< 1 Ihe E Mere 25 >

1 Devid na ndịisi agha ndị Izrel họpụtara ndị ga na-ebu amụma mgbe ndị ji ụbọ akwara, une na ogene na-eti egwu. Ha sitere nʼụmụ Asaf, Heman na Jedutun, họpụta ha. Ndị a bụ aha ndị rụrụ ọrụ nke a:
Assim Davi e os príncipes do exército apartaram para o ministério a os filhos de Asafe, e de Hemã, e de Jedutum, os quais profetizassem com harpas, saltérios, e címbalos: e o número deles foi, de homens idôneos para a obra de seu ministério
2 Ndị amụma na-ebu amụma, ndị nke bụ ụmụ Asaf: Zakua, Josef, Netanaya na Asarela bụ ụmụ Asaf nọ nʼokpuru Asaf, onye nọ nʼokpuru eze bụ onyeisi ha.
Dos filhos de Asafe: Zacur, José, Netanias, e Asarela, filhos de Asafe, sob a direção de Asafe, o qual profetizava à ordem do rei.
3 Ma nye Jedutun, ụmụ ndị ikom ya: Gedaliya, Zeri, Jeshaya, Shimei, Hashabaya na Matitaia. Ha dị isii nʼọnụọgụgụ nọrọ nʼokpuru nna ha bụ Jedutun, onye na-ebu amụma, na-eji une na-enye Onyenwe anyị ekele na otuto.
De Jedutum: os filhos de Jedutum, Gedalias, Zeri, Jesaías, Hasabias, e Matitias, e Simei: seis, sob a mão de seu pai Jedutum, o qual profetizava com harpa, para celebrar e louvar a o SENHOR.
4 Ma nye Heman, ụmụ ndị ikom ya: Bukaya, Matanaya, Uziel, Shubuel, Jerimot, Hananaya, Hanani, Eliata, Gidalti, Romamti-Eza, Joshbekasha, Maloti, Hotia, na Mahaziot.
De Hemã: os filhos de Hemã, Buquias, Matanias, Uziel, Sebuel, Jeremote, Hananias, Hanani, Eliata, Gidalti, Romanti-Ezer, Josbecasa, Maloti, Hotir, e Maaziote.
5 Ndị a niile bụ ụmụ Heman, onye bụ ọhụ ụzọ eze. Dịka nkwa Chineke kwere maka ibuli ya elu, Chineke nyere ya ụmụ ndị ikom iri na anọ, na ụmụ ndị inyom atọ.
Todos estes foram filhos de Hemã, vidente do rei em palavras de Deus, para exaltar o poder seu: e deu Deus a Hemã catorze filhos e três filhas.
6 Ụmụ ndị ikom ndị a niile nọ nʼokpuru nna ha, maka ịbụ abụ nʼụlọ Onyenwe anyị na-eji ịkpọ ụbọ na une na iti ọla na-ada ụda, nʼihi ofufe ụlọ Chineke. Asaf, na Jedutun, na Heman nọkwa nʼokpuru nlekọta eze.
E todos estes estavam sob a direção de seu pai na música, na casa do SENHOR, com címbalos, saltérios e harpas, para o ministério do templo de Deus, por disposição do rei acerca de Asafe, de Jedutum, e de Hemã.
7 Ọnụọgụgụ ha tinyere ụmụ nne ha ndị e nyere ọzụzụ nʼihe gbasara abụ, bụ ndị nwere nghọta nʼihe banyere abụ a na-abụku Onyenwe anyị, dị narị abụọ, na iri asatọ na asatọ.
E o número deles com seus irmãos instruídos em música do SENHOR, todos os aptos, foi duzentos oitenta e oito.
8 Ha ji ife nza kee ọrụ ha, ma onye ukwu ma onye nta nʼime ha, ndị nwere nghọta ma ndị a na-azụ azụ, nʼotu aka ahụ.
E lançaram sortes para os turnos do serviço, entrando o pequeno com o grande, o mesmo o mestre que o discípulo.
9 Nza nke mbụ e fere mara Josef nwa Asaf, ya na ụmụ ya ndị ikom na ụmụnne ya. Ha niile dị iri na abụọ. Nke abụọ, Gedaliya na ụmụ ya ndị ikom na ụmụnne ya. Ha niile dị iri na abụọ.
