< 1 Ihe E Mere 24 >
1 Ndị a bụ otu e si kenye ụmụ Erọn ọrụ ije ozi ha: Ụmụ ndị ikom Erọn bụ Nadab, na Abihu, na Elieza, na Itama.
Synů pak Aronových tato jsou zpořádaní: Synové Aronovi: Nádab, Abiu, Eleazar a Itamar.
2 Ma Nadab na Abihu nwụrụ tupu nna ha anwụọ. Ha amụtaghị ụmụ ndị ikom, ya mere, Elieza na Itama jere ozi dịka ndị nchụaja.
Ale že umřel Nádab a Abiu před otcem svým, a neměli synů, protož konali úřad kněžský Eleazar a Itamar.
3 Devid kewara ha dịka usoro ije ozi ha ga-esi dị. Ọ bụ Zadọk onye ikwu Elieza, na Ahimelek onye ikwu Itama nyeere Devid aka ime nke a.
Kteréž zpořádal David, totiž Sádocha z synů Eleazarových, a Achimelecha z synů Itamarových, vedlé počtu a řádu jejich v přisluhováních jejich.
4 Ọnụọgụgụ ndị ndu a chọtara nʼikwu Elieza karịrị ọnụọgụgụ ndị ndu a chọtara nʼikwu Itama. Nʼihi ya, e sitere nʼikwu Elieza nweta ndịisi ezinaụlọ iri na isii, sitekwa nʼikwu Itama nweta ndịisi ezinaụlọ asatọ.
Nalezeno pak synů Eleazarových více předních mužů, než synů Itamarových, a rozdělili je. Z synů Eleazarových bylo předních po domích otcovských šestnáct, a z synů Itamarových po čeledech otcovských osm.
5 E kere ha na-eleghị onye ọbụla anya nʼihu, site nʼife nza, nʼihi na e nwere ndịisi ozi ebe nsọ, nweekwa ndịisi ozi Chineke nʼetiti ndị ikwu Elieza na Itama.
I rozděleni jsou losem jedni od druhých, ačkoli byli knížata nad věcmi svatými, a knížata Boží z synů Eleazarových a z synů Itamarových.
6 Ode akwụkwọ Shemaya, nwa Netanel, onye Livayị, dekọtara aha ndị a niile nʼihu eze, na ndịisi ozi eze, ya bụ, Zadọk onye nchụaja, na Ahimelek nwa Abịata, na ndịisi ezi ndị nchụaja, na nke ndị Livayị. E sitere nʼikwu Elieza, họrọ otu ezinaụlọ, sitekwa nʼikwu Itama họrọ otu ezinaụlọ.
I popsal je Semaiáš syn Natanaelův, písař z pokolení Léví před králem a knížaty, a Sádochem knězem a Achimelechem synem Abiatarovým i knížaty čeledí otcovských mezi kněžími a Levíty, tak že dům otcovský jeden zaznamenán Eleazarovi, tolikéž druhý zaznamenán Itamarovi.
7 Nza nke mbụ mara Jehoiarib nke abụọ a maa Jedaya
Padl pak los první na Jehoiariba, na Jedaiáše druhý,
8 nke atọ, Harim nke anọ, Seorim
Na Charima třetí, na Seorima čtvrtý,
9 nke ise, Malkija nke isii, Mijamin
Na Malkiáše pátý, na Miamin šestý,
10 nke asaa, Hakoz nke asatọ, Abija
Na Hakkoza sedmý, na Abiáše osmý,
11 nke itoolu, Jeshua nke iri, Shekanaya
Na Jesua devátý, na Sechaniáše desátý,
12 nke iri na otu, Eliashib nke iri na abụọ, Jakim
Na Eliasiba jedenáctý, na Jakima dvanáctý,
13 nke iri na atọ, Hupa nke iri na anọ, Jeshebeab
Na Chuppa třináctý, na Jesebaba čtrnáctý,
14 nke iri na ise, Bilga nke iri na isii, Imea
Na Bilgu patnáctý, na Immera šestnáctý,
15 nke iri na asaa, Hezia nke iri na asatọ, Hapizez
Na Chezira sedmnáctý, na Happizeza osmnáctý,
16 nke iri na itoolu, Petahaya nke iri abụọ, Jehezkel
Na Petachiáše devatenáctý, na Ezechiele dvadcátý,
17 nke iri abụọ na otu, Jakin nke iri abụọ na abụọ, Gamul
Na Jachina jedenmecítmý, na Gamule dvamecítmý,
18 nke iri abụọ na atọ, Delaya nke iri abụọ na anọ, Maazaya.
