< 1 Ihe E Mere 20 >

1 Nʼoge ọkọchị, mgbe ndị eze na-apụ ibu agha, Joab duuru ndị agha pụọ ibu agha. O bibiri ala ndị Amọn niile, gaa Raba nọchibido ya, ma Devid nọdụrụ na Jerusalem. Joab busoro Raba agha, mee ka ọ ghọọ mkpọmkpọ ebe.
Ní àkókò àkọ́rọ̀ òjò, ni ìgbà tí àwọn ọba lọ sí ogun, Joabu ṣamọ̀nà àwọn ọ̀wọ́ ọmọ-ogun. Ó fi ilẹ̀ àwọn ará Ammoni ṣòfò. Ó lọ sí ọ̀dọ̀ Rabba. Ó sì fi ogun dúró tì í. Ṣùgbọ́n Dafidi dúró sí Jerusalẹmu Joabu kọlu Rabba, ó sì fi sílẹ̀ ní ìparun.
2 Devid kpupuru okpueze nke dị eze ha nʼisi, ahụtara nʼịdị arọ nke okpueze ahụ ruru kilogram ọlaedo iri atọ na anọ, nke e ji nkume ndị dị oke ọnụahịa chọọ mma, e kpunyere ya Devid nʼisi. O sitekwara nʼobodo ahụ kwakọrọ ọtụtụ ihe nkwata nʼagha.
Dafidi mú adé kúrò lórí àwọn ọba wọn ìwọ̀n rẹ̀ dàbí i tálẹ́ǹtì wúrà, a sì tò ó jọ pẹ̀lú àwọn òkúta iyebíye. A sì gbé e ka orí Dafidi. Ó kó ọ̀pọ̀ ìkógun láti ìlú ńlá náà.
3 Ọ kpọpụtara ndị nọ nʼebe ahụ, manye ha nʼịrụ ọrụ nke e ji mma nkwọ e ji awa osisi, na igwe e ji egwu ala, na anyụike na-arụ. Otu a ka Devid mekwara obodo niile nke ndị Amọn. Emesịa, Devid na ndị agha ya niile laghachiri na Jerusalem.
Ó sì kó gbogbo àwọn ènìyàn tí ó wà ní ibẹ̀ jáde, ó sì fi iṣẹ́ lé wọn lọ́wọ́ láti ṣiṣẹ́ pẹ̀lú ayùn àti ìtulẹ̀ onírin àti àáké. Dafidi ṣe eléyìí sí gbogbo àwọn ará ìlú Ammoni. Nígbà náà, Dafidi àti gbogbo àwọn ọmọ-ogun rẹ̀ padà sí Jerusalẹmu.
4 Mgbe oge gatụrụ, agha ọzọ daara ha na ndị Filistia, na Gaza. Mgbe ahụ, Sibekai, onye Husha, gburu Sipai, otu nʼime ndị agbụrụ Refaim. Nke a mere ka ndị Filistia chilie aka ha elu, bụrụ ndị a lụgburu nʼagha.
Ní ẹ̀yìn èyí ni ogun bẹ́ sílẹ̀ ní Geseri pẹ̀lú àwọn ará Filistini, ní àkókò yìí ni Sibekai ará Huṣati pa Sipai, ọ̀kan lára àwọn ọmọ Refaimu, àti àwọn ará Filistini ni a ṣẹ́gun.
5 Nʼagha ọzọ ha na ndị Filistia lụrụ, Elhanan, nwa Jaịa, gburu Lami nwanne Golaịat, onye Gat. Onye ùbe ya nwere osisi dị ogologo dịka nke onye na-ekwe akwa ji ekwe akwa.
Nínú ogun mìíràn pẹ̀lú àwọn ará Filistini, Elhanani ọmọ Jairi pa Lahmi arákùnrin Goliati ará Gitti, ẹni ti ó ní ọ̀kọ̀ kan tí ó dàbí ọ̀pá ahunṣọ.
6 Nʼagha ọzọkwa, bụ nke a lụrụ na Gat, e nwere otu nwoke gbara oke dimkpa, nke nwere mkpịsịaka isii nʼaka ya ọbụla, nweekwa mkpịsịụkwụ isii nʼụkwụ ya ọbụla, ya bụ, a gụkọtaa ha niile, iri mkpịsịaka na mkpịsịụkwụ abụọ na anọ. Ọ bụkwa onye amụrụ nʼagbụrụ Rafa.
Síbẹ̀síbẹ̀ nínú ogun mìíràn, tí ó wáyé ní Gati, ọkùnrin títóbi kan wà tí ó ní ìka mẹ́fà ní ọwọ́ rẹ̀ pẹ̀lú ìka mẹ́fà ní ẹsẹ̀ rẹ̀ mẹ́rìnlélógún lápapọ̀. Òun pẹ̀lú wá láti Rafa.
7 Mgbe ọ kọchara Izrel, Jonatan nwa Shimea, nwanne Devid gburu ya.
Nígbà tí ó fi Israẹli ṣẹ̀sín, Jonatani ọmọ Ṣimea, arákùnrin Dafidi sì pa á.
8 Ndị a bụ ndị agbụrụ Rafa dị na Gat. Devid na ndị agha ya gburu ha niile.
Wọ̀nyí ni ìran ọmọ Rafa ní Gati, wọ́n sì ṣubú sí ọwọ́ Dafidi àti àwọn ọkùnrin rẹ̀.

< 1 Ihe E Mere 20 >