E a primeira sorte saiu por Asafe, a José: a segunda a Gedalias, quem com seus irmãos e filhos foram doze;
10 Nke atọ, Zakua na ụmụ ya ndị ikom na ụmụnne ya. Ha niile dị iri na abụọ.
A terceira a Zacur, com seus filhos e seus irmãos, doze;
11 Nke anọ, Izri na ụmụ ya ndị ikom na ụmụnne ya. Ha niile dị iri na abụọ.
A quarta a Izri, com seus filhos e seus irmãos, doze;
12 Nke ise, Netanaya na ụmụ ya ndị ikom na ụmụnne ya. Ha niile dị iri na abụọ.
A quinta a Netanias, com seus filhos e seus irmãos, doze;
13 Nza nke isii mara Bukaya, na ụmụ ya ndị ikom na ụmụnne ya. Ha niile dị iri na abụọ.
A sexta a Buquias, com seus filhos e seus irmãos, doze;
14 Nke asaa, Jesarela na ụmụ ya ndị ikom na ụmụnne ya. Ha niile dị iri na abụọ.
A sétima a Jesarela, com seus filhos e seus irmãos, doze;
15 Nke asatọ, Jeshaya na ụmụ ya ndị ikom na ụmụnne ya. Ha niile dị iri na abụọ.
A oitava a Jesaías, com seus filhos e seus irmãos, doze;
16 Nke itoolu, Matanaya na ụmụ ya ndị ikom na ụmụnne ya. Ha niile dị iri na abụọ.
A nona a Matanias, com seus filhos e seus irmãos, doze;
17 Nke iri, Shimei na ụmụ ya ndị ikom na ụmụnne ya. Ha niile dị iri na abụọ.
A décima a Simei, com seus filhos e seus irmãos, doze;
18 Nke iri na otu, Azarel na ụmụ ya ndị ikom na ụmụnne ya. Ha niile dị iri na abụọ.
A décima primeira a Azareel, com seus filhos e seus irmãos, doze;
19 Nza nke iri na abụọ mara Hashabaya, na ụmụ ya ndị ikom na ụmụnne ya. Ha niile dị iri na abụọ.
A décima segunda a Hasabias, com seus filhos e seus irmãos, doze;
20 Nke iri na atọ, Shubuel na ụmụ ya ndị ikom na ụmụnne ya. Ha niile dị iri na abụọ.
A décima terceira a Subael, com seus filhos e seus irmãos, doze;
21 Nke iri na anọ, Matitaia na ụmụ ya ndị ikom na ụmụnne ya. Ha niile dị iri na abụọ.
A décima quarta a Matitias, com seus filhos e seus irmãos, doze;
22 Nke iri na ise, Jeremot na ụmụ ya ndị ikom na ụmụnne ya. Ha niile dị iri na abụọ.
A décima quinta a Jeremote, com seus filhos e seus irmãos, doze;
23 Nke iri na isii, Hananaya na ụmụ ya ndị ikom na ụmụnne ya. Ha niile dị iri na abụọ.
A décima sexta a Hananias, com seus filhos e seus irmãos, doze;
24 Nke iri na asaa, Joshbekasha na ụmụ ya ndị ikom na ụmụnne ya. Ha niile dị iri na abụọ.
A décima sétima a Josbecasa, com seus filhos e seus irmãos, doze;
25 Nza nke iri na asatọ mara Hanani, na ụmụ ya ndị ikom na ụmụnne ya. Ha niile dị iri na abụọ.
A décima oitava a Hanani, com seus filhos e seus irmãos, doze;
26 Nke iri na itoolu, Maloti na ụmụ ya ndị ikom na ụmụnne ya. Ha niile dị iri na abụọ.
A décima nona a Maloti, com seus filhos e seus irmãos, doze;
27 Nke iri abụọ, Eliata na ụmụ ya ndị ikom na ụmụnne ya. Ha niile dị iri na abụọ.
A vigésima a Eliata, com seus filhos e seus irmãos, doze;
28 Nke iri abụọ na otu, Hotia na ụmụ ya ndị ikom na ụmụnne ya. Ha niile dị iri na abụọ.
A vigésima primeira a Hotir, com seus filhos e seus irmãos, doze;
29 Nke iri abụọ na abụọ, Gidalti na ụmụ ya ndị ikom na ụmụnne ya. Ha niile dị iri na abụọ.
A vigésima segunda a Gidalti, com seus filhos e seus irmãos, doze;
30 Nke iri abụọ na atọ, Mahaziot na ụmụ ya ndị ikom na ụmụnne ya. Ha niile dị iri na abụọ.
A vigésima terceira a Maaziote, com seus filhos e seus irmãos, doze;
31 Ebe nza nke iri abụọ na anọ mara Romamti-Eza, na ụmụ ya ndị ikom na ụmụnne ya. Ha niile dị iri na abụọ.
A vigésima quarta a Romanti-Ezer, com seus filhos e seus irmãos, doze.

< 1 Ihe E Mere 25 >