Na Delaiáše třimecítmý, na Maaseiáše čtyřmecítmý.
19 Otu a ka e si keere ha usoro ije ozi ha mgbe ha batara nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị. E mere ya dị ka ụkpụrụ nna nna ha Erọn nyere ha si dị, dịka Onyenwe anyị, Chineke Izrel si nye ya nʼiwu.
Ti jsou, jenž zřízeni byli v přisluhováních svých, aby vcházeli do domu Hospodinova podlé řádu svého, pod spravou Arona otce jejich, jakož mu byl přikázal Hospodin Bůh Izraelský.
20 Ndị a bụkwa ndị ndu a họpụtara nʼebo Livayị: Site nʼụmụ Amram, a họpụtara Shubuel. Site nʼụmụ Shubuel a họpụtara Jehdeia.
Z synů Léví ostatních, z synů Amramových Subael, z synů Subael Jechdeiáš.
21 Site nʼụmụ Rehabaya, onye mbụ a họpụtara bụ Ishaya.
Z Rechabiáše, z synů Rechabiášových kníže Iziáš.
22 Site na ndị Izha a họpụtara Shelomot. Sitekwa nʼụmụ Shelomot a họpụtaara Jahat.
Z Izara Selomot, z synů Selomotových Jachat.
23 Site nʼụmụ Hebrọn a họpụtara Jeraya, nwa mbụ ya, Amaraya nwa nke abụọ ya, Jahaziel nwa nke atọ ya na Jekameam nwa nke anọ ya.
Synové pak Jeriášovi: Amariáš druhý, Jachaziel třetí, Jekamam čtvrtý.
24 A họpụtara Maịka nwa Uziel, sitekwa nʼụmụ Maịka họpụta Shamia.
Syn Uzielův Mícha, z synů Míchy Samir.
25 A họpụtara nwanne Maịka nke nwoke aha ya bụ Ishaya, sitekwa nʼụmụ Ishaya họpụta Zekaraya.
Bratr Míchův Iziáš, a syn Iziášův Zachariáš.
26 Site nʼụmụ Merari e nwere Mahali na Mushi. A họpụtakwara Beno nwa Jaazia.
Synové Merari: Moholi a Musi, synové Jaaziášovi: Beno.
27 Sitekwa nʼụmụ Merari a họpụtara ụmụ Jaazia ndị a: Beno, Shoham, Zakua na Ibri.
Synové Merari z Jaaziáše: Beno, Soham, Zakur a Ibri.
28 Site nʼụmụ Mahali a họpụtara Elieza, ma Elieza nʼonwe ya amụtaghị nwa nwoke.
Z Moholi Eleazar, kterýž neměl synů.
29 Site nʼụmụ Kish a họpụtara Jerameel.
Z Cisa synové Cisovi: Jerachmeel.
30 Site nʼụmụ Mushi, a họpụtara Mahali, na Eda na Jerimot. Ndị a niile bụ ndị Livayị dịka ezinaụlọ ha si dị.
Synové pak Musi: Moholi, Eder a Jerimot. Ti jsou synové Levítů po domích otců svých.
31 Dịka e mere mgbe a na-ahọpụta ụmụ Erọn, e ji ife nza kenye ha niile ọrụ ha kwesiri ịrụ nʼotu nʼotu, onye ukwu ha na onye nta ha. E mere ya nʼihu eze Devid, na Zadọk, na Ahimelek, na ndịisi ezinaụlọ ndị nchụaja na ndị Livayị niile. Mgbe a na-efe nza a, e mesoro ndị ikom niile otu mmeso, ma okenye ha ma ndị na-etolite etolite.
I ti také metali losy naproti bratřím svým, synům Aronovým, před Davidem králem, Sádochem a Achimelechem, i knížaty otcovských čeledí z kněží a Levítů, z čeledí otcovských, každý přednější naproti bratru svému mladšímu.