga-eji kpụọ ihe ọlaọcha niile, bronz a ga-eji kpụọ ihe bronz niile, igwe a ga-eji kpụọ ihe igwe niile, na osisi a ga-eji rụọ ihe osisi niile, nkume dị oke ọnụahịa ọniks, a ga-ahịọnye ahịọnye, na nkume dị oke ọnụahịa tọkwọisi, na nkume ndị ọzọ ụcha ha dị iche iche, na nkume ndị ọzọ mara mma, tinyere mabụl.
Using all my means I have provided for the house of my God—gold for the articles made of gold, silver for the silver, bronze for the bronze, iron for the iron, and wood for the wood; onyx stones and stones for settings: turquoise, different colored stones, every kind of precious stone; and plenty of marble.
3 Ugbu a, nʼihi mmasị m nʼebe ụlọnsọ Chineke m dị, ana m enye akụ nke aka m niile, ya bụ ọlaedo na ọlaọcha m, iji ya nye aka, maka iwu ụlọnsọ ukwu Chineke m. Ihe ndị a ka m na-enye, tụkwasịkwa nʼelu ihe ndị ọzọ niile bụ nke m nyerela, nʼihi ụlọnsọ ukwu a:
More than this, because of my devotion to the house of my God, I'm now giving my personal fortune of gold and silver, in addition to everything that I have provided for this holy house.
4 bụ puku talenti ọlaedo atọ (ọlaedo e si Ọfịa bubata), na puku talenti ọlaọcha asaa nke a nụchara anụcha, nke a ga-eji machite ahụ ụlọ niile nke ụlọ ndị ahụ.
3,000 talents of gold—the gold of Ophir—and 7,000 talents of refined silver will go to cover the walls of the buildings,
5 Maka ọrụ niile a ga-eji ọlaedo rụọ, na nke a ga-eji ọlaọcha rụọ, na ọrụ niile ndị ǹka ga-arụ. Ugbu a, onye jikeere iwere onwe ya nyechasịa Onyenwe anyị nʼaka taa?”
gold for the gold work, and silver for the silver work, and for all the work done by the craftsmen. Now who willingly wants to commit themselves to giving to the Lord today?”
6 Mgbe ahụ, ndịisi ezinaụlọ, na ndịisi ozi nke ebo Izrel niile, na ndịisi agha na-achị ọtụtụ puku ndị agha, na ndịisi agha na-achị ọtụtụ narị ndị agha, na ndịisi ozi na-elekọta ọrụ eze, jiri obi ha niile nye onyinye.
They gave willingly—the family leaders, those in charge of the tribes of Israel, the commanders of thousands and of hundreds, and the officials in charge of the king's work.
7 Ha nyere maka ọrụ ụlọnsọ ukwu Chineke. Ha nyere puku talenti ọlaedo ise, na puku darik ọlaedo iri, nyekwa puku talenti ọlaọcha iri, na puku talenti bronz iri na asatọ, na narị puku talenti igwe.
They gave to the service of the house of God 5,000 talents and 10,000 darics of gold, 10,000 talents of silver, 18,000 talents of bronze, and 100,000 talents of iron.
8 Ndị niile nwere nkume dị oke ọnụahịa dị iche iche webatara ya tinye ha nʼụlọakụ dị nʼụlọ nso ukwu Onyenwe anyị, nke Jehiel onye Geshọn na-elekọta.
Those who had precious stones gave them to the treasury of the house of the Lord, under the supervision of Jehiel the Gershonite.
9 Ndị Izrel niile ṅụrịrị ọṅụ nʼihi otu ndịisi ha jiri wepụta obi nye onyinye, nʼihi na ha ji ọṅụ na obi ha niile nye Onyenwe anyị onyinye. Eze Devid nʼonwe ya ṅụrịkwara ọṅụ nke ukwuu.
The people celebrated because their leaders had been so willing to give to the Lord, freely and wholeheartedly. King David was also really delighted.
10 Nʼihu ọha Izrel niile, Devid kelere Onyenwe anyị ekele sị, “Otuto dịrị gị Onyenwe anyị Chineke nna anyị Izrel site nʼebighị ebi ruo ebighị ebi.
