< 1 Ihe E Mere 21 >

1 Ekwensu biliri megide Izrel, mgbe ọ kpaliri Devid ka ọ gụọ Izrel ọnụ.
사단이 일어나 이스라엘을 대적하고 다윗을 격동하여 이스라엘을 계수하게 하니라
2 Ya mere, Devid gwara Joab na ndịisi agha okwu sị, “Gaa gụọ ụmụ Izrel niile ọnụ, site na Bịasheba ruo Dan. Emesịa, bịa gwa m ihe ị gụtara ka m mata ole ọnụọgụgụ ha dị.”
다윗이 요압과 백성의 두목에게 이르되 너희는 가서 브엘세바에서부터 단까지 이스라엘을 계수하고 돌아와서 내게 고하여 그 수효를 알게 하라
3 Ma Joab zaghachiri, “Ka Onyenwe anyị mee ka ndị agha ya mụbaa, otu onye narị ụzọ karịa. Ma onyenwe m eze, ọ bụ na ndị a niile abụghị ndị nọ nʼokpuru ọchịchị onyenwe m? Nʼihi gịnị ka onyenwe m ji na-achọ ime ihe a? Nʼihi gịnị ka ọ ga-eji wetara Izrel ikpe ọmụma?”
요압이 가로되 여호와께서 그 백성을 지금보다 백 배나 더하시기를 원하나이다 내 주 왕이여 이 백성이 다 내 주의 종이 아니니이까 내 주께서 어찌하여 이 일을 명하시나이까 어찌하여 이스라엘로 죄가 있게 하시나이까 하나
4 Ma okwu eze dị ike karịa nke Joab. Ya mere, Joab pụrụ gagharịa nʼIzrel niile, mechaa lọghachikwa na Jerusalem.
왕의 명령이 요압을 재촉한지라 드디어 떠나서 이스라엘 땅에 두루 다닌 후에 예루살렘으로 돌아와서
5 Joab nyere Devid ngụkọta ọnụọgụgụ nke ndị agha Izrel niile. NʼIzrel niile, ha dị otu nde, na narị puku ndị ikom ndị tozuru iji mma agha buo agha, tinyekwara narị puku ndị ikom anọ na iri asaa nʼala Juda ndị na-amịpụta mma agha.
백성의 수효를 다윗에게 고하니 이스라엘 중에 칼을 뺄만한 자가 일백십만이요 유다 중에 칼을 뺄 만한 자가 사십칠만이라
6 Ma Joab agụnyeghị ndị Livayị, na ndị Benjamin nʼọnụọgụgụ ahụ, nʼihi na iwu eze amasịghị ya nʼobi nʼụzọ ọbụla.
요압이 왕의 명령을 밉게 여겨 레위와 베냐민 사람은 계수하지 아니하였더라
7 Iwu banyere ọnụọgụgụ a adịghịkwa Chineke mma nʼanya. Ya mere, ọ tara ndị Izrel ahụhụ nʼihi ya.
하나님이 이 일을 괘씸히 여기사 이스라엘을 치시매
8 Mgbe ahụ, Devid sịrị Chineke, “Emehiela m nke ukwuu site nʼihe a m mere. Ma ugbu a, biko, arịọ m gị, wezuga ikpe ọmụma dịịrị ohu gị; nʼihi na emeela m ihe nzuzu dị ukwuu.”
다윗이 하나님께 아뢰되 내가 이 일을 행함으로 큰 죄를 범하였나이다 이제 간구하옵나니 종의 죄를 사하여 주옵소서 내가 심히 미련하게 행하였나이다 하니라
9 Onyenwe anyị gwara Gad, onye ọhụ ụzọ Devid, sị,
여호와께서 다윗의 선견자 갓에게 이르시되
10 “Gaa gwa Devid, ‘Otu a ka Onyenwe anyị na-ekwu: Ụzọ ihe atọ ka m na-eche gị nʼihu. Họrọ otu nʼime ha nke m ga-eme ka ọ bịakwasị gị.’”
가서 다윗에게 말하여 이르기를 여호와의 말씀이 내가 네게 세 가지를 보이노니 그 중에서 하나를 택하라 내가 그것을 네게 행하리라 하셨다 하라
11 Ya mere Gad jekwuuru Devid sị ya, “Ihe a ka Onyenwe anyị kwuru, Họrọ nke dị gị mma.
갓이 다윗에게 나아가 고하되 여호와의 말씀이 너는 마음대로 택하라
12 Oke ụnwụ nke ga-adị afọ atọ, ka ọ bụ ọnwa atọ nke mkpochapụ nʼihu ndị iro unu, site na mma agha ha ga-eru unu ahụ, ka ọ bụ ụbọchị atọ nke mma agha Onyenwe anyị, bụ ajọ ọrịa na-efe efe ịda nʼala a, nke mmụọ ozi Onyenwe anyị ga-eme ka ọ bịakwasị ala Izrel niile. Ugbu a, chee echiche, kpebie ọsịsa ị chọrọ ka m weghachiri onye ahụ zitere m.”
