< 1 Ihe E Mere 24 >

1 Ndị a bụ otu e si kenye ụmụ Erọn ọrụ ije ozi ha: Ụmụ ndị ikom Erọn bụ Nadab, na Abihu, na Elieza, na Itama.
Magulu a ana a Aaroni anali awa: Ana a Aaroni anali Nadabu, Abihu, Eliezara ndi Itamara.
2 Ma Nadab na Abihu nwụrụ tupu nna ha anwụọ. Ha amụtaghị ụmụ ndị ikom, ya mere, Elieza na Itama jere ozi dịka ndị nchụaja.
Koma Nadabu ndi Abihu anamwalira abambo awo asanamwalire, ndipo analibe ana aamuna. Kotero Eliezara ndi Itamara ankatumikira monga ansembe.
3 Devid kewara ha dịka usoro ije ozi ha ga-esi dị. Ọ bụ Zadọk onye ikwu Elieza, na Ahimelek onye ikwu Itama nyeere Devid aka ime nke a.
Mothandizidwa ndi Zadoki chidzukulu cha Eliezara ndi Ahimeleki chidzukulu cha Itamara, Davide anawagawa mʼmagulu molingana ndi ntchito yawo yotumikira.
4 Ọnụọgụgụ ndị ndu a chọtara nʼikwu Elieza karịrị ọnụọgụgụ ndị ndu a chọtara nʼikwu Itama. Nʼihi ya, e sitere nʼikwu Elieza nweta ndịisi ezinaụlọ iri na isii, sitekwa nʼikwu Itama nweta ndịisi ezinaụlọ asatọ.
Atsogoleri ambiri anapezeka pakati pa zidzukulu za Eliezara kusiyana ndi zidzukulu za Itamara ndipo anagawidwa moyenera: atsogoleri 16 a mabanja ochokera kwa Eliezara, ndipo atsogoleri asanu ndi atatu a mabanja ochokera kwa zidzukulu za Itamara.
5 E kere ha na-eleghị onye ọbụla anya nʼihu, site nʼife nza, nʼihi na e nwere ndịisi ozi ebe nsọ, nweekwa ndịisi ozi Chineke nʼetiti ndị ikwu Elieza na Itama.
Anawagawa mosakondera pochita maere, pakuti iwo anali akuluakulu a ku malo opatulika ndi akuluakulu a Mulungu pakati pa zidzukulu za Eliezara ndi Itamara.
6 Ode akwụkwọ Shemaya, nwa Netanel, onye Livayị, dekọtara aha ndị a niile nʼihu eze, na ndịisi ozi eze, ya bụ, Zadọk onye nchụaja, na Ahimelek nwa Abịata, na ndịisi ezi ndị nchụaja, na nke ndị Livayị. E sitere nʼikwu Elieza, họrọ otu ezinaụlọ, sitekwa nʼikwu Itama họrọ otu ezinaụlọ.
Mlembi Semaya mwana wa Netaneli, Mlevi, analemba mayina awo pamaso pa mfumu ndi akuluakulu ake: wansembe Zadoki, Ahimeleki mwana wa Abiatara ndi atsogoleri a mabanja a ansembe ndiponso Alevi, banja limodzi kuchokera kwa Eliezara kenaka limodzi kuchokera kwa Itamara.
7 Nza nke mbụ mara Jehoiarib nke abụọ a maa Jedaya
Maere woyamba anagwera Yehoyaribu, achiwiri anagwera Yedaya,
8 nke atọ, Harim nke anọ, Seorim
achitatu anagwera Harimu, achinayi anagwera Seorimu,
9 nke ise, Malkija nke isii, Mijamin
achisanu anagwera Malikiya, achisanu ndi chimodzi anagwera Miyamini,
10 nke asaa, Hakoz nke asatọ, Abija
achisanu ndi chiwiri anagwera Hakozi, achisanu ndi chitatu anagwera Abiya,
11 nke itoolu, Jeshua nke iri, Shekanaya
achisanu ndi chinayi anagwera Yesuwa, a khumi anagwera Sekaniya,
12 nke iri na otu, Eliashib nke iri na abụọ, Jakim
a 11 anagwera Eliyasibu, a 12 anagwera Yakimu,
13 nke iri na atọ, Hupa nke iri na anọ, Jeshebeab
a 13 anagwera Hupa, a 14 anagwera Yesebeabu,
14 nke iri na ise, Bilga nke iri na isii, Imea
a 15 anagwera Biliga, a 16 anagwera Imeri,
15 nke iri na asaa, Hezia nke iri na asatọ, Hapizez
a 17 anagwera Heziri, a 18 anagwera Hapizezi,
16 nke iri na itoolu, Petahaya nke iri abụọ, Jehezkel
a 19 anagwera Petahiya, a 20 anagwera Ezekieli,
17 nke iri abụọ na otu, Jakin nke iri abụọ na abụọ, Gamul
a 21 anagwera Yakini, a 22 anagwera Gamuli,
18 nke iri abụọ na atọ, Delaya nke iri abụọ na anọ, Maazaya.
a 23 anagwera Delaya, ndipo a 24 anagwera Maaziya.
