< 1 Ihe E Mere 23 >

1 Mgbe Devid ghọrọ nnọọ agadi, ụbọchị ndụ ya jukwara ya afọ, o mere Solomọn nwa ya, eze Izrel.
Daudi alipokuwa mzee aliyeshiba siku, akamfanya Solomoni mwanawe kuwa mfalme juu ya Israeli.
2 Nʼoge a, ọ kpọkọtara ndị ndu Izrel niile, tinyekwara ndị nchụaja na ndị Livayị.
Pia akawakusanya pamoja viongozi wote wa Israeli, pamoja na makuhani na Walawi.
3 A gụrụ ndị Livayị niile ọnụ, bụ ndị gbara iri afọ atọ gbagoo, chọpụta na ha dị iri puku ndị ikom atọ na asatọ nʼọnụọgụgụ.
Walawi waliokuwa na umri wa miaka thelathini au zaidi walihesabiwa, nayo hesabu ya wanaume ilikuwa 38,000.
4 Devid sịrị, “Nʼime ndị a, ka iri puku ndị ikom abụọ na anọ bụrụ ndị ga-ahụ maka ọrụ ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, puku ndị ikom isii a bụrụ ndịisi na ndị ikpe,
Daudi akasema, “Miongoni mwa hawa, 24,000 watasimamia kazi ya Hekalu la Bwana na 6,000 watakuwa maafisa na waamuzi,
5 puku ndị ikom anọ abụrụ ndị nche ọnụ ụzọ ama, ebe puku ndị ikom anọ ndị ọzọ ga-eji ihe egwu dị iche iche nke m kwadobere maka ito Onyenwe anyị, na-eto ya.”
na 4,000 watakuwa mabawabu, na wengine 4,000 watamsifu Bwana kwa ala za uimbaji nilizotoa kwa ajili ya kusudi hilo.”
6 Devid kewara ndị Livayị nʼoke, nʼoke dịka ụmụ ndị ikom Livayị si dị: Geshọn, Kohat na Merari.
Daudi akawagawa Walawi katika makundi kufuatana na wana wa Lawi: Gershoni, Kohathi na Merari.
7 E kekwara ikwu Geshọn ụzọ abụọ dịka ụmụ ya si dị, Ladan na Shimei.
Wana wa Wagershoni walikuwa wawili: Ladani na Shimei.
8 Ndị sitere nʼezinaụlọ Ladan dị ndị ikom atọ: Jehiel, onyeisi ha, Zetam na Juel.
Wana wa Ladani walikuwa watatu: Yehieli wa kwanza, Zethamu na Yoeli.
9 Ụmụ Shimei bụ, Shelomot, Haziel na Haran, ha dị ndị ikom atọ. Ndị a niile bụ ndịisi ezinaụlọ nʼikwu Ladan.
Wana wa Shimei walikuwa watatu: Shelomothi, Hazieli na Harani. Hawa watatu walikuwa viongozi wa jamaa za Ladani.
10 Ụmụ Shimei bụ, Jahat, Ziza, Jeush na Beriya. Ha dị ndị ikom anọ.
Nao wana wa Shimei walikuwa wanne: Yahathi, Zina, Yeushi na Beria.
11 Jahat bụ onye mbụ, Ziza onye nke abụọ. Ma Jeush na Beriya amụtaghị ọtụtụ ụmụ ndị ikom. Nʼihi ya, a gụnyekọtara ha dịka otu ezinaụlọ, kenye ha otu ọrụ.
Yahathi alikuwa wa kwanza na Ziza wa pili, lakini Yeushi na Beria hawakuwa na wana wengi; kwa hiyo walihesabiwa kama jamaa moja, wakapewa wajibu kwa pamoja.
12 Ụmụ ndị ikom Kohat bụ Amram, Izha, Hebrọn na Uziel. Ha dị ndị ikom anọ.
Wana wa Kohathi walikuwa wanne: Amramu, Ishari, Hebroni na Uzieli.
