< 1 Ihe E Mere 27 >
1 Nke a bụ usoro ndị Izrel, dịka ọnụọgụgụ ha si dị, ndịisi ezinaụlọ, na ndị ọchịagha na-achị ọtụtụ puku ndị agha, ndị ọchịagha na-achị ọtụtụ narị ndị agha, na ndịisi ozi ha, bụ ndị na-ejere eze ozi nʼihe niile gbasara nkewa e kewara ndị agha dịka ịrụ ọrụ ha si dị nʼọnwa nʼọnwa nʼime ọnwa niile nke afọ. Nkewa ọbụla nwere ndị agha ọnụọgụgụ ha dị iri puku ndị agha abụọ na anọ.
[軍隊組織]以色列子民、族長、千夫長、百夫長,以及所有的官員,都按照數目分定班次,每年按月輪流值班,事奉君王;每班二萬四千人。
2 Ndị a bụ aha ọchịagha na-achị ndị agha nʼọnwa ọbụla. Onyeisi nkewa nke mbụ, maka ọnwa nke mbụ bụ Jashobeam nwa Zabdiel. Ọnụọgụgụ ndị agha dị na nkewa ya bụ iri puku abụọ na anọ.
正月第一軍的軍長是匝貝狄爾的兒子依市巴耳,他這一軍有二萬四千人,
3 O si nʼikwu Perez nke dị nʼebo Juda, ọ bụ onyeisi ndịisi agha nke ọnwa mbụ.
他是培勒茲的後代,是正月各軍官的軍長。
4 Onyeisi nkewa nke abụọ, maka ọnwa nke abụọ bụ Dodayi, nwa Ahohi bụ onyeisi agha nkewa nke abụọ. Miklot bụ onyendu otu a, ọnụọgụgụ ndị agha dị na nkewa a bụ iri puku abụọ na anọ.
二月第二軍的軍長是阿曷亞人多待的兒子厄肋阿匝爾,他這一軍有二萬四千人。
5 Onyeisi nkewa nke atọ, maka ọnwa nke atọ bụ Benaya nwa Jehoiada, onye nchụaja. Ọ bụ onyeisi, ọnụọgụgụ ndị agha dị na nkewa ya bụ iri puku abụọ na anọ.
三月第三軍的軍長是大司祭約雅達的兒子貝納雅,他這一軍有二萬四千人。
6 Nke a bụ Benaya ahụ bụ dike nʼagha nʼetiti iri ndịisi agha atọ, ma bụrụkwa onye na-achị iri ndị agha atọ ahụ. Amizabad nwa ya ka e tinyere ilekọta nkewa nke atọ a.
貝納雅是三十勇士之一,且為三十勇士之長;他的兒子阿米匝巴特指揮他的部隊。
7 Onyeisi nkewa nke anọ, maka ọnwa nke anọ bụ Asahel, nwanne Joab. Zebadaya nwa bụ onye nnọchiri anya ya. Ọnụọgụgụ ndị agha dị na nkewa ya bụ iri puku abụọ na anọ. Zebadaya nwa ya, nọchiri anya ya mgbe ọ nwụrụ.
四月第四軍的軍長是約阿布的兄弟阿撒耳,他以後是他的兒子則巴狄雅,他這一軍有二萬四千人。
8 Onyeisi nkewa nke ise, maka ọnwa nke ise bụ Shamhut onye Izha. Ọnụọgụgụ ndị agha dị na nkewa ya bụ iri puku abụọ na anọ.
五月第五軍的軍長是依次辣黑人沙默胡特,他這一軍有二萬四千人。
9 Onyeisi nkewa nke isii, maka ọnwa nke isii bụ Ira nwa Ikesh, onye Tekoa, bụ onyeisi agha nkewa nke isii. Ọnụọgụgụ ndị agha dị na nkewa ya bụ iri puku abụọ na anọ.
六月第六軍的軍長是特科亞人依刻士的兒子依辣,他這一軍有二萬四千人。
10 Onyeisi nkewa nke asaa, maka ọnwa nke asaa bụ Helez onye Pelon. Onye sitere nʼikwu Ifrem. Ọnụọgụgụ ndị agha dị na nkewa ya bụ iri puku abụọ na anọ.
