< 1 Ihe E Mere 26 >

1 Usoro otu ndị nche ọnụ ụzọ ụlọnsọ ahụ. Site na ndị Kora: Meshelemaia, nwa Kore, otu nʼime ụmụ Asaf.
These were the divisions of the gatekeepers: From the Korahites: Meshelemiah son of Kore, one of the sons of Asaph.
2 Meshelemaia nwekwara ụmụ ndị ikom: nke mbụ bụ Zekaraya, na Jediael nke abụọ, Zebadaya, bụ nke atọ, Jatniel, nke anọ
Meshelemiah had sons: Zechariah the firstborn, Jediael the second, Zebadiah the third, Jathniel the fourth,
3 Elam, nke ise na Jehohanan, bụ nke isii na Eliehoenai bụ onye nke asaa.
Elam the fifth, Jehohanan the sixth, and Eliehoenai the seventh.
4 Obed-Edọm nwekwara ụmụ ndị ikom. Ha bụ ndị a: Shemaya, nwa mbụ ya, Jehozabad, osote ya, Joa, nke atọ, Saka, bụ onye nke anọ Netanel, nke ise,
And Obed-edom also had sons: Shemaiah the firstborn, Jehozabad the second, Joah the third, Sachar the fourth, Nethanel the fifth,
5 Amiel, nke isii Isaka, nke asaa na Peuletai, onye bụ onye nke asatọ. Nʼihi na Chineke gọziri Obed-Edọm.
Ammiel the sixth, Issachar the seventh, and Peullethai the eighth. For God had blessed Obed-edom.
6 Shemaya, nwa ya mụtakwara ụmụ ndị ikom, ndị bụ ndị ndu nʼezinaụlọ nna ha, nʼihi na ha bụ dike na dimkpa.
Also to his son Shemaiah were born sons who ruled over their families because they were strong, capable men.
7 Ụmụ ndị ikom Shemaya bụ, Otni, Refael, Obed na Elzabad; ụmụnne ya bụ Elihu na Semakaya bụkwa dike na dimkpa.
Shemaiah’s sons were Othni, Rephael, Obed, and Elzabad; his brothers were Elihu and Semachiah, also capable men.
8 Ndị a niile bụ ụmụ ụmụ Obed-Edọm; ha na ụmụ ha ndị ikom, na ndị ikwu ha niile bụ dimkpa ndị nwere ike ịrụ ọrụ ahụ. Ha niile bụ ụmụ ụmụ Obed-Edọm. Ha dị iri isii na abụọ nʼọnụọgụgụ.
All these were descendants of Obed-edom; they and their sons and brothers were capable men with strength to do the work—62 in all from Obed-edom.
9 E sitekwara nʼezinaụlọ Meshelemaia họpụta ndịisi iri na asatọ ndị bụkwa ezi ndị ndu.
Meshelemiah also had sons and brothers who were capable men—18 in all.
10 Hosa, nwa Merari nwekwara ụmụ ndị ikom: Shimri onye nke mbụ (ọ bụ ezie na ọ bụghị ọkpara ya ma nna ya họpụtara ya ka ọ bụrụ onye mbụ).
Hosah the Merarite also had sons: Shimri the first (although he was not the firstborn, his father had appointed him as the first),
11 Hilkaya, nke abụọ, Tebalaya, nke atọ na Zekaraya onye nke anọ. Ụmụ ndị ikom na ụmụnne Hosa nwere dị iri na atọ.
Hilkiah the second, Tebaliah the third, and Zechariah the fourth. The sons and brothers of Hosah numbered 13 in all.
12 E kere ndị nche ụlọnsọ ukwu niile nʼotu nʼotu. Otu ndị a nwekwara ndịisi. E kenyekwara otu ọbụla ọrụ dịka e si kenye ụmụnna ha ọrụ ha nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.
These divisions of the gatekeepers, through their chief men, had duties for ministering in the house of the LORD, just as their brothers did.
13 E sitere nʼife nza kenye ma nwantakịrị ma okenye, ọnụ ụzọ ha ga-eche nche, dịka ezinaụlọ ha si dị.
They cast lots for each gate, according to their families, young and old alike.
14 Site nʼife nza, Shelemaya ketara iche ọnụ ụzọ dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ nche. Zekaraya nwa ya, onye ndụmọdụ nwere uche, sitekwara nʼife nza keta iche ọnụ ụzọ dị nʼakụkụ ugwu, ya na ndị otu ya.
The lot for the East Gate fell to Shelemiah. Then lots were cast for his son Zechariah, a wise counselor, and the lot for the North Gate fell to him.
15 Obed-Edọm na ndị otu ya na-eche ụzọ dị na ndịda. Ụmụ ya bụ ndị na-eche ụlọ ebe a na-achịkọta ihe.
The lot for the South Gate fell to Obed-edom, and the lot for the storehouses to his sons.
16 Shupim na Hosa na-eche ọnụ ụzọ dị nʼọdịda anyanwụ ya na ọnụ ụzọ ama Shaleket nke dị nʼụzọ elu elu. Ndị nche na-esota ndị nche ibe ha.
The lots for the West Gate and the Shallecheth Gate on the ascending highway fell to Shuppim and Hosah. There were guards stationed at every watch.
17 Ya mere, ọ bụ ndị Livayị isii na-eche nche nʼọnụ ụzọ dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ ụbọchị niile. Mmadụ anọ na-anọ nʼugwu, anọ na ndịda, abụọ nʼebe a na-achịkọbata ihe.
Each day there were six Levites on the east, four on the north, four on the south, and two pairs at the storehouse.
18 Nʼogige nke dị nʼọdịda anyanwụ e nwere ndị nche anọ nʼụzọ, ndị nche abụọ ọzọ nʼime ogige nʼonwe ya.
As for the court on the west, there were four at the highway and two at the court.