13 Ụmụ ndị ikom Amram bụ, Erọn na Mosis. Erọn ka e kewapụrụ iche, ido ya nsọ ya na ụmụ ya ruo ebighị ebi, maka ido ihe niile kachasị nsọ nsọ, ịchụ aja nʼihu Onyenwe anyị, ije ozi nʼihu ya nakwa ikwupụta ngọzị nʼaha ya ruo ebighị ebi.
Wana wa Amramu walikuwa: Aroni na Mose. Aroni waliwekwa wakfu, yeye na wazao wake milele, wawe wakiweka wakfu vitu ambavyo ni vitakatifu mno, kutoa dhabihu mbele za Bwana, kuhudumu mbele zake na kutamka baraka katika Jina la Bwana milele.
14 Ụmụ Mosis, onye nke Chineke ka a gụnyekọtara dịka ndị si nʼebo Livayị.
Wana wa Mose mtu wa Mungu walihesabiwa kama sehemu ya kabila la Lawi.
15 Ụmụ ndị ikom Mosis bụ, Geshọm na Elieza.
Wana wa Mose walikuwa: Gershomu na Eliezeri.
16 Ụmụ ndị ikom Geshọm bụ Shubuel, onye mbụ.
Wazao wa Gershomu: Shebueli alikuwa wa kwanza.
17 Ụmụ ụmụ Elieza bụ Rehabaya onye mbụ. Elieza amụtaghị ụmụ ndị ikom ọzọ, ma ụmụ ndị ikom Rohabaya dị ọtụtụ.
Wazao wa Eliezeri: Rehabia alikuwa wa kwanza. Eliezeri alikuwa na mwana mmoja tu, lakini wana wa Rehabia walikuwa wengi sana.
18 Ụmụ ndị ikom Izha bụ Shelomit onye mbụ.
Wana wa Ishari: Shelomithi alikuwa wa kwanza.
19 Ụmụ ndị ikom Hebrọn bụ Jereaya onye mbụ, na Amaraya, onye nke abụọ, Jahaziel onye nke atọ, na Jekameam, onye nke anọ.
Wana wa Hebroni walikuwa: Yeria alikuwa wa kwanza, wa pili Amaria, wa tatu Yahazieli, na wa nne Yekameamu.
20 Ụmụ ndị ikom Uziel bụ Maịka, onye mbụ, na Ishaya, onye nke abụọ.
Wana wa Uzieli walikuwa: Mika wa kwanza na Ishia wa pili.
21 Ụmụ ndị ikom Merari bụ Mahali na Mushi Ụmụ ndị ikom Mali bụ Elieza na Kish
Wana wa Merari walikuwa: Mahli na Mushi. Wana wa Mahli walikuwa: Eleazari na Kishi.
22 Elieza nwụrụ na-amụtaghị ụmụ ndị ikom. Ọ bụ naanị ụmụ ndị inyom ka ọ mụtara. Ụmụ nwanne nna ha, ụmụ ndị ikom Kish, lụrụ ha.
Eleazari akafa bila ya kuwa na wana: alikuwa na binti tu. Binamu zao, wana wa Kishi, wakawaoa.
23 Ụmụ ndị ikom Mushi bụ Mahali, Eda na Jeremot. Ha dị ndị ikom atọ.
Wana wa Mushi: Mahli, Ederi na Yeremothi; wote walikuwa watatu.
24 Ndị a bụ ụmụ ụmụ Livayị dịka ezinaụlọ ha si dị, ndịisi ezi, dịka e si debanye aha, na dịka e si gụọ ha ọnụ nʼotu nʼotu, ya bụ ndị na-arụ ọrụ nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, ndị gbara iri afọ abụọ gbagoo.
Hawa walikuwa wazao wa Lawi kwa jamaa zao. Wakuu wa jamaa kama walivyoandikwa kwa majina yao na kuhesabiwa kila mmoja, yaani, wenye uwezo wa kufanya kazi kuanzia miaka ishirini au zaidi, waliohudumu katika Hekalu la Bwana.
25 Nʼihi na Devid kwuru sị, “Ebe ọ bụ na Onyenwe anyị, Chineke Izrel enyela ndị ya udo, ebe ọ bụkwa na ọ ga-ebi na Jerusalem ruo ebighị ebi.