七月第七軍的軍長是厄弗辣因的後裔帕耳提人赫肋茲人,他這一軍有二萬四千人。
11 Onyeisi nkewa nke asatọ, maka ọnwa nke asatọ bụ Sibekai onye Husha. Onye sitere nʼikwu Zera. Ọnụọgụgụ ndị agha dị na nkewa ya bụ iri puku abụọ na anọ.
八月第八軍的軍長是則辣黑族胡沙人息貝開,他這一軍有二萬四千人。
12 Onyeisi nkewa nke itoolu, maka ọnwa nke itoolu bụ Abieza onye Anatot. Onye sitere nʼikwu Benjamin. Ọnụọgụgụ ndị agha dị na nkewa ya bụ iri puku abụọ na anọ.
九月第九軍的軍長是本雅明足阿納托特人阿彼厄則爾,他這一軍有二萬四千人。
13 Onyeisi nkewa nke iri, maka ọnwa nke iri bụ Maharai onye Netofa, site nʼikwu Zera. Ọnụọgụgụ ndị agha dị na nkewa ya bụ iri puku abụọ na anọ.
十月第十軍的軍長是則辣黑族乃托法人瑪哈賴,他這一軍有二萬四千人。
14 Onyeisi nkewa nke iri na otu, maka ọnwa nke iri na otu bụ Benaya onye Piraton, nke ikwu Ifrem. Ọnụọgụgụ ndị agha dị na nkewa ya bụ iri puku abụọ na anọ.
十一月第十一軍的軍長是厄弗辣因的後裔丕辣通人貝納雅,他這一軍有二萬四千人。
15 Onyeisi nkewa nke iri na abụọ, maka ọnwa nke iri na abụọ bụ Heldai onye Netofa. Onye sitere nʼezinaụlọ Otniel. Ọnụọgụgụ ndị agha dị na nkewa ya bụ iri puku abụọ na anọ.
十二月第十二軍的軍長是敖特尼耳族乃托法人赫耳特,他這一軍有二萬四千人。[各支派首領]
16 Ndị a bụ ndị ndu ebo Izrel niile: Elieza nwa Zikri bụ onyendu ndị Ruben; Shefataya nwa Maaka bụ onyendu ndị Simiọn;
以色列各支派的首領:勒烏本子孫的首領是齊革黎的兒子厄里厄則爾;西默盎子孫的首領是瑪加的兒子舍法提雅;
17 Hashabaya nwa Kemuel bụ onyendu ndị Livayị; Zadọk bụ onyendu ụmụ Erọn;
肋未子孫的首領是刻慕耳的兒子哈沙彼雅;亞郎子孫的首領是匝多克;
18 Elihu nwanne Devid bụ onyendu ndị Juda; Omri nwa Maikel bụ onyendu ndị Isaka;
猶大子孫的首領是達味的一個兄弟厄里雅布;依撒加爾子孫的首領是米加耳的兒子敖默黎;
19 Ishmaya nwa Ọbadaya bụ onyendu ndị Zebụlọn; Jerimot nwa Azriel bụ onyendu ndị Naftalị;
則步隆子孫的首領是敖巴狄雅的兒子依市瑪雅;納斐塔里子孫的首領是阿黎耳的兒子耶黎摩特;
20 Hoshea nwa Azazaya bụ onyendu ndị Ifrem; Juel nwa Pedaya bụ onyendu ọkara ebo Manase;
厄弗辣因子孫的首領是阿匝齊雅的兒子曷舍亞;默納協半支派子孫的首領是培達雅的兒子約厄耳;
21 Ido nwa Zekaraya bụ onyendu ọkara ebo Manase nke ọzọ dị na Gilead; Jaasiel nwa Abna bụ onyendu ndị Benjamin;
基肋阿得地方默納協另半支派子孫的首領是則加黎雅的兒子依多;本雅明子孫的首領是阿貝乃爾的兒子雅息耳;
22 Azarel nwa Jeroham bụ onyendu ndị Dan. Ndị a niile bụ ndị ndu ebo Izrel niile.
丹子孫的首領是耶洛罕的兒子阿匝勒耳:以上是以色列各支派的首領。
23 Mgbe Devid gụrụ ụmụ Izrel ọnụ. Ọ gụghị ndị gbara site nʼiri afọ abụọ gbadaa ala, nʼihi na Onyenwe anyị kwere nkwa ime ka ọnụọgụgụ ụmụ Izrel baa ụba dịka kpakpando eluigwe.