19 Otu a ka e si keere ha usoro ije ozi ha mgbe ha batara nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị. E mere ya dị ka ụkpụrụ nna nna ha Erọn nyere ha si dị, dịka Onyenwe anyị, Chineke Izrel si nye ya nʼiwu.
Umu ndi mmene anasankhidwira kuti azigwira ntchito yotumikira pamene alowa mʼNyumba ya Yehova, motsatira dongosolo limene anapatsidwa ndi kholo lawo Aaroni, monga momwe Yehova Mulungu wa Israeli anamulamulira.
20 Ndị a bụkwa ndị ndu a họpụtara nʼebo Livayị: Site nʼụmụ Amram, a họpụtara Shubuel. Site nʼụmụ Shubuel a họpụtara Jehdeia.
Za zidzukulu zina zonse za Levi: Kuchokera kwa ana a Amramu: Subaeli; kuchokera kwa ana a Subaeli: Yehideya.
21 Site nʼụmụ Rehabaya, onye mbụ a họpụtara bụ Ishaya.
Kwa Rehabiya, kuchokera kwa ana ake: Mtsogoleri anali Isiya.
22 Site na ndị Izha a họpụtara Shelomot. Sitekwa nʼụmụ Shelomot a họpụtaara Jahat.
Kuchokera ku banja la Izihari: Selomoti; kuchokera kwa ana a Selomoti: Yahati.
23 Site nʼụmụ Hebrọn a họpụtara Jeraya, nwa mbụ ya, Amaraya nwa nke abụọ ya, Jahaziel nwa nke atọ ya na Jekameam nwa nke anọ ya.
Ana a Hebroni: woyamba anali Yeriya, wachiwiri anali Amariya, wachitatu anali Yahazieli ndipo Yekameamu anali wachinayi.
24 A họpụtara Maịka nwa Uziel, sitekwa nʼụmụ Maịka họpụta Shamia.
Mwana wa Uzieli: Mika; kuchokera kwa ana a Mika: Samiri.
25 A họpụtara nwanne Maịka nke nwoke aha ya bụ Ishaya, sitekwa nʼụmụ Ishaya họpụta Zekaraya.
Mʼbale wa Mika: Isiya; kuchokera kwa ana a Isiya: Zekariya.
26 Site nʼụmụ Merari e nwere Mahali na Mushi. A họpụtakwara Beno nwa Jaazia.
Ana a Merari: Mahili ndi Musi. Mwana wa Yaaziya: Beno.
27 Sitekwa nʼụmụ Merari a họpụtara ụmụ Jaazia ndị a: Beno, Shoham, Zakua na Ibri.
Ana a Merari: Kuchokera kwa Yaaziya: Beno, Sohamu, Zakuri ndi Ibiri.
28 Site nʼụmụ Mahali a họpụtara Elieza, ma Elieza nʼonwe ya amụtaghị nwa nwoke.
Kuchokera kwa Mahili: Eliezara, amene analibe ana aamuna.
29 Site nʼụmụ Kish a họpụtara Jerameel.
Kuchokera kwa Kisi: Mwana wa Kisi: Yerahimeeli.
30 Site nʼụmụ Mushi, a họpụtara Mahali, na Eda na Jerimot. Ndị a niile bụ ndị Livayị dịka ezinaụlọ ha si dị.
Ndipo ana a Musi: Mahili, Ederi ndi Yerimoti. Awa anali Alevi potsata mabanja a makolo awo.
31 Dịka e mere mgbe a na-ahọpụta ụmụ Erọn, e ji ife nza kenye ha niile ọrụ ha kwesiri ịrụ nʼotu nʼotu, onye ukwu ha na onye nta ha. E mere ya nʼihu eze Devid, na Zadọk, na Ahimelek, na ndịisi ezinaụlọ ndị nchụaja na ndị Livayị niile. Mgbe a na-efe nza a, e mesoro ndị ikom niile otu mmeso, ma okenye ha ma ndị na-etolite etolite.
Iwonso anachita maere, monga anachitira abale awo, zidzukulu za Aaroni, pamaso pa mfumu Davide, ndi Zadoki ndi Ahimeleki, atsogoleri a mabanja a ansembe ndi Alevi. Mabanja a mwana wamkulu anachita nawo mofanana ndi a mwana wamngʼono.

< 1 Ihe E Mere 24 >