< 1 Ihe E Mere 27 >
1 Nke a bụ usoro ndị Izrel, dịka ọnụọgụgụ ha si dị, ndịisi ezinaụlọ, na ndị ọchịagha na-achị ọtụtụ puku ndị agha, ndị ọchịagha na-achị ọtụtụ narị ndị agha, na ndịisi ozi ha, bụ ndị na-ejere eze ozi nʼihe niile gbasara nkewa e kewara ndị agha dịka ịrụ ọrụ ha si dị nʼọnwa nʼọnwa nʼime ọnwa niile nke afọ. Nkewa ọbụla nwere ndị agha ọnụọgụgụ ha dị iri puku ndị agha abụọ na anọ.
Hii ndiyo orodha ya Waisraeli: viongozi wa jamaa, majemadari wa maelfu, majemadari wa mamia na maafisa wao, waliomtumikia mfalme kwa lolote lililohusu vikosi vya jeshi vilivyokuwa zamu mwezi baada ya mwezi katika mwaka mzima. Kila kikosi kimoja kilikuwa na watu 24,000.
2 Ndị a bụ aha ọchịagha na-achị ndị agha nʼọnwa ọbụla. Onyeisi nkewa nke mbụ, maka ọnwa nke mbụ bụ Jashobeam nwa Zabdiel. Ọnụọgụgụ ndị agha dị na nkewa ya bụ iri puku abụọ na anọ.
Msimamizi wa kikosi cha kwanza kwa mwezi wa kwanza alikuwa Yashobeamu mwana wa Zabdieli. Kulikuwa na watu 24,000 katika kikosi chake.
3 O si nʼikwu Perez nke dị nʼebo Juda, ọ bụ onyeisi ndịisi agha nke ọnwa mbụ.
Yeye alikuwa mzao wa Peresi, na mkuu wa maafisa wote wa jeshi kwa mwezi wa kwanza.
4 Onyeisi nkewa nke abụọ, maka ọnwa nke abụọ bụ Dodayi, nwa Ahohi bụ onyeisi agha nkewa nke abụọ. Miklot bụ onyendu otu a, ọnụọgụgụ ndị agha dị na nkewa a bụ iri puku abụọ na anọ.
Msimamizi wa kikosi kwa mwezi wa pili alikuwa Dodai Mwahohi. Miklothi ndiye alikuwa kiongozi wa kikosi chake. Kikosi chake kilikuwa na watu 24,000.
5 Onyeisi nkewa nke atọ, maka ọnwa nke atọ bụ Benaya nwa Jehoiada, onye nchụaja. Ọ bụ onyeisi, ọnụọgụgụ ndị agha dị na nkewa ya bụ iri puku abụọ na anọ.
Jemadari wa kikosi cha tatu kwa mwezi wa tatu alikuwa Benaya mwana wa kuhani Yehoyada. Ndiye alikuwa mkuu wa kikosi chake kilichokuwa na watu 24,000.
6 Nke a bụ Benaya ahụ bụ dike nʼagha nʼetiti iri ndịisi agha atọ, ma bụrụkwa onye na-achị iri ndị agha atọ ahụ. Amizabad nwa ya ka e tinyere ilekọta nkewa nke atọ a.
Huyu ndiye yule Benaya aliyekuwa shujaa miongoni mwa wale Thelathini na ndiye alikuwa juu yao hao Thelathini. Mwanawe Amizabadi ndiye alikuwa mkuu katika kikosi chake.
7 Onyeisi nkewa nke anọ, maka ọnwa nke anọ bụ Asahel, nwanne Joab. Zebadaya nwa bụ onye nnọchiri anya ya. Ọnụọgụgụ ndị agha dị na nkewa ya bụ iri puku abụọ na anọ. Zebadaya nwa ya, nọchiri anya ya mgbe ọ nwụrụ.
Jemadari wa nne kwa mwezi wa nne alikuwa Asaheli nduguye Yoabu, mwanawe Zebadia ndiye aliingia mahali pake kwenye uongozi. Kikosi chake kilikuwa na watu 24,000.
8 Onyeisi nkewa nke ise, maka ọnwa nke ise bụ Shamhut onye Izha. Ọnụọgụgụ ndị agha dị na nkewa ya bụ iri puku abụọ na anọ.
Jemadari wa kikosi cha tano kwa mwezi wa tano alikuwa Shamhuthi Mwizrahi. Kikosi chake kilikuwa na watu 24,000.
9 Onyeisi nkewa nke isii, maka ọnwa nke isii bụ Ira nwa Ikesh, onye Tekoa, bụ onyeisi agha nkewa nke isii. Ọnụọgụgụ ndị agha dị na nkewa ya bụ iri puku abụọ na anọ.
Jemadari wa kikosi cha sita kwa mwezi wa sita alikuwa Ira, mwana wa Ikeshi Mtekoa. Kikosi chake kilikuwa na watu 24,000.