혹 삼 년 기근일지, 혹 네가 석 달을 대적에게 패하여 대적의 칼에 쫓길 일일지, 혹 여호와의 칼 곧 온역이 사흘동안 이 땅에 유행하며 여호와의 사자가 이스라엘 온 지경을 멸할 일일지 하셨나니 내가 무슨 말로 나를 보내신 이에게 대답할 것을 결정하소서
13 Devid sịrị Gad, “Anọ m nʼoke nsogbu. Ọ ka mma ka m daba nʼaka Onyenwe anyị karịa ịdaba nʼaka mmadụ. Nʼihi na obi ebere ya bara ụba nke ukwuu.”
다윗이 갓에게 이르되 내가 곤경에 있도다 여호와께서는 긍휼이 심히 크시니 내가 그의 손에 빠지고 사람의 손에 빠지지 않기를 원하나이다
14 Nʼihi ya, Onyenwe anyị zitere ajọ ọrịa na-efe efe nʼala Izrel, iri puku ndị ikom asaa dara nwụọ.
이에 여호와께서 이스라엘 백성에게 온역을 내리시매 이스라엘 백성의 죽은 자가 칠만이었더라
15 Chineke zipụrụ mmụọ ozi ị ga bibie Jerusalem, ma dịka mmụọ ozi ahụ na-eme nke a, Onyenwe anyị hụrụ ya, o wutere ya nʼihi mbibi ahụ. Ọ sịrị mmụọ ozi ahụ nke na-ebibi ndị mmadụ, “O zuola! Seghachi aka gị.” Mgbe ahụ, mmụọ ozi Onyenwe anyị na-eguzo nʼebe ịzọcha ọka Arauna onye Jebus.
하나님이 예루살렘을 멸하러 사자를 보내셨더니 사자가 멸하려 할 때에 여호와께서 보시고 이 재앙 내림을 뉘우치사 멸하는 사자에게 이르시되 족하다 이제는 네 손을 거두라 하시니 때에 여호와의 사자가 여부스 사람 오르난의 타작 마당 곁에 선지라
16 Mgbe Devid leliri anya elu hụ mmụọ ozi Onyenwe anyị ka o guzo nʼetiti mbara eluigwe na ụwa, hụkwa mma agha o ji, nke o chere ihu ya na Jerusalem, ya na ndị okenye Izrel yi akwa mkpe, dara nʼala kpuo ihu nʼala.
다윗이 눈을 들어보매 여호와의 사자가 천지 사이에 섰고 칼을 빼어 손에 들고 예루살렘 편을 가리켰는지라 다윗이 장로들로 더불어 굵은 베를 입고 얼굴을 땅에 대고 엎드려
17 Devid sịrị Chineke, “Ọ bụghị m nyere iwu ka a gụọ ndị tozuru ibu agha ọnụ? Ọ bụ mụ onwe m, mụ bụ onye ọzụzụ atụrụ, mehiere mee ajọ omume. Ma ndị a bụ naanị ụmụ atụrụ, gịnị kwanụ ka ha mere? Onyenwe anyị Chineke m, biko ekwela ka ọrịa a na-efe efe nọgide nʼahụ ndị gị, ka aka gị dịgide naanị nʼahụ m, dịgidekwa nʼahụ ndị ụlọ m.”
하나님께 아뢰되 명하여 백성을 계수하게 한 자가 내가 아니니이까 범죄하고 악을 행한 자는 곧 내니이다 이 양무리는 무엇을 행하였나이까 청컨대 나의 하나님 여호와여 주의 손으로 나와 내 아비의 집을 치시고 주의 백성에게 재앙을 내리지 마옵소서
18 Mgbe ahụ, mmụọ ozi Onyenwe anyị nyere Gad iwu ka ọ gwa Devid, ka ọ gaa wuore Onyenwe anyị ebe ịchụ aja nʼebe ịzọcha ọka Arauna, onye Jebus.
여호와의 사자가 갓을 명하여 다윗에게 이르시기를 올라가서 여부스 사람 오르난의 타작 마당에서 여호와를 위하여 단을 쌓으라 하신지라
19 Ya mere, Devid rubere isi gaa dịka okwu ahụ Gad kwuru nʼaha Onyenwe anyị.
다윗이 이에 갓이 여호와의 이름으로 이른 말씀대로 올라가니라
20 Mgbe Arauna nọ nʼebe ịzọcha ọka, ọ tụgharịrị hụ mmụọ ozi ahụ, ụmụ ya ndị ikom anọ ndị so ya guzo nʼebe ahụ zoro onwe ha.