二十歲以下的,達味皆未予以統計,因為上主曾應許過使以色列的人數多如天上的星辰。
24 Joab nwa Zeruaya, agụchaghị mmadụ niile ọnụ nʼihi na Chineke tara Izrel ahụhụ nʼihi ịgụ ọnụ a. Ya mere, e denyeghị ọnụọgụgụ mmadụ ole a gụtara nʼakwụkwọ akụkọ Devid eze Izrel nwere.
責魯雅的兒子約阿布開始統計過,但是沒有完成,因為上主曾向以色列大發忿怒,故此人口數字也沒有載在達味王實錄上。[財政的主管]
25 Azmavet nwa Adiel, bụ onye na-elekọta ụlọ ịchịkọta ihe eze. Ma Jonatan nwa Ụzaya bụ onyeisi ndị na-ahụ maka ụlọ nchịkọta ihe dị nʼakụkụ ala ahụ niile, ma nʼobodo ukwu, ma nʼobodo nta, ma nʼụlọ nche ndị Izrel niile.
掌管軍王府庫的是阿狄耳的兒子阿次瑪委特;掌管郊邑、村堡、貨倉的是烏齊雅的兒子約納堂;
26 Ezri nwa Kelub bụ onye na-elekọta ubi eze na ndị na-arụ ọrụ nʼime ya.
掌管耕田種地農人的是革路布的兒子厄次黎;
27 Shimei onye Ramat na-elekọta ubi vaịnị niile. Otu a kwa, Zabdi onye Sifma ka ọ dị nʼaka imepụta mmanya na ichekwa ha.
掌管葡萄園的是辣瑪人史米;掌管葡萄園內酒倉的是史斐米人匝貝狄;
28 Baal-Hanan onye Gedera na-elekọta ubi oliv na osisi sikamọ eze, nke dị nʼoke ala ndị Filistia na Izrel. Joash ka ọ dị nʼaka iweta mmanụ oliv.
掌管平原的橄欖園和無花果園的是革德爾人巴耳哈南;掌管油庫的是約阿士;
29 Shitrai onye Sharọn na-elekọta igwe ehi eze ndị na-ata nri na Sharọn. Shafat nwa Adlai na-elekọta igwe ehi ndị nke dị nʼala ndagwurugwu.
掌管仔沙龍平原所牧放的牛群的是沙龍人史特賴;掌管在山谷中所牧放的牛群的是阿德來的兒子沙法特;
30 Obil onye Ishmel nwe ilekọta ịnyịnya kamel eze. Jehdeia onye Meronot na-elekọta ịnyịnya ibu.
掌管駱駝的是依市瑪耳人敖彼耳;掌管驢群的是默洛諾特人耶赫狄雅;
31 Jaziz onye Haga bụ onyeisi na-elekọta igwe atụrụ. Ndị a niile bụ ndịisi na-elekọta akụ niile nke eze Devid nwere.
掌管楊群的是哈革爾人雅齊:以上是掌管達味君王財政的主管。[中樞要員]
32 Jonatan nwanne nna Devid bụ onye ndụmọdụ na nwoke nwere ezi nghọta. Ọ bụkwa ode akwụkwọ. Jehiel nwa Hakmoni bụ onye na-elekọta ụmụ eze ndị ikom.
達味的叔父約納堂作參事,這人有智慧,又有學問,他與哈革摩尼的兒子耶希耳教導君王的兒子:
33 Ahitofel bụ onye na-adụ eze ọdụ. Hushaị onye Akai bụ enyi eze.
阿希托費耳為君王的顧問;阿爾基人胡瑟為君王的朋友;
34 Mgbe Ahitofel nwụrụ, Jehoiada nwa Benaya na Abịata nọchiri anya ya. Joab bụ ọchịagha igwe ndị agha eze.
繼阿希托費耳之後的是貝納雅的兒子約雅達和厄耳雅塔;約阿布為君王軍隊的元帥。