10 Onyeisi nkewa nke asaa, maka ọnwa nke asaa bụ Helez onye Pelon. Onye sitere nʼikwu Ifrem. Ọnụọgụgụ ndị agha dị na nkewa ya bụ iri puku abụọ na anọ.
Jemadari wa kikosi cha saba kwa mwezi wa saba alikuwa Helesi Mpeloni wa Waefraimu. Kikosi chake kilikuwa na watu 24,000.
11 Onyeisi nkewa nke asatọ, maka ọnwa nke asatọ bụ Sibekai onye Husha. Onye sitere nʼikwu Zera. Ọnụọgụgụ ndị agha dị na nkewa ya bụ iri puku abụọ na anọ.
Jemadari wa nane kwa mwezi wa nane, alikuwa Sibekai Mhushathi wa Wazera. Kikosi chake kilikuwa na watu 24,000.
12 Onyeisi nkewa nke itoolu, maka ọnwa nke itoolu bụ Abieza onye Anatot. Onye sitere nʼikwu Benjamin. Ọnụọgụgụ ndị agha dị na nkewa ya bụ iri puku abụọ na anọ.
Jemadari wa tisa kwa mwezi wa tisa alikuwa Abiezeri Mwanathothi wa Wabenyamini. Kikosi chake kilikuwa na watu 24,000.
13 Onyeisi nkewa nke iri, maka ọnwa nke iri bụ Maharai onye Netofa, site nʼikwu Zera. Ọnụọgụgụ ndị agha dị na nkewa ya bụ iri puku abụọ na anọ.
Jemadari wa kumi kwa mwezi wa kumi alikuwa Maharai Mnetofathi wa Wazera. Kikosi chake kilikuwa na watu 24,000.
14 Onyeisi nkewa nke iri na otu, maka ọnwa nke iri na otu bụ Benaya onye Piraton, nke ikwu Ifrem. Ọnụọgụgụ ndị agha dị na nkewa ya bụ iri puku abụọ na anọ.
Jemadari wa kumi na moja kwa mwezi wa kumi na moja alikuwa Benaya Mpirathoni wa Waefraimu. Kikosi chake kilikuwa na watu 24,000.
15 Onyeisi nkewa nke iri na abụọ, maka ọnwa nke iri na abụọ bụ Heldai onye Netofa. Onye sitere nʼezinaụlọ Otniel. Ọnụọgụgụ ndị agha dị na nkewa ya bụ iri puku abụọ na anọ.
Jemadari wa kumi na mbili kwa mwezi wa kumi na mbili alikuwa Heldai Mnetofathi kutoka jamaa ya Othnieli. Kikosi chake kilikuwa na watu 24,000.
16 Ndị a bụ ndị ndu ebo Izrel niile: Elieza nwa Zikri bụ onyendu ndị Ruben; Shefataya nwa Maaka bụ onyendu ndị Simiọn;
Maafisa waliokuwa wanaoongoza makabila ya Israeli walikuwa: Kwa Wareubeni: Eliezeri mwana wa Zikri; kwa Wasimeoni: Shefatia mwana wa Maaka;
17 Hashabaya nwa Kemuel bụ onyendu ndị Livayị; Zadọk bụ onyendu ụmụ Erọn;
kwa Walawi: Hashabia mwana wa Kemueli; kwa Aroni: Sadoki;
18 Elihu nwanne Devid bụ onyendu ndị Juda; Omri nwa Maikel bụ onyendu ndị Isaka;
kwa Yuda: Elihu, nduguye Daudi; kwa Waisakari: Omri mwana wa Mikaeli;
19 Ishmaya nwa Ọbadaya bụ onyendu ndị Zebụlọn; Jerimot nwa Azriel bụ onyendu ndị Naftalị;
kwa Wazabuloni: Ishmaya mwana wa Obadia; kwa Wanaftali: Yeremothi mwana wa Azrieli;
20 Hoshea nwa Azazaya bụ onyendu ndị Ifrem; Juel nwa Pedaya bụ onyendu ọkara ebo Manase;
kwa Waefraimu: Hoshea mwana wa Azazia; kwa nusu ya kabila la Manase: Yoeli mwana wa Pedaya;
21 Ido nwa Zekaraya bụ onyendu ọkara ebo Manase nke ọzọ dị na Gilead; Jaasiel nwa Abna bụ onyendu ndị Benjamin;
kwa nusu nyingine ya kabila la Manase huko Gileadi: Ido mwana wa Zekaria; kwa Wabenyamini: Yaasieli mwana wa Abneri;
22 Azarel nwa Jeroham bụ onyendu ndị Dan. Ndị a niile bụ ndị ndu ebo Izrel niile.
kwa Wadani: Azareli mwana wa Yerohamu. Hao ndio waliokuwa maafisa wa makabila ya Israeli.
23 Mgbe Devid gụrụ ụmụ Izrel ọnụ. Ọ gụghị ndị gbara site nʼiri afọ abụọ gbadaa ala, nʼihi na Onyenwe anyị kwere nkwa ime ka ọnụọgụgụ ụmụ Izrel baa ụba dịka kpakpando eluigwe.