19 A họpụtara ndị nche ndị a site nʼikwu Kora na Merari.
These were the divisions of the gatekeepers who were descendants of Korah and Merari.
20 Ụfọdụ ndị Livayị ka e nyefere ọrụ ilekọta ụlọakụ, na ụlọ a na-echekọta onyinye niile e doro nsọ nke e webatara nʼụlọnsọ ukwu Chineke.
Now their fellow Levites were in charge of the treasuries of the house of God and the treasuries of the dedicated things.
21 Ndị agbụrụ Ladan, ndị si nʼikwu Geshọn, ndị bụ ndịisi ezinaụlọ nna ha Ladan, bụ onye Geshọn, bụ Jehieli,
From the descendants of Ladan, who were Gershonites through Ladan and heads of the families of Ladan the Gershonite, were Jehieli,
22 na ụmụ ndị ikom Jehieli, Zetam na nwanne ya nwoke Juel. Ndị a bụ ndị na-elekọta ụlọakụ niile dị nʼụlọnsọ Onyenwe anyị.
the sons of Jehieli, Zetham, and his brother Joel. They were in charge of the treasuries of the house of the LORD.
23 Site na ndị Amram, na ndị Izha, na ndị Hebrọn, na ndị Uziel.
From the Amramites, the Izharites, the Hebronites, and the Uzzielites:
24 Shubuel nwa Geshọm, na nwa nwa Mosis ka e nyere ọrụ ịbụ onyeisi ụlọakụ dị nʼụlọnsọ ahụ.
Shebuel, a descendant of Gershom son of Moses, was the officer in charge of the treasuries.
25 Ụmụnna ya site na Elieza bụ ndị a, Rehabaya nwa ya nwoke, Jeshaya nwa nwoke Rehabaya, Joram nwa nwoke Jeshaya na Zikri nwa nwoke Shelomit.
His relatives through Eliezer included Rehabiah his son, Jeshaiah his son, Joram his son, Zichri his son, and Shelomith his son.
26 Shelomit na ụmụnna ya ka ọ dị nʼaka ilekọta ụlọakụ nke ihe nsọ niile, nke Devid bụ eze, na ndịisi ezinaụlọ niile, ndị bụ ndịisi agha na-achị ọtụtụ puku ndị agha, na ndịisi agha na-achị ọtụtụ narị ndị agha, na ndịisi agha ndị ọzọ, doro nsọ.
This Shelomith and his brothers were in charge of all the treasuries for the things dedicated by King David, by the heads of families who were the commanders of thousands and of hundreds, and by the army commanders.
27 Ụfọdụ ihe agha na ihe sitere nʼihe a kwatara nʼagha ka ha doro nsọ maka idozi ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.
They had dedicated some of the plunder from their battles to the repair of the house of the LORD.
28 Ya na ihe niile nke Samuel, bụ onye ọhụ ụzọ, na Sọl, nwa Kish na Abna, nwa Nea na Joab, nwa Zeruaya na ihe niile ndị ọzọ e doro nsọ. Ọ bụ nʼaka Shelomit na ụmụnna ya ka ọ dị ilekọta ha.
Everything that had been dedicated by Samuel the seer, Saul son of Kish, Abner son of Ner, and Joab son of Zeruiah, along with everything else that was dedicated, was under the care of Shelomith and his brothers.
29 Site nʼikwu Izha, Kenaniya, na ụmụ ndị ikom ya ka ozi dịrị pụọ nʼụlọnsọ, dịka ndịisi na ndị ikpe nye ndị Izrel.
From the Izrahites, Chenaniah and his sons had the outside duties as officers and judges over Israel.
30 Site na ndị Hebrọn, Hashabaya na ụmụnna ya ndị bụkwa dimkpa, ọnụọgụgụ ha dị otu puku na narị asaa, ka e mere ndịisi ala Izrel dị nʼakụkụ ọdịda anyanwụ osimiri Jọdan. Ihe niile banyere ọrụ Onyenwe anyị, na ijere eze ozi dị ha nʼaka.
From the Hebronites, Hashabiah and his relatives, 1,700 capable men, had charge of the affairs of Israel west of the Jordan for all the work of the LORD and for the service of the king.
31 Jeraya bụ onyendu ndị Hebrọn, dịka akwụkwọ e dekọrọ usoro ọmụmụ si gosi. Nʼihi na nʼafọ nke iri anọ nke ọchịchị eze Devid nʼIzrel, ka e mere nnyocha nʼakwụkwọ usoro ọmụmụ chọpụta na e nwere ndị dị ike ọrụ nʼetiti ndị Hebrọn. A chọpụtara ndị a nʼobodo Jeza nke dị na Gilead.
As for the Hebronites, Jerijah was the chief of the Hebronites, according to the genealogies of his ancestors. In the fortieth year of David’s reign the records were searched, and strong, capable men were found among the Hebronites at Jazer in Gilead.
32 Jeraya nwere ndị ikwu ya, ndị bụ dimkpa, na ndị dị ike ọrụ, ọnụọgụgụ ha dị puku abụọ na narị asaa. Ndị a niile bụkwa ndị ndu ezinaụlọ dị iche iche. Ya mere, Devid, eze Izrel, mere ha ndịisi ebo Ruben, na ebo Gad, na ọkara ebo Manase. Ọrụ ha bụ ilekọta ihe banyere ofufe Chineke na ije ozi niile metụtara eze.
Among Jerijah’s relatives there were 2,700 capable men who were heads of families. King David appointed them over the Reubenites, the Gadites, and the half-tribe of Manasseh for every matter pertaining to God and to the affairs of the king.

< 1 Ihe E Mere 26 >