Then David praised the Lord before the whole assembly: “Praise to you, Lord, the God of Israel our father, for ever and ever!
11 Gị onwe gị, Onyenwe anyị nwe ịdị ukwu, na ike, na ịma mma, na ugwu eze, na ebube, nʼihi na ihe niile nʼeluigwe na nʼụwa bụ nke gị. Gị onwe gị, Onyenwe anyị nwe alaeze. Gị kwa ka e buliri elu dịka onye na-achị isi nʼelu ihe niile.
Lord, yours is the greatness, the power, the glory, the splendor, and the majesty, for everything in heaven and on earth is yours. Lord, yours is the kingdom, and you are admired as ruler of all.
12 Akụnụba na nsọpụrụ na-esite nʼebe ị nọ abịa. Gị onwe gị na-achịkwa ihe niile. Ọ bụkwa nʼaka gị ka ume na ike dị ibuli ihe niile elu, na inye ihe niile ike.
Riches and honor come from you and you reign supreme. You possess power and might, and have the ability to make people great and to give strength to all.
13 Ugbu a, Chineke anyị, anyị na-enye gị ekele na-etokwa aha gị dị ebube.
Now our God we thank you, and we praise you and your glorious character.
14 “Ma onye ka m bụ, ole ndị kwa ka ụmụ Izrel bụ, na i kweere ka anyị gbasapụ aka anyị nye gị onyinye. Ihe niile anyị nwere sitere nʼaka gị bịa, ha kwa ka anyị na-enyeghachi gị.
But who am I, and who are my people, that we are able to give as willingly as this? For everything we have comes from you—we are only giving back what you have given us.
15 Anyị bụ ndị ọbịa na ndị mbịarambịa nʼihu gị, dịka nna nna anyị ha. Ụbọchị ndụ anyị nʼụwa dị ka onyinyo, nke olileanya na-adịghị nʼime ya.
In your eyes we are strangers and foreigners, just like our forefathers. Our time here on earth passes like a shadow, we have no hope of staying here long.
16 O, Onyenwe anyị Chineke anyị, ihe niile ndị a anyị bukọrọ maka iji rụọra gị ụlọnsọ si nʼaka gị bịa. Ha niile bụkwa nke gị.
Lord our God, even all this wealth that we have provided to build you a house for your holy name comes from what you give, and it all belongs to you.
17 Amaara m, Chineke m, na ị na-anwale obi, na i na-enwekwa mmasị nʼihe ziri ezi. Ihe ndị niile ka m onwe m nyere site nʼafọ ofufu nakwa obi ziri ezi. Ma ugbu a, ahụla m ọṅụ ndị gị, bụ ndị nọ nʼebe a, ji were afọ ofufu nye gị onyinye ha.
I know, my God, that you look on the inside and are happy when we live right. Everything I have given willingly and with an honest heart, and now I have seen your people here giving happily and willingly to you.
18 Ya mere, gị Onyenwe anyị, Chineke nna anyị Ebraham na Aịzik, na Izrel, biko, mee ka ụdị ọchịchọ a dịgide nʼime obi ndị gị ruo ebighị ebi, meekwa ka ha jiri obi ha niile gbasoo gị mgbe niile.
Lord, the God of Abraham, Isaac, Israel, and our forefathers, please keep these thoughts and commitments in the minds of your people forever, and make sure they stay loyal to you.
19 Nye nwa m Solomọn obi zuruoke nke ọ ga-eji debe iwu gị niile, ọchịchọ gị niile na ụkpụrụ gị niile, ya na mmụọ imezu ihe niile metụtara owuwu ụlọnsọ ukwu a nke m kwadooro ihe niile ndị a.”
Please also give my son Solomon a desire to whole-heartedly keep your commandments, decrees, and statutes, and to do all he can to build your Temple that I have provided for.”
20 Mgbe ahụ, Devid gwara ndị Izrel okwu sị, “Toonu Onyenwe anyị Chineke unu!” Ha niile toro Onyenwe anyị Chineke nna ha, kpọọ isiala nye Onyenwe anyị na eze.