Daudi hakuwahesabu watu waliokuwa chini ya miaka ishirini, kwa sababu Bwana alikuwa ameahidi kuwafanya Israeli kuwa wengi kama nyota za angani.
24 Joab nwa Zeruaya, agụchaghị mmadụ niile ọnụ nʼihi na Chineke tara Izrel ahụhụ nʼihi ịgụ ọnụ a. Ya mere, e denyeghị ọnụọgụgụ mmadụ ole a gụtara nʼakwụkwọ akụkọ Devid eze Izrel nwere.
Yoabu mwana wa Seruya alianza kuwahesabu watu lakini hakumaliza. Kwa sababu ya kuwahesabu watu, hasira ya Mungu iliwaka juu ya Israeli, nayo hiyo hesabu yao haikuingizwa katika kitabu cha kumbukumbu za Mfalme Daudi.
25 Azmavet nwa Adiel, bụ onye na-elekọta ụlọ ịchịkọta ihe eze. Ma Jonatan nwa Ụzaya bụ onyeisi ndị na-ahụ maka ụlọ nchịkọta ihe dị nʼakụkụ ala ahụ niile, ma nʼobodo ukwu, ma nʼobodo nta, ma nʼụlọ nche ndị Izrel niile.
Azmawethi mwana wa Adieli ndiye alikuwa msimamizi wa hazina za mfalme. Msimamizi wa hazina katika mashamba, miji, vijiji na kwenye ngome alikuwa Yonathani mwana wa Uzia.
26 Ezri nwa Kelub bụ onye na-elekọta ubi eze na ndị na-arụ ọrụ nʼime ya.
Ezri mwana wa Kelubu alikuwa msimamizi wa wafanyakazi waliolima katika mashamba.
27 Shimei onye Ramat na-elekọta ubi vaịnị niile. Otu a kwa, Zabdi onye Sifma ka ọ dị nʼaka imepụta mmanya na ichekwa ha.
Shimei Mramathi alikuwa msimamizi wa mashamba ya mizabibu. Zabdi Mshifmi alikuwa msimamizi wa zabibu, utengenezaji na uhifadhi wa divai katika mapipa makubwa.
28 Baal-Hanan onye Gedera na-elekọta ubi oliv na osisi sikamọ eze, nke dị nʼoke ala ndị Filistia na Izrel. Joash ka ọ dị nʼaka iweta mmanụ oliv.
Baal-Hanani Mgederi ndiye alikuwa mwangalizi wa mashamba ya mfalme ya mizeituni na mikuyu katika tambarare za vilima vya magharibi. Yoashi alikuwa msimamizi wa ghala za mafuta ya zeituni.
29 Shitrai onye Sharọn na-elekọta igwe ehi eze ndị na-ata nri na Sharọn. Shafat nwa Adlai na-elekọta igwe ehi ndị nke dị nʼala ndagwurugwu.
Shitrai Msharoni alikuwa msimamizi wa makundi ya ngʼombe waliojilisha huko Sharoni. Shafati mwana wa Adlai alikuwa msimamizi wa yale makundi ya ngʼombe yaliyokuwa makondeni.
30 Obil onye Ishmel nwe ilekọta ịnyịnya kamel eze. Jehdeia onye Meronot na-elekọta ịnyịnya ibu.
Obili Mwishmaeli alikuwa msimamizi wa ngamia. Yedeya Mmeronothi alikuwa msimamizi wa punda.
31 Jaziz onye Haga bụ onyeisi na-elekọta igwe atụrụ. Ndị a niile bụ ndịisi na-elekọta akụ niile nke eze Devid nwere.
Yazizi Mhagri alikuwa msimamizi wa makundi ya kondoo na mbuzi. Hawa wote ndio waliokuwa maafisa wasimamizi wa mali alizokuwa nazo Mfalme Daudi.
32 Jonatan nwanne nna Devid bụ onye ndụmọdụ na nwoke nwere ezi nghọta. Ọ bụkwa ode akwụkwọ. Jehiel nwa Hakmoni bụ onye na-elekọta ụmụ eze ndị ikom.
Yonathani mjomba wa Daudi alikuwa mshauri, mtu mwenye ufahamu mkubwa na mwandishi. Yehieli mwana wa Hakmoni alikuwa akiwahudumia wana wa mfalme.
33 Ahitofel bụ onye na-adụ eze ọdụ. Hushaị onye Akai bụ enyi eze.
Ahithofeli alikuwa mshauri wa mfalme. Hushai Mwariki alikuwa rafiki wa mfalme.
34 Mgbe Ahitofel nwụrụ, Jehoiada nwa Benaya na Abịata nọchiri anya ya. Joab bụ ọchịagha igwe ndị agha eze.
Baada ya Ahithofeli, Yehoyada mwana wa Benaya aliingia mahali pake kama mshauri wa mfalme pamoja na Abiathari. Yoabu alikuwa ndiye jemadari wa majeshi ya mfalme.