때에 오르난이 밀을 타작하다가 돌이켜 천사를 보고 네 아들과 함께 숨었더니
21 Mgbe Devid bịakwutere Arauna, Arauna weliri anya hụ ya, ọ hapụrụ ebe ịzọcha ọka ahụ, bịa kpọọ isiala nye Devid, kpudokwa ihu ya nʼala.
다윗이 오르난에게 나아가매 오르난이 내어다보다가 다윗을 보고 타작 마당에서 나와서 얼굴을 땅에 대고 절하매
22 Devid sịrị ya, “Nye m ebe a, bụ ala ebe ịzọcha ọka gị, ka m nwee ike wuore Onyenwe anyị ebe ịchụ aja, ka akwụsị ọrịa a na-efe efe dakwasịrị ndị mmadụ. Resi m ya nʼọnụ ahịa o ruru.”
다윗이 오르난에게 이르되 이 타작하는 곳을 내게 붙이라 너는 상당한 값으로 붙이라 내가 여호와를 위하여 여기 한 단을 쌓으리니 그리하면 온역이 백성 중에서 그치리라
23 Ma Arauna zara sị Devid, “Were ya ka onyenwe m eze mee ihe ọbụla dị ya nʼobi. Aga m enye ehi maka iji chụọ aja nsure ọkụ, ihe nzọcha ọka niile ka ha bụrụ nkụ na ọka wiiti maka ịchụ aja mkpụrụ ọka. Aga m enye ha niile.”
오르난이 다윗에게 고하되 왕은 취하소서 내 주 왕의 좋게 여기시는 대로 행하소서 보소서 내가 이것들을 드리나이다 소들은 번제물로, 곡식 떠는 기계는 화목으로, 밀은 소제물로 삼으시기 위하여 다 드리나이다
24 Ma eze Devid zaghachiri Arauna, “ee, aghaghị m ịkwụzu gị ọnụahịa ya. Nʼihi na agaghị m ewere ihe bụ nke gị nye ya Onyenwe anyị, maọbụ chụọ aja nsure ọkụ nke na-agaghị efu m ihe ọbụla.”
다윗 왕이 오르난에게 이르되 그렇지 아니하다 내가 결단코 상당한 값으로 사리라 내가 여호와께 드리려고 네 물건을 취하지 아니하겠고 값 없이는 번제를 드리지도 아니하리라 하고
25 Ya mere, Devid kwụrụ Arauna narị shekel ọlaedo isii iji zụrụ ebe ahụ.
그 기지 값으로 금 육백 세겔을 달아 오르난에게 주고
26 Devid wuru ebe ịchụrụ Onyenwe anyị aja nʼebe ahụ, chụọkwa aja nsure ọkụ na aja udo. Ọ kpọkuru Onyenwe anyị, Onyenwe anyị zakwara ya, site nʼọkụ nke si nʼeluigwe daa nʼelu ebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ ahụ.
다윗이 거기서 여호와를 위하여 단을 쌓고 번제와 화목제를 드려 여호와께 아뢰었더니 여호와께서 하늘에서부터 번제단 위에 불을 내려 응답하시고
27 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị nyere mmụọ ozi ahụ iwu ka o tinyekwa mma agha ya nʼọbọ ya.
사자를 명하시매 저가 칼을 집에 꽂았더라
28 Mgbe Devid hụrụ na Onyenwe anyị azala ekpere ya nʼebe ịzọcha ọka nke Arauna onye Jebus, ọ chụkwara aja ọzọ nye Onyenwe anyị.
이 때에 다윗이 여호와께서 여부스 사람 오르난의 타작 마당에서 응답하심을 보고 거기서 제사를 드렸으니
29 Ụlọ ikwu Onyenwe anyị na ebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ ahụ Mosis wuru nʼọzara dị nʼebe dị elu Gibiọn, nʼoge ahụ.
옛적에 모세가 광야에서 지은 여호와의 장막과 번제단이 그 때에 기브온 산당에 있으나
30 Ma Devid ejerughị ebe ahụ ịjụta Chineke ase, nʼihi na ụjọ tụrụ ya mgbe ọ hụrụ mma agha ahụ dị nʼaka mmụọ ozi Onyenwe anyị.
다윗이 여호와의 사자의 칼을 두려워하여 감히 그 앞에 가서 하나님께 묻지 못함이라

< 1 Ihe E Mere 21 >