Then David said to everyone there, “Praise the Lord your God!” So everyone praised the Lord, the God of their fathers. They bowed down in reverence to the Lord and to the king.
21 Nʼechi ya, ha wetara otu puku oke ehi, na otu puku ebule, na otu puku ụmụ ebule jiri ha chụọrọ Onyenwe anyị aja nsure ọkụ. Tinyere aja ihe ọṅụṅụ na ọtụtụ aja ndị ọzọ nʼebe ọ bara ụba nʼihi ụmụ Izrel niile.
The following day they presented sacrifices and burnt offerings to the Lord: one thousand bulls, one thousand rams, and one thousand lambs, with their drink offerings and plenty of sacrifices for all of Israel.
22 Emesịa, ha jiri ọṅụ rie oriri, ṅụkwaa ihe ọṅụṅụ nʼihu Onyenwe anyị. Ha nọkwa nʼebe ahụ nabata Solomọn, nwa Devid dịka eze nke ugboro abụọ, teekwa ya mmanụ nʼihu Onyenwe anyị ka ọ bụrụ onye ọchịchị. Ha mekwara Zadọk onye nchụaja.
Then they ate and drank in the presence of the Lord with great happiness that day. They made Solomon, the son of David, king for a second time, and they anointed him as ruler for the Lord, and anointed Zadok as priest.
23 Ya mere, Solomọn nọkwasịrị nʼocheeze Onyenwe anyị dịka eze, nʼọnọdụ nna ya Devid. Ọ bara ụba nke ukwuu. Ndị Izrel rubekwaara ya isi.
So Solomon took the throne of the Lord as king in place of David, his father. He was successful, and all the Israelites obeyed him.
24 Ndịisi ọchịchị niile, na ndịisi Izrel niile, na ụmụ ndị ikom eze Devid niile kwupụtara nrube isi ha nye Solomọn, eze ọhụrụ.
All the officials and warriors, as well as all of King David's sons, gave a solemn promise of loyalty to King Solomon.
25 Onyenwe anyị mere ka Solomọn dị ukwuu hie nne nʼanya ndị Izrel niile. Ọ yikwasịrị ya ebube nke alaeze nʼụdị ọ dịbeghị eze ọbụla buru ya ụzọ chịa nʼIzrel nweturula.
The Lord made Solomon highly respected throughout Israel, and gave him greater royal majesty than had been given to any king of Israel before him.
26 Devid nwa Jesi bụ eze ndị Izrel niile.
So David, son of Jesse, ruled over all of Israel.
27 Ọ chịrị Izrel iri afọ anọ. Ọ chịrị afọ asaa na Hebrọn, chịakwa iri afọ atọ na atọ na Jerusalem.
He ruled over Israel forty years—seven in Hebron, and thirty-three in Jerusalem.
28 Ọ nwụrụ mgbe ọ ghọrọ ezigbo agadi. Ọ bụkwa onye biri ogologo ndụ, onye nwekwara akụnụba na nsọpụrụ. Solomọn nwa ya nwoke nọchiri ya dịka eze.
David died at a good old age, having lived a long life, blessed with wealth and honor. Then his son Solomon took over and ruled in his place.
29 Ihe niile gbasara ọchịchị eze Devid, site na mmalite rụọ nʼọgwụgwụ, ka e dere nʼakwụkwọ akụkọ Samuel, onye ọhụ ụzọ, na nʼakwụkwọ Netan, onye amụma, na nʼakwụkwọ Gad onye ọhụ ụzọ.
Everything that King David did, from beginning to end, is written down in the Records of Samuel the Seer, the Records of Nathan the Prophet, and the Records of Gad the Seer.
30 Akụkọ ndị a gosiri ihe gbasara ọchịchị eze ya, na ịdị ike ya, na ihe niile mere ya, na ihe mere ndị Izrel, na ndị eze ndị mba ọzọ bi ha gburugburu.
These include all the details of his reign, his power, and what happened to him, and to Israel, and all to the kingdoms of the neighboring countries.