Kwa maana Daudi alikuwa amesema, “Kwa vile Bwana, Mungu wa Israeli amewapa watu wake raha na amekuja kuishi Yerusalemu milele,
26 Ugbu a, ọ dịkwaghị mkpa ọ dị na ndị Livayị ga na-ebugharị ụlọ ikwu, maọbụ ngwongwo ọbụla nke ije ozi niile ya.”
Walawi hawahitaji tena kubeba Maskani wala chombo chochote cha utumishi wake.”
27 Ịgụ ndị Livayị ọnụ bụ otu nʼime ihe ikpeazụ Devid mere tupu ọ nwụọ. A gụrụ ndị Livayị gbara iri afọ abụọ gbagoo ọnụ.
Kulingana na maagizo ya mwisho ya Daudi, Walawi waliohesabiwa ni wale wa kuanzia umri wa miaka ishirini au zaidi.
28 Ọrụ e nyere ndị Livayị niile bụ inyere ụmụ Erọn ndị nchụaja aka nʼofufe nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị: ilekọta ogige, na ọnụụlọ nta ndị dị nʼakụkụ ya niile, na ime ka ihe nsọ niile dị ọcha, na ịrụ ọrụ ọbụla e nyere ha nʼụlọ Chineke.
Wajibu wa Walawi ulikuwa kuwasaidia wazao wa Aroni kuhudumu katika Hekalu la Bwana: Kuwa wasimamizi wa nyua, vyumba vya pembeni, kutakasa vyombo vitakatifu na utendaji mwingine wowote katika nyumba ya Mungu.
29 Ọ bụkwa ọrụ ha iwebata achịcha a na-eche nʼihu Chineke, na ụtụ ọka e ji enye onyinye mkpụrụ ọka, na achịcha mbadamba a na-ejighị ihe na-eko achịcha mee. Ọrụ ha bụkwa ịgwakọta ihe e ji eme achịcha, na ighe ya, na ilekọta ihe ọtụtụ niile e ji atụ ihe.
Walikuwa wasimamizi wa mikate iliyowekwa mezani, unga kwa ajili ya sadaka za nafaka, mikate isiyotiwa chachu, uokaji na uchanganyaji, pamoja na vipimo vyote vya wingi na ukubwa.
30 Ụtụtụ ọbụla, na anyasị ọbụla, ọ bụ ọrụ ha iguzo nʼihu Onyenwe anyị ịbụ abụ otuto, na ekele.
Pia ulikuwa wajibu wao kila asubuhi kumshukuru na kumsifu Bwana. Iliwapasa pia kufanya hivyo jioni
31 Ha na-enyekwa aka nʼihe gbasara aja nsure ọkụ a na-achụ nʼụbọchị izuike, na nʼoge mmemme ọnwa ọhụrụ, na mmemme ndị ọzọ niile a kara aka. Mgbe niile ka ha ga-eje ozi ha nʼihu Onyenwe anyị dịka usoro ha na ọnụọgụgụ ha si dị.
na wakati wowote sadaka za kuteketezwa zilipotolewa kwa Bwana siku za Sabato na kwenye sikukuu za Mwezi Mwandamo na katika sikukuu nyingine zilizoamriwa. Iliwapasa kuhudumu mbele za Bwana mara kwa mara kwa idadi maalum na kwa namna waliyokuwa wamepewa maelekezo.
32 Ya mere, e tinyere ọrụ ilekọta ụlọ nzute Onyenwe anyị, na ụlọnsọ ukwu ahụ nʼaka ha. Ha ka ọ dịkwara inyere ndị ikwu ha, bụ ndị nchụaja ahụ, ụmụ Erọn, aka nʼọrụ ha niile nʼụlọnsọ ukwu ahụ.
Hivyo Walawi wakafanya wajibu wao katika Hema la Kukutania, katika Mahali Patakatifu chini ya uongozi wa ndugu zao wazao wa Aroni, kwa ajili ya utumishi katika Hekalu la Bwana.

< 1 Ihe E